Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
26. Rekọmend Tempụl niile


“26. Rekọmend Tempụl niile,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“26. Rekọmend Tempụl niile,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
bishọp na-agba onyeikom ajụjụ ọnụ

26.

Rekọmend Tempụl niile

26.0

Ime ka a mata

Ịbanye tempụl bụ ohere ọma dị nsọ. Ndị ndu ngalaba ukwu na stek na-agba ndị otù niile ume itozu oke nke na inwe rekọmend tempụl ọbụna ọ bụrụ ma ha e bighị ebe dị nso na tempụl.

Ndị ndu Nzukọ nsọ na-agba mbọ niile ịhụ na ndị niile banyere niime tempụl tozuru oke ime otu ahụ (lee Abụ ọma 24:3-5).

Ndị otù ga-enwerịrị rekọmend tempụl dị ugbua iji banye tempụl.

Onye bishọp na-anara ndụmọdụ n’aka onyeisi stek ya ọ bụrụ ma o nwere ajụjụ ndị banyere rekọmend tempụl ndị a na-azaghị niime isiakwụkwọ nke a. Onyeisi stek nwere ike kpọtụrụ Ụlọ ọrụ nke Otu Ndịisi Mbụ jiri ajụjụ niile.

26.1

Ụdị Rekọmend Tempụl niile

Enwere ụdị rekọmend atọ dị:

  1. Rekọmend tempụl maka ndị otù na-anatabeghị onyinye dị nsọ. Rekọmend ndị a bụ maka ndị otù na-anatabeghị onyinye dị nsọ ndị a na-arachi nye ndị nne na nna ha ma ọ bụ na-eme baptizim na Emume Nnabata nnọchite anya. A na-enye ha site na Akụrụngwa niile nke Onye ndu na Klak (LCR). Maka ozi ndị ọzọ, lee 26.4.

  2. Rekọmend tempụl maka emume nsọ ndị dị ndụ. Rekọmend ndị a bụ maka ndị otù na-anata onyinye dị nsọ nke onwe ha ma ọ bụ a na-arachi nye di ma ọ bụ nwunye. Rekọmend maka emume nsọ onye dị ndụ ka a na-atapanye na rekọmend tempụl a na-eji maka ndị otù nataworo onyinye dị nsọ (akọwara n’okpuru).

  3. Rekọmend tempụl maka ndị otù nataworo onyinye dị nsọ. Rekọmend ndị a bụ maka ndị otù ndị natawororịị onyinye dị nsọ n’oge gara aga. A na-enye ha site na LCR. Ha na-enye ndị otù ikike isonye n’emume nsọ niile nke tempụl maka ndị nwụrụ anwụ. Anakwa eji ha mgbe onye otù nataraworo onyinye dị nsọ na-arachi nye ndị nne na nna ma ọ bụ ụmụ dị ndụ ma ọ bụ nwụrụ anwụ. Maka ozi ndị ọzọ, lee 26.3.

26.2

Ichekwa Rekọmend Tempụl niile

26.2.1

Ndị ndu Ọkwa nchụaja Na-echekwa Rekọmend Tempụl

Ndị ndu ọkwa nchụaja ndị enyere ikike ijide akwụkwọ rekọmend tempụl niile kwesịrị ịkpachara anya chekwaa ha.

Ndị ndu ọkwa nchụaja nakwa ahụ na ndị a na-enyeghị ikike enweghị ụzọ esi enweta ozi nke rekọmend tempụl niime LCR.

26.2.3

Rekọmend ndị Furu efu ma ọbụ E zuru ezu

Bishọp na-arịọ ndị otù ịgwa ya ozugbo o kwere omume ọ bụrụ ma rekọmend ha fuo ma ọ bụ ezuo ya. Yanwa ma ọ bụ onye ndụmọdụ ya enyere ikike ma ọ bụ klak na-eji LCR akagbu rekọmend ahụ ozugbo o kwere omume. Ọ bụrụ ma sistem adịghị, bishọp na-akpọtụrụ ụlọ ọrụ tempụl ka akagbuo rekọmend ahụ.

26.2.4

Ndị Ji Rekọmend Ndị Na-adịghị Ebi ndụ Ụkpụrụ niile nke Ntozu oke

Ọ bụrụ ma bishọp chọpụta na onye otù onye nwere rekọmend ugbua anaghị ebi ndụ ụkpụrụ niile nke ntozu oke (lee 26.3), ọ na-anara onye otù ahụ rekọmend. Ọ na-eji LCR iji kagbuo rekọmend. Ọ bụrụ ma sistem adịghị, bishọp na-akpọtụrụ ụlọ ọrụ tempụl ka akagbuo rekọmend ahụ.

26.3

Ntuziaka Izugbe maka Ịnye Rekọmend Tempụl niile

Ndị ndu Ọkwa nchụaja kwesịrị inye rekọmend naanị ma ọ bụrụ ma onye otù zata ajụjụ niile nke rekọmend n’ụzọ dabara adaba.

Ajụjụ ọnụ niile nke rekọmend tempụl ekwesịghị ka a gbaa ya ọsọ. Ha kwesịrị ịbụ nke na-emeghị na mbara. Kosiladị, onye ahụ a na-agba ajụjụ ọnụ nwere ike kpọkuo dimkpa ọzọ ịnọ ebe ahụ.

Ndị ndu Ọkwa nchụaja ekwesịghị ịgbakwunye ihe ndị ọzọ ọ chọrọ n’elu ihe ndị ahụ edepụtara niime akwụkwọ rekọmend tempụl ọ bụghị ma ha kwesịrị iwepụ ihe ọbụla achọrọ.

Na stek niile, onye otù nke otu ndịisi stek ma ọ bụ klak stek na-eme ka rekọmend tempụl ahụ dị nkọ niime LCR mgbe enyesịrị ya. Na distrit niile, onye otù nke otu ndịisi mishọn ma ọ bụ klak mishọn na-ame ka rekọmend ahụ dị nkọ. Rekọmend niile maka baptizim na Emume Nnabata nnọchite anya ka a na-eme ka ọ dị nkọ mgbe ebipụtara ha site n’aka onye otù nke otu bishọp ma ọ bụ onyeisi ngalaba nta.

26.3.1

Ajụjụ ọnụ niile nke Rekọmend Tempụl maka ndị otù dị niime Ngalaba ukwu na Ngalaba nta

niime ngalaba ukwu, bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ na-eduzi ịgba ajụjụ ọnụ niile nke rekọmend tempụl ma na-enye ndị ahụ tozuru oke rekọmend. niime ngalaba nta, naanị onyeisi ngalaba nta na-agba ajụjụ ọnụ niile nke rekọmend tempụl ma na-enye rekọmend.

niime ngalaba ukwu, bishọp n’onwe ya na-agba ndị otù ajụjụ ọnụ ndị:

  • Na-anata onyinye dị nsọ nke onwe ha (lee 27.1 na 27.2).

  • A na-arachi nye di ma ọ bụ nwunye (lee 27.3).

N’ọnọdụ ndị dị ọkụ ọkụ mgbe bishọp na-anọghị ya, o nwere ike nye otu niime ndị ndụmọdụ ya ikike ịgba ajụjụ ọnụ ndị a.

Tupu enye rekọmend n’ọnọdụ ọbụla na ndi edepụtara n’elu, bishọp na-enyochagharị ndekọihe nke onye otù ahụ iji mara n’ezie na ọ dịghị ihe nkọwa banyere mgbochi niile nke ịbụ onye otù Nzukọ nsọ agụnyere. Maka ndị otù na-anata onyinye dị nsọ nke onwe ha ma ọ bụ a na-arachi nye di ma ọ bụ nwunye, ọ nakwa ahụ na:

  • Baptizim na Emume Nnabata nke onye ahụ ka edekọrọ na ndekọihe nke ịbụ onye otù.

  • Nwanne ndị nwoke anatawo Ọkwa nchụaja Melkizedek.

Mgbe ajụjụ ọnụ sitere n’aka onye otù nke otu bishọp ma ọ bụ onyeisi ngalaba nta gasịrị, onye otù nke otu ndịisi stek na-agba ndị otù ajụjụ ọnụ ndị bi na stek. Onye otù nke ndịisi mishọn na-agba ajụjụ ọnụ nke abụọ maka ndị otù bi na distrikt. Onyeisi distrikt anaghị agba ajụjụ ọnụ ndị nke rekọmend tempụl ma ọ bụghị ma Otu Ndịisi Mbụ nyere ya ikike.

26.3.2

Ajụjụ ọnụ niile nke Rekọmend Tempụl maka ndị otù nọ Mpaghara ndị Dịpụrụ Adịpụ

Ụfọdụ ndị otù bi na mpaghara nke ga-adị oke ọnụ ime njem ma ọ bụ raa ezigbo ahụ izute onye otù nke ndịisi stek ma ọ bụ mishọn. N’ọnọdụ ndị a, onyeisi tempụl nwere ike gbaa onye ahụ ajụjụ ọnụ ma bịanye aka na rekọmend ahụ. Tupu agbaa ajụjụ ọnụ ahụ, ọ na-akparịkọta ụka ya na onyeisi stek ma ọ bụ mishọn. Bishọp, onye ndụmọdụ enyere ikike, ma ọ bụ onyeisi ngalaba nta kwesịwororịị ịgba onye otù ahụ ajụjụ ọnụ ma bịanye aka na rekọmend ahụ.

26.4

Inye ndị otù Na-anatabeghị Onyinye Dị nsọ Rekọmend Tempụl

26.4.1

Ntuziaka Izugbe

Rekọmend tempụl niile ka a na-enye ndị otù na-anatabeghị onyinye dị nsọ dị ka ndị a sotere:

  • Maka ndị otù gbara afọ 11 ma karịa maka ime baptizim na Emume Nnabata maka ndị nwụrụ anwụ. (Ndịiyom nta na ndịikom nta echiri echichi tozuru etozu maka rekọmend tempụl malite na Jenụwarị afọ ha ga-agba afọ12.)

  • Maka ndị otù gbara afọ 8 ruo 20 a ga-arachi nye ndị nne na nna ha. Ụmụntakịrị dị nta karịa afọ 8 enweghị mkpa rekọmend iji rachie nye ndi nne na nna ha (lee 26.4.4).

  • Maka ndị otù gbara afọ 8 ruo 20 ileanya na nrachi niile nke ụmụnne ha dị ndụ, ụmụnne ha nihi alumdi nne na nna ha, ma ọ bụ ụmụnne nne na nna ha ndị n’abụghi otu nna m’ọbụ nne ji.

Anaghị enye ndị otù nataworo n’oge gara onyinye dị nsọ ha rekọmend ọbụla akọwara niime nkeji nke a.

Nwoke onye otù Nzukọ nsọ onye tozuru oke nke ọma ijide ọkwa nchụaja ka a garịrị echi echichi n’ọkwa ọkwa nchụaja tupu ya e nwee ike nata rekọmend tempụl.

26.4.2

Rekọmend Tempụl niile maka ndị otù E Mere Baptizim Ọhụrụ

Bishọp na-agba ndị otù ọhụrụ ajụjụ ọnụ ndị gbara afọ dabara adaba ịnata rekọmend tempụl maka baptizim na Emume Nnabata nnọchite anya naanị. Ọ na-agba ajụjụ ọnụ nke a ngwa ngwa emesịrị onye otù a onye otù, nke a na-abụkarị niime otu izu ụka (lee 26.4.1). Maka ụmụnne ndị nwoke, ajụjụ ọnụ nke a ka enwere ike ime dị ka akụkụ nke ajụjụ ọnụ ịnata Ọkwa nchụaja nke Erọn.

26.4.3

Rekọmend Tempụl niile maka Baptizim na Emume Nnabata Nnọchite Anya Naanị

Rekọmend tempụl niile nke a na-enye maka baptizim na Emume Nnabata nnọchite anya ka enwere ike iji mee ihe naanị maka Ebumnoobi ahụ.

26.4.4

Rekọmend Tempụl niile maka Nrachi Ụmụ Dị ndụ nye Nne na nna

Ndị otù gbara afọ 21 ma ọ bụ karịa nwere ike rachie nye nne na nna ha ma ọ bụ lee nrachi naanị ma ọ bụrụ ma ha (1) anatawo onyinye dị nsọ ma (2) nwere rekọmend tempụl dị ugbua.

26.5

Inye Rekọmend Tempụl niile na Ọnọdụ Ndị Pụrụ iche

26.5.1

Ndị otù Na-anata Onyinye dị nsọ Nke Onwe Ha

Ndị otù tozuru oke chọrọ ịnata onyinye dị nsọ nke onwe ha nwere ike mee otu ahụ mgbe ha zutere ọnọdụ niile ndị a sotere:

  • Ha gbara opekampe afọ 18.

  • Ha emezuwo ma ọ bụ anaghịkwa aga ụlọakwụkwọ dị elu, ụlọakwụkwọ sekọndịrị, ma ọ bụ nke ya na ya ha.

  • Otu afọ zuru ezu agafewo kemgbe Emume Nnabata ha gasịrị.

  • Ha na-enwe ọchịchọ ịnata ma nye ọgbụgba ndụ tempụl ha nkwanye ugwu ruo oge ndụ ha niile.

Na mgbakwunye, onyeikom garịrị ejide Ọkwa nchụaja Melkizedek tupu ịnata onyinye dị nsọ nke ya. Maka ozi banyere ndị otù na-akwado ịnata onyinye dị nsọ nke onwe ha, lee 25.2.8. Maka ozi banyere onye nwere ike ịnata onyinye dị nsọ, lee 27.2.1.

26.5.3

Ndị Mgbasa ozi ọma Nta Na-alọghachi site N’ije ozi Pụrụ n’Ebe obibi

Onyeisi mishọn na-ede agụgụ ụbọchi ma na-eme ka rekọmend ahụ dị nkọ ka o wee mebie n’ọnwa atọ site n’ụbọchi onye mgbasa ozi ọma ahụ lọghachiri ebe obibi.

Bishọp na-agba onye mgbasa ozi ọma lọghachiri ajụjụ ọnụ iji nye rekọmend tempụl ọhụrụ nso nso na njedebe ọnwa atọ oge mmebi ahụ.

26.5.4

Ndị otù Na-ebibeghị n’Otu Ngalaba ukwu Opekampe Otu Afọ

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ na-akpọtụrụ bishọp ikpeazụ tupu ịgba ajụjụ ọnụ rekọmend tempụl.

26.5.7

Ndị otù Na-ahụta onwe ha dị ka Mgbanwe Okike

Onyeisi stek kwesịrị ịdụ ndụmọdụ ya na Otu Ndịisi Mpaghara ikwu maka ọnọdụ ndị nke onye ọbụla jiri mmetụta uche na ịhụnaanya yiri nke Kraịst (lee 38.6.23).

26.5.8

Ndị otù Meworo Njọ Siri ike

Onye otù meworo njọ siri ike nwere ike ọ gaghị anata rekọmend tempụl tutu ruo mgbe ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị mere nchegharị (lee 32.6).

26.5.9

Ndị otù Ndị Anabataghachiworo mgbe e mesịrị Mwepụ aha ma ọ bụ Ịgba Arụkwaghịm Ịbụ onye otù Nzukọ nsọ

26.5.9.1

Ndị otù Ndị Na-anataghị Onyinye dị nsọ Oge gara aga

Ndị otù ndị a nwere ike a gaghị enye ha rekọmendị iji nata onyinye dị nsọ nke onwe ha tutu ruo otu afọ zuru oke mgbe ụbọchi nnabataghachi ha nye Nzukọ nsọ site na baptizim na Emume Nnabata gasịrị.

26.5.9.2

Ndị otù Ndị Nataworo Onyinye dị nsọ Oge gara aga

Ndị otù ndị nataworo onyinye dị nsọ oge gara aga nwere ike gaghị anata ụdị rekọmend tempụl ọbụla tutu eweghachite ngọzi niile nke tempụl ha site n’emume nsọ nke mweghachite ngọzi niile.

Bipụta