Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
22. Inye ihe maka Mkpa nke Anụ ahụ niile na Iwulite Ndabere Onwe


“22. Inye ihe maka Mkpa niile nke Anụ ahụ na Iwulite Ndabere N’onwe,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“22. Inye ihe maka Mkpa niile nke Anụ ahụ na Iwulite Ndabere Onwe,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
onyeikom na-arụ ọrụ

22.

Inye ihe maka Mkpa niile nke Anụ ahụ na Iwulite Ndabere Onwe

22.0

Ndubata

Ndị otù Nzukọ nsọ gbara ndụ “ibukọrịta ibu otu onye n’ibe ya, … na-eso ndị n’eru uju eru uju … , ma nye nkasi obi ndị nọ na mkpa nkasi obi” (Mozaya 18:8–9).

Ndị otù Nzukọ nsọ ka a na-adụkwa ndụmọdụ ịgba ndabere onwe nke onwe ha ume site na ịrụsị ọrụ ike na site na enyemaka nke Onyenwe anyị. Ndabere onwe bụ ike ahụ, mkpebi, na mbọ ịrụpụta mkpa nke ime mmụọ na nke anụ ahụ niile nke ndụ maka onwe na ezi na ụlọ.


MBỌ NIILE NKE MMADỤ NA NKE EZI NA ỤLỌ


22.1

Wulite Ndabere N’onwe

Site n’enyemaka nke Onyenwe anyị, ndị otù n’ewulite ndabere onwe n’ụzọ ndị a sotere:

  • Wulite ike nke ime mmụọ, nke anụ ahụ, na nke mmetụta uche.

  • Nwete agụmakwụkwọ na ọrụ.

  • Mee ka nkwadebe nke anụ ahụ dị mma karịa.

22.1.4

Ime Nkwadebe nke Anụ ahụ

Akwụkwọ nsọ na-akuzi ịdị mkpa nke ime nkwadebe (lee izikiel 38:7; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:30). Ndị otù ka enyere ndụmọdụ ime nkwadebe ka ha nwee ike lekọta onwe ha, ndị ezi na ụlọ ha, na ndị ọzọ n’oge mkpa.

Ndị otù na-amụbawanye ime nkwadebe nke ịkpata ego site na:

  • Ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye niile (lee Malakaị 3;8-12).

  • Iwepụ ma zere ụgwọ ruo n’ókè kwere omume.

  • Ikwado ma bie ndụ niime atụmatụ mkpata na mmefu ego.

  • Ichekwa ego maka ọdịniihu.

  • Inwete agụmakwụkwọ dabara adaba iji nyere ha aka nwete ihe maka onwe ha na ndị ezi na ụlọ ha (lee 22.3.3).

Ime nkwadebe gụnyekwara iwulite atụmatụ maka otu esi elekọta mkpa ndị kachasị mkpa n’oge ihe mberede. Ndị otù ka a na-agba ume iwulite otu esi enwete nri, mmiri, na ihe ndị ọzọ dị mkpa ma mgbe obere oge ma mgbe ogologo oge.

22.2

Jee ozi lekọta nye Ndị ahụ nwere Mkpa nke Anụ ahụ na Nke Mmetụta uche

Ndị na-eso ụzọ nke Onyenwe anyị ka akuziiri “inwe ịhụnaanya … ma jeere otu onye n’ibe ya ozi” na “inyere ndị ahụ nọ na mkpa nke … enyemaka aka” (Mozaya 4:15-16). Ndị otù na-agba mbọ ịhụ ndị ọzọ dị ka otu Onye Nzọpụta si a hụ ha, na-aghọta ike na mkpa ha ndị pụrụ iche. Mkpa ndị a nwere ike gụnye nri, uwe, ụlọ obibi, agụmakwụkwọ, inwete ọrụ, ahụike anụ ahụ, na ọdị mma nke mmetụta uche.

22.2.1

Ụlọ nkwakọba ihe nke Onyenwe anyị

Akụrụngwa niile dị adị nye Nzukọ nsọ iji nyere ndị ahụ nwere mkpa anụ ahụ aka ka akpọrọ ụlọ nkwakọba ihe nke Onyenwe anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 82:18–19). Ndị a gụnyere onyinye ndị otù niile nke oge, akaraka niile, ọmịiko, ngwaọrụ niile, na akụrụngwa ego niile iji nyere ndị ahụ nọ na mkpa aka.

Ụlọ nkwakọba ihe nke Onyenwe anyị dị na ngalaba ukwu na stek ọbụla. Ndị ndu nwere ike mgbe ụfọdụ nyere ndị mmadụ na ndị ezi na ụlọ aka gboo mkpa ha site n’ịdọrọ ọmụma ihe, nka niile, na ije ozi nke ndị otù ngalaba ukwu na stek nyere.

22.2.2

Iwu nke Ibu ọnụ na Onyinye Ibu ọnụ niile

Onyenwe anyị ehiwewo iwu nke ibu ọnụ na onyinye ibu ọnụ niile iji gọzie ndị Ya na iwete ụzọ nye ha iji jeere ndị ahụ nọ na mkpa ozi. Ndị otù na-abịarute Onyenwe anyị nso ma bawanye n’ike nke ime mmụọ dị ka ha na-edebe iwu nke ibu ọnụ. (Lee Aịzaya 58:6–12; Malakaị 3:8–12.)

Enwere ike buo ọnụ n’oge nke ọbụla. Kosiladị, ndị otù na-edebekarị Ụbọchi izuike mbụ n’ọnwa dị ka ụbọchi ibu ọnụ. Ụbọchi ibu ọnụ na-agụnyekarị ndị a sotere:

  • Ikpe ekpere

  • Ịnọ na-erighị nri na ańụghị mmiri ruo oge awa 24 (ọ bụrụ na-adị ike na anụ ahụ)

  • Inye onyinye mmepụ aka nke ibu ọnụ

Onyinye ibu ọnụ bụ onyinye iji nyere ndị ahụ nọ na mkpa aka. Mgbe ndị otù na-ebu ọnụ, a na-akpọku ha inye onyinye nke opekampe zuru nha ego ole nri ndị ahụ ha na-erighị.

Ndị otù nwere ike nye onyinye ibu ọnụ ha na fọm Otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye ndị ọzọ edezuru nye bishọp ma ọ bụ otu niime ndị ndụmọdụ ya. N’ụfọdụ mpaghara, ha nwekwara ike nye onyinye ha site n’ikuku


MBỌ NIILE NKE ONYE NDU


22.3

Ụkpụrụ maka Iwulite Ndabere Onwe na Ije ozi Nlekọta nye Ndị ahụ nọ na Mkpa

22.3.1

Chọpụta Ndị ahụ nọ na Mkpa

Bishọp nwere oke na ọrụ dị nsọ ịchọpụta ma lekọta ndị ahụ nọ na mkpa (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 84:112). Ndị ọzọ nwere ọrụ dị mkpa n’inyere bishọp aka n’oke na ọrụ nke a gụnyere:

  • Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị n’eje ozi nlekọta.

  • Otu ndịisi Otu Enyemaka na kworum ndị okenye.

  • Ndị ndụmọdụ nke bishọp.

  • Ndị otù ndị ọzọ nke kansụl ngalaba ukwu.

22.3.2

Nyere Ndị otù aka Nwete ma Gboo Mkpa Obere Oge

Ndị otù na-agbalịsi ike izute ọkpụrụkpụ mkpa ha site na mbọ nke onwe ha na enyemaka sitere n’aka ikwu na ibe ha. Mgbe nke a na-ezughị, ndị otù nwere ike chọọ enyemaka site n’ụzọ ndị ọzọ dị ka:

  • Akụrụngwa niile nke gọvmentị na obodo (lee 22.12).

  • Enyemaka nke Nzukọ nsọ.

Enyemaka nke Nzukọ nsọ nwere ike gụnye enyemaka nke mkpa obere oge niile dị ka nri, ihe ndị nke ịdị ọcha, uwe, ụlọ obibi, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ndị bishọp nwere ike jiri onyinye nke ibu ọnụ iji gboo mkpa ndị a. Ebe enwere usoro nke ndị bishọp, ndị bishọp na-ejikarị ndị ahụ ewete nri na ngwa ndị ọzọ dị mkpa (lee “Iwu nke Bishọp na Ndị Ntụaka” niime Leader and Clerk Resources [LCR]).

22.3.3

Nyere Ndị otù aka Wulite Ndabere Onwe nke Ogologo Oge

Ndị otù nwere ike chọọ nkwado na-aganiihu iji zute aka mgba niile nke ogologo oge. Agụmakwụkwọ, ọzụzụ ọrụ aka, ma ọ bụ akụrụngwa ndị ọzọ nwere ike nyere ha aka wulite ndabere onwe ma wete maka mkpa niile nke ogologo oge.

Atụmatụ Ndabere Onwe na-enyere ndị otù aka chọpụta ike na mkpa ha. Ọ nakwa enyere ha aka chọpụta akụrụngwa ndị ọzọ bara uru. Atụmatụ nke a kwesịrị ka eji ya mee ihe mgbe ọbụla a tulere enyemaka nke Nzukọ nsọ.

22.3.4

Jee ozi lekọta nye Ndị ahụ nwere Mkpa nke Mmetụta uche

Ọtụtụ ndị otù na-agabiga aka mgba mmetụta uche. Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị n’eje ozi nlekọta na ndị ndu ngalaba ukwu nwere ike bụrụ ngwa ọrụ n’inyere ndị otù aka na ihe ịma aka ndị a.

22.4

Ụkpụrụ niile nke Iwete Enyemaka nke Nzukọ nsọ

Site n’enyemaka nke Onyenwe anyị, ndị otù na-achọ ụzọ iji wetere onwe ha na ndị ezi na ụlọ ha ihe.

Enyemaka nke Nzukọ nsọ ka e bu n’obi iji nyere ndị otù aka wulite nnwere onwe, na-abụghị maka idabere. Enyemaka ọbụla enyere kwesịrị ịgba ndị otù ume niime mgbalị ha na-inwe ndabere onwe.

22.4.1

Gbaa Ume Oke na Ọrụ nke Onwe na nke Ezi na ụlọ

Ndị ndu na-akuzi na ndị mmadụ na ndị ezi na ụlọ nwere isi oke na ọrụ maka ahụike nke anụ ahụ, mmetụta uche, na ọdị mma nke ime mmụọ nke onwe ha.

Tupu ewete enyemaka nke Nzukọ nsọ, bishọp ahụ (ma ọ bụ onye ndu ọzọ ma ọ bụ onye otù o kenyere ọrụ) na-enyocha ya na ndị otù akụrụngwa ndị ha na-eji iji zute mkpa nke onwe ha.

22.4.2

Iwete Enyemaka nke Anụ ahụ maka Ihe ndị Dị Mkpa

Mbunobi nke enyemaka nke Nzukọ nsọ bụ iji nwee ike zute ọkpụrụkpụ mkpa niile ebe ndị otu na-agba mbọ inwe ndabere onwe.

Ndị bishọp kwesịrị ikpe ezi ikpe ma chọọ ntuziaka nke ime mmụọ mgbe a na-atụle ego ole na oge nke enyemaka enyere. Ha kwesịrị ịdị ọmịiko ma mepụ aka ma ghara imepụta ndabere.

22.4.3

Wete Akụrụngwa niile ma ọ bụ Ije ozi niile Karịa Mkpụrụ Ego

O kwe omume, bishọp ahụ kwesịrị izere inye mkpụrụ ego. Kama, o kwesịrị iji onyinye ibu ọnụ ma ọ bụ usoro nke ndị bishọp iji wetere ndị otù ngwa nri ma ọ bụ ije ozi niile. Mgbe ahụ ndị otù nwere ike iji ego nke onwe ha wee kwụọ ụgwọ mkpa ndị ọzọ.

Mgbe nke a na-ezughị, bishọp nwere ike nye aka site n’iji onyinye ibu ọnụ iji nwee ike kwụọ ụgwọ ndị ọzọ ndị dị mkpa oge nta (lee 22.5.2).

22.4.4

Nye Ọrụ ma ọ bụ Ohere Ije ozi niile

Ndị bishọp na-akpọku ndị ahụ na-anata enyemaka ịbịa rụọ ọrụ ma ọ bụ jee ozi ruo otu ike kwere ha. Nke a na-enyere ndị otù aka nọgide n’echiche nwere ugwu. Ọ nakwa abawanye ike ha n’inwe ndabere onwe.

22.4.5

Debe Ozi banyere Enyemaka nke Nzukọ nsọ Nzuzo

Bishọp na ndị ndu ngalaba ukwu ọzọ na-edebe na nzuzo ozi ọbụla banyere ndị otù nwere ike inwe mkpa enyemaka Nzukọ nsọ. Nke a na-echekwa ọnọdụ na-abụghị maka ọha na ugwu nke ndị otù.

22.5

Atụmatụ niile maka Inye Enyemaka nke Nzukọ nsọ

Ndị ndu Nzukọ nsọ kwesịrị isoro atụmatụ niile edepụtara na nkeji nke a mgbe a na-enye enyemaka site n’onyinye ibu ọnụ niile ma ọ bụ usoro nke ndị bishọp maka nri na ngwa ndị ọzọ dị mkpa.

22.5.1

Atụmatụ niile Gbasara Ndị Na-anata Enyemaka nke Nzukọ nsọ

22.5.1.1

Enyemaka nye ndị otù Ngalaba ukwu

N’ụzọ niile, ndị otù na-anata enyemaka nke Nzukọ nsọ kwesịrị ibi n’oke ngalaba ukwu ahụ niile ma nwee ndekọihe nke ịbụ onye otù ha na ngalaba ukwu ahụ. Enwere ike inye enyemaka na-agbanyeghị ma onye otù ọ na-abịasi ike nzukọ niile nke Nzukọ nsọ ma ọ bụ n’esoro ụkpụrụ niile nke Nzukọ nsọ.

22.5.1.2

Enyemaka nye Ndị Bishọp na Ndịisi Stek

Nkwado ederede nke onyeisi stek dị mkpa tupu bishọp e nwee ike jiri onyinye nke ibu ọnụ ma ọ bụ kwadoo arịrịọ nke bishọp maka onwe ya ma ọ bụ ezi na ụlọ ya.

22.5.1.4

Enyemaka nye Ndị ahụ Na-abụghị ndị otù Nzukọ nsọ

Ndị mmadụ na-abụghị ndị otù Nzukọ nsọ ka a na-arụtụkarị aka na akụrụngwa niile nke ime obodo maka enyemaka. N’oge ndị rara ahụ, dị ka Mmụọ si duo, bishọp nwere ike nyere ha aka site n’onyinye ibu ọnụ ma ọ bụ usoro nke ndị bishọp.

22.5.2

Atụmatụ niile maka Ojiji Onyinye nke Ibu ọnụ

22.5.2.1

Ọrụ ndị dọkịnta ma ọ bụ Nlekọta Ahụike Ndị Ọzọ

Mpaghara Nzukọ nsọ ọbụla nwere oke nkwado ehiwere maka iji onyinye nke ibu ọnụ iji kwụọ ụgwọ ndị nke ọrụ ndị dọkịnta, nke eze, ma ọ bụ ahụike nke uche.

Maka ego ole akwadoro na ntuziaka niile, lee “Ojiji nke Onyinye Ibu ọnụ maka Ịkwụ Ụgwọ Ọrụ ndị dọkịnta.”

22.5.2.3

Ịkwụghachi ụgwọ nke Onyinye Ibu ọnụ niile

Ndị otù anaghị akwụghachi enyemaka nke onyinye ibu ọnụ ha natara site n’aka Nzukọ nsọ.

22.5.2.4

Ego Mmefu nke Onyinye Ibu ọnụ na Ngalaba Ukwu

Achọghị ka ndị bishọp kachie ọnụ enyemaka nke onyinye ibu ọnụ maka ndị otù ngalaba ukwu ruo n’ego ole nke onyinye anatara niime ngalaba ukwu ahụ.

22.5.3

Atụmatụ niile banyere Ịkwụ Ụgwọ niile

Ọ bụrụ ma o kwe omume, ịkwụ ụgwọ niile kwesịrị ka e mee ya kpọm kwem nye ndị azụmahịa nke na-ewete ngwa ahịa na ije ozi niile.

22.5.4

Atụmatụ niile n’Ịkwụ ụgwọ niile Nke Ga-abara Bishọp ma ọ bụ Onyeisi Stek Uru

Mgbe a na-enye ndị otù enyemaka onyinye nke ibu ọnụ, bishọp nwere ike gaghị iji ego ahụ were kwụọ ụgwọ maka ngwa ahịa ma ọ bụ ije ozi niile n’ụzọ nke ọ ga-erite uru n’onwe ya.

Ọ bụrụ ma ịkwụ ụgwọ onyinye ibu ọnụ maka onye otù ga-abara onyeisi stek uru ma ọ bụ azụmahịa nke o nwere, nkwado nke Otu Ndịisi Mpaghara ka a ga-achọ.

22.6

Ọrụ niile nke Ndị ndu Ngalaba ukwu

22.6.1

Bishọp na Ndị Ndụmọdụ Ya

Bishọp nwere iwu si n’igwe ịchọpụta ma lekọta ndị ahụ nwere mkpa nke anụ ahụ (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 84:112). Ọ na-enyepụ ọtụtụ ọrụ nke a n’aka otu ndịisi Otu Enyemaka na kworum ndị okenye. Kosiladị, ọrụ ndị dị ańaa ka naanị bishọp na-arụ. N’ịmaatụ, bishọp ahụ:

  • Na-ekpebi ụdị, ego ole, na oge enyemaka nke anụ ahụ ọbụla enyere ga-eru.

  • Na-akwado enyemaka nke onyinye ibu ọnụ (lee 22.4 na 22.5) ma usoro niile nke ndị bishọp maka nri na ngwa ndị ọzọ dị mkpa (lee 22.13).

  • Na-enyochagharị n’onwe ya atụmatụ ndabere onwe nke ndị otù. Ọ na-enye ndị ndu ngalaba ukwu ndị ọzọ ọrụ isochi atụmatụ ndị ahụ dị ka achọrọ.

Bishọp na ndị ndụmọdụ ya nwere oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Kuzie ụkpụrụ niile na ngọzi niile metụtara na (1) ilekọta ndị ahụ nwere mkpa nke anụ ahụ na nke mmetụta uche na (2) iwulite ndabere onwe (lee 22.1).

  • Kuzie iwu nke ibu ọnụ ma gbaa ndị otù ume inye onyinye mmepụ aka nke ibu ọnụ (lee 22.2.2).

  • Elekọta nnakọta na inye nkọwa nke onyinye ibu ọnụ niile (lee 34.3.2).

22.6.2

Otu Ndịisi Otu Enyemaka na Kworum Ndị Okenye

N’okpuru ntuziaka nke bishọp, otu ndịisi Otu Enyemaka na kworum ndị okenye nwere isi ọrụ n’ilekọta ndị ahụ nọ na mkpa niime ngalaba ukwu ahụ (lee 8.2.2 na 9.2.2). Ndị ndu ndị a na-akuziri ndị otù ngalaba ukwu:

  • Ije Ozi Nlekọta nye ndị ahụ nọ na mkpa.

  • Idebe iwu nke ibu ọnụ.

  • Iwulite ndabere n’onwe.

  • Ịmụbawanye nkwadobe nke onwe na nke ezi na ụlọ.

22.6.3

Ụmụnne Nwoke ma ọ bụ Ụmụnne Nwanyị N’eje Ozi Nlekọta

Inye enyemaka maka mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ ọtụtụ mgbe na-amalite site n’aka ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị n’eje ozi nlekọta (lee 21.1). Ha na-erepọọtụ mkpa niile nke ndị ahụ ha na-ejere ozi nye otu ndịisi kworum ndị okenye ma ọ bụ Otu Enyemaka ha n’ajụjụ ọnụ nke ije ozi nlekọta ma n’oge ndị ọzọ. Ha nwere ike kọọ mkpa ndị dị nzuzo kpọm kwem n’aka bishọp.

22.7

Ọrụ nke Kansụl Ngalaba ukwu

Otu ọrụ dị mkpa nke kansụl ngalaba ukwu bụ ịtụ atụmatụ otu esi elekọta ndị ahụ nọ na mkpa na inyere ha aka nwete ndabere onwe (lee 4.4). Ndị otù kansụl na-atụkwasị atụmatụ ndị a n’elu ozi sitere n’ajụjụ ọnụ ije ozi nlekọta na site na mkpọtụrụ nke onwe ha na ndị ahụ nọ na mkpa. Na mkparịta ụka banyere mkpa niile nke ndị otù, kansụl na-asọpụrụ ọchịchọ niile nke onye ọbụla rịọrọ ka edebe ya nzuzo.

22.8

Ọrụ nke Kansụl Ntoroọbia Ngalaba ukwu

Otu Ebumnoobi nke kansụl ndị ntoroọbịa ngalaba ukwu bụ iji nyere ndị ntoroọbịa aka bụrụ ndị nyefechasịworo onwe n’iso Jizọs Kraịst (lee 29.2.6).

N’okpuru nduzi nke otu bishọp, kansụl ndị ntoroọbia nke ngalaba ukwu na-atụpụta ụzọ niile iji jeere ndị ahụ nọ na mkpa dị niime ngalaba ukwu na obodo ha ozi.

Bipụta