Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
28. Emume nsọ niile nke Tempụl maka Ndị Nwụrụ anwụ


“28. Emume nsọ niile nke Tempụl maka Ndị Nwụrụ anwụ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“28. Emume nsọ niile nke Tempụl maka Ndị Nwụrụ anwụ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ebe a na-eme baptizim

28.

Emume nsọ niile nke Tempụl maka Ndị Nwụrụ anwụ

28.0

Ime ka a mata

Emume nsọ ndị e mere niime tempụl na-eme ya ekwe omume maka ndị ezi na ụlọ ịnọkọ ọnụ mgbe ebighị ebi ma nwete nhumiihe nke ọńụ n’uju n’ihu Chineke.

Maka ụmụ Nna nke Eluigwe ịlaghachikwute Ya, onye ọbụla niime ha aghaghị ichegharị, tozuo oke ịnata emume nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu, ma nye ọgbụgba ndụ niile metụtara emume nsọ ọbụla nkwanye ugwu.

Nna nke Eluigwe maara na ọtụtụ niime ụmụ Ya agaghị anata emume nsọ ndị a n’oge ndụ anụ ahụ ha. O wetere ụzọ ọzọ maka ha ịnata emume nsọ niile ma mee ọgbụgba ndụ Ya na ha. niime tempụl niile, emume nsọ niile ka enwere ike ime na nnọchite anya. Nke a pụtara na onye dị ndụ na-anata emume nsọ n’aha onye nwụrụ anwụ. Niime ụwa mmụọ, ndị nwụrụ anwụ nwere ike họrọ ịnabata ma ọ bụ ịjụ emume nsọ niile nke emeworo na-aha ha (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 138:19, 32-34, 58-59).

Ndị otù Nzukọ nsọ ka a na-agba ume ịmata ndị ikwu ha nwụrụ anwụ ndị na-anatabeghị emume nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu. Ndị otù emesịa na-eme emume nsọ niile na-aha ndị ikwu ha ahụ.

Ọ bụrụ ma ndị otù akwadobeghị aha ndị ezi na ụlọ maka ọrụ tempụl (lee 28.1.1), aha niile nke ndị nwụrụ anwụ ndị ekwesịrị imere emume nsọ ka a ga-enye na tempụl.

28.1

Ntuziaka niile Izugbe maka Ime Emume nsọ niile Nnọchite anya

Ndị nwụrụ anwụ ndị gbara afọ 8 ma ọ bụ karịa n’oge ọnwụ ha ka enwere ike imere emume nsọ nnọchite anya n’aha ha. Ewezuga dị ka ekwuru na 28.3, emume nsọ nnọchite anya ka enwere ike ime maka mmadụ niile nwụrụ anwụ ngwangwa mkpụrụ ụbọchi 30 gafeworo site n’ụbọchi ọnwụ ha ọ bụrụ ma ihe ndị a sotere daba:

  • Otu onye ikwu dị nso nke onye nwụrụ anwụ (di ma ọ bụ nwunye na-agbaghị alụkwaghị m, nwata gbara dimkpa, onye nne ma ọ bụ onye nna ma ọ bụ nwanne) na-enyefe aha ahụ maka emume nsọ niile nke tempụl.

  • Ikike ime emume nsọ ka a na-anata otu onye ikwu dị nso nke onye ahụ nwụrụ anwụ (di ma ọ bụ nwunye na-agbaghị alụkwaghị m, nwata gbara dimkpa, nne ma ọ bụ nna, ma ọ bụ nwanne).

Ọ bụrụ ma enweghị nke metụtara otu niime ọnọdụ ndị a dị n’elu, emume nsọ niile nke onye nnọchite anya ka enwere ike imere onye ahụ mgbe afọ 110 gasịrị mgbe a mụrụ onye nwụrụ anwụ.

28.1.1

Ịkwado Aha niile nke Ndị Nwụrụ anwụ maka Emume nsọ nke Tempụl

Ebe o kwere omume, ozi iji mata ndị otù ezi na ụlọ nwụrụ anwụ kwesịrị ka etinye ya niime FamilySearch.org tupu e mee emume nsọ niile nke tempụl (lee 25.4.2).

28.1.1.1

Inyefe Aha niile nke ndị otù Ezi na ụlọ

Mgbe a na-enyefe aha niile maka emume nsọ niile nke tempụl, ndị otù kwesịrị n’ụzọ ọbụla inyefe naanị aha nke ndị mmadụ bụ ndị ikwu ha.

28.1.2

Onye Nwere ike Isonye n’Emume nsọ niile maka Ndị Nwụrụ

Ndị otù niile nwere rekọmend tempụl ugbua nwere ike sonye na baptizim niile na Emume Nnabata niile nke ndị nwụrụ anwụ. Ndị otù nataworo onyinye dị nsọ jirikwa rekọmend tempụl ugbua nwere ike sonye na emume nsọ niile maka ndị nwụrụ anwụ. Lee 26.3

28.1.4

Ịhazi oge

O nwere ike dị mkpa na ndị otù ga-eme egbunye oge tupu ime emume nsọ niile maka ndị nwụrụ anwụ. Lee temples.ChurchofJesusChrist.org maka ozi eji akpọtụrụ ma ịhazi oge maka ihe tempụl ọbụla.

28.2

Ime Emume nsọ niile nke Temple maka Ndị Nwụrụ anwụ.

Mgbe a na-eme emume nsọ nnọchite anya, onye otù nwere ike mee dị ka onye nnọchite anya naanị maka onye nwụrụ anwụ bụkwa otu ụdị okike ọmụmụ dị ka onye otù ahụ.

28.2.1

Baptizim niile na Emume Nnabata niile maka Ndị Nwụrụ anwụ

Onye otù ọbụla nwere rekọmend tempụl ugbua ka enwere ike ịkpọ ije ozi n’ọrụ ebe baptizim. Ụfọdụ niime ọrụ ndị a nwere ike gụnye:

  • Ime dị ka onye nnọchi anya maka baprtizim niile na Emume Nnabata niile.

  • Ime dị ka onye aka ebe maka baptizim onye nnọchite anya.

  • Inyere ndị petrọn aka.

Ndị ji Ọkwa nchụaja Melkizedek na ndị nchụaja dị niime Ọkwa nchụaja Erọn ka enwere ike ikpọku ime baptizim niile maka ndị nwụrụ anwụ. Ndị ji Ọkwa nchụaja Melkizedek ka enwekwara ike ikpọku ịrụ ọrụ na Emume Nnabata maka ndị nwụrụ anwụ.

Naanị ndịikom nataworo onyinye dị nsọ ka enwere ike ikpọku:

  • Ije ozi dị ka omee rekọọdụ n’ebe a na-eme baptizim.

  • Ije ozi dị ka omee rekọọdụ Emume Nnabata.

28.2.2

Onyinye dị nsọ (tinyekwara Emume Nnabata)

Mgbe a na-eme emume onyinye dị nsọ nnọchite anya maka ndị nwụrụ anwụ, emume nnabata bụ akụkụ onyinye dị nsọ ka a na-eme ma mee rekọọdụ ya iche iche (lee 27.2). Onye otù nataworo onyinye dị nsọ ma jirikwa tempụl rekọmend ugbua nwere ike mee dị ka onye nnọchite anya iji nata emume nsọ ndị ahụ.

28.2.3

Ịrachi nye Di ma ọ bụ nwunye na Ịrachi Ụmụ nye Ndị Nne na nna

niime tempụl, ndị nwụrụ anwụ ka e nwere ike ịrachi nye di ma ọ bụ nwunye ndị ha lụrụ na ndụ. Ndị nwụrụ anwụ ka e nwekwara ike ịrachi ụmụ ha ndị dị ndụ ma ọ bụ ndị nwụrụ anwụ nye ha. Ọnye otu nataworo onyinye nsọ jikwa tempụl rekọmend ugbua nwere ike mee dị ka onye nnọchite anya maka emume nsọ nrachi.

28.3

Ọnọdụ Ndị Pụrụ iche

Nkeji nke a na-akọwa ọnọdụ niile nke ụfọdụ ntuziaka ndị dị na 28.1 nwere ike ọ gaghị adaba.

28.3.1

Ụmụ Ndị Nwụrụ anwụ tupu Ọmụmụ (Nwa nwụrụ n’afọ na Ime Pụrụ apụ)

Emume nsọ tempụl niile adịghị mkpa ma ọ bụ na agaghị eme ha maka ụmụ ndị nwụrụ tupu ọmụmụ. Maka ozi ndị ọzọ, lee 38.7.3.

28.3.2

Ụmụ Ndị Nwụrụ tupu Afọ Asatọ

Obere ụmụaka ka agbapụtara site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst ma “a zọpụta ha niime alaeze seletịal nke eluigwe” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 137:10). N’ihi nke a, ọdịghị baptizim ma ọ bụ onyinye dị nsọ e mere maka nwa nwụrụ tupu afọ 8. Kosiladị, nrachi niile nye ndị nne na nna ka e nwere ike imere ụmụ ndị a na-amụghị niime ọgbụgba ndụ ma ọ bụ anataghị emume nsọ ahụ na ndụ (lee 18.1).

Bipụta