Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
19. Egwu


“19. Egwu,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“19. Egwu,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
onyeinyom na nwata na-akpọ ube

19.

Egwu

19.1

Ebumnoobi nke Egwu niime Nzukọ nsọ

Egwu dị nsọ na-abawanye okwukwe nʼime Jizọs Kraist. Ọ na-akpọku Mmụọ ma na-akuzi ozizi. Ọ nakwa ekepụta mmetụta nke nkwanye ugwu, na-ejikọ ndị otù ọnụ, ma na-ewete ụzọ esi efe Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ofufe.

19.2

Egwu N’ebe obibi

Site na ndị amụma Ya, Onyenwe anyị agbawo ndị mmadụ na ezi na ụlọ niile ume iji egwu na-akpali mmụọ eme ihe niime ndụ ha kwa ụbọchi.

Rekọọdụ egwu Nzukọ nsọ ndị emere dị adị site n’ụzọ ndị a soterenụ:

19.3

Egwu niime Ọgbakọ niile nke Nzukọ nsọ

19.3.1

Ịtụ atụmatụ Egwu maka Ọgbakọ niile nke Nzukọ nsọ

Ndị nchịkwa egwu ngalaba ukwu na stek na-arụkọ ọrụ ha na ndị ndu ọkwa nchụaja ịtụ atụmatụ egwu maka nzukọ ofufe niile. Ha na-ahọrọ egwu nke na-akpọli mmụọ nke ofufe na nzukọ ndị ahụ.

19.3.2

Egwu niime Nzukọ Oriri nsọ

Egwu niime nzukọ oriri nsọ gụnyere ndị ọgbakọ ịbụ abụ mmepe na mmechi nzukọ na tupu enye oriri nsọ. Abụ oriri nsọ kwesịrị ịrụtụ aka na oriri nsọ n’onwe ya ma ọ bụ n’aja nke Onye Nzọpụta.

Egwu tupu mbido ka a na-akpọ dị ka ndị otù na-agbakọ tupu nzukọ ebido. Mgbe ekpesịrị ekpere mmechi, egwu mgbe emechiworo ka a na-akpọ dị ka ndị otù na-apụ na nzukọ.

Nzukọ oriri nsọ nwekwara ike gụnye abụ mgbakwunye ndị otù bụrụ n’etiti nzukọ ahụ—n’ịma atụ, n’etiti okwu niile ndị ekwuru.

19.3.3

Egwu niime Klaasị na Nzukọ Ngalaba Ukwu Ndị Ọzọ

Ndị ndu na-agba ndị nkuzi ume iji abụ na egwu ndị ọzọ dị nsọ kwalite nkuzi ha.

19.3.6

Ngwa Egwu niile

Ngwa egwu niile dị adị ka a na-ejikarị maka egwu tupu mbido na egwu mgbe emechiworo na maka nkwadoegwu abụ niime ọgbakọ niile nke Nzukọ nsọ. Ebe ha dị adị na ebe ndị otù nwere ike ịkpọ ha, ọgan na ube niile bụ ngwa egwu akwadoro. Ndị otù bishọp nwere ike kwadoo iji ngwa ndị ọzọ akwadoro iji soro n’ịgụ egwu ndị ọgbakọ, maka egwu tupu mbido na nke mgbe emechiworo, ma na nhọrọ egwu ndị ọzọ.

Ọ bụrụ na ube, ọgan, ma ọ bụ ọkwadoegwu adịghị adị, enwere ike iji ndị erekọdụrụ erekọdụ (lee 19.2).

19.3.7

Kwaya niile

19.3.7.1

Kwaya Ngalaba ukwu niile

Ebe enwere ọtụtụ ndị otù, ngalaba ukwu nwere ike hazie ndị kwaya maka ịgụ egwu na nzukọ oriri nsọ mgbe ọbụla.

Na mgbakwunye nye kwaya ngalaba ukwu, ndị ezi na ụlọ na otu niile nke ụmụnwanyị, ụmụnwoke, ndị ntoroọbịa, ma ọ bụ ụmụntakịrị ka enwere ike ịkpọku ịgụ egwu na ọgbakọ niile nke Nzukọ nsọ.

19.4

Odudu Egwu niime Ngalaba ukwu

19.4.1

Otu Bishọp

Bishọp ka ọ dị n’aka maka egwu ngalaba ukwu. O nwere ike inye ọrụ nke a otu niime ndị ndụmọdụ ya.

19.4.2

Onye Nchịkwa Egwu Ngalaba ukwu

Onye nchịkwa egwu ngalaba ukwu na-eje ozi n’okpuru ntuziaka nke otu bishọp. O nwere oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Ịbụ onye njụ nye otu bishọp na ndị ndu ngalaba ukwu ndị ọzọ maka ihe niile banyere egwu.

  • Soro otu bishọp rụọ ọrụ iji tụọ atụmatụ egwu nke nzukọ oriri nsọ niile (lee 19.3.1 na 19.3.2)

  • Dị ka otù bishọp chọrọ, na-arọpụta ndị otù ije ozi n’ọkpụkpọ okù niile nke egwu ngalaba ukwu. Kuziere ndị ahụ na-eje ozi niime ọkpụkpọ okù ndị a ihe, na-enye nkwado, nkuzi, na ọzụzụ dị ka a chọrọ.

19.4.3

Ọkpụkpọ okù ndị Agbakwunyere

Otù bishọp nwere ike kpọọ ndị otù ije ozi n’ọkpụkpọ okù ndị a sotere.

19.4.3.1

Onye Ndu Egwu Ngalaba ukwu

Onye ndu egwu na-atụzi aka ịbụ abụ ndị ọgbakọ maka nzukọ oriri nsọ na maka nzukọ ngalaba ukwu ndị ọzọ dị ka a chọrọ.

19.4.3.2

Ọkwadoegwu Ngalaba ukwu

Ọkwadoegwu ngalaba ukwu na-ewete egwu tupu mbido na nke mgbe emechiworo na nkwadoegwu nke abụ n’oge nzukọ oriri nsọ na nzukọ ngalaba ukwu ndị ọzọ dị ka a chọrọ.

19.7

Atụmatụ na Ntuziaka ndị Agbakwunyere

19.7.2

Ojiji nke Ngwa egwu niile nke Ụlọ ụka maka Mmegharị aka, Nkuzi ihe nke Onwe, na Ngụgharị niile

Mgbe enweghị nhọrọ ọzọ bara uru, ndị ndu ọkwa nchụaja nwere ike nye ikike maka ojiji ube na ọgan nke ụlọ ụka maka mmegharị aka, nkuzi nke onwe a kwụrụ ụgwọ, na ngụgharị niile gụnyere ndị otù nke ngalaba niile na-abịa ụlọ ụka ahụ.

Bipụta