Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
24. Nkwado niile na Ije Ozi nke Mgbasa ozi ọma


“24. Nkwado niile na Ije Ozi Mgbasa ozi ọma,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“24. Nkwado niile na Ije Ozi Mgbasa ozi ọma,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ndị mgbasa ozi ọma na-eje ije

24.

Nkwado niile na Ije Ozi Mgbasa ozi ọma

24.0

Ndubata

N’oge ochie, Onyenwe anyị nyere iwu ikpokọta Israel n’etiti “mba niile, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ” (Matiu 2819; leekwa amaokwu 20). Onyenwe anyị enyegharịwokwa iwu ahụ n’ụbọchi ikpeazụ ndị a (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 39:11; 68:6-8; 112:28-30).

Ijere Onyenwe anyị ozi dị ka onye mgbasa ozi ọma bụ ohere ọma dị nsọ. Ọ na-ewete ngọzi niile nke mgbe ebighị ebi nye onye ahụ na ndị ahụ ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị n’ejere ozi (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:14–16).

Onyenwe anyị na-arịọ onyeikom nta ọbụla tozuru oke, kpa ume ịkwado maka ma jee ozi mishọn.

Onyenwe anyị nakwa anabata onyeinyom nta ọbụla tozuru oke, kpa ume ije ozi mishọn ọ bụrụ ma ha chọọ.

Ndị mgbasa ozi ọma agadi ka achọkwara ma a na-agba ha ume ije ozi.

24.1

Okù Ije Ozi

Ndị mgbasa ozi ọma na-anọchite anya Onyenwe anyị ma a garịrị akpọ ha site n’ikike kwesịrị ekwesị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:11; Ndepụta nke Okwukwe 1:5). Okù ije ozi mishọn n’ụzọ ọbụla ka Onyeisi Nzukọ nsọ na-akpọkarị. Maka ndị agadi ije ozi mgbasa ozi ọma, okù ahụ ka a na-akpọ site n’aka onyeisi stek.

24.2

Ọrụ Mgbasa ozi ọma niile enyere

Okù ije ozi dị ka onye mgbasa ozi ọma gụnyere kpọm kwem otu ọrụ enyere. Ọrụ ndị a enyere dịgasị iche iche.

24.2.1

Ndị Mgbasa ozi ọma Nta Na-akuzi ihe

Ọtụtụ ndị mgbasa ozi ọma nta ka enyere ọrụ ikuzi ozi ọma mgbe a pụrụ n’ebe obibi. Ọrụ ndị a ka a na-enye site na mkpughe nye Ndị ozi. Ndị mgbasa ozi ọma ndị a n’eje ozi n’okpuru ntuziaka nke onyeisi mishọn.

24.2.2

Ndị Mgbasa ozi ọma Nta Na-eje ozi

Ụfọdụ ndị mgbasa ozi ọma nta ka a na-enye ọrụ ije ozi niime Nzukọ nsọ na obodo ahụ mgbe ebi n’ebe obibi. Ọrụ ndị a ka a na-enye site na mkpughe enyere Ndị ozi ma a na-enyekwa ya ndị ahọpụtara ndị ọnọdụ ha kacha mma maka ije ozi mishọn (lee 24.3.3).

24.2.3

Ndị Mgbasa ozi ọma Agadi

Ndị mgbasa ozi ọma agadi ka a na-agba ume ịchọta ndị mmadụ a ga-akuziri ihe ma nyere ha aka kwadoo maka baptizim. Ndị mgbasa ozi ọma agadi ka enwekwara ike inye ọrụ iji kwadoo:

  • Ndị otù na ndị ndu mpaghara na nke obodo.

  • Ngalaba na akụrụngwa Nzukọ nsọ niile.

  • Otù ọrụ ebere niile.

Anaghị a sị ka ndị mgbasa ozi ọma agadi rụọ ọrụ otu ụdị awa, mee otu ụdị ihe omume niile, ma ọ bụ mezuo otu ụdị ihe atụrụ anya dị ka ndị mgbasa ozi ọma nta.

Ọrụ ndị enyere maka ndị mgbasa ozi ọma agadi ka enyere site na mkpughe enyere Ndị Ozi. Ndị nwere mmasị ije ozi nwere ike kwupụta ụdị ije ozi ha chọrọ kama ha ga-adị njikere ịnabata ọrụ ọbụla.

24.2.4

Ndị Agadi Ije ozi Mgbasa ozi ọma

Na mgbakwunye nye ọkpụkpọ okù niile na ngalaba ukwu ma ọ bụ stek ebe ha bi, ndị otù nwere ike jeere Onyenwe anyị ozi dị ka ndị agadi Ije ozi Mgbasa ozi ọma . Ndị mgbasa ozi ọma ndị a na-eje ozi bara uru niime ngalaba Nzukọ nsọ niile, akụrụngwa niile, na mishọn niile (lee 24.7.1). Ha na-ebi n’ebe obibi.

Ndị agadi ije ozi mgbasa ozi ọma ka a na-akpọ okù site n’aka onyeisi stek. Ha na-eje ozi n’okpuru ntuziaka ya. Oge ole ha jere ozi izu ụka ọbụla dabeere n’ike ha, ohere ije ozi niile dị na mpaghara ha, na ntuziaka sitere n’aka Otù Ndịisi Mpaghara.

24.2.5

Nchịkọta nke Ọrụ Mgbasa ozi ọma niile Enyere

Tebulu ndị a sotere chịkọtara ụdị ọrụ mgbasa ozi ọma niile enyere.

Onye Mgbasa ozi ọma Nta Na-akuzi ihe
(lee 24.2.1)

Onye Mgbasa ozi ọma ije ozi Nta
(lee 24.2.2)

Onye Mgbasa ozi ọma Agadi
(lee 24.2.3)

Onye Mgbasa ozi ọma Ije ozi Agadi
(lee 24.2.4)

Ka akpọrọ site n’aka

Onye Mgbasa ozi ọma Nta Na-akuzi ihe
(lee 24.2.1)

Onyeisi Nzukọ nsọ

Onye Mgbasa ozi ọma ije ozi Nta
(lee 24.2.2)

Onyeisi Nzukọ nsọ

Onye Mgbasa ozi ọma Agadi
(lee 24.2.3)

Onyeisi Nzukọ nsọ

Onye Mgbasa ozi ọma Ije ozi Agadi
(lee 24.2.4)

Onyeisi stek

Ka enyere ọrụ site n’aka

Onye Mgbasa ozi ọma Nta Na-akuzi ihe
(lee 24.2.1)

Onye Ozi

Onye Mgbasa ozi ọma ije ozi Nta
(lee 24.2.2)

Onye Ozi

Onye Mgbasa ozi ọma Agadi
(lee 24.2.3)

Onye Ozi

Onye Mgbasa ozi ọma Ije ozi Agadi
(lee 24.2.4)

Onyeisi stek

Ka e dopụrụ iche site n’aka

Onye Mgbasa ozi ọma Nta Na-akuzi ihe
(lee 24.2.1)

Onyeisi stek

Onye Mgbasa ozi ọma ije ozi Nta
(lee 24.2.2)

Onyeisi stek

Onye Mgbasa ozi ọma Agadi
(lee 24.2.3)

Onyeisi stek

Onye Mgbasa ozi ọma Ije ozi Agadi
(lee 24.2.4)

Onyeisi stek ma ọ bụ onye ndụmọdụ

Bi ebi

Onye Mgbasa ozi ọma Nta Na-akuzi ihe
(lee 24.2.1)

Pụrụ site n’ebe obibi

Onye Mgbasa ozi ọma ije ozi Nta
(lee 24.2.2)

N’ebe obibi

Onye Mgbasa ozi ọma Agadi
(lee 24.2.3)

Pụrụ site n’ebe obibi ma ọ bụ nọ n’ebe obibi

Onye Mgbasa ozi ọma Ije ozi Agadi
(lee 24.2.4)

Nọ n’ebe obibi

Onye ndu Ụka

Onye Mgbasa ozi ọma Nta Na-akuzi ihe
(lee 24.2.1)

Onyeisi mishọn ma ọ bụ onyeisi ebe arụrụ ụlọ agụgụala

Onye Mgbasa ozi ọma ije ozi Nta
(lee 24.2.2)

Onyeisi stek

Onye Mgbasa ozi ọma Agadi
(lee 24.2.3)

Mishọn, tempụl, ma ọ bụ onyeisi ebe arụrụ ụlọ agụgụala; ma ọ bụ Onyeisi Mpaghara

Onye Mgbasa ozi ọma Ije ozi Agadi
(lee 24.2.4)

Onyeisi stek

Na-enye repọọtụ n’aka

Onye Mgbasa ozi ọma Nta Na-akuzi ihe
(lee 24.2.1)

Onyeisi mishọn ma ọ bụ onyeisi ebe arụrụ ụlọ agụgụala

Onye Mgbasa ozi ọma ije ozi Nta
(lee 24.2.2)

Onye ndu ije ozi mishọn

Onye Mgbasa ozi ọma Agadi
(lee 24.2.3)

Mishọn, tempụl, ma ọ bụ onyeisi ebe arụrụ ụlọ agụgụala; Onyeisi Mpaghara; onye ntuziaka ndị ọbịa n’ogige; ma ọ bụ Ngalaba Nzukọ nsọ ma ọ bụ onye njikwa akụrụngwa niile.

Onye Mgbasa ozi ọma Ije ozi Agadi
(lee 24.2.4)

Onye nchịkwa ọrụ nke ije ozi enyere

Afọ ole achọrọ

Onye Mgbasa ozi ọma Nta Na-akuzi ihe
(lee 24.2.1)

18–25 (ndịikom)
19–29 (ndịinyom)

Onye Mgbasa ozi ọma ije ozi Nta
(lee 24.2.2)

18–25 (ndịikom)
19–29 (ndịinyom)

Onye Mgbasa ozi ọma Agadi
(lee 24.2.3)

Afọ 40 ma ọ bụ karịa ọ bụrụ ma ịmewo alumdi na nwunye ma ọ bụ ọ bụrụ na nwanne nwanyị na-anọghị n’ọlụlụ.

Onye Mgbasa ozi ọma Ije ozi Agadi
(lee 24.2.4)

26 ma ọbụ karịa

24.3

Ime nkwado na Itozu oke Ije Ozi Mishọn

Ndị mgbasa ozi ọma a na-atụ anya ka a na-agba ume ije ozi mishọn n’ihi ịhụnaanya ha nye Onyenwe anyị na ụmụ Ya. Ha kwesịrị ịmara nke ọma ajụjụ ọnụ niile nke ịkwado onye mgbasa ozi ọma.

24.3.1

Ntọgharị nye Jizọs Kraịst

Ndị a na-atụ anya ịje mgbasa ozi ọma na-agba mbọ ịgba ntọgharị ha na Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya eweghachitere ume.

24.3.2

Irute Ọkọlọtọ nke Ntozu oke

Ndị a na-atụ anya ije mgbasa ozi ọma na-agba mbọ itozu oke nke nsiso nke Mmụọ ahụ. Nke a dị mkpa maka ije ozi mgbasa ozi ọma dị irè (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:13-14).

24.3.2.1

Nchegharị

Nchegharị na-achọ inwe okwukwe niime Kraịst, na-enwe ezi Ebumnoobi, ma na-edebe iwu nsọ niile. Ọ gụnyere ikwupụta na ịhapụ njọ. Maka njọ ndị siri ike, nchegharị na-achọ nkwupụta nye bishọp ma ọ bụ onyeisi stek.

Onye nke chegharịrị ka a ga-agbaghara ma mee ọcha site na Aja mgbaghara mmehie na amara nke Jizọs Kraịst. Onyenwe anyị anaghị echetakwa njọ ahụ ọzọ. (Lee Aịzaya 43:25; Jekọb 6:5; Alma 34:15–17; Helaman 5:10–11; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:42–43. Leekwa 32.1 niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a.)

Onye ahọpụtara ije mgbasa ozi ọma garịrị a bụ na o chegharịwo site na njọ siri ike tupu onyeisi stek enwee ike nyefee nkwado ya (lee 32.6; lee kwa 24.4.4). Usoro nke nchegharị gụnyere oge zuru ezu ka onye ahụ gosi site n’ibi ndụ ezi omume na ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị anatawo mmụọ nke Kraịst ruo na mgbaghara nke njọ niile.

24.3.3

Ahụike nke Anụ ahụ, nke Echiche, na nke Mmetụta Uche

Ọrụ mgbasa ozi ọma na-ama aka mgba. Ndị mgbasa ozi ọma nta aghaghị itinyecha onwe ha kpamkpam ma nwee ike nke anụ ahụ, echiche, na mmetụta uche iji wee dị ike rụọ ọrụ mgbasa ozi ọma eyiri n’uju ya.

24.3.4

Ego niile

24.3.4.1

Ịkwụ Ụgwọ Ije ozi Ndị Mgbasa ozi ọma Nta Pụrụ site N’ebe obibi

Ndị nta ahọpụtara ndị kwadobeworo dị ka otu ike ha dị ekwesịghị ka egbuoro ha oge site n’ije ozi n’ihi ego. Ndị ahụ nwere mkpa enyemaka ego nke iji tụnwuo ụtụ niile ha kpebiri ịtụ nwere ike nata ya site na ndị ikwu na ibe na ndị enyi.

Ọ bụrụ ma ozughị, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek nwere ike rịọ ndị otù nọ na ngalaba ukwu ma ọ bụ stek ahụ ịtụnye ego na-akpa ego mgbasa ozi ọma ngalaba ukwu ahụ.

Mkpata na mmefu ego nke ngalaba obodo na onyinye ibu ọnụ ka enwere ike gaghị eji mee ihe.

Ụtụ ekpebiri ịtụ Kwa Ọnwa. Ndị mgbasa ozi ọma nta na-akuzi ihe na ndị ezi na ụlọ ha na-atụnye ego akpọrọ aha ọnwa ọbụla iji nye aka kwuzuo ego atụmatụ mgbasa ozi ọma.

Ụtụ ndị a ka a na-eme n’akpa ego mgbasa ozi ọma ngalaba ukwu. Ndị bishọp na-achọpụta eziokwu na ego niile ka a na-atụ ọnwa ọbụla. Ego ndị karịrị ihe ekwesịrị ịkwụ kwa ọnwa ka a na-ekwesịghị ịkwụ maka ọdịniihu. Ego niile atụrụ n’ọdịniihu ka a na-enweghị ike ịkwụghachi ọ bụrụ ma onye mgbasa ozi ọma alọghachi ebe obibi n’oge.

Mmefu ego niile n’ebe ubi ama. Ọnwa ọbụla, ndị mgbasa ozi ọma nta na-anata ego site n’aka mishọn iji nwete nri, ịgba ụgbọ, na ihe ndị ọzọ eji ebi ndụ. Ego ndị a dị nsọ. Ndị mgbasa ozi ọma n’eji ha naanị maka Ebumnoobi metụtara mishọn. Ekwesịghị iji ha maka mmefu nke onwe, ichekwa, ma ọ bụ zigara ndị otù ezi na ụlọ ma ọ bụ ndị ọzọ. Ndị mgbasa ozi ọma na-eweghachiri mishọn ego ọbụla ha na-enweghị mkpa maka ya.

Ndị mgbasa ozi ọma n’eji ego nke onwe iji gboo mkpa ndị ọzọ. Mmefu ego maka onwe ndị a kwesịrị ịdị obere. (Lee Ọkọlọtọ niile nke Mgbasa ozi ọma maka Ndị Na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, 4.8.)

24.3.4.2

Ịkwụ Ụgwọ Ndị Mgbasa ozi ọma ndị Agadi ndị N’eje ozi ebe Pụrụ site N’ebe obibi

Ụtụ ekpebiri ịtụ Kwa Ọnwa. Ndị mgbasa ozi ọma agadi n’eje ozi ebe pụrụ n’ebe obibi ha, na-atụnye ụtụ n’akpa ego mgbasa ozi ọma ngalaba ukwu nke ebe obibi ha n’ọnwa ọbụla. Ụtụ ndị a na-enye aka n’ikwuchi ego ụlọ obibi na nke ụgbọala.

Ndị bishọp na-achọpụta na ego niile ahụ ka a na-akwụ ọnwa ọbụla. Ego ndị karịrị ihe ekwesịrị ịkwụ kwa ọnwa ka a na-ekwesịghị ịkwụ maka ọdịniihu.

Mmefu ego ndị Agbakwunyere. Na mgbakwunye n’elu ụtụ ekpebiri ịkwụ kwa ọnwa, nke na-enye aka kwụọ ụgwọ ụlọ obibi na ụgwọ ụgbọala, ndị mgbasa ozi ọma agadi aghaghị ịkwụ ụgwọ ndị ọzọ niile, tinyekwara nri.

24.3.4.3

Ịkwụ ụgwọ Ndị Mgbasa ozi ọma N’eje ozi N’ebe obibi ha

Ndị mgbasa ozi ọma n’eje ozi n’ebe obibi ha ka ọ dị n’aka ịhụ maka mkpa ego niile dịịrị ha.

24.3.4.4

Inshọransị nke Ọgwụgwọ ọrịa na Mmefu ego niile

A na-agba ndị mgbasa ozi ọma niile ume nke ukwuu idebe inshọransị nke ọgwụgwọ ọrịa ha dị adị ọ bụrụ ma o kwe omume, tinyekwara ndị mgbasa ozi ọma nta na-akuzi ihe.

Ndị mgbasa ozi ọma n’eje ozi n’ebe obibi garịrị ewete inshọransị nke kpuchiri ọgwụgwọ ọrịa nke onwe ha na ihe ndị ọzọ. Ndị mgbasa ozi ọma agadi n’eje ozi n’ebe pụrụ ebe obibi ha garịrị ewetekwa mkpuchi nke a. Ndị mgbasa ozi ọma agadi ndị ga-eje ozi ofe mba ha nwere ike inwete inshọransị site na Atụmatụ Ọgwụgwọ ọrịa Ije ozi ndị Agadi.

24.3.5

Ọrụ Ndị otù Ezi na ụlọ na Ndị ndu N’ikwado Ndị Mgbasa ozi ọma

Ndị otù ezi na ụlọ, ndị bishọp, na ndị ndu ndị ọzọ na-enyere ndị ntoroọbịa aka kwadoo ije ozi mishọn.

Ndị otù ezi na ụlọ na ndị ndu na-agba ndị niile ahọpụtara ije mgbasa ozi ọma ume ịmụ ihe:

  • Akwụkwọ nke Mọmọn na akwụkwọ nsọ ndị ọzọ.

  • Kwusaa Ozi ọma M.

  • Nchekwa niile maka Iji Teknụzụ eme ihe.

Ndị otù ezi na ụlọ na ndị ndu na-enyere ndị niile ahọpụtara aka ikpebi isoro ụkpụrụ niile nke mgbasa ozi ọma. Ha na-agba ndị ahọpụtara ume ịmụ Akwụkwọ Ntuziaka ụkpụrụ mgbasa ozi ọma niile nke metụtara ọrụ enwereike inye ha.

  • Maka ndị mgbasa ozi ọma nta na-akuzi ihe: Ọkọlọtọ Mgbasa ozi ọma niile maka Ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst

24.4

Ịtụ arọ Ndị Mgbasa ozi ọma

24.4.1

Ntule Ahụike niile

Ndị niile ahọpụtara ka achọrọ ka ndị ọkachamara nke ọgwụgwọ ọrịa tulee njikere ahụike ha.

24.4.2

Fọm niile nke ịgba Ajụjụ ọnụ na Nkwado

Bishọp na onyeisi stek na-agba onye ọbụla ahọpụtara ajụjụ ọnụ ndị e meziri nke ọma, nke na-enyocha ime mmụọ, ma nke na-ebuli mmụọ ha elu. Ha na-eji ajụjụ ọnụ niile nke eji atụ arọ onye mgbasa ozi ọma.

Bishọp na onyeisi stek nakwa enyocha ozi gbasara ọkọlọtọ niile nke ntozu oke na njikere ahụike dị niime usoro Nkwado N’ikuku maka Mgbasa ozi ọma n’Ikuku. Bishọp na onyeisi stek anaghị agbakwunye ọkọlọtọ ntozu oke ọbụla. ọ bụghị ma ha na-agbanwe ajụjụ niile nke ajụjụ ọnụ ahụ.

Ọ bụrụ ma bishọp na onyeisi stek nwere nchegbu banyere onye ahọpụtara irute ụkpụrụ niile nke ntozu oke ma ọ bụ banyere njikere nke ahụike ya, ha na-adụkọrịta ndụmọdụ ha na onye ahụ. Ndị nne na nna nwekwara ike iso na ndụmọdụ ahụ mọbụrụ ma nwata ahụ ahọpụtara nye ikike. Bishọp na onyeisi stek anaghị ezipụ arọ ahụ a tụrụ tutu onye ahụ echegharịwo site na njọ siri ike (lee 24.3.2.1). Dịka otu ahụike nke anụ ahụ, nke echiche, ma ọ bụ nke mmetụta uche nke onye ahụ si wee dị, ha nwere ike kparịta ụka ma ọ ga-ekwe omume inye ya ọrụ dị ka ije ozi mgbasa ozi ọma.

N’ọnọdụ ndị gbata gbata mgbe bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-anọghị ya, o nwere ike nye otu niime ndị ndụmọdụ ya ikike iduzi ịgba ajụjụ ọnụ ndị a.

Na distrikt niile, onyeisi mishọn ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ na-agba ajụjụ ọnụ ma nye nkwado ndị mgbasa ozi ọma ahọpụtara. Ndịisi distrikt anaghị agba ajụjụ ọnụ ndị a.

24.4.4

Ndị ahụ Na-enweghị ike Ije ozi Mgbasa ozi ọma N’uju Oge

Mgbe ụfọdụ onye otù nwere ọchịchọ ije ozi nwere ike agaghị akpọ ya dị ka onye mgbasa ozi ọma n’uju oge. Nke a nwere ike bụrụ nihi ịma aka ahụike niile, erughị ọkọlọtọ niile nke ntozu oke, okwu gbasara iwu, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ. Onyeisi stek nwere ike gụpụ ya site n’ije ozi mgbasa ozi ọma n’uju oge.

24.5

Mgbe Anatasiri Okù Mishọn

Ndị mgbasa ozi ọma akpọrọ ọhụrụ ka a na-agba ume ịgụ ma ọ bụ gụgharịa Akwụkwọ nke Mọmọn tupu mmalite mishọn ha. Ha na-esoro ndụmọdụ Eze Benjamin “leenụ onwe unu, na echiche unu, na okwu unu, na ihe niile unu na-eme” (Mozaya 4:30).

24.5.1

Onyinye dị nsọ nke Tempụl na Ije ozi Tempụl

Ọ bụrụ ma ndị mgbasa ozi ọma akpọrọ ọhụrụ anatabeghị emume nsọ onyinye dị nsọ nke tempụl, ha kwesịrị ime otu ahụ tupu ịmalite ije ozi mgbasa ozi ọma ebe o kwere omume (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 43:15–16; 105:33). Nke a gụnyere ndị mgbasa ozi ọma nke ije ozi ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị maka ọnọdụ ha.

Ndị mgbasa ozi ọma akpọrọ ọhụrụ ndị nataworo onyinye dị nsọ nwere ike jee ozi dị ka ndị ọrụ emume nsọ tupu ha amalite ije ozi mgbasa ozi ọma dị ka o kwesịrị (lee 25.5)

24.5.2

Nzukọ Oriri nsọ niile

Otù ndị bishọp na-akpọku ndị mgbasa ozi ọma akpọrọ ọhụrụ ikwu okwu na nzukọ oriri nsọ tupu mmalite mishọn ha. Nke a bụ nzukọ oriri nsọ a na-emekarị. Nlekwasị anya kwesịrị ịbụ na oriri nsọ na Onye Nzọpụta.

24.5.3

Idopu Ndị Mgbasa ozi ọma Iche

Onyeisi stek nke ebe obibi ahụ na-edopu iche onye mgbasa ozi ọbụla nsonso na ụbọchi mmalite agụgụ mishọn ya. N’ọnọdụ ndị dị ọkụ ọkụ mgbe onyeisi stek na-anọghị ya, o nwere ike nye otu niime ndị ndụmọdụ ya ikike idopu ndị mgbasa ozi ọma iche.

Onyeisi mishọn ma ọ bụ otu niime ndị ndụmọdụ ya na-edopu ndị mgbasa ozi ọma iche ndị akpọrọ site na distrikt ndị dị niime mishọn ya. Onyeisi distrikt anaghị edopu ndị mgbasa ozi ọma iche.

Nwanne nwoke ga-eje ozi nke pụrụ n’ebe obibi ya ga-enwerịrị Ọkwa Nchụaja Melkizedek tupu edopu ya iche dị ka onye mgbasa ozi ọma. Nwanne nwoke ga-eje ozi dị ka onye mgbasa ozi ọma nke ije ozi kwesịrị iji Ọkwa Nchụaja Melkizedek ọ bụrụ ma ọ dabara adaba maka ọnọdụ ya niile

24.6

Ije ozi Pụrụ N’ebe Obibi

24.6.2

niime Ubi ama

24.6.2.5

Arịrịọ niile maka Ikwado Ndị ọzọ n’ụzọ Ego ma ọ bụ na Agụmakwụkwọ ma ọ bụ Njem ọpụpụ

Ndị mgbasa ozi ọma na ndị ezi na ụlọ ha ekwesịghị iwete ego nkwado maka ndị ahụ bi ebe ndị mgbasa ozi ọma n’eje ozi, tinyekwara nkwado ego maka agụmakwụkwọ. ọ bụghị ma ndị mgbasa ozi ọma na ndị ezi na ụlọ ha ga-akwụ ụgwọ ndị chọrọ ịpụ gaa mba ndị ọzọ (lee 38.8.19).

24.6.2.8

Ndekọihe niile nke Ịbụ onye otù na Ịkwụ Otu ụzọ n’ụzọ iri

Ngalaba ukwu ebe obibi nke onye mgbasa ozi ọma na-ejide ndekọihe niile nke ịbụ onye otù. Ngalaba ukwu ebe obibi nakwa edekọ ọnọdụ otu ụzọ n’ụzọ iri ya. Ndị mgbasa ozi ọma anaghị akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri site n’ego nkwado ha na-anata na mishọn. Kosiladị, ha na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri ọ bụrụ ma ha nwee ego nke onwe ha.

24.6.3

Ịlọghachi Ebe obibi site na Mishọn

24.6.3.1

Ịlọghachi Ebe obibi dị ka Ahaziri na Nsinambụ

Ndị mgbasa ozi ọma na ndị otù ezi na ụlọ ha ekwesịghị ịrịọ ntọghapụ n’oge ma ọ bụ ịgbatị ije ozi maka ọdịmma nke onwe.

Ndị mgbasa ozi ọma nta kwesịrị isi na mishọn ha mee njem nlọghachị ruo n’ebe obibi ha ozugbo. Njem ọzọ ka enwere ike ịkwado naanị ọ bụrụ ma opekampe otu nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye nlekọta ga-esoro onye mgbasa ozi ọma ahụ.

Anaghị atọghapụ ndị mgbasa ozi ọma tutu ruo mgbe ha ruru n’aka onyeisi stek ha. Ha na-esoro ọkọlọtọ niile nke mgbasa ozi ọma tutu ruo oge ahụ.

24.6.3.2

Ịlọghachi Ebe obibi N’oge

Ụfọdụ ndị mgbasa ozi ọma ka a na-atọghapụ n’oge nihi ahụike, ntozu oke, ma ọ bụ maka ihe ndị ọzọ. Ndị bishọp na ndịisi stek na-enye nkwado pụrụ iche n’ebe ndị mgbasa ozi ọma ndị a na-alọghachi nọ. Ndị ndu na-enyere ha aka rụọ ọrụ inweghachi ahụike ma ọ bụ ịlaghachi ọrụ ije ozi ọ bụrụ ma o kwe omume.

24.7

Mishọn Ije ozi niile

24.7.1

Ịmata Ohere niile maka Ndị Mgbasa ozi ọma Ije ozi

Bishọp, onyeisi stek, na onye mgbasa ozi ọma nke ije ozi na-adụkọrịta ndụmọdụ ọnụ ịmata ohere niile dị niime obodo iji jee ozi. Maka ndị mgbasa ozi ọma nta na-eje ozi, onye ndu mishọn ije ozi na nne na nna ma ọ bụ onye nlekọta nke onye mgbasa ozi ọma ahụ na-esonye na mkparịta ụka ahụ.

24.8

Mgbe Ije ozi Mgbasa ozi ọma gasịrị

24.8.2

Ajụjụ ọnụ Ntọghapụ Onye Mgbasa ozi ọma

Onyeisi stek na-atọghapụ ndị mgbasa ozi ọma ma duo n’ịgba ajụjụ ọnụ ntọghapụ. niime distrit niile, n’ụzọ niile onyeisi mishọn ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ na-atọghapụ ndị mgbasa ozi ọma.

Ntuziaka ndị a sotere maka ịgba ajụjụ ọnụ nke a nwere ike inye aka.

  • Gbaa ha ume ịganiihu dị ka onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst ogologo ndụ niile.

  • Na-adụ ha ndụmọdụ iwulite ezi agwa ha mụtara dị ka onye mgbasa ozi ọma.

  • Gbaa ha ume itule ma kwadoo maka ọdịniihu, tinyekwara agụmakwụkwọ na inweta ọrụ maka ndị mgbasa ozi ọma nta.

  • Gbaa ha ume ịnọgide n’ebi ndụ ntozu oke nke rekọmend tempụl.

24.8.4

Ọkpụkpọ okù

Ndị ndu ozugbo na-enye ọrụ ije ozi nlekọta na ọkpụkpọ okù nke ndi mgbasa ozi ọma atọghapụrụ nsonso a. Nke a gụnyere ịtule ma a ga-akpọ ha dị ka ndị ọrụ emume nsọ nke tempụl dị ka okwesịrị (lee 25.5).

24.9

Akụrụngwa niile maka Ịtụ arọ niile maka Mgbasa ozi ọma na Ije ozi

24.9.2

Websites

Bipụta