Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
23. Ikesa Ozi ọma na Ịgba Ndị otù Ọhụrụ na Ndị Na-alọghachi alọghachi Ume


“23. Ikesa Ozi ọma na Ịgba Ndị otù Ọhụrụ na Ndị Na-alọghachi alọghachi Ume,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“23. Ikesa Ozi ọma na Ịgba Ndị otù Ọhụrụ na Ndị Na-alọghachi alọghachi Ume,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe.

Foto, oyiyi
ndị mmadụ na-ele anya n’ekwe ntị

23.

Ikesa Ozi ọma na Ịgba Ndị otù Ọhụrụ na Ndị Na-alọghachi alọghachi Ume

23.0

Ndubata

Ịkpọku ndị niile ịnata ozi ọma bụ akụkụ ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu (lee 1.2 niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a; Matiu 28:19–20). Ọ gụnyere:

  • Isonye n’ọrụ mgbasa ozi ọma na ije ozi dị ka ndị mgbasa ozi ọma.

  • Inyere ndị otù Nzukọ nsọ ọhụrụ na ndị na-alọghachi aka gaaniihu n’ụzọ ọgbụgba ndụ.

23.1

Kesaa Ozi ọma ahụ

23.1.1

Ịhụnaanya

Otu ụzọ anyị si egosi ịhụnaanya anyị nye Chineke bụ site n’inwe ịhụnaanya na ijere ụmụ Ya ozi (lee Matiu 22:36-39; 25:40). Anyị na-agba mbọ inwe ịhụnaanya ma jee ozi dị ka Jizọs Kraịst mere. Ịhụnaanya nke a na-akpate mmụọ anyị irute ndị nke okpukperechi niile, agbụrụ niile, na omenaala niile nso (lee Ọlụ 10:34; 2 Nefi 26:33).

23.1.2

Kesaa

N’ihi na anyị hụrụ Chineke na ụmụ Ya naanya, anyị na-achọkarị ikesa ngọzi niile O nyeworo anyị (lee Jọn 13:34–35) ma nye aka kpokọta Israel. Anyị na-achọ inyere ndị mmadụ aka nwete mmetụta ọńụ nke anyị na-enwete (lee Alma 36:24). Anyị na-ekwupụta n’ihu ọha maka Onye Nzọpụta na mmetụta Ya niime ndụ anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 60:2). Anyị na-ekesa ihe ndị a n’ụzọ a maara amara na ụzọ eke dị ka akụkụ nke mmekọrịta niile nke onwe, n’ikuku, na ndị ọzọ.

23.1.3

Kpọkuo

Anyị na-ekpe ekpere maka mkpatemmụọ na nduzi maka otu esi akpọku ndị ọzọ ị:

  • Bịanụ hụrụ ngọzi niile dị adị site na Jizọs Kraịst, ozi ọma Ya, na Nzukọ nsọ Ya (lee Jọn 1:37-39, 45-46).

  • Bịanụ nyere anyị aka jeere ndị nọ na mkpa ozi.

  • Bịanụ sonye niime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst eweghachitere.

Ọtụtụ mgbe, naanị ikpọku pụtara ịgụnye ezi na ụlọ anyị, ndị enyị, na ndị agbata obi n’ihe anyị dị mbụ eme.

23.2

Gbaa ndị otù Ọhụrụ Ume

Onye otù ọhụrụ ọbụla chọrọ ime enyi, ohere niile iji jee ozi, na ọzụzụ nke ime mmụọ. Dị ka ndị otù Nzukọ nsọ, anyị na-enye ndị otù ọhụrụ ịhụnaanya na nkwado anyị (lee Mozaya 18:8-10). Anyị na-enyere ha aka nwete uche nke isonye niime Nzukọ nsọ. Anyị na-enyere ha aka gaaniihu n’ụzọ ọgbụgba ndụ ma mie emie karịa “n’ịtọgharị nye Onyenwe anyị” (Alma 23:6).

23.3

Gbaa Ndi otu Na-alọghachị Ume

Ụfọdụ ndị otù na-ahọrọ ịkwụsị isonye niime Nzukọ nsọ. “Nye ụdị a,” ka Onye Nzọpụta kwuru, “ka unu ga-aga n’ihu na-ekwusa ozi ọma; n’ihi na unu amataghị ma ha ga-alọghachi ma chegharịa, ma jiri nzube zuru oke nke obi, ma aga m agwọ ha; ma unu ga-abụ ụzọ esi eweta nzọpụta nye ha” (3 Nephi 18:32).

Ndị otù na-adịghị esonye n’uju nwere ike ịlọghachi ọ bụrụ ma ha nwee mmekọrịta ndị siri ike ha na ndị otù Nzukọ nsọ. Dị ka ndị otù ọhụrụ, ha chọrọ ime enyi, ohere niile iji jee ozi, na ọzụzụ nke ime mmụọ.

23.4

Ndị ndu Stek

23.4.1

Otu Ndịisi Stek

Onyeisi stek ji ọtụghe niile dị niime stek maka ikesa ozi ọma na ịgba ndị otù ọhụrụ na ndị na-alọghachi ume. Ya na ndị ndụmọdụ ya na-enye ntuziaka n’ozuzu maka mgbalị ndị a.

Mgbe niile n’ọnwa, onyeisi stek na-ezukọ ya na onyeisi mishọn ihazi mbọ niile dị n’etiti ndị ndu stek na ngalaba ukwu na ndị mgbasa ozi ọma n’uju oge.

23.4.3

Ndị Kansụl Dị elu

Otu ndịisi stek nwere ike nye ndị kansụl dị elu ọrụ ikuzi ma kwadoo otu ndịisi kworum ndị okenye na ndị ndu mishọn na ngalaba ukwu. Otu onye kansụl dị elu ma ọ bụ karịa ka enwere ike inye ọrụ idu mbọ ndị a. Kosiladị, ndị kansụl dị elu niile nwere oke na ọrụ ndị a maka ngalaba ukwu na kworum niile nke enyere ha ọrụ na ya.

23.4.4

Otu Ndịisi Otu Enyemaka Stek

N’okpuru ntuziaka nke onyeisi stek, otu ndịisi Otu Enyemaka stek na-akuzi ihe ma na-akwado otu ndịisi Otu Enyemaka ngalaba ukwu niime oke na ọrụ ha maka ikesa ozi ọma na ịgba ndị otù ọhụrụ na ndị na-alọghachi alọghachi ume.

23.5

Ndị ndu Ngalaba ukwu

23.5.1

Otu Bishọp

Otu bishọp na otu ndịisi kworum ndị okenye na Otu Enyemaka na-ahazi dị ka ha na-edu mbọ niile nke ngalaba ukwu n’ikesa ozi ọma na ịgba ndị otù ọhụrụ na ndị na-alọghachi alọghachi ume. Ndị ndu ndị a na-adụkọrịta ndụmọdụ mgbe niile.

Otu ndị bishọp na-ahụ na mbọ ndị a ka ekwuru maka ya ma a hazie ya na nzukọ kansụl ngalaba ukwu na kansụl ndị ntoroọbịa nke ngalaba ukwu niile.

Bishọp na-agba ndị otù ọhụrụ ajụjụ ọnụ nke afọ ole kwesịrị ekwesị maka rekọmend tempụl iji mee baptizim na Emume Nnabata nnọchite anya (lee 26.4.2). Ọ nakwa agba ụmụnne ndị nwoke ajụjụ ọnụ nke afọ ole kwesịrị ekwesị iji nata Ọkwa nchụaja nke Erọn. Ọ na-agbakarị ajụjụ ọnụ ndị a niime otu izu nke Emume Nnabata nke onye otù ahụ.

23.5.2

Otu Ndịisi Kworum Ndị Okenye na Otu Enyemaka

Otu ndịisi kworum ndị okenye na Otu Enyemaka na-edu mbọ niile nke ngalaba ukwu kwa ụbọchị ikesa ozi ọma ma gbaa ndị otù ọhụrụ na ndị na-alọghachi alọghachi ume (lee 8.2.3 na 9.2.3).

Ndị ndụ ndịa nwere oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Na-enyere ndị otù aka ịhụ ụmụ Chineke naanya, ikesa ozi ọma, na ịkpọku ndị ọzọ ịnata ngọzi niile nke Onye Nzọpụta.

  • Nye ndị otù ọhụrụ na ndị na-alọghachi alọghachi ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị n’eje ozi nlekọta (lee 21.2.1).

  • Duo n’ọrụ nke onye ndu mishọn ngalaba ukwu.

Onyeisi kworum ndị okenye na onyeisi Otu Enyemaka nke ọbụla na-enye otu onye otù ndịisi ọrụ inye aka duo mbọ ndị a. Ndị otù otu ndịisi abụọ ndị a na-arụkọ ọrụ ọnụ. Ha na-aga nzukọ nchịkọta kwa izu (lee 23.5.7).

23.5.3

Onye Ndu Mishọn Ngalaba ukwu

Otu bishọp na-anara ndụmọdụ n’aka onyeisi stek iji mata ma ọ bụ ịkpọ onye ndu mishọn ngalaba ukwu. Onye a kwesịrị ịbụ onye ji Ọkwa nchụaja Melkizedek. Ọ bụrụ ma akpọghị onye ndu a, onye otù nke otu ndịisi kworum ndị okenye na-emezu ọrụ nke a.

Onye ndu mishọn ngalaba ukwu na-akwado otu ndịisi kworum ndị okenye na otu ndịisi Otu Enyemaka niime oke na ọrụ mgbasa ozi ọma ha. O nwekwara oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Chikọta ọrụ nke ndị otù na ndị ndu ngalaba ukwu, ndị mgbasa ozi ọma ngalaba ukwu, na ndị mgbasa ozi ọma n’uju oge.

  • Duo nzukọ nchịkọta kwa izuụka (lee 23.5.7).

23.5.4

Ndị Mgbasa Ozi ọma Ngalaba ukwu

Ndị mgbasa ozi ọma ngalaba ukwu na-enyere ndị otù ngalaba ukwu aka nwete nhụmiihe ọńụ nke ikesa ozi ọma dị ka akọwara niime 23.1. Ha na-eje ozi n’okpuru ntuziaka nke onye ndu mishọn ngalaba ukwu ma ọ bụ onye otù ndịisi kworum ndị okenye onye na-emjupụta ọrụ nke a.

23.5.5

Kansụl Ngalaba ukwu na Kansụl Ndị Ntoroọbia Ngalaba ukwu

Ikesa ozi ọma na ịgba ndị otù ọhụrụ na ndị Na-alọghachi alọghachi ume kwesịrị ka ekwuo ya mgbe niile niime nzukọ niile nke kansụl ngalaba ukwu. Bishọp nwere ike kpọkuo onye ndu mishọn ngalaba ukwu ịga nzukọ niile nke kansụl ngalaba ukwu.

Fọm ndị dị ka ndị a sotere nwere ike nye aka na mkparịta ụka ndị a:

N’ịkparịta ụka mkpa niile nke ndị ntoroọbịa dị niime ngalaba ukwu, kansụl ndị ntoroọbịa ngalaba ukwu na-enye nlekọta anya pụrụ iche na ndị otù ọhụrụ na ndị otu na-alọghachi nyekwa ndị ntoroọbịa ndị nke ndị mgbasa ozi ọma na-akuziri ihe.

23.5.7

Nzukọ Nchịkọta niile

Izuụka ọbụla, obere nzukọ na-adịghị n’okpuru iwu ka a na-eme iji chịkọta mbọ niile iji kesaa ozi ọma ma gbaa ndị otù ọhụrụ na ndị na-alọghachi alọghachi ume. Ọ bụrụ ma akpọọ onye ndu mishọn ngalaba ukwu, ọ na-eduzi nzukọ ndị a. Ma ọ bụghị otu a, onye otù nke otu ndịisi kworum ndị okenye onye na-emezu ọrụ nke a na-eduzi.

Ndị ọzọ akpọkuru gụnyere:

  • Ndị otù nke otu ndịisi Otu Enyemaka na kworum ndị okenye enyere ọrụ.

  • Ndị mgbasa ozi ọma ngalaba ukwu.

  • Onye enyemaka niime kworum ndị nchụaja (ma ọ bụ onyeisi kworum ndị nkuzi ma ọ bụ ndị dikọn ọ bụrụ ma enweghị ndị nchụaja ọbụla niime ngalaba ukwu ahụ).

  • Onye otù otu ndịisi nke klaasị Ndịiyom Nta kacha ochie.

  • Ndị mgbasa ozi ọma n’uju oge.

Bipụta