Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
25. Ọrụ Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ dị niime Ngalaba ukwu na Stek


“25. Ọrụ Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ dị niime Ngalaba ukwu na Stek Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“25. Ọrụ Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ dị niime Ngalaba ukwu na Stek Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
tempụl

25.

Ọrụ Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ dị niime Ngalaba ukwu na Stek

25.0

Ime ka a mata

Ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ bụ ụzọ esi ejikọta ma na-arachi ndị ezi na ụlọ maka mgbe ebighị ebi (lee Matiu 16:19). Ọrụ nke a gụnyere:

Ozi ndị ọzọ dị adị na “Tempụl niile” na “Agụgụala Ezi na ụlọ” (Isiokwu nke Ozi ọma niile, topics.ChurchofJesusChrist.org).

25.1

Nsonye nke Onye otù na Onye ndu na Ọrụ Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ

Ndị otù Nzukọ nsọ nwere ohere ọma na oke na ọrụ inye aka jikọta ezi na ụlọ ha maka mgbe ebighị ebi. Ha na-akwado onwe ha ime ọgbụgba ndụ niile dị ka ha na-anata emume nsọ niile nke tempụl, ma ha na-agba mbọ idebe ọgbụgba ndụ ndị ahụ.

Ndị otù Nzukọ nsọ ka a na-agba ume ịmata ndị ikwu na ibe ha nwụrụ anwụ ndị na-anatabeghị emume nsọ tempụl niile. Mgbe ahụ ndị otù emee emume nsọ niile n’aha nke ndị ikwu na ibe ndị ahụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:18). N’ụwa mmụọ, ndị nwụrụ anwụ nwere ike ịhọrọ ịnabata ma ọ bụ ịjụ emume nsọ niile nke emeworo maka ha.

25.1.1

Oke na ọrụ nke Mmadụ maka Ọgịga Tempụl

Ndị otù na-ekpebi n’onwe ha mgbe na ugboro ole ha ga-efe ofufe niime tempụl. Ndị ndu anaghị ehiwe oke ma ọ bụ usoro repọọtụ maka ọgịga tempụl.

25.2

Ịhazi Ọrụ Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ dị niime Ngalaba ukwu

25.2.1

Otu Bishọp

Otu bishọp na otu ndịisi kworum ndị okenye na Otu Enyemaka na-ahazi dị ka ha na-edu mbọ niile nke tempụl na agụgụala ezi na ụlọ. Ndị ndu ndị a na-adụkọrịta ndụmọdụ mgbe niile.

Otu bishọp nwekwara oke na ọrụ ndị a sotere maka ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ niime ngalaba ukwu:

  • Na-ahụ na ozizi na ngọzi niile nke ọrụ tempụl na ọrụ agụgụala ezi na ụlọ ka a na-akuzi na nzukọ nsọ.

  • Na-ahụ na ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ ka ahaziri na nzukọ kansụl ngalaba ukwu na kansụl ndị ntoroọbịa ngalaba ukwu.

  • Na-elekọta nhazi nke ọmụmụihe niile nke nkwadobe tempụl (lee 25.2.8).

  • Nye rekọmend tempụl (lee isi nke 26).

25.2.2

Otu Ndịisi Kworum Ndị Okenye na Otu Enyemaka

Otu ndịisi kworum ndị okenye na Otu Enyemaka na-edu mbọ niile nke tempụl na agụgụala ezi na ụlọ kwa ụbọchị na ngalaba ukwu (lee 8.2.4 na 9.2.4). Ha na-arụkọ ọrụ ọnụ idu mgbalị ndị a ha na kansụl ngalaba ukwu, n’okpuru nchịkọta nke bishọp.

Ndị ndu ndị a nwere oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Na-enyere ndị otù aka kwadoo ịnata emume nsọ niile ma mee ọgbụgba ndụ niile.

  • Na-agba ndị otù ume ife ofufe niime tempụl mgbe ọbụla ọnọdụ ha kwere omume.

  • Na-agba ndị otù ume ịmụta ihe banyere ndị nna nna ochie ha ha ma mee emume nsọ niile nke tempụl n’aha ha.

  • Duo n’ọrụ nke onye ndu tempụl na agụgụala ezi na ụlọ na ngalaba ukwu. Ọ bụrụ ma akpọghị onye ndu a, onye otù nke otu ndịisi kworum ndị okenye na-emju ọrụ nke a (lee 25.2.3).

Onyeisi kworum ndị okenye na onyeisi Otu Enyemaka nke ọbụla na-ekenye onye otù nke otu ndịisi inye aka duo ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ niime ngalaba ukwu ahụ. Ndị otù ndịisi abụọ ndị a na-arụkọ ọrụ ọnụ. Ha na-aga nzukọ nchịkọta tempụl na agụgụala ezi na ụlọ nke ngalaba ukwu (lee 25.2.7).

25.2.3

Onye ndu Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ na Ngalaba ukwu

Otu bishọp na-anara ndụmọdụ n’aka onyeisi stek iji kpebie ma a ga-akpọ onye ndu tempụl na agụgụala ezi na ụlọ na ngalaba ukwu. Onye a kwesịrị ịbụ onye ji Ọkwa nchụaja Melkizedek.

Onye ndu tempụl na agụgụala ezi na ụlọ ngalaba ukwu na-akwado otu ndịisi kworum ndị okenye na otu ndịisi Otu Enyemaka niime oke na ọrụ niile tempụl na agụgụala ezi na ụlọ ha. O nwekwara oke na ọrụ niile ndị a sotere:

  • Na-edu nzukọ nchịkọta tempụl na agụgụala ezi na ụlọ niile na ngalaba ukwu (lee 25.2.7).

  • Na-akuziri ndị njụta tempụl na agụgụala ezi na ụlọ ngalaba ukwu ihe. Na-achịkọta mgbalị ha iji nyere ndị otù aka n’ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ.

  • Rụkọọ ọrụ ha na onye ndu mishọn ngalaba ukwu na ndị mgbasa ozi ọma iji nyere ndị ahụ na-amụ ozi ọma, ndị otù ọhụrụ, na ndị otù na-alọghachi aka itinye aka n’ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ.

25.2.4

Ndị Njụta Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ Ngalaba ukwu

Ndị njụta tempụl na agụgụala ezi na ụlọ na-eje ozi n’okpuru ntuziaka nke onye ndu tempụl na agụgụala ezi na ụlọ ngalaba ukwu ma ọ bụ onye otù ndịisi kworum ndị okenye onye na-emezu ọrụ nke a. Otu bishọp na-akpọ ndị otù ndị a ije ozi. Enwere ike ịkpọ ndị dimkpa na ndị ntoroọbịa.

Ndị Njụta nwere oke na ọrụ niile ndị a sotere:

  • Na-enyere ndị otù aka nwete nhụmiihe ngọzi niile nke ịchọpụta ndị nna nna ochie ha ma mee emume nsọ niile nke tempụl n’aha ha.

  • Na-enyere ndị otù aka kwadobe ịnata emume nsọ niile ma mee ọgbụgba ndụ niile.

  • Sonye na nzukọ nchịkọta tempụl na agụgụala ezi na ụlọ niile (lee 25.2.7).

25.2.7

Nzukọ Nchịkọta Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ na Ngalaba ukwu

Nkenke nzukọ nchịkọta tempụl na agụgụala ezi na ụlọ ngalaba ukwu na-anọghị n’ụkpụrụ iwu ka a na-eme mgbe niile. Ọ bụrụ ma akpọọ onye ndu tempụl na agụgụala ezi na ụlọ ngalaba ukwu, ọ na-eduzi nzukọ ndị a. Ma ọ bụghị otu a, onye otù nke otu ndịisi kworum ndị okenye onye na-emezu ọrụ nke a na-eduzi.

Ndị ọzọ akpọkuru gụnyere:

  • Ndị otù nke otu ndịisi Otu Enyemaka na kworum ndị okenye enyere ọrụ.

  • Onye enyemaka niime kworum ndị nchụaja.

  • Onye otù ndịisi klaasị Ndịiyom Nta kacha ochie.

  • Ndị Njụta nke tempụl na agụgụala ezi n’ụlọ.

Ebumnoobi nke nzukọ niile ndị a bụ:

  • Ime atụmatụ otu esi enyere ndị otù akpọrọ aha aka n’ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ ha dị ka a chọrọ.

Nzukọ ndị a ka enwere ike ime na mmadụ ma ọ bụ n’ikuku. Nchịkọta ka enwekwara ike mee n’ụzọ ndị ọzọ, gụnyere okù ekwe ntị, ederede ekwe ntị, na email niile.

25.2.8

Ọzụzụ maka Nkwadobe Tempụl

N’okpuru ntuziaka nke bishọp, ọzụzụ maka nkwadobe tempụl ka enwere ike ịhazi iji nyere ndị otù aka kwadoo ime ọgbụgba ndụ niile dị ka ha na-anata emume nsọ tempụl niile. Ọzụzụ ndị a ka a na-eme n’ofe nzukọ nke Sọnde a na-emekarị n’oge dabara adaba maka ndị otù. E nwere ike ime ha na ụlọ ụka ma ọ bụ ebe obibi.

Ihe ọmụmụ niile na nkuzi niile maka ịhazi ọzụzụ ahụ dị niime Enyere Onyinye Dị nsọ Sitere N’elu: Akwụkwọ ọmụmụ ihe Onye nkuzi maka Nkwadobe Tempụl Semina. A na-enye ndị nsonye kọpị niile nke Ịkwado Ịbanye Tempụl Dị nsọ. Maka ọmụmụ ihe nke onwe na akụrụngwa niile ọmụmụ ihe, lee temples.ChurchofJesusChrist.org.

25.4

Akụrụngwa Agụgụala ezi na ụlọ niile

25.4.1

Ezi na ụlọ m: Akụkọ ndi Na-akpọkọta Anyị Ọnụ

Ezi na ụlọ m: Akụkọ ndi Na-akpọkọta Anyị Ọnụ na-enyere ndị mmadụ aka chọpụta ndị ikwu na ibe ha na ndị nna nna ochie ma kpokọta akụkọ ha. Akwụkwọ nke a nwekwara ike nyere ndị otù aka ịmalite ikwadobe aha niile nke ezi na ụlọ maka emume nsọ tempụl niile.

Akwụkwọ a ka enwere ike ibudata na ChurchofJesusChrist.org. Kọpị ndị a na-ahụ anya ka enwere ike ịtụ na store.ChurchofJesusChrist.org.

25.4.2

FamilySearch.org Na App FamilySearch

FamilySearch.org bụ website nke Nzukọ nsọ maka ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ. O nwere ike inyere ndị na-eji ya aka:

  • Wulite njikọ osisi ezi na ụlọ na mmekọrịta niile.

  • Chọpụta ndị nna nna ochie na akụkọ ha.

  • Kesaa ma chekwaa akụkọ ezi na ụlọ niile, foto niile, na agụgụala niile.

  • Kwadoo aha niile nke ezi na ụlọ maka emume nsọ tempụl niile.

App FamilySearch Tree na app FamilySearch Memories na-enye ndị mmadụ ike isonye n’ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ site na ngwa mkpanaka niile.

25.5

Ịtụ aro na Ịkpọkù Ndị Ọrụ Tempụl

25.5.1

Ịtụ aro Ndị Ọrụ Tempụl

Ndị ọrụ tempụl e bu n’obi ka a na-amata n’ụzọ ndị a sotere:

  • Ndị otù achọpụtara site n’aka bishọp ma ọ bụ onye ndu ọzọ nke ngalaba ukwu

  • Ndị otù ndị bịakwutere bishọp banyere ije ozi

  • Ndị otù onyeisi tempụl, onye metrọn, ma ọ bụ onye ndu tempụl ọzọ tụrụ arọ.

  • Ndị otù na-eme nkwado maka ma ọ bụ lọghachiri na nso nso a site na ije ozi mgbasa ozi ọma (lee isi nke 24)

Aha nke ndị ọrụ tempụl ebu n’obi ka a na-enyefe site na tool Ịtụ aro Onye ọrụ Tempụl. Ngwaọrụ nke a dị adị nye ndị bishọp, ndịisi stek, na otu Ndịisi tempụl.

Bipụta