Come, Follow Me
Appendix D: Maka Kworum Ọkwa Nchụaja Erọn niile na Klasị Ndịinyom Nta niile—Ajenda Nzuko


“Appendix D: Maka Kworum Ọkwa Nchụaja Erọn niile na Klasị Ndịinyom Nta niile—Ajenda Nzuko,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Appendix D,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Appendix D

Maka Kworum Ọkwa nchụaja Erọn niile, na Klasị Ndịinyom Nta niile

Agụgụ ụbọchị Nzukọ:

Ituziaka (onye otù klas ma ọ bụ otu ndịisi kworum):

MMepe

Abụ (ma achọọ):

Ekpere:

Kwugharịa Isiokwu Ndịiyom Nta ma ọ bụ Isiokwu Kworum Ọkwa nchụaja nke Erọn.

Nyekọrịta ndụmọdụ ọnụ

Onye na-edu nzukọ ahụ na-atuzi, klas ma ọ bụ kworum na-ewe nkeji 5 ruo 10 na-adụkọrịta ndụmọdụ ọnụ banyere oke na ọrụ ha n’ọrụ ha niime ọrụ Nzọpụta na Mbuli elu nke Chineke. Nke a bụ ohere maka otù ndịisi klas ma ọ bụ kworum isochi nihe ndị ekwurịkọtara niime nzukọ niile nke ndịisi ma nzukọ niile nke kansụl ndị ntoroọbia na ngalaba ukwu.

Onye na-eduzi nwekwara ike jiri otu ma ọ bụ karịa niime ajụjụ ndị a:

Ibi ndụ ozi ọma

  • Kedụ nhụmiihe na nso nso a ndị gbaworo ama anyị banyere Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya ume?

  • Gịnị ka anyị na-eme iji bịarute Onye Nzọpụta nso? Kedụ otu anyị si agbalị ịdị ka Ya karịa?

  • Kedụ otu anyị siworo nwete mmetụta odudu nke Onyenwe anyị niime ndụ anyị?

Ilekọta ndị ahụ nọ na mkpa

  • Onye ka o metụtaworo anyị inyere aka ma ọ bụ ijere ozi? Kedụ ọrụ ndị ekenyere anyị site n’aka otù ndị bishọp iji nyere onye nọ na mkpa aka?

  • Kedụ aka mgba ndị otù klas ma ọ bụ kworum na-ezute? Kedụ otu anyị nwere ike i si kwadoo ibe anyị nihe ndị anyị na-agabiga?

  • Enwewo onye kwabataworo niime ngalaba ukwu ma ọ bụ sonyere Nzukọ nsọ na nso nso a? Kedụ otu anyị nwere ike i si nyere ha aka nwee mmetụta nnabata?

Ịkpọku ndị niile ịnata ozi ọma ahụ

  • Kedụ ihe anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka nwete mmetụta ịhụnaanya nke Chineke?

  • Kedụ ihe omume ndị na-abịa abịa nke anyị nwere ike ịkpọku ndị enyi anyị ịbịa?

  • Kedụ atụmatụ ikesa ozi ọma ka akparịtaworo na nzukọ kansụl ndị ntoroọbia ngalaba ukwu niile? Kedụ otu klas ma ọ bụ kworum anyị ga-esi eso eme ihe?

Ijịkọta ndị ezi na ụlọ ọnụ maka ebighị ebi

  • Olee ụfọdụ ụzọ ndị anyị nwere ike i si jikọta anyị na ndị otù ezi na ụlọ ọnụ n’ụzọ kacha mma, gụnyere ndị nna na nna na ndị nne nne na ụmụ nwanne nne na nna?

  • Kedụ ihe anyị na-eme iji chọta aha nke ndị nna nna anyị ha ndị nwere mkpa emume nsọ tempụl niile? Kedụ ihe anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka chọta aha nke ndị nna nna ha ha?

  • Kedụ otu anyị nwere i si sonye n’ọrụ tempụl karịa—n’otu n’otu na dị ka klas ma ọ bụ kworum?

Mụkọtanụ ihe ọnụ

Onye ndu dimkpa ma ọ bụ onye otù kworum ma ọ bụ klas na-edu ntuziaka banyere ihe ọgụgụ Bịanụ, Soro M nke izu ụka nke a. Ha na-eji nchepụta ọmụmụ ihe ndị dị niime Bịanụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ. Nchepụta ọmụmụ ihe nwere akara ngosi semịnarịakara ngosi nke a dabara adaba na semịnarị ma kachasị dị mkpa nye ndị ntoroọbịa. Kosiladị, nchepụta ọmụmụ ihe nke ọbụla niime ndị a ka e nwere iji eme ihe Akụkụ nzukọ nke a na-ewekarị ihe dị ka nkeji 35 ruo 40.

Mmechi

Onye na-atuzi aka nzukọ:

  • Na-agba ama nke ụkpụrụ ndị akuziri.

  • Na-ekwurịta otu klaasị ma ọ bụ kworum ga-esi etinye n’ọrụ ihe ha mụworo—dị ka otù ma ọ bụ n’otu n’otu.

Ekpere: