Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
27. Emume nsọ niile nke Tempụl maka Ndị Dị ndụ


“27. Emume nsọ niile nke Tempụl maka Ndị Dị ndụ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“27. Emume nsọ niile nke Tempụl maka Ndị Dị ndụ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
nwanyị na nwoke na-agba akwụkwọ

27.

Emume nsọ niile nke Tempụl maka Ndị Dị ndụ

27.0

Ime ka a mata

Tempụl bụ ụlọ nke Onyenwe anyị. Ọ na-atụrụ anyị aka n’ebe Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst nọ. Na tempụl niile, anyị na-esonye n’emume nsọ niile dị nsọ ma mee ọgbụgba ndụ niile anyị na Nna nke Eluigwe ma kechie anyị nye Ya na Onye Nzọpụta anyị. Ọgbụgba ndụ na emume nsọ ndị a na-akwado anyị ịlaghachi n’ihu Nna nke Eluigwe ma arachikọta anyị ọnụ dị ka ndị ezi na ụlọ nke ebighị ebi.

N’ọgbụgba ndụ na emume nsọ niile nke tempụl, “ike nke ndụ iyi Chineke na-apụta ìhè” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 84:20).

Ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ niile nke tempụl dị nsọ. Ọdịmara niile ndị metụtara ọgbụgba ndụ tempụl niile ekwesịghị ka ekwuo maka ha na mpụta tempụl. ọ bụghị ma anyị ga-akparịta ụka ozi dị nsọ anyị kwere nkwa niime tempụl ịghara ikpughe. Kosiladị, anyị nwere ike ikpa nkata isi Ebumnoobi niile na ozizi nke ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ niile nke tempụl na mmetụta nke ime mmụọ anyị na enwete niime tempụl.

Ndị ndu ngalaba ukwu na stek na-akparịta ụka n’ozi dị niime isiakwụkwọ nke a ha na ndị otù na-akwado ịnata onyinye dị nsọ ma ọ bụ emume nsọ nrachi niile.

27.1

Ịnata Emume nsọ niile nke Tempụl

27.1.1

Ịkwadobe Ịnata Emume nsọ niile nkeTempụl

Ndị otù kwesịrị ịkwado onwe ha niime mmụọ ịnata emume nsọ niile nke tempụl na ime ma nye nkwanye ugwu na ọgbụgba ndụ niile nke tempụl.

Ndị nne na nna nwere ọrụ mbụ inyere ụmụ ha aka kwadoo ịnata emume nsọ niile nke tempụl. Ndị ndu stek na ngalaba ukwu, ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị na-eje ozi nlekọta, na ndị otù ezi na ụlọ nke ukwu na-akwado ndị nne na nna n’ọrụ nke a.

Akụrụngwa niile iji nyere ndị otù aka kwadoo ịnata emume nsọ niile nke tempụl dị adị na temples.ChurchofJesusChrist.org.

Ndị otù na-akwadebe ịnata onyinye dị nsọ nke onwe ha ma ọ bụ ka arachie nye di ma ọ bụ nwunye ka a na-agba ume isonye na ihe ọmụmụ nkwadobe tempụl (lee 25.2.8).

27.1.3

Ndị otù Nwere Nkwarụ Anụ Ahụ

Ndị otù tozuru oke nwere nkwarụ anụ ahụ nwere ike nata emume nsọ niile nke tempụl. Ndị otù ndị a ka a na-agba ume ịga tempụl ha na ndi ikwu ma ọ bụ ndị enyi nke otu ụdị okike natawororịị onyinye dị nsọ onye nwere ike inyere ha aka. Ọ bụrụ ma ndị otù enweghị ike ịbịa ha na ndị otù ezi na ụlọ ma ọ bụ enyi, ha nwere ike kpọtụrụ tempụl na gboo ịji hụ nhazi ndị enwere ike ime.

27.1.4

Enyemaka Ntụgharị asụsụ ma ọ bụ Ntapịa asụsụ

Ọ bụrụ ma ndị otù chọrọ enyemaka ntụgharị asụsụ ma ọ bụ ntapịa asụsụ, ha kwesịrị ịkpọtụrụ tempụl na gboo iji hụ ma ọ dị adị.

27.1.5

Uwe iji Yiri gaa na Tempụl

Mgbe a na-aga na tempụl, ndị otù kwesịrị iyi ụdị uwe ha na-eyikarị gaa nzukọ oriri nsọ

Lee 27.3.2.6 maka ozi banyere uwe iji yiri gaa agbam akwụkwọ tempụl ma ọ bụ nrachi.

Lee 38.5 maka ozi banyere:

  • Uwe a ga-eyi n’oge onyinye dị nsọ na emume nsọ nrachi niile

  • Inwete, iyiri, na ilekọta uwe mmemme na gament niile tempụl.

27.1.6

Ilekọta Nwa

Ụmụntakịrị ga-enwerịrị nlekọta nke onye dimkpa ma ọ bụrụ na ha nọ na ogige tempụl. Ndị ọrụ tempụl dị adị ilekọta ụmụntakịrị naanị n’ọnọdụ ndị a sotere:

  • Ọ bụrụ na a na-arachi ha nye ndị nne na nna.

  • Ọ bụrụ na ha na-ele nrachi nke ụmụnne ha dị ndụ, ụmụnne ha nihi alumdi nne na nna ha, ma ọ bụ ụmụnne nne na nna ha ndị n’abụghi otu nna ma ọ bụ nne ji.

27.1.7

Izute ndị otù mgbe Ha Natasịrị Emume nsọ niile nkeTempụl

Ọtụtụ mgbe ndị otù na-enwe ajụjụ mgbe ha natasịrị emume nsọ niile nke tempụl. Ndị otù ezi na ụlọ nataworo onyinye dị nsọ, bishọp, ndị ndu ndị ọzọ nke ngalaba ukwu, na ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị na-eje ozi nlekọta nwere ike zukọọ ha na ndị otù ịkparịta ụka nhumiihe tempụl ha.

Akụrụngwa niile iji nye aka zaa ajụjụ niile dị adị na temples.ChurchofJesusChrist.org.

27.2

Onyinye dị nsọ ahụ

Mkpụrụ okwu ahụ onyinye dị nsọ pụtara “onyinye.” Onyinye dị nsọ tempụl bụ nnọọ onyinye si n’aka Chineke nke O sitere na ya agọzi ụmụ Ya. Ụfọdụ niime onyinye nke ndị otù na-anata site na onyinye dị nsọ nke tempụl gụnyere:

  • Ọmụma ihe kacha ukwuu banyere Ebumnoobi niile na nkuzi niile nke Onyenwe anyị.

  • Ike iji mee ihe niile nke Nna nke Eluigwe chọrọ ụmụ Ya ime.

  • Ntuziaka si n’igwe mgbe i na-ejere Onyenwe anyị, ndị ezi na ụlọ ha, na ndị ọzọ ozi.

  • Ụbara olileanya, nkasi obi, na udo.

Mmejupụta nke ngọzi ndị a dabeere n’ikwesị ntụkwasị obi nye ozi ọma nke Jizọs Kraịst.

Onyinye dị nsọ ka a na-anata n’ụzọ abụọ. N’ụzọ nke mbụ, mmadụ na-anata emume nsọ nke mbido akpọrọ emume nnabata. Emume nnabata bụkwa nke ama dị ka nsacha na otite mmanụ (lee Ọpụpụ 29:4-9). Ọ gụnyere ngọzi ndị pụrụ iche metụtara ihe nketa na ike si n’igwe nke mmadụ.

N’oge emume nnabata, a na-enye onye otù ahụ ikike iyi gament tempụl. Gament ahụ nọchitere anya mmekọrịta nke onwe ya na Chineke na mkpebi irube isi na ọgbụgba ndụ niile e mere niime tempụl. Mgbe ndị otù kwesịrị ntụkwasị obi n’ọgbụgba ndụ ha ma yiri gament n’ụzọ ziri ezi n’oge ndụ ha niile, ọ nakwa arụ ọrụ dị ka ihe nchekwa. Maka ozi banyere iyi ma lekọta gament, lee 38.5.5.

N’akụkụ nke abụọ nke onyinye dị nsọ, a na-akuzi atụmatụ nke nzọpụta, tinyekwara Okike, Ọdịda nke Adam na Iv, Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, Ngọnarị okwukwe, na Mweghachite. Ndị otù nakwa anata nkuzi maka otu esi alaghachi n’ihu Onyenwe anyị.

N’emume onyinye dị nsọ, a na-akpọku ndị otù ịgba ọgbụgba ndụ ndị dị nsọ dị ka ndị a sotere:

  • Debe iwu nke nrube isi ma gbalịa idebe iwu nsọ niile nke Nna nke Eluigwe.

  • Rube isi n’iwu nke ịchụ aja, nke pụtara ịchụ aja ikwado ọrụ nke Onyenwe anyị na ichegharị jiri obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị.

  • Rube isi n’iwu nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst, nke bụ iwu ka dị elu nke Ọ kuziri mgbe Ọ nọ n’elu ụwa.

  • Debe iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta, nke pụtara na onye otù ga-enwe mmekọrịta mmekọahụ naanị ya na onye ọ lụrụ n’usoro iwu na n’okpuru iwu dị ka otu iwu nke Chineke siri dị.

  • Debe iwu nke nnyefechasị, nke pụtara na ndị otù na-araranye oge ha, akara aka niile, na ihe niile nke Onyenwe anyị jiworo gọzie ha iji wulite Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst n’elu ụwa.

Na nsote ya, Nna nke Eluigwe na-ekwe nkwa na ndị ahụ nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ niile nke tempụl ha ka a ga-enye onyinye “ike sitere n’elu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:32, 38; leekwa Luk 24:49; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 43:16).

27.2.1

Onye Nwere ike Ịnata Onyinye dị nsọ

Ndị otù Nzukọ nsọ gbara dimkpa ka a na-akpọku ikwadebe maka na ịnata onyinye dị nsọ nke onwe ha. Emume nsọ mbute ụzọ niile achọrọ ka a ga-emerịrị ma detuo tupu ndị otù enwee ike nata onyinye dị nsọ (lee 26.3.1).

27.2.1.1

Ndị otù E Mere Baptizim Ọhụrụ

Ndị otù ọhụrụ gbara dimkpa tozuru oke nwere ike nata onyinye dị nsọ ha opekampe otu ọkpụrụ afọ site n’ụbọchi emere ha onye otù.

27.2.1.2

Ndị otù Nwere Di ma ọ bụ Nwunye Na-anatabeghị Onyinye dị nsọ

Onye otù tozuru oke onye di ma ọ bụ nwunye ya anatabeghị onyinye dị nsọ nwere ike nata onyinye dị nsọ nke ya onwe ya mgbe ezutere ọnọdụ ndị a:

  • Di ma ọ bụ nwunye na-anatabeghị onyinye dị nsọ na-enye nkwenye ya.

  • Onye otù ahụ, bishọp, na onyeisi stek nwere ntụkwasị obi n’oke na ọrụ a na-eme site na ọgbụgba ndụ tempụl agaghị a bụ ihe ntisa nye alụmdi na nwunye ahụ.

Ọnọdụ ndị a metụtara ma di ma ọ bụ nwunye ọ bụ onye otù Nzukọ nsọ ma ọ bụ na ọ bụghị.

27.2.1.3

Ndị otù Nwere Nkwarụ Ọgụgụ isi

Ndị otù nwere nkwarụ ọgụgụ isi nwere ike nata onyinye dị nsọ nke onwe ha ọ bụrụ ma:

  • Ha anatawo emume nsọ mbute ụzọ niile achọrọ (lee 26.3.1).

  • Ha nwere ike ọgụgụ isi iji ghọta, mee, ma debe ọgbụgba ndụ ndị ha na ha so.

Bishọp na onye otù ahụ a dụọ ndụmọdụ ma, ebe ọ dabara adaba, ndị nne na nna ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. Ọ nakwa achọ ntuziaka nke Mmụọ. Ọ nwere ike duọ ndụmọdụ ya na onyeisi stek.

27.2.2

Ikpebi Mgbe aga Anata Onyinye dị nsọ

Mkpebi ịnata onyinye dị nsọ bụ nke onwe ma e kwesịrị ime ya n’ekpere. Onyinye dị nsọ bụ ngọzi nke ike na mkpughe nye ndị niile kwadoro ịnata ya. Ndị otù nwere ike họrọ ịnata onyinye dị nsọ nke onwe ha mgbe ha zutere ọnọdụ ndị a sotere:

  • Ha gbara opekampe afọ 18.

  • Ha emezuwo ma ọ bụ anaghịkwa aga ụlọakwụkwọ dị elu, ụlọakwụkwọ sekọndịrị, ma ọ bụ nke ya na ya ha.

  • Otu ọkpụrụkpụ afọ agafewo kemgbe Emume Nnabata ha.

  • Ha na-enwe ọchịchọ ịnata ma nye ọgbụgba ndụ tempụl ha nkwanye ugwu n’oge ndụ ha niile.

Ndị otù nataworo ọkpụkpọ okù mishọn ma ọ bụ na-akwado ka arachie na tempụl kwesịrị ịnata onyinye dị nsọ.

Tupu inye rekọmend tempụl maka onye otù ịnata onyinye dị nsọ, bishọp na onyeisi stek kwesịrị inwe mmetụta na onye ahụ akwadowo ịghọta ma debe ọgbụgba ndụ tempụl niile dị nsọ. Ntozu nke a ka a na-ekpebi n’otu onye n’otu n’otu maka onye ọbụla.

27.2.3

Ịtụ Atụmatụ na Ịhazi oge Onyinye dị nsọ ahụ

27.2.3.1

Ịnata Rekọmend maka Emume nsọ niile maka Onye Dị ndụ

Onye otù ga-anatarịrị rekọmend maka emume nsọ niile maka onye dị ndụ iji banye tempụl ma nata onyinye dị nsọ. Maka ozi banyere rekọmend ndịa, lee 26.5.1.

27.2.3.2

Ịkpọtụrụ Tempụl

Ndị otù na-eme atụmatụ ịnata onyinye dị nsọ kwesịrị ịkpọtụrụ tempụl tupu oge eruo iji hazie oge emume nsọ.

27.2.3.3

Ndị nduga ozi maka ndị otù Na-anata Onyinye dị nsọ

Ndị otù na-anata onyinye dị nsọ nke onwe ha nwere ike kpọkuo onye otù otu ụdị okike ha nataworo onyinye dị nsọ ime dị ka onye nduga ozi ma nyere ha aka n’oge nzukọ onyinye dị nsọ. Onye nduga ozi ga-enwerịrị rekọmend tempụl dị ugbua. Tempụl nwere ike wete onye nduga ozi ọ bụrụ ma achọọ.

27.3

Nrachi nke Di na Nwunye

Nrachi nke tempụl na-ejikọta di na nwunye ọnụ maka oge ndụ na ebighị ebi niile. Ha ga-anata ngọzi ndịa ọ bụrụ ma ha kwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ niile ha mere na tempụl. Site n’ọgbụgba ndụ nke a, ụmụ ha nwekwara ike bụrụ akụkụ nke ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi ha.

Ndị ndu Nzukọ nsọ na-agba ndị otù ume ikwado ịlụ di na nwunye ma rachie niime tempụl. Ebe alụmdi na nwunye tempụl abụghị nke anabatara n’usoro iwu, ndị ndu Nzukọ nsọ ji ikike ma ọ bụ ndị ọzọ nwere ike mee alụmdi na nwunye ndị iwu kwadoro nke nrachi tempụl ga-esochi (lee 38.3). Usoro nke a ka enwekwara ike isoro mgbe alụmdi na nwunye tempụl nwere ike kpata ndị nne na nna ma ọ bụ ndị otù ezi na ụlọ nwe ha iche na-agụpụrụ ha n’ihi na ha enweghị ike ịga mmemme tempụl.

27.3.1

Onye Enwere Ike Ịrachi na Tempụl

Ndị otù Nzukọ nsọ niile na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ka a na-akpọku ikwado maka nrachi tempụl. Ndị ahụ mere alụmdi na nwunye n’okpuru iwu ka a na-agba ume irachi maka ugbua na mgbe ebighị ebi na tempụl ozugbo ha kwadoro. Ndị otù ga-enweterịrị onyinye dị nsọ tupu ha enwee ike rachie (lee 27.2).

Di na nwunye a na-arachi na tempụl aghaghị ịbụ ma (1) ndị mere alụmdi na nwunye o’kpuru iwu tupu arachie ha ma ọ bụ (2) ndị lụrụ ma arachie ha niime otu ụdị mmemme tempụl. Lee 27.3.2.

27.3.1.2

Ndị otù Nwere Nkwarụ Ọgụgụ isi

Ndị otù nwere nkwarụ ọgụgụ isi ka enwere ike irachi nye di ma ọ bụ nwunye ha, nwoke nwanyị kwere nkwa ịlụ, ma ọ bụ nwanyị e kwere nkwa ịlụ ọ bụrụ ma:

  • Ha anatawo emume nsọ mbute ụzọ niile a chọrọ, gụnyere onyinye dị nsọ (lee 27.2.1.3).

  • Ha nwere ike ọgụgụ isi iji ghọta, mee, ma debe ọgbụgba ndụ ndị metụtara ha.

Bishọp na onye otù na-adụ ndụmọdụ ma di ya ma ọ bụ nwunye ya, nwoke nwanyị kwere nkwa ịlụ, ma ọ bụ nwanyị e kwere nkwa ịlụ. Ọ nakwa achọ ntuziuaka nke Mmụọ. Ọ nwere ike duọ ndụmọdụ ya na onyeisi stek.

27.3.2

Ime atụmatụ na Ịhazi oge Alụmdi na nwunye ma ọ bụ Nrachi Tempụl

27.3.2.1

Ịnata Rekọmend maka Emume nsọ Onye Dị ndụ

Onye otù ga-anatarịrị rekọmend maka emume nsọ niile nke onye dị ndụ iji nwee ike rachikọta onwe ya nye di ma ọ bụ nwunye ya. Maka ozi banyere rekọmend ndịa, lee 26.3.

27.3.2.2

Ịkpọtụrụ Tempụl

Ndị otù na-eme atụmatụ ịlụ ma ọ bụ rachie nye di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịkpọtụrụ tempụl tupu oge eruo iji hazie oge emume nsọ ahụ.

27.3.2.3

Ịnata Ikike Alụmdi na nwunye

Tupu alụọ, di na nwunye ga-anatarịrị ikike alụmdi na nwunye n’usoro iwu nke dị irè ebe a ga-eme alụmdi na nwunye ahụ. Ọ bụrụ na di na nwunye ahụ enwewo atụmatụ na ha ga-alụ ma rachie n’oge otu ụdị mmemme ahụ, ha ga-eweterịrị ikike alụmdi na nwunye dị irè bịa na tempụl.

Di na nwunye a na-arachi mgbe emesịrị alụmdi na nwunye nke iwu ekwesịghị iwete ikike alụmdi na nwunye bịa na tempụl. Kama, ha ga-ewete agụgụ ụbọchi na ebe ha mere alụmdi na nwunye nke iwu dị ka akụkụ nke usoro nchọpụta ndekọihe.

27.3.2.4

Ndị Nduga Ozi maka Nwanyị na Nwoke Na-agba Akwụkwọ

Nwanne nwanyị nataworo onyinye dị nsọ nwere ike soro nwanyị na-agba akwụkwọ inyere ya aka niime ụlọ iyiri uwe. Nwanne nwoke nataworo onyinye dị nsọ nwere ike mee otu ahụ kwa maka nwoke na-agba akwụkwọ. Onye nduga ozi ga-enwerịrị rekọmend tempụl dị ugbua. Tempụl nwere ike wete onye nduga ozi ọ bụrụ ma achọọ.

27.3.2.5

Onye Na-arụ ọrụ Alụmdi na nwunye ma ọ bụ Nrachi Tempụl

Alụmdi na nwunye ma ọ bụ nrachi nke tempụl ka a na-emekarị site n’aka onye nrachi onye enyere ọrụ na tempụl ebe di na nwunye ga-alụ ma ọ bụ eme nrachi. Ọ bụrụ ma onye otù ezi na ụlọ ma ọ bụ onye ha ma ama ji ikike nrachi ma enye ya ọrụ na tempụl ebe di na nwunye ahụ ga-alụ ma ọ bụ mee nrachi, ha nwere ike kpọkuo ya ime ọrụ alụmdi na nwunye ma ọ bụ nrachi ahụ.

27.3.2.6

Uwe Dabara adaba maka Alụmdi na nwunye ma ọ bụ Nrachi Tempụl

Uwe Nwanyị na-agba akwụkwọ. Uwe nwanyị na-agba akwụkwọ a na-eyi na tempụl kwesịrị ịcha ụcha, nwee oke na mmewe na akwa, ma hara inwe ọtụtụ ọla ịchọ mma dị ukwuu. O kwesịkwara ikpuchi gament nke tempụl. Akwa na-ahụ ụzọ kwesịrị ka etinye akwa niime ya.

Ịdị n’ụdị uwe ndị ọzọ a na-eyi niime tempụl, uwe nwanyị na-agba akwụkwọ kwesịrị inwe aka ogologo ma ọ bụ aka gafeetụrụ ikiaka. Uwe niile ekwesịghị inwe ọdụ ọgwụla ma a ga-enwe ike adụli ya ntutu elu ma ọ bụ ewepụ ya maka emume nrachi.

Tempụl nwere ike wete uwe ọ bụrụ ma ọ dị mkpa ma ọ bụ achọọ.

Iyi uwe Nwoke Na-agba Akwụkwọ. Nwoke na-agba akwụkwọ na-eyikarị uwe tempụl n’oge alụmdi na nwunye ma ọ bụ mmemme nrachi (lee 38.5.1 na 38.5.2).

Iyi uwe Ndị Ọbịa. Ndị ahụ na-abịa mmemme alụmdi na nwunye ma ọ bụ nrachi kwesịrị iyi uwe yiri ihe ha ga-eyi bịa nzukọ oriri nsọ. Ndị otù si na nzukọ onyinye dị nsọ bịa nrachi ozugbo ahụ nwere ike yiri mmemme tempụl.

Okooko osisi Di na nwunye na ndị ọbịa ha ekwesịghị ijide okooko osisi n’oge mmemme alụmdi na nwunye ma ọ bụ nrachi.

27.3.2.7

Ịgbanwe Mgbanaka mgbe emesịrị Alụmdi na nwunye ma ọ bụ Nrachi Tempụl

Ịgbanwe mgbanaka abụghị akụkụ nke emume nrachi tempụl. Kosiladị, di na nwunye nwere ike gbanwee ọla mgbanaka mgbe emesịrị emume ahụ na ime ụlọ nrachi. Di na nwunye ekwesịghị ịgbanwe mgbanaka n’oge ọzọ ma ọ bụ ebe ọzọ niime tempụl ma ọ bụ n’ogige tempụl.

Di na nwunye lụworo alụ ma mee nrachi n’otu emume ahụ nwere ike gbanwee mgbanaka n’oge ọzọ iji nabata ndị otù ezi na ụlọ ndị na-enweghị ike bịa alụmdi na nwunye tempụl. Mgbanwe ahụ ekwesịghị imegharị akụkụ ọbụla nke alụmdi na nwunye ahụ ma ọ bụ emume nrachi ahụ. Di na nwunye ahụ ekwesịghị ịgbanwe nkwa mgbe emesịrị ọlụlụ ma ọ bụ nrachi na tempụl.

Di na nwunye lụrụ ọlụlụ nke iwu tupu nrachi tempụl ha nwere ike gbanwee mgbanaka na emume nke iwu, na nrachi tempụl ha, ma ọ bụ na emume abụọ ahụ.

27.3.4

Onye Nwere ike Ịbịa Alụmdi na nwunye ma ọ bụ Nrachi Tempụl

Di na nwunye kwesịrị ịkpọku naanị ndị otù ezi na ụlọ na ndị enyi nọ nso na alụmdi na nwunye ma ọ bụ nrachi tempụl. Ndị otù kwesịrị ntụkwasị obi ga-anatarịrị onyinye dị nsọ ma nwee rekọmend tempụl dị ugbua iji bịa.

Onyeisi stek nwere ike nye mmadụ ikike onye na-emebeghị baptizim ma ọ bụ anatabeghị onyinye dị nsọ n’ihi nkwarụ ọgụgụ isi ịbịa alụmdi na nwunye ma ọ bụ nrachi tempụl nke nwanne ya dị ndụ. Onye ahụ garịrị:

  • Agba opekampe afọ 18.

  • Enwe ike gosi nkwanye ugwu n’oge emume ahụ.

Onyeisi stek edee leta na-ekwupụta na enyere onye ahụ ikike ịbịa lere nrachi ahụ. Leta nke a ka a na-ewete na tempụl.

27.4

Nrachi Ụmụ Dị ndụ nye Ndị Nne na nna

Ụmụ a mụrụ mgbe nne ha rachiwororịị nye di ya na tempụl ka a mụrụ niime ọgbụgba ndụ nke nrachi ahụ. Ọ dịghị mkpa na ha natara emume nsọ nke nrachi nye ndị nne na nna.

Ụmụ a na-amụghị niime ọgbụgba ndụ nwere ike ịghọ akụkụ nke ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi site n’ịrachi ha nye ndị nne na nna mụrụ ha ma ọ bụ nke kutere ha. Ụmụ ndị a nwere oke n’otu ụdị ngọzi ndị ahụ dị ka ndị ahụ a mụrụ niime ọgbụgba ndụ.

27.4.2

Ịkpọtụrụ Tempụl

Di na nwunye chọrọ ka arachie ụmụ ha nye ha, ma ọ bụ ụmụ chọrọ ka arachie ha nye ndị nne na nna ha nwụrụ anwụ, kwesịrị ịkpọtụrụ tempụl n’oge tupu ịhazi oge emume nsọ ahụ.

Bipụta