Otu nime Kraịst
Ọ bụ naanị nime na site na iguzosi ike na Jizọs Kraịst ma hụ ya nanya ka anyị nwere ike inwe olile anya ịbụ otu.
Dịka Onyeisi Dallin H. Oaks kwuru, taa bụ Sọnde Ịgu nkwụ, mbido nke Izu-ụka Dị Nsọ, na-egosipụta ka Onyenwe anyị were mmeri banye nime Jerusalem, ahụhụ niile Ọ tara nime Getsemani na ọnwụ n’elu obe ka ụbọchị ole na ole gachara, na Mbilite n’ọnwụ Ya dị ebube na Sọnde Ista. Ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị echefu ihe Kraịst diri iji gbapụta anyị.1 Ma ka anyị ghara ịtufu nnukwu ọńụ ahụ anyị ga-enwe ọzọ na Ista dịka anyị na-atụgharị uche na mmeri Ya na ili na onyinye nke mbilite n’ọnwụ zuru mmadụ niile.
N’uhuruchi tupu ọnwụnwa niile na mkpọgide n’obe nke chere Ya, Jizọs sonyere Ndị Ozi Ya iri nri Ngabiga. Na ọgwugwu nke Nri Anyasị, nime Ekpere Arịrịọ dị nsọ, Jizọs rịọrọ Nna Ya arịrịọ n’okwu ndị a: “Nna Dị nsọ, debe aha gị n’aha nke m [Ndị ozi m] ndị i nyeworo m, ka ha wee bụrụ otu, dịka anyị dị.”2
Mgbe ahụ, n’ịdị nrọ, Onye Nzọpụta gbasara arịrịọ Ya ka ọ gụnyere ndị kwere ekwe niile.
“Anaghị M ekpe ekpere maka naanị ndị a, kama maka ndị nke ga-ekwenye na mụ site na okwu ha;
“Ka ha niile wee bụrụ otu; dị ka gị onwe gị, Nna, nọ nime m, ma Mụ nọ nime gị, ka ha n’otu aka ahụ nọrọ nime anyị.”3
Ịbụ otu bụ isiokwu na-emegharị ugboro ugboro nime oziọma nke Jizọs Kraịst na omume niile nke Chineke na ụmụ Ya. Gbasara obodo Zayọn na oge Inọk, e kwuru na “ha nwere otu obi na otu uche.”4 Agba Ọhụrụ dere gbasara Ndị Nsọ mbụ nke Nzukọ nsọ mgbo ochie nke Jizọs, “Igwe mmadụ nke ndị kwere na ha nwere otu obi na otu mkpụrụ obi.”5
Na ọgbọ anyị, Onyenwe anyị dụrụ ọdụ, “Asị M unu, bụrụ otu; ma ọ bụrụ na unu a dịghị n’otu unu a bụghị ndị m.”6 Onyenwe anyị kwuru na otu nime ihe ndị kpatara ndị nsọ mbụ nke Missouri na-ejighị guzobe ebe nke Zayọn bụ na ha adịghị “n’otu dịka njikọ nke iwu ahụ nke ala-eze Selestịal siri dị.”7
Ebe Chineke na-emeri nime obi na uche niile, ndị mmadụ ahụ ka a kọwara dịka “ otu, ụmụ nke Kraịst.”8
Mgbe Onye Nzọpụta ahụ a kpọlitere n’ọnwụ pụtara nye ndị mmadụ Akwụkwọ nke Mọmọn oge ochie, O kwuru na-enweghị mmasị na n’oge gara aga enweworị arụmụka n’etiti ndị mmadụ gbasara baptizim na ihe ndị ọzọ. O nyere iwu:
“Ma agaghị enwe ịrụ ụka n’etiti unu, dịka ọ na-adịrịị na mbụ; ọbụghị ma a ga-enwe ịrụ ụka n’etiti unu gbasara ihe nile nke ozizi m, dịka ọ na-adịrịị na mbụ.
“N’ihi na n’ezie, n’ezie asị m unu, onye nke nwere mmụọ nke ndọrọ-ndọrọ abụghị nke m, kama ọ bụ nke ekwensu, onye bụ nna nke ndọrọ.”9
Nime ụwa anyị jupụtara na esemokwu, kedu ka a ga-esi nweta ịdị n’otu, nke kachasị nime Nzukọ nsọ, ebe anyị kwesịrị inwe “otu Onyenwe anyị, otu okwukwe, otu baptizim”?10 Pọl na-enye anyị ịgodo ahụ:
“N’ihi na ka ha ra bụ unu ndị meworo baptizim n’ime Kraịst eyikwasiwo Kraịst.
“Ọ dighị kwa onye Ju mọbụ onye Greek, ọ dighị onye oru mọbụ onye nwe onwe ya, ọ dighị nwoke mọbụ nwanyị: n’ihi na unu niile bụ otu nime Kraịst”11
Anyị dị iche iche karịa ma mgbe ụfọdụ enweghị ike ịbịkọta ọnụ dịka otu mọbụ na ndabere ọ bụla mọbụ n’aha ọbụla ọzọ. Naanị na Jizọs Kraịst ka anyị nwere ike ịbụ otu.
Ịbụ otu nime Kraịst na-eme otu otu—onye ọbụla nime anyị na-amalite n’onwe anyị. Anyị bụ mmadụ abụọ nke anụ ahụ na mmụọ ma na-alụ ọgụ mgbe ụfọdụ nime onwe anyị. Dịka Pọl kwuru:
“N’ihi na iwu nke Chineke di m mma dika mmadụ ime m siri dị;
“Kama A na m ahụ iwu ọzọ nime ndị otu [ahụ] [nke anụ ahụ m], na-alụ ọgụ megide iwu nke uche m, ma na-adọta m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị nime ndị otu m.”12
Jizọs bụkwara onye nwere anụ ahụ na mmụọ. A nwalere Ya, Ọ ghọtara; Ọ nwere ike inyere anyị aka inweta ịdị n’otu nime anyị.13 Ya mere, ịdọrọ ihè na amara nke Kraịst, anyị na-agbalịsi ike inye mmụọ anyị—na Mmụọ Nsọ ahụ—ike n’elu anụ ahụ. Ma mgbe anyị dara, Kraịst, site na aja mgbaghara mmehie Ya, enyewo anyị onyinye nke nchegharị na ohere ịnwale ọzọ.
Ọ bụrụ na anyị n’otu n’otu “yikwasị Kraịst,” mgbe ahụ anyị nwere ike inwe olile anya ịbụ otu,dịka Pọl kwuru, “anụ ahụ nke Kraịst”14 I “yikwasị Kraịst” n’ezie gụnyere ime “iwu Ya nke mbụ na nke kachasị”15 ka ọbụrụ iwu nke mbụ anyị kachasị, ma ọbụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya, anyị ga-edebe iwu Ya niile.16
Ịdị n’otu n’etiti ụmụnne anyị nwoke na nwanyị nime anụ ahụ nke Kraịst na-eto ka anyị na-erube isi n’iwu nke abụọ— nke jikọrọ ya na nke mbụ— ịhụ ndị ọzọ n’anya dịka onwe anyị.17 Ma echere m na ịdị n’otu zuru oke karịa ga-adị n’etiti anyị ma ọbụrụ na anyị gbasoo nkwuputa nke Onye Nzọpụta nke dị elu na nke dị nsọ karịa nke iwu nke abụọ a—ka anyị hụrịta onwe anyị n’anya abụghị naanị dịka anyị hụrụ onwe anyị kama dịka Ọ hụrụ anyị n’anya.18 Na nchịkọta, ọ bụ “onye ọbụla na-achọ ọdịmma nke onye agbata-obi ya, ma na-eme ihe nile jiri anya lekwasị nani n’otuto nke Chineke.”19
Onyeisi G. Romney, onye bụbu onye ndụmọdụ nime Otù Ndịisi Mbụ, n’ịkọwa otu esi enweta udo na ịdị n’otu na-adịgide, kwuru:
“Ọbụrụ na otu onye, na-erubere Setan isi, jupụtara na ọrụ nke anụ ahụ, ọ na-aluso onwe ya agha. Ọbụrụ na mmadụ abụọ ekweta, onye ọbụla nime ha na-alụ ọgụ nime onwe ya ma na-alụso ibe ya ọgụ. Ọbụrụ na ọtụtụ mmadụ ekweta, ọha mmadụ [na-aghọrọ] mkpụrụ nke nnukwu nrụgide na esemokwu. Ọbụrụ na ndị na-achị obodo ekweta, a na-enwe esemokwu zuru ụwa ọnụ.”
Onyeisi Romney gara n’ihu: “Dịka ọrụ nke anụ ahụ si dị n’ụwa niile, otu a ka ozi ọma nke udo dị kwa. Ọbụrụ na otu onye n’ebi ya, ọ ga-enwe udo nime ya. Ọbụrụ na mmadụ abụọ ebie ya, onye ọbụla nime ha ga-enwe udo nime onwe ya na n’etiti onwe ha. Ọbụrụ na ụmụ amaala bie ya, mba ahụ ga-enwe udo nke ụlọ. Mgbe enwere ọtụtụ mba na-anụ ụtọ mkpụrụ nke Mmụọ iji chịkwaa ihe omume niile nke ụwa, mgbe ahụ, na naanị mgbe ahụ, ka udu agha niile agazighị ada, na ọkọiọtọ agha niile ga-awụpụ. … (Lee Alfred Lord Tennyson, “Locksley Hall,“ The Complete Poetical Works of Tennyson, ed. W. J. Rolfe, Bosten: Houghton–Mifflin Co., 1898, p. 93, ahịrị niile 27–28.)”20
Mgbe anyị “yikwasịrị Kraịst,” ọ ga-ekwe omume idozi mọbụ dobe ịdị iche iche niile, nghọtahie niile, na esemokwu niile na-akụkụ. Ịma-atụ dị egwu nke imeri nkewa bụ nke a na-ahụ nime agụgụala nke Nzukọ nsọ anyị. Okenye Brigham Henry Roberts (nke a na-akpọkarị B. H. Roberts), amụrụ na England nime afọ 1857, jere ozi dịka onye otù Kansụl Mbụ nke Iri Asaa—ihe anyị na-akpọ taa dịka Ndị Isi Nduzi nke Iri Asaa. Okenye Roberts bụ onye nwere ike ịchebe ozi ọma ahụ eweghachitere ma Nzukọ nsọ n’oge ụfọdụ niile ihe siri ya ike.
N;afọ 1895, otu o sila dị,e tinyere ọrụ Okenye Roberts nime Nzukọ nsọ n’ihe egwu site n’esemokwu. B. A họpụtara H. ka ọ bụrụ onye nnọchi anya na mgbakọ ahụ nke depụtara ụkpụrụ iwu maka Utah mgbe ọ ghọrọ steeti. Mgbe nke ahụ gasịrị, o kpebiri ịbụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị maka United States Congress mana ọ gwaghị mọbụ chọọ ikike n’aka Otu Ndịisi Mbụ. Onyeisi Joseph F. Smith, onye ndụmọdụ nime Otu Ndịisi Mbụ, wepụrụ aha B. H. maka ọdịda ahụ na nzukọ ọkwa nchụaja zuruọha. Okenye Roberts dara na ntuli aka ahụ ma chee na ọdịda ya bụ n’ihi nkwupụta niile nke Onyeisi Smith. Ọ katọrọ ndị ndu Nzukọ nsọ na ụfọdụ okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ajụjụ ọnụ niile. Ọ kwụsịrị ije-ozi nke Nzukọ nsọ. Nime nzukọ dị ogologo nime Tempụl Salt Lake ya na ndị otù Ndịisi Mbụ na Kansụl nke Ndị Iri na abụọ, B. H. n’ọgidesịrị ike n’ịkwado onwe ya. Mgbe emesịrị, “Onyeisi [Wilford] Woodruff nyere [Okenye Roberts] izuụka atọ ka ọ tụlegharụa ọnọdụ ya. Ọ bụrụ na ọ nọgide na-enweghị nchegharị, ha ga-atọhapụ ya na Iri Asaa ahụ.”21
Nime nzukọ nke onwe nke sochiri ya na Ndị-ozi Heber J. Grant na Fracis Lyman, B. H. ekweghị na mbụ, mana ịhụnanya na Mmụọ Nsọ mechara merie. Anya mmiri bịara na anya ya niile. Ndị-ozi abụọ ahụ nwere ike ịzaghachi ụfọdụ mkparị na mmejọ niile ndị ha chere na-ewute B. H., ma ha pụrụ jiri arịrịọ si na obi maka ime udo. Na ụtụtụ echi ya, mgbe ogologo ekpere gasịrị, Okenye Roberts zigara ndị Okenye Grant na Lyman akwụkwọ ozi na ọ dị njikere isorokwa ụmụnne ya.22
Mgbe o mesiri zute Otù Ndịisi Mbụ, Okenye Roberts sịrị, “A gakwuru m Onyenwe anyị ma nata ihè na ntụziaka site na Mmụọ Ya ka m dobe onwe m n’okpuru ikike nke Chineke.”23 N’ihi mkpali ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ, B. H. Roberts nọgidere bụrụ onye-ndu Nzukọ nsọ na nke kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ nke ndụ ya.24
Anyị nwekwara ike hụ ihe ịma-atụ a na ịdị n’otu apụtaghị nnọọ ikweta na onye ọbụla kwesịrị ime ihe nke onwe ya mọbụ ga na ụzọ nke onweya. Anyị enweghị ike ịbụ otu ọ gwụla ma anyị niile gbadoro mbọ anyị niile nye otu ihe. Ọ pụtara, n’okwu niile B. H. Roberts, idobe onwe anyị n’okpuru ikike nke Chineke. Anyị bụ akụkụ dị iche iche nke anụ ahụ nke Kraịst, na-arụ ọrụ dị iche iche n’oge niile dị iche iche— ntị, anya, isi, aka, ukwu niile—agbanyeghị ihe niile nke otu ahụ.25 Ya mere, ebu m n’obi anyị bụ “na ekwesịghị inwe nkewa n’anụ arụ ahụ; kama na ndị otù ahụ kwesịrị inwe otu ụdị nlekọta anya maka onye na ibe ya.”26
Ịdị n’otu adịghị achọ ịbụ otu ụdị ihe, mana ọ chọrọ nkwekọ. Anyị nwere ike jikọta obi anyị ọnụ n’ịhụnanya, bụrụ otu n’okwukwe na ozizi, ma ka na-akwado otu egwuregwu niile ọbụla, ka na-enwe nghọtahie n’okwu niile ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-enwe arụmụka banyere ebumnuche niile na ụzọ ziri ezi iji nweta ha, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Kama anyị enweghị ike iji iwe ghọtahie mọbụ see okwu mọbụ ledaa ibe anyị anya. Ka Onye nzọpụta kwuru:
“N’ihi na n’ezie, n’ezie asị m unu, onye nke nwere mụọ nke ndọrọ-ndọrọ abụghị nke m, kama ọ bụ nke ekwensu, onye bụ nna nke ndọrọ-ndọrọ, ma ọ na-akpalite obi nile nke ndị mmadụ iji iwe dọọ ndọrọ-ndọrọ, otu onye na ibe ya.
“Lee, nke a abụghị ozizi m, iji iwe kpalite obi niile nke ndị mmadụ, otu onye megide ibe ya; mana nke a bụ ozizi m, na a ga-akwụsị ụdị ihe ndị ahụ.”27
Otu afọ gara aga, Onyeisi Russell M. Nelson rịọrọ anyị jiri okwu ndị a: “O nweghị onye ọbụla nime anyị nwere ike ịchịkwata mba niile ma ọ bụ ihe niile ndị ọzọ n’eme ma ọbụnadị ndị otù ezi na ụlọ nke onwe anyị. Mana anyị nwere ike ịchịkwata onwe anyị. Oku m na-akpọ taa, ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, bụ ka akwụsị esemokwu niile ahụ na-ere ọkụ niime obi unu, ebe obibi unu, na niime ndụ unu. Lienụ ihe ọbụla na ihe niile na-eme ka inwee agụụ imerụ ndị ọzọ ahụ—amaghị ma ihe ndị ahụ na-eme ka inwe agụụ ọ bụ iwe, ire nkọ, ma ọ bụ mkpọrọm asị maka onye mere gị ihe ọjọọ. Onye Nzọpụta nyere anyị iwu ịtụgharị akụkụ nti nke ọzọ [lee 3 Nefi 12:39], ịhụ ndị iro anyị naanya, na ikpe ekpere maka ndị na-eji anyị eme ihe nleda-anya [lee 3 Nefi 12:44].”28
A na m ekwu ọzọ na ọ bụ naanị nime na site n’ikwesị ntụkwasị obi nye Jizọs Kraịst ka anyị ga enwe ike nwee olile anya ịbụ otu—otu nime, otu n’ụlọ, otu nime Nzukọ nsọ, n’ikpeazụ otu nime Zayọn, na karịa ihe niile, otu anyị na Nna na Ọkpara na Mmụọ Nsọ.
A na m alaghachi na emume niile nke Izuụka Dị Nsọ na mmeri ikpeazụ nke Onye Mgbapụta anyị. Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraịst na-agba ama maka ịdị nsọ Ya nakwa na O meriwo ihe niile. Mbilite n’ọnwụ Ya na-agba akaebe na, nime Ya na ọgbụgba ndụ, anyị onwe anyị nwekwara ike imeri ihe niile ma ghọọ otu. Mbilite n’ọnwụ Ya na-agba akaebe na site n’aka Ya, anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi bụ ihe dị adị.
N’ụtụtụ a, A na m agba aka-ebe nke Mbilite n’ọnwụ Ya na ihe niile ọ pụtara, n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.