Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
30. Ọkpụkpọ okù ndị dị niime Nzukọ nsọ


“30. Ọkpụkpọ okù ndị dị niime Nzukọ nsọ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“30. Ọkpụkpọ okù ndị dị niime Nzukọ nsọ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ndị mmadụ na-eweli aka nri ha

30.

Ọkpụkpọ okù ndị dị niime Nzukọ nsọ

30.0

Ndubata

Ọkpụkpọ okù niile na-enye ndị otù ohere inwe mmetụta ọńụ nke ijere Chineke ozi site n’ijere ụmụ Ya ozi (lee Mozaya 2:17). Ọkpụkpọ okù na-enyere ndị otù aka mụbawanye okwukwe ha ma bịarute Onyenwe anyị nso.

O kwesịghị ekwesị ịchọsike ọkpụkpọ okù nke ebu n’obi (lee Mak 10:42–45; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:34-37). Ma ọ bụkwanụ na ndị òtù Nzukọ nsọ “na-etolite” site n’otu ọkpụkpọ okù ruo n’ọzọ. Ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi dị mkpa karịa ihe ọkpụkpọ okù ahụ bụ. Onyenwe anyị na-akwanye ugwu nye nraranye nke ndị niile n’eje ozi niime Nzukọ nsọ Ya.

30.1

Ịchọpụta Onye A Ga-akpọ

30.1.1

Ntuziaka Izugbe

Ndị ahụ na-eje ozi niime Nzukọ nsọ ka Chineke kpọrọ (lee Ndị Hibru 5:4; Ndepụta nke Okwukwe 1:5). Ndị ndu na-achọ odudu nke mmụọ n’ịchọpụta onye a ga-akpọ (leekwa 4.2.6). Ha nakwa atụle:

  • Ntozu oke nke onye otù (dị ka achọpụtara n’ajụjụ ọnụ).

  • Onyinye niile na ike niile onye otù ahụ nwere, ma ọ bụ nwere ike imepụta, iji gọzie ndị ọzọ.

  • Ọnọdụ onwe niile nke onye otù, gụnyere ahụike na ọrụ ya.

  • Mmetụta nke ọkpụkpọ okù ahụ nwere ike inwe na alụmdi na nwunye na ezi na ụlọ onye ahụ.

Ndị otù na-enwete ngọzi n’ihi aja niile ha na-achụ iji jee ozi niime Nzukọ nsọ. Kosiladị, ọkpụkpọ okù ekwesịghị itinye ibu n’ekwesịghị ekwesị n’ahụ ndị mmadụ ma n’ezi na ụlọ ha niile. ọ bụghị ma ọkpụkpọ okù niile o kwesịrị ime ya araa ndị otù ahụ imejupụta oke na ọrụ ha n’ebe ụlọ ọrụ ha.

N’ụzọ niile, onye otù ọbụla ka na-akpọ ije ozi n’otu ọkpụkpọ okù n’otu oge, na mgbakwunye ịbụ nwanne nwoke ma ọ bụ nwanyị n’ije ozi nlekọta.

Mgbe a na-akpọku onye otù lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ndị ndu na-ahụ na di ma ọ bụ nwunye maara ma na-akwado ọkpụkpọ okù ahụ. Tupu inye otu onyeikom nta ma ọ bụ onyeinyom nta ọkpụkpọ okù, ndị ndu ga-anata nkwado site n’aka ndị nne na nna ma ọ bụ ndị nlekọta ya.

Tupu enye ọkpụkpọ okù, bishọp na-akpachara anya nyochaa ndekọihe ịbụ onye otù nke onye ahụ iji chọpụta na enweghị ihe nkọwa etinyere ma ọ bụ mgbochi ịbụ onye otù n’ụkpụrụ iwu.

30.1.2

Ọkpụkpọ okù niile maka Ndị otù Ọhụrụ

Ohere ndị nke iji jee ozi na-enyere ndị otù aka tolite niime mmụọ.

Ndị ndu ngalaba ukwu na-enye ndị otù ọhụrụ ohere iji jee ozi ngwangwa ha mere baptizim ma mee onye otù.

30.1.3

Ọkpụkpọ okù niile maka Ndị ahụ Na-abụghị ndị otù

Ndị na-abụghị ndị otù nke Nzukọ nsọ ka enwere ike ịkpọ n’ọkwa ndị ụfọdụ, dị ka onye na-akpọ ọgan, onye ntuziaka egwu, ma ọ bụ ọkpụkpọ okù iji nye aka mee atụmatụ ihe omume niile. Kosiladị, ekwesịghị ka akpọọ ha dị ka ndị nkuzi, dị ka ndị otù ndịisi kworum ma ọ bụ ndịisi otu, ma ọ bụ dị ka ndị ndu egwu Praịmarị.

30.1.4

Ke Nzuzo

Ọkpụkpọ okù na ntọghapụ niile dị nsọ. N’ihi nke a, ndị ndu na-edebe ozi banyere ọkpụkpọ okù na ntọghapụ a chọrọ ime na nzuzo.

30.1.5

Nkwanye na Nkwado niile maka Ọkpụkpọ okù niile

Chaatị nke Ọkpụkpọ okù niile na-egosi onye nwere ike inye nkwanye maka ọkpụkpọ okù ọbụla na onye ga-enye nkwado (lee 30.8).

Ndị bishọp na ndịisi stek na-akpachara anya tulee nkwanye ọbụla, mata na emewo ya site n’oke ekpere. Otu bishọp ma ọ bụ otu ndịisi stek nwere oke na ọrụ ikpeazụ ịnata mkpatemmụọ banyere onye a ga-akpọ.

30.2

Ime Ọkpụkpọ okù

Ịnata ọkpụkpọ okù iji jee ozi kwesịrị ị bụ nhụmiihe ime mmụọ bara uru nye onye otù.

Mgbe onye ndu mere ọkpụkpọ okù, ọ na-akọwa na ọ bịara site n’aka Onyenwe anyị.

Onye ndu nwekwara ike:

  • Kọwaa Ebumnoobi ya, uru, na oke na ọrụ niile nke ọkpụkpọ okù ahụ.

  • Gbaa onye otù ahụ ume ịchọ Mmụọ nke Onyenwe anyị niimejupụta ọkpụkpọ okù ahụ.

  • Gbaa ama na Onyenwe anyị ga-enyere onye otù aka ma ga-agọzi ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị maka ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.

  • Gwa onye otù ahụ onye ga-enye ọzụzụ na nkwado maka ọkpụkpọ okù ahụ.

  • Gwa onye otù ahụ maka nzukọ ọbụla o kwesịrị ịga na akụrụngwa ndị dị adị.

30.3

Ntuli aka Nkwado ndị otù niime Ọkpụkpọ okù niile

Ndị ahụ akpọrọ n’ọkwa Nzukọ nsọ ndị kachasị kwesịrị ka egosi ha maka ntuli aka nkwado tupu ha amalite ije ozi (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28:13; 42:11).

Onye ahụ na-eduzi ntuli aka nkwado na mbụ na-akpọpụta onye atọghapụrụ site n’ọkwa ahụ (ọ bụrụ na ọ dabara). Ọ na-akpọku ndị otù inye ngosipụta nke ekele maka ije ozi nke onye ahụ (lee 30.6).

Mgbe a na-egosipụta mmadụ maka ntuli aka nkwado, onye ndu ọkwa nchụaja enyere ikike na-akpọku ya iguzoro. Onye ndu nwere ike jiri okwu dị ka ndị a sotere:

“[Aha] ka akpọworo dị ka [ọkwa]. Ndị ahụ ọ masịrị ituli aka nkwado nye [ya bụ nwoke ma ọ bụ ya bụ nwnayị] nwere ike gosipụta ya site na-iweli aka elu. [Kwụsitụ obere.] Ndị ahụ megidere, ọ bụrụ na-enwere onye ọbụla, nwekwara ike gosi ya. [Kwụsitụ obere.]

Ọ bụrụ ma onye otù na-arụsị ọrụ ike na-emegide ọkpụkpọ okù ahụ, onye ndu nduzi ma ọ bụ onye ndu ọkwa nchụaja e nyere ọrụ na-ezukọta ya na ya na nzuzo mgbe emechara nzukọ.

30.4

Idopụ Iche ndị otù Ije ozi N’ọkpụkpọ okù niile

Maka ozi ọzọ, lee 18.11.

30.6

Ịtọghapụ ndị otù site na Ọkpụkpọ okù

Mgbe atọghapụrụ onyeisi ma ọ bụ bishọp, ndị ndụmọdụ ya ka atọghapụrụ ozugbo.

Ime ntọghapụ bụ ohere dị mkpa maka onye ndu igosipụta obi ekele na ịnakwere aka Chineke n’ije ozi nke onye otù ahụ. Onye ndu na-ezukọ ya na onye otù n’onwe ya iji gwa ya maka ntọghapụ tupu ekwupụta ya n’ọha. Naanị ndị ahụ kwesịrị ịma ka a na-agwa maka ntọghapụ tupu amaa ọkwa ya.

Onye ndu ọkwa nchụaja enyere ikike na-ama ọkwa ntọghapụ ahụ n’otu ụdị ntọ ebe esi tulie aka nkwado. Onye ndu nwere ike jiri okwu ndị dị ka ndị a sotere:

“[Aha] ka a tọghapụrụ dị ka [ọkwa]. Ndị ahụ ọ ga-amasị igosipụta ekele maka ije ozi [ya] nwere ike gosipụta ya site n’ituli aka elu”

Onye ndu anaghị ajụ ma enwere onye megidere ya.

30.8

Chaatị nke Ọkpụkpọ okù niile

30.8.1

Ọkpụkpọ okù niile nke Ngalaba ukwu

Ọkpụkpọ okù

Akwanyere site n’aka

Akwadoro site n’aka

Atụliri aka nkwado site na

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Ọkpụkpọ okù

Bishọp2

Akwanyere site n’aka

Otu Ndịisi Stek, na-eji LCR

Akwadoro site n’aka

Otu Ndịisi Mbụ na Kworum nnke ndị Iri na abụọ

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi stek mgbe anatasịrị nkwado site n’aka Otu Ndịisi Mbụ

Ọkpụkpọ okù

Ndị Ndụmọdụ niime Otu bishọp2

Akwanyere site n’aka

Bishọp

Akwadoro site n’aka

Otu ndịisi stek na kansụl dị elu

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi stek ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Klak ngalaba ukwu

Akwanyere site n’aka

Otu Bishọp

Akwadoro site n’aka

Otu ndịisi stek na kansụl dị elu

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi stek ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ ma ọ bụ onye kansụl dị elu

Ọkpụkpọ okù

Onyeisi ode akwụkwọ ngalaba ukwu

Akwanyere site n’aka

Otu Bishọp

Akwadoro site n’aka

Otu ndịisi stek na kansụl dị elu

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi stek ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ ma ọ bụ onye kansụl dị elu

Ọkpụkpọ okù

Onyeisi kworum ndị okenye

Akwanyere site n’aka

Otu ndịisi stek (site na mkpọku ha na bishọp)

Akwadoro site n’aka

Otu ndịisi stek na kansụl dị elu

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi stek

Ọkpụkpọ okù

Ndị ndụmọdụ niime otu ndịisi kworum ndị okenye

Akwanyere site n’aka

Onyeisi kworum (site na mkpọku ya na bishọp ahụ)

Akwadoro site n’aka

Otu ndịisi stek na kansụl dị elu

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi stek ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ ma ọ bụ onye kansụl dị elu

Ọkpụkpọ okù

Ọkpụkpọ okù niile nke kworum ndị okenye ndị ọzọ

Akwanyere site n’aka

Otu ndịisi kworum

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù kworum

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi kworum ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Ndịisi otu ngalaba ukwu

Akwanyere site n’aka

Otu Bishọp

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp

Ọkpụkpọ okù

Ndị ndụmọdụ niime otu ndịisi otu ngalaba ukwu

Akwanyere site n’aka

Onyeisi otu

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Ọkpụkpọ okù niile nke Otù Enyemaka Ngalaba ukwu ndị ọzọ

Akwanyere site n’aka

Otu Ndịisi Otu Enyemaka

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù nke Otù Enyemaka

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Ọkpụkpọ okù ndị ọzọ nke Ndịinyom Nta, Praịmarị, na Ụlọakwụkwọ Sọnde

Akwanyere site n’aka

Otu ndịisi nke otu

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Onye ndu mgbasa ozi ọma ngalaba ukwu (onye otù nke otu ndịisi kworum ndị okenye nwere ike mejuo ọrụ nke a; ọ bụrụ otu ahụ, ọ dịghị mkpa na-akpọrọ ya okù, tulie aka kwadoo, ma ọ bụ dopụ iche naanị ya)

Akwanyere site n’aka

Otu bishọp (na mkpọtụrụ ha na ndịisi kworum ndị okenye na Otu Enyemaka)

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Ndị mgbasa ozi ọma ngalaba ukwu

Akwanyere site n’aka

Otu bishọp ma ọ bụ ndịisi kworum ndị okenye na Otu Enyemaka

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Onye ndu tempụl na agụgụala ezi na ụlọ ngalaba ukwu (onye otù nke otu ndịisi kworum ndị okenye nwere ike mejuo ọrụ nke a; ọ bụrụ otu ahụ, ọ dịghị mkpa na-akpọrọ ya okù, tulie akakwadoo, ma ọ bụ dopụ iche naanị ya)

Akwanyere site n’aka

Otu bishọp (na mkpọtụrụ ha na ndịisi kworum ndị okenye na Otu Enyemaka)

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Ndị enyemaka nye onyeisi kworum ndị nchụaja

Akwanyere site n’aka

Bishọp (dị ka onyeisi kworum ndị nchụaja)

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù kworum

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp

Ọkpụkpọ okù

Ndịisi kworum ndị nkuzi na ndị dikọn

Akwanyere site n’aka

Otu Bishọp

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù kworum

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

A kpọrọ site n’aka bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ; dopụ iche site n’aka bishọp

Ọkpụkpọ okù

Ndị ndụmọdụ niime otu ndịisi kworum ndị nkuzi na ndị dikọn na ode akwụkwọ kworum

Akwanyere site n’aka

Onyeisi kworum

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù kworum

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Onyeisi klaasị nke Ndịiyom Nta

Akwanyere site n’aka

Otu ndị bishọp (site na mkpọtụrụ nke ha na otu ndịisi Ndịinyom Nta)

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù klas

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Ndị ndụmọdụ niime otu ndịisi klaasị Ndịinyom Nta na ode akwụkwọ klaasị

Akwanyere site n’aka

Onyeisi klaasị

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù klaasị

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Ọkpụkpọ okù ndị ọzọ na ngalaba ukwu

Akwanyere site n’aka

Otu Bishọp

Akwadoro site n’aka

Otu Bishọp

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba ukwu

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Bishọp ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ

  1. Ndị nrachi dị nkọ na tempụl ekwesịghị ka enye ha ọkpụkpọ okù ije ozi niime otu ndị bishọp. Ndị nrachi ka akpọrọ n’okpuru ntuziaka nke Onyeisi Nzukọ nsọ.

30.8.2

Ọkpụkpọ okù niile nke Ngalaba nta

Ọkpụkpọ okù

Akwanyere site n’aka

Akwadoro site n’aka

Atụliri aka nkwado site na

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Ọkpụkpọ okù

Onyeisi Ngalaba nta1

Akwanyere site n’aka

Otu ndịisi stek, mishọn, ma ọ bụ distrikt

Akwadoro site n’aka

Otu ndịisi stek na kansụl dị elu ma ọ bụ otu ndịisi mishọn

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba nta

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi stek ma ọ bụ mishọn (ma ọ bụ onyeisi distrikt ọ bụrụ ma ekenyere ọrụ)

Ọkpụkpọ okù

Ndị ndụmọdụ niime otu ndịisi ngalaba nta1

Akwanyere site n’aka

Onyeisi Ngalaba nta

Akwadoro site n’aka

Otu ndịisi stek na kansụl dị elu ma ọ bụ otu ndịisi mishọn (ma ọ bụ, mgbe enyere ikike site n’aka onyeisi mishọn, otu ndịisi distrikt)

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba nta

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi stek, mishọn, ma ọ bụ distrikt ma ọ bụ onye ndụmọdụ enyere ọrụ

Ọkpụkpọ okù

Klak ngalaba nta, ndị enyemaka klak, na onyeisi ode akwụkwọ

Akwanyere site n’aka

Otu ndịisi ngalaba nta

Akwadoro site n’aka

Otu ndịisi stek na kansụl dị elu ma ọ bụ otu ndịisi mishọn (ma ọ bụ, mgbe enyere ikike site n’aka onyeisi mishọn, otu ndịisi distrikt)

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba nta

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi stek ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ ma ọ bụ onye kansụl dị elu (maka ngalaba nta ndị dị niime stek niile); onyeisi distrikt ma ọ bụ onye ndu ọkwa nchụaja o nyere ọrụ (maka ngalaba nta ndị dị niime mishọn)

Ọkpụkpọ okù

Onyeisi kworum ndị okenye

Akwanyere site n’aka

Otu ndịisi stek, distrikt, ma ọ bụ mishọn (na mkpọtụrụ ha na onyeisi ngalaba nta)

Akwadoro site n’aka

Otu ndịisi stek na kansụl dị elu ma ọ bụ otu ndịisi mishọn (ma ọ bụ, mgbe enyere ikike site n’aka onyeisi mishọn, otu ndịisi distrikt)

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba nta

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi stek ma ọ bụ mishọn (ma ọ bụ onyeisi distrikt ọ bụrụ ma ekenyere ọrụ)

Ọkpụkpọ okù

Ndị ndụmọdụ niime otu ndịisi kworum ndị okenye

Akwanyere site n’aka

Onyeisi kworum (site na mkpọtụrụ ya na onyeisi ngalaba nta)

Akwadoro site n’aka

Otu ndịisi stek na kansụl dị elu ma ọ bụ otu ndịisi mishọn (ma ọ bụ, mgbe enyere ikike site n’aka onyeisi mishọn, otu ndịisi distrikt)

Atụliri aka nkwado site na

Ndị otù ngalaba nta

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Onyeisi stek ma ọ bụ mishọn ma ọ bụ onye ndụmọdụ ekenyere ọrụ ma ọ bụ onye kansụl dị elu (ma ọ bụ onyeisi distrikt ma ọ bụ onye ndu ọkwa nchụaja ọzọ ọ bụrụ ma enye ọrụ)

Ọkpụkpọ okù

Ọkpụkpọ okù ndị ọzọ nke ngalaba nta

Akwanyere site n’aka

Lee 30.8.1, idochi onyeisi ngalaba nta maka bishọp na ngalaba nta maka ngalaba ukwu.

Akwadoro site n’aka

Lee 30.8.1, idochi onyeisi ngalaba nta maka bishọp na ngalaba nta maka ngalaba ukwu.

Atụliri aka nkwado site na

Lee 30.8.1, idochi onyeisi ngalaba nta maka bishọp na ngalaba nta maka ngalaba ukwu.

Akpọrọ ma dopụ iche site n’aka

Lee 30.8.1, idochi onyeisi ngalaba nta maka bishọp na ngalaba nta maka ngalaba ukwu.

  1. Ndị nrachi dị nkọ niime tempụl ekwesịghị ka enye ha ọkpụkpọ okù ije ozi niime otu ndịisi ngalaba nta. Ndị nrachi ka akpọrọ n’okpuru ntuziaka nke Onyeisi Nzukọ nsọ.

Bipụta