Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
38. Atụmatụ niile na Ntuziaka niile nke Nzukọ nsọ


“38. Atụmatụ niile na Ntuziaka niile nke Nzukọ nsọ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“38. Atụmatụ niile na Ntuziaka niile nke Nzukọ nsọ,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

38.

Atụmatụ niile na Ntuziaka niile nke Nzukọ nsọ

38.1

Nsonye nke Nzukọ nsọ

Nna anyị nke Eluigwe hụrụ ụmụ Ya naanya. “Ndị niile yiri otu n’ihu Chineke,” ma Ọ na-akpọku ndị niile “ịbịakwute ya ma rie site na ịdị mma ya” (2 Nefi 26:33).

38.1.1

Ọbịbịa na Nzukọ niile nke Nzukọ nsọ

Ndị niile ka a nabatara ịbịa nzukọ oriri nsọ, nzukọ Sọnde ndị ọzọ, na emume ọha niile nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazu a. Onyeisi ọrụ nduzi ka ọ dị n’aka ị hụ na ndị niile bịara nyere nkwanye ugwu kwesịrị ntọ ahụ dị nsọ.

Ndị ahụ bịara kwesịrị izere nkwụsitụ ma ọ bụ mmegheri anya niile megidere ife ofufe ma ọ bụ Ebumnoobi ndị ọzọ nke nzukọ ahụ. Ọchịchọ nke ọgbọ na mkparam agwa niile nke nzukọ na emume Nzukọ nsọ dị iche iche ka ekwesịrị ịkwanyere ugwu. Nke ahụ gụnyere ị na-ezere omume ịchọ ịhụnaanya ekerechi ọzọ na site na-iyi uwe ma ọ bụ ekike nke na-akpata mmegheri anya. O gbochikwara ikwu okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ikwu okwu ụdị mmasị mmekọahụ ma ọ bụ njirimara ndị ọzọ nke onwe n’ụzọ nke na-emegheri anya site na nzukọ ndị lekwasịrị anya na Onye Nzọpụta.

Ọ bụrụ na-enwere agwa na-ezighị ezi, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek n’ejiri mmụọ nke ịhụnaanya nye ndụmọdụ nzuzo. Ọ na-agba ndị ahụ agwa ha n’ezighị ezi maka ọgbakọ ahụ ume ka ha lekwasị anya n’inyeaka kwagide oghere dị nsọ maka onye niile nọ ebe ahụ site na nkwusi ike pụrụ iche n’ife Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta ofufe.

Ụlọ ụka Nzukọ nsọ niile na-anọgide dị ka arịa na-abụghị maka ọha na eze dị n’okpuru atụmatụ niile Nzukọ nsọ. Ndị ahụ na-adịghị njikere isoro ntuziaka ndị a ka a ga-arịọ n’ụzọ nsọpụrụ ịghara ịbịa nzukọ niile na emume niile nke Nzukọ nsọ.

38.2

Atụmatụ niile maka Emume nsọ niile na Ngọzi niile

Ozi izugbe banyere emume nsọ niile na ngọzi niile ka enyere niime isi nke 18. Ozi banyere emume nsọ tempụl ka enyere niime isi nke 27 na 28. Ndị bishọp nwere ike kpọtụrụ onyeisi stek ọ bụrụ ma ha nwere ajụjụ. Ndịisi stek nwere ike kpọtụrụ Otu Ndịisi Mpaghara ọ bụrụ ma ha nwere ajụjụ.

38.3

Alụmdi na Nwunye nke Iwu

Ndị ndu Nzukọ nsọ na-agba ndị otù ume itozu oke maka alụmdi na nwunye tempụl ma lụọ di na nwunye ma rachie niime tempụl. Ọ bụrụ ma iwu obodo kwere, ndị ndu Nzukọ nsọ, kosiladị, na-eme alụmdi na nwunye nke iwu.

Alụmdi na Nwunye nke iwu kwesịrị ka emee ya n’usoro iwu nke ebe ahụ a na-eme alụmdi na nwunye ahụ.

38.3.1

Onye Nwere Ike Ime Alụmdi na Nwunye nke Iwu

Mgbe iwu obodo kwere, ndị ọrụ Nzukọ nsọ ndịa sotere ndị na-eje ozi ugbua nwere ikike nke ime ihe n’ọkpụkpọ okù ha iji mee mmemme alụmdi na nwunye nke iwu:

  • Onyeisi mishọn

  • Onyeisi stek

  • Onyeisi distrikt

  • Bishọp

  • Onyeisi Ngalaba nta

Ndịisi ọrụ ndị a nwere ike ime naanị alụmdi na nwunye nke iwu n’etiti otu nwoke na otu nwanyị. Ọnọdụ niile ndịa sotere aghaghịkwa imetụta:

  • Nwanyị na-alụ di ma ọ bụ nwoke na-alụ nwunye bụ onye otù Nzukọ nsọ ma ọ bụ na o họrọwo agụgụ ụbọchi a ga-eme ya baptizim.

  • Ma ọ bụ ma ndekọihe nwanyị na-alụ di ma ọ bụ nwoke na-alụ nwanyị nọ, ma ọ bụ ga-anọ mgbe emesịrị baptizim, na ngalaba Nzukọ nsọ nke onyeisi ọrụ ahụ na-eduzi.

  • Onyeisi ọrụ Nzukọ ka enyere ikike n’iwu idu na alụmdi na nwunye nke iwu na gburugburu ebe a ga-eme alụmdi na nwunye ahụ.

38.3.4

Alụm di na nwunye Nke Iwu Emere niime Ụlọ Nzukọ nsọ niile

Mmemme agbam akwụkwọ ka enwere ike ime n’ụlọ Nzukọ nsọ ọ bụrụ ma ọ naghị ekewa nhazi nke emume Nzukọ nsọ niile ana emekarị. Agbam akwụkwọ abụghị ihe a ga-eme n’Ụbọchị izu ike ma ọ bụ na mgbede Mọnde niile. Agbam akwụkwọ ndị emere n’ụlọ Nzukọ nsọ kwesịrị ịdị mfe ma nye nkwanye ugwu. Egwu kwesịrị ịdị nsọ, nwee nkwanye ugwu, ma jupụta n’ọńụ.

Alụm di na nwunye ka enwere ike ime niime ụlọ ụka, họọlụ omenaala, ma ọ bụ ọńụ ụlọ ọzọ dị mma. Alụm di na nwunye kwesịrị isoro ntuziaka niile maka iji ụlọ ụka eme ihe n’ụzọ ziri ezi.

38.3.6

Mmemme Alụm di na Nwunye Nke Iwu

Imee alụmdi na nwunye nke iwu, onyeisi ọrụ Nzukọ nsọ na-agwa di na nwunye ahụ na-asị, “Biko jidenụ onye na ibe ya n’aka nri.” Mgbe ahụ kwuo si, “[Aha niile nke nwoke na-alụ nwunye], unu ejidewo onye na ibe ya n’aka nri na akara nkwa niile nke unu ga-abanye niime ya ugbua n’ihu Chineke na ndị aka ebe ndị a.” (Di na nwunye nwere ike họrọ ma ọ bụ rọpụta ndị akaebe ndị a n’oge)

Onyeisi ọrụ mgbe ahụ na-agwa nwoke na-alụ nwanyị ma jụọ, “[Aha niile nke nwoke na-alụ nwanyị] dị ka nwunye gị ị lụrụ site n’iwu, ma ị na esite na uche na nhọrọ nke onwe gị na-ekwe nkwa dị nsọ dị ka onye nsiso ya na di ọ lụrụ site n’iwu na gị na-arapara na ya n’enweghị onye ọzọ; na gị ga-edebe iwu niile, oke n’ọrụ niile, na atụmanya niile gbasara ọnọdụ dị nsọ nke ọlụlụ; ma na ị ga-ahụ ya naanya, kwanyere ya ugwu, ma chekwaa ma lekọta ya ruo ogologo ndụ niile unu abụọ ga-ebi?”

Nwoke ahụ na-alụ nwanyị aza, “Ee” ma ọ bụ “Aga m.”

Onyeisi ọrụ mgbe ahụ na-agwa nwanyị na-alụ nwoke ma jụọ, “[Aha niile nke nwanyị na-alụ nwoke] dị ka di gị ị lụrụ site n’iwu, ma ị na esite na uche na nhọrọ nke onwe gị na-ekwe nkwa dị nsọ dị ka onye nsiso ya na nwunye ọ lụrụ site n’iwu na ị na-arapara na ya n’enweghị onye ọzọ; na ị ga-edebe iwu niile, oke n’ọrụ niile, na atụmanya niile gbasara ọnọdụ dị nsọ nke ọlụlụ; ma na ị ga-ahụ ya naanya, kwanyere ya ugwu, ma chekwaa ma lekọta ya ruo ogologo ndụ niile unu abụọ ga-ebi?”

Nwanyị ahụ na-alụ nwoke a zaa, “Ee” ma ọ bụ “Aga m.”

Onyeisi ọrụ Nzukọ nsọ mgbe ahụ agwa di na nwunye ahụ okwu ma sị, “Site n’ikike iwu enyere m dị ka okenye nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazu a, ana m akpọpụta unu, [aha nwoke na-alụ nwanyị] na [aha nwanyị na-alụ di], di na nwunye, lụrụ n’ụzọ iwu nke iwu kwadoro maka oge nke ndụ anụ ahụ unu.”

(Mkpụrụokwu agbanwere maka ụkọchukwu na-adịghị eje ozi dị ka onyeisi nduzi Nzukọ nsọ: “Site n’omume ikike iwu enyere m dị ka ụkọchukwu niime [ngalaba nke otù ndị agha ma ọ bụ otù ndị nkiti] ana m akpọpụta unu, [aha nwoke na-alụ nwanyị] na [aha nwanyị na-alụ nwoke], di na nwunye, lụrụ n’ụzọ iwu nke iwu kwadoro maka oge nke ndụ anụ ahụ unu.”)

“Ka Chineke gọzie njikọta unu inwete ọńụ na ụmụ ụmụ unu ya na ogologo ndụ nke ịńụrịkọta ọńụ ọnụ, ma ka Ọ gọzie unu idebe nkwa niile ahụ dị nsọ nke unu kweworo. Ngọzi ndị a niile ka m na-akpọku n’isi unu n’aha nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.”

Ọkpụkpọ okù isusukọta ọnụ dị ka di na nwunye dị na nhọrọ, dị ka otu omenaala dị.

38.4

Atụmatụ niile nke Nrachi

Emume nsọ nrachi niile nke tempụl na-ejikọta ezi na ụlọ niile ọnụ ebighị ebi dị ka ndị otù na-agba mbọ ịkwanyere ọgbụgba ndụ ndị ha mere ugwu mgbe ha natara emume nsọ ahụ. Emume nsọ niile nke nrachi gụnyere:

  • Nrachi nke di na nwunye.

  • Nrachi ụmụ nye ndị nne na nna.

Ndị ahụ debere ọgbụgba ndụ ha ga-ejigide ngọzi niile nke onwe ewetere site na nrachi. Nke a bụ eziokwu ọbụna ọ bụrụ ma di ma ọ bụ nwunye onye ahụ emebiwo ọgbụgba ndụ niile ma ọ bụ pụọ site na alụmdi na nwunye ahụ.

Ụmụ kwesịrị ntụkwasị obi ndị arachiri nye ndị nne na nna ma ọ bụ amụọ niime ọgbụgba ndụ na-ejigide ngọzi nke ịnwe nne na nna ebighị ebi. Nke a bụ eziokwu ọbụna ọ bụrụ ma ndị nne na nna ha kagburu nrachi alụmdi na nwunye ha, mee ka ewepụ ha ịbụ onye otù Nzukọ nsọ, ma ọ bụ gbaa ịbụ onye otù ha arụkwaghịm.

Ndị otù kwesịrị ịnara ndụmọdụ ha na bishọp ha ọ bụrụ ma ha nwee ajụjụ banyere atụmatụ niile nke nrachi. Bishọp na-akpọtụrụ onyeisi stek ọ bụrụ ma o nwere ajụjụ. Ndịisi stek nwere ike kpọtụrụ otu ndịisi tempụl na distrikt tempụl ha, Otu Ndịisi Mpaghara, ma ọ bụ Ụlọọrụ nke Otu Ndịisi Mbụ ọ bụrụ ma ha nwere ajụjụ niile.

38.5

Uwe na Gament niile nke Tempụl

38.5.1

Uwe Tempụl

N’oge emume nsọ onyinye dị nsọ na nrachi niile dị niime tempụl, ndị otù Nzukọ nsọ na-eyi uwe ọcha. Ụmụnwanyị na-eyi uwe ọcha ndị a sotere: uwe mwụda aka ogologo ma ọ bụ nke gafetụrụ ikiri aka (ma ọ bụ skeetị na uwe elu aka ogologo ma ọ bụ nke gafetụrụ ikiri aka), sọks ma ọ bụ hosiery, na akpụkpọ ụkwụ ma ọ bụ slipas.

Ụmụnwoke na-eyi uwe ọcha ndị a sotere: sheetị aka ọgologo, eriri olu, uwe ogologo ọkpa, sọks, na akpụkpọ ụkwụ ma ọ bụ slipas.

N’oge emume nsọ onyinye dị nsọ na nrachi niile, ndị otù na-eyikwasị uwe mmemme ndị agbakwunyere n’elu uwe ọcha ha.

38.5.2

Inwete Uwe na Gament niile nke Tempụl

Ndị ndu ngalaba ukwu na stek na-agba ndị otù ume inwete uwe tempụl nke onwe ha. Uwe na gament tempụl ka enwere ike ịzụ site na ụlọahịa Nkesa Nzukọ nsọ ma ọ bụ na store.ChurchofJesusChrist.org. Ndị klak stek na ngalaba ukwu nwere ike nyere ndị otù aka zụọ uwe ha.

38.5.5

Iyi na Nlekọta nke Gament ahụ

Ndị otù na-anata onyinye dị nsọ na-eme ọgbụgba ndụ iyi gament tempụl oge ndụ ha niile.

Ọ bụ ohere dị nsọ iyi gament tempụl. Ime otu a bụ ngosipụta nke mkpebi ime mmụọ isoro Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst.

Gament bụ ihe ncheta nke ọgbụgba ndụ emere niime tempụl. Mgbe eyiri ya nke ọma oge ndụ niile, ọ ga-arụ ọrụ dị ka ihe nchekwa.

Gament ahụ ka ekwesịrị iyi n’okpuru uwe anyị yi. Ọ bụ ihe mmasị nke onwe ma uwe ime ime ahụ ọ ga-abụ n’elu ma ọ bụ n’okpuru gament tempụl.

Gament ekwesịghị ka eyipụ ya maka ihe omume ndị a na-eme mgbe ekwesịrị iyi gament. Ekwesịghị ikwagharị ya maka iji nabata ụdị uwe dị iche iche.

Gament ahụ dị nsọ ma ekwesịrị ịsọpụrụ ya. Ndị otù nataworo onyinye dị nsọ kwesịrị ịchọ nduzi nke Mmụọ Nsọ iza ajụjụ niile nke onwe banyere iyi gament ahụ.

38.5.7

Ikpofu Gament niile na Uwe Mmemme Tempụl

Ikpofu gament tempụl ndị mebiworo, ndị otù kwesịrị ichapụ ma mebie akara niile. Ndị otù emesịa ga-achakasị akwa nke fọrọ ka a ghara ịmata ya dị ka gament. Akwa nke fọrọ ka enwere ike ịtụfu.

Ndị otù nwere ike nye ndị otù ọzọ nataworo onyinye dị nsọ gament na uwe tempụl ọnọdụ ha ka dị mma

38.5.8

Uwe Tempụl Olili

Ọ bụrụ ma o kwe omume, ndị otù nwụrụ anwụ ndị nataworo onyinye dị nsọ kwesịrị ka e lie ma ọ bụ gbaa ha ọkụ n’uwe tempụl. Ọ bụrụ na omenaala obodo ma ọ bụ omume olili niile na-eme ka nke a bụrụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ sie ike, enwere ike pịaa uwe ahụ ma tụkwasị ya na-akụkụ anụ ahụ ahụ.

Anụ ahụ nwoke ka a na-eyiwe gament tempụl na uwe ọcha ndị a sotere: sheetị aka ọgologo, eriri olu, uwe ogologo ọkpa, sọks, na akpụkpọ ụkwụ ma ọ bụ slipas. Anụ ahụ nwanyị ka a na-eyiwe gament tempụl na uwe ọcha ndị a sotere: uwe mwụda aka ogologo ma ọ bụ nke gafetụrụ ikiriaka (ma ọ bụ skeetị na uwe elu aka ogologo ma ọ bụ nke gafetụrụ ikiriaka), sọks ma ọ bụ hosiery, na akpụkpọ ụkwụ ma ọ bụ slipas.

Uwe mmemme tempụl ka a na-edebe n’elu anụ ahụ dị ka atụziri aka n’onyinye dị nsọ. Uwe mwụda ka a na-edebe na ubu aka nri ma e kee ya jiri eriri dị n’ukwu aka ekpe. Ihe okike ka a na-eke gburugburu ukwu. Eriri ukwu ahụ ka a na-eke gburugburu n’ukwu ma a maa ya akpụ n’ukwu aka ekpe. Okpu nke nwoke ka a na-edebekarị na-akụkụ anụ ahụ ya tutu o ruo oge e ji emechi igwe ozu ma ọ bụ akpati. Mgbe ahụ atụkwasị okpu ebe akpụ ya dị n’elu ntị aka ekpe. Akwa mkpuchi ihu nwanyị ka enwere ike ikechi na pilo dị na-azụ isi ya. Iji akwa mkpuchi ihu iji ekpuchi ihu nke nwanyị tupu e mee olili ma ọ bụ ịgba ọkụ bụ nke nhọrọ, dị ka ezi na ụlọ si kpebie.

38.6

Atụmatụ niile n’Okwu banyere Omume ọma

38.6.1

Ite ime

Onyenwe anyị nyere iwu, “Ị gaghị … egbu mmadụ, ọ bụghị ma mee ihe ọbụla dị ka ya” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:6). Nzukọ nsọ megidere ịhọrọ ite ime maka ndirimfe nke onwe ma ọ bụ nke ọha. Ndị otù enweghị ike ma ọlị ịrara onwe ha nye maka, mee, hazie maka, kwụọ ụgwọ maka, kwere maka, ma ọ bụ kwagide ite ime. Naanị mgbe enwere ike ịgụpụ bụ mgbe:

  • Afọ ime bịara site n’ikwa iko n’ike ma ọ bụ ndina ụgwa.

  • Dọkinta maara ihe kpebiri na ndụ ma ọ bụ ahụike nke nne nọ n’ezigbo nsogbu.

  • Dọkinta maara ihe kpebiri na nwa ebu n’afọ nwere nsogbu siri ike nke na-agaghị ekwe nwa ahụ dị ndụ fee oge ọmụmụ.

Ọbụna ihe ngụpụ ndị a anaghị anapụta ite ime ozugbo. Ite ime bụ ihe kachasị jọgbuo onwe ya. Ekwesịrị iche echiche maka ya naanị mgbe ndị ahụ ọdịnaka natara aziza sitere n’ekpere. Ndị otù nwere ike dụọ ndụmọdụ ha na bishọp ha dị ka akụkụ nke usoro nke a.

38.6.2

Mmetọ

Mmetọ bụ mmegbu ma ọ bụ nleghara anya maka ndị ọzọ n’ụzọ nke na-akpata mmerụ ahụ nke anụ ahụ, nke mmekọahụ, nke mmetụta uche, ma ọ bụ nke ego. Ọnọdụ Nzukọ nsọ bụ na enweghị ike anabata ụdị mmetọ ọbụla. Ndị ahụ na-emetọ di ma ọ bụ nwunye ha, ụmụ ha, ndị otù ezi na ụlọ ha, ma ọ bụ onye ọbụla ọzọ na-emebi iwu niile nke Chineke na mmadụ.

Ndị otù niile, kacha nke ndị nne na nna na ndị ndu, ka a na-agba ume ịdịrị nkọ ma na-arụsi ọrụ ike ma mee ihe niile ha nwere ike iji chekwaa ụmụntakịrị na ndị ọzọ megide mmetọ. Ọ bụrụ ma ndị otù mara maka oge nke mmetọ, ha akọọrọ ya n’aka ndị ji ikike obodo ma ha na bishọp a dụọ ndụmọdụ. Ndị ndu Nzukọ nsọ kwesịrị iji mkpesa nke mmetọ kpọrọ ihe ma ghara ileghara ha anya ma ọlị.

Okenye niile na-arụ ọrụ ha na ụmụntakịrị ma ọ bụ ndị ntoroọbịa kwesịrị imezu ọzụzụ nchekwa ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa niime otu ọnwa nke akwadoro ha (lee ProtectingChildren.ChurchofJesusChrist.org). Ha kwesịrị imegharị ọzụzụ ahụ afọ atọ ọbụla.

Mgbe mmetọ mere, ọrụ mbụ a na-arụ ozugbo nke ndị ndu Nzukọ nsọ bụ inyere ndị ahụ emetọworo aka ma chekwaa ndị na-adịghị ike site na mmetọ nwere ike ime n’ọdịniihu. Ndị ndu ekwesịghị igba mmadụ ume ịnọgide n’ezi na ụlọ ma ọ bụ ọnọdụ nke mmetọ dị na ya ma ọ bụ nke n’enweghị nchekwa.

38.6.2.1

Akara ekwentị Enyemaka n’ihi Mmetọ

N’ụfọdụ obodo, Nzukọ nsọ nwere ekwe ntị enyemaka nzuzo ehiwere maka mmetọ iji nyere ndịisi stek na ndị bishọp aka. Ndị ndu ndị a kwesịrị ngwa ngwa ịkpọtụrụ ekwe ntị enyemaka ahụ banyere ọnọdụ ọbụla nke enwere ike emetọwo mmadụ—ma ọ bụ onye ahụ nọ ọnọdụ enwere iji metọọ ya. Ha kwesịkwara ịkpọ ya ma ọ bụrụ ma ha mata maka onye otù na-ele, na-azụ, ma ọ bụ na-ekesa nziakwụna nwata.

N’obodo ndị n’enweghị akara ekwe ntị enyemaka, bishọp matara maka mmetọ kwesịrị ịkpọtụrụ onyeisi stek ya. Onyeisi stek kwesịrị ịchọ nduzi site n’aka ọka ikpe mpaghara n’ụlọ ọrụ mpaghara.

38.6.2.2

Inye Ndụmọdụ n’Okwu niile nke Mmetọ

Ndị emetọrọ ọtụtụ oge na-ata ahụhụ nkụja siri ike. Ndịisi stek na ndị bishọp na-azaghachi n’ọmịiko na obi ebere metụtara n’obi . Ha na-ewete ndụmọdụ na nkwado ime mmụọ iji nyere ndị ihe metụrụ aka merie mpụtara nke mmetọ na-emebi ihe.

Mgbe ụfọdụ ndị ihe metụrụ na-enwe mmetụta ihere ma ọ bụ ọmụma ikpe. Ikpe mmehie amaghị ndị ihe metụrụ. Ndị ndu na-enyere ha na ndị ezi na ụlọ ha aka ghọta ịhụnaanya nke Chineke na ọgwụgwọ nke na-abịa site na Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya (lee Alma 15:8; 3 Nefi 17:9).

Ndịisi stek na ndị bishọp kwesịrị inyere ndị ahụ metọrọ mmadụ aka chegharịa ma kwụsi agwa mmetọ ha. Ọ bụrụ ma onye dimkpa mere mmehie mmekọahụ megide nwata, omume ahụ nwere ike sie ezigbo ike ịgbanwe. Usoro nke nchegharị nwere ike too ogologo nke ukwuu. Lee 38.6.2.3.

Na mgbakwunye nye ịnata enyemaka mmụọ kpalitere nke ndị ndu Nzukọ nsọ, ndị ihe metụrụ, ndị mejọrọ, na ndị ezi na ụlọ ha nwere ike nwee mkpa ndụmọdụ ọkachamara. Maka ozi, lee 31.3.6.

38.6.2.3

Mmetọ Nwata ma ọ bụ Ntoroọbịa

Mmetọ nwata ma ọ bụ ntoroọbịa bụ mmehie kachasị dị njọ (lee Luk 17:2). Dị ka e dere ebe a, mmegbu nwata ma ọ bụ ntoroọbịa gụnyere ndị a sotere:

  • Mmetọ anụ ahụ: Imerụ mmadụ ezigbo ahụ site na ime ihe ike nke anụ ahụ. Ụfọdụ mmerụ ahụ nwere ike agaghị ahụ ha anya.

  • Mmetọ mmekọahụ ma ọ bụ nrigbu: Ime omume mmekọahụ ọbụla gị na nwata ma ọ bụ ntoroọbịa ma ọ bụ imara ama kwe ma ọ bụ nyere ndị ọzọ aka ime ụdị ihe ahụ. Dị ka e dere ebe a, mmetọ mmekọahụ agụnyeghị ikwenyere omume mmekọahụ n’etiti ụmụaka abụọ ndị bụ ebiri.

  • Mmetọ mmetụta uche: Iji omume niile na okwu niile jiri mebie nke ukwuu uche nsọpụrụ nke onwe ma ọ bụ uru nke onwe nke nwata ma ọ bụ ntoroọbịa. Nke a na-agụnyekarị mkparị ugboro ugboro na-aganiihu, aghụghọ niile, na nkatọ ndị na-eweda onwe ala ma mee weda ugwu mmadụ. O nwekwara ike ịgụnye nleghara anya dị njọ.

  • Nziakwụna nwata: Lee 38.6.6.

Ọ bụrụ ma bishọp ma ọ bụ onyeisi stek mata maka ma ọ bụ nyoo enyo maka mmetọ nwata ma ọ bụ ntoroọbịa, ọ na-esoro ntuziaka niile ozugbo dị niime 38.6.2.1. Ọ nakwa eme ihe iji nye aka chekwaa megide mmetọ ọdịniihu.

Kansụl ịbụ onye otù Nzukọ nsọ na nkọwa ndekọihe dị mkpa ma ọ bụrụ ma onye otù dimkpa metọọ nwata ma ọ bụ ntoroọbịa dị ka akọwara na nkeji nke a. Leekwa 38.6.2.5.

Ọ bụrụ ma nwatakịrị metọọ obere nwata, onyeisi stek na-akpọtụrụ Ụlọọrụ nke Otu Ndịisi Mbụ maka ntuziaka.

38.6.2.4

Mmetọ nke Di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ Okenye Ọzọ

Ọtụtụ mgbe enweghị otu ụzọ eji akọwa ihe mmetọ pụtara nke enwere ike ịtụnyere ọnọdụ ọbụla. Kama, enwere ịdị njọ dị iche iche dị na omume mmegbu. Ịdị njọ nke a sitere na iji okwu ndị dị nkọ mgbe ụfọdụ iji merụọ mmadụ ezigbo ahụ.

Ọ bụrụ ma bishọp ma ọ bụ onyeisi stek mata maka mmetọ nke di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ okenye ọzọ, ọ na-esoro ntuziaka niile ozugbo dị niime 38.6.2.1. Ọ nakwa eme ihe iji nye aka chekwaa megide mmetọ ọdịniihu.

Ndị ndu na-achọ ntuziaka nke Mmụọ iji kpebie ma ndụmọdụ nke onwe ma ọ bụ ma kansụl ịbụ onye otù bụ nhazi kachasị daba adaba iji lebara mmetọ ahụ anya. Ha nwekwara ike ha na onye ndu ọkwa nchụaja ha nọ n’okpuru a dụọ ndụmọdụ banyere nhazi ahụ. Kosiladị, mmetọ ọbụla nke di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ okenye ọzọ nke ruru ogo nke akọwara n’okpuru na-achọ ime kansụl ịbụ onye otù.

  • Mmetọ anụ ahụ: Imerụ mmadụ ezigbo ahụ site na ime ihe ike nke anụ ahụ. Ụfọdụ mmerụ ahụ nwere ike agaghị ahụ ha anya.

  • Mmetọ mmekọahụ: Lee ọnọdụ niile akọwapụtara na 38.6.18.3.

  • Mmetọ mmetụta uche: Iji omume niile na okwu niile jiri mebie nke ukwuu uche nsọpụrụ nke onwe ma ọ bụ uru nke onwe nke mmadụ. Nke a na-agụnyekarị mkparị ugboro ugboro na-aganiihu, aghụghọ niile, na nkatọ ndị na-eweda onwe ala ma mee weda ugwu mmadụ.

  • Mmetọ ego: Imegbu mmadụ n’ihe gbasara ego. Nke a nwere ike gụnye iji arịa, ego, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ baara mmadụ uru n’ụzọ iwu megidere ma ọ bụ nke ejighị ikike. O nwekwara ike gụnye inwete ike ego n’ụzọ aghụghọ megide mmadụ. O nwere ike gụnye iji ikike ego iji kwanye agwa.

38.6.2.5

Ọkpụkpọ okù Nzukọ nsọ, Rekọmend niile Tempụl, na Nkọwa Ndekọihe Ịbụ onye otù

Ekwesịghị inye ndị otù metọworo ndị ọzọ ọkpụkpọ okù Nzukọ nsọ ma e nwere ike agaghị enye ha rekọmend tempụl tutu ruo mgbe ha chegharịrị ma ewepụrịị mgbochi niile nke ịbụ onye otù Nzukọ nsọ.

Ọ bụrụ ma mmadụ metọọ nwantakịrị ma ọ bụ ntoroọbịa n’ụzọ mmekọahụ ma ọ bụ metọọ nwantakịrị ma ọ bụ ntoroọbịa nke ukwuu n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ n’ụzọ mmetụta uche, ndekọihe ịbụ onye otù ya ka a ga-edenye nkọwa na ya. A gaghị enye ya ọkpụkpọ okù ma ọ bụ ọrụ ọbụla gụnyere ụmụntakịrị na ndi ntoroọbịa. Nke a gụnyere enyeghị ọrụ ije ozi nlekọta nke ezi na ụlọ nwere ndị ntoroọbịa ma ọ bụ ụmụntakịrị n’ebe obibi ha. Nke a gụnyere enweghị ntoroọbịa dị ka onye nsiso ije ozi nlekọta. Mgbochi ndị a kwesịrị ịnọ ebe ahụ ọ gwụla ma Otu Ndịisi Mbụ nyere ikike mwepụ ihe nkọwa.

38.6.2.6

Kansụl niile nke Stek na nke Ngalaba ukwu

Na nzukọ kansụl nke stek na ngalaba ukwu, otù ndịisi stek na otù ndị bishọp na-enyocha atụmatụ niile na ntuziaka niile nke Nzukọ nsọ n’igbochi ma lebara mmetọ anya. Ndị ndu na ndị otù kansụl na-achọ nduzi nke Mmụọ dị ka ha na-akuzi ihe ma na-kparịta ụka banyere isiokwu nke a dị mmetụta.

Ndị otù kansụl nakwa emezu ọzụzụ nchekwa ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa (lee 38.6.2).

38.6.2.7

Okwu Iwu niile Metụtara Mmetọ

Ọ bụrụ ma omume mmegbu niile nke onye otù emebiwo iwu gbasara ya, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek kwesịrị ịgba onye otù ahụ ume iripọọtụ omume ndị a nye onye ọrụ mmanye iwu ma ọ bụ ụlọọrụ gọvmentị ndị ọzọ dabara adaba.

Ndị ndu na ndị otù Nzukọ nsọ kwesịrị ịmejupụta oke na ọrụ niile iwu kwadoro iji repọọtụọ mmetọ nye ụlọọrụ obodo niile.

38.6.4

Mgbochi Ịmụ Nwa

Ọ bụ ohere nke di na nwunye ndị nwere ike ịmụ ụmụ iwete anụ ahụ nye ụmụ Chineke mụrụ na mmụọ, ndị ọ bụzi ọrụ ha ilekọta ma zụọ (lee 2.1.3 Mkpebi banyere ụmụ ole a ga-amụ na mgbe a ga-amụ ha bụ nnọọ nke onwe na nzuzo dịịrị ha. Ekwesịrị ị hapụ ya n’etiti di na nwunye ahụ na Onyenwe anyị.

38.6.5

Ịdị Ọcha Mmekọrịta na Ikwesị ntụkwasi obi

Iwu Ịdị ọcha mmekọrịta nke Onyenwe anyị bụ:

  • Nsepụ aka site na mmekọrịta mmekọahụ dị n’ofe alụmdi na nwunye iwu kwadoro n’etiti otu nwoke na otu nwanyị.

  • Ikwesị ntụkwasị obi niime alụmdi na nwunye.

Mmekọrịta chiri anya nke anụ ahụ n’etiti di na nwunye kwesịrị ịma mma ma dị nsọ. Akwadoro ya n’aka Chineke maka okike nke ụmụ na maka ngosipụta nke ịhụnaanya n’etiti di na nwunye.

38.6.6

Nziakwụna Nwata

Nzukọ nsọ megidere nziakwụna nwantakịrị n’ụdị ọbụla. Ọ bụrụ na bishọp ma ọ bụ onyeisi stek mata na onye otù tinyere aka na nziakwụna nwantakịrị, ọ na-esoro nkuzi niile ozugbo dị niime 38.6.2.1.

38.6.8

Ibi Nwanyị Ugwu

Nzukọ nsọ megidere ibi nwanyị ugwu.

38.6.10

Ndina ụgwa

Nzukọ nsọ megidere ụdị ndina ụgwa ọbụla. Dị ka e kwuru ebe a, ndina ụgwa bụ mmekọrịta mmekọahụ n’etiti:

  • Nne ma ọ bụ nna na nwa.

  • Nne nke ukwu ma ọ bụ nna nke ukwu na nwa nwa.

  • Ụmụnne.

  • Nwanne nne na nna nke nwoke mọbụ nke nwanyị na ụmụ ndị ụmụnne ha.

Dị ka e dere ebe a, nwa, nwa nwa, ụmụnne, nwa nwanne nke nwanyị na nwa nwanne nke nwoke tinyekwara mmekọrịta nke ụmụ a mụrụ n’onwe, ndị e kutere ekute, nwa di ma ọ bụ nwa nwunye, ma ọ bụ nke ndị a na-elekọta.

Mgbe nwantakịrị obere bụ onye ndina ụgwa metụtara, bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-akpọ akara ekwe ntị enyemaka nke Nzukọ nsọ n’ihi Mmetọ niime obodo ndị ọ dị (lee 38.6.2.1). N’obodo ndị ọzọ, onyeisi stek kwesịrị ịchọ nduzi site n’aka ọka ikpe mpaghara n’ụlọ ọrụ mpaghara. A nakwa agba ya ume ịdụkọrịta ọdụ ya na onye ọrụ Ije ozi Ezi na ụlọ ma ọ bụ onye njikwa ọdịmma na ndabere onwe n’ụlọ ọrụ mpaghara.

Kansụl ndị otù Nzukọ nsọ na nkọwa ndekọihe dị mkpa ma ọ bụrụ ma onye otù mee njọ ndina ụgwa. Ndina ụgwa na-achọkarị mgbe niile iwepụ ịbụ onye otù Nzukọ nsọ nke mmadụ.

Ọ bụrụ ma nwatakịrị mee njọ ndina ụgwa, onyeisi stek na-akpọtụrụ Ụlọ ọrụ nke Otù Ndịisi Mbụ maka ntuziaka.

Ndị emetọrọ site na ndina ụgwa mgbe ụfọdụ na-ata ahụhụ nkụja siri ike. Ndị ndu na-eji ọmịiko na obi ebere si n’obi azaghachi. Ha na-ewete nkwado ime mmụọ na ndụmọdụ iji nyere ha aka merie mpụtara ndina ụgwa na-emebi ihe.

Mgbe ụfọdụ ndị ihe metụrụ na-enwe mmetụta ihere ma ọ bụ ọmụma ikpe. Ikpe mmehie amaghị ndị ihe metụrụ. Ndị ndu na-enyere ha na ndị ezi na ụlọ ha aka ghọta ịhụnaanya nke Chineke na ọgwụgwọ nke na-abịa site na Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya (lee Alma 15:8; 3 Nefi 17:9).

Na mgbakwunye ịnata enyemaka mmụọ kpalitere nke ndị ndu Nzukọ nsọ, ndị ihe metụrụ na ndị ezi na ụlọ ha nwere ike nwee mkpa ndụmọdụ ọkachamara. Maka ozi, lee 38.6.18.2.

38.6.12

Otù Nzuzo

Otù nzuzo na-elekwasị anya n’ọchịchịrị ma na-eduba na nghọgbu. Ọ na-ebibi okwukwe niime Kraịst.

Otù nzuzo gụnyere ife Setan. Ọ gụnyekwara ihe omume niile dị omimi nke na-ekwekọtaghị n’ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ụdị ihe omume ndị a gụnyere (mana ejedebeghị na) ịgba afa, abụmọnụ niile, na omume ọgwụgwọ ndị bụ nṅomi nke ike ọkwa nchụaja nke Chineke (lee Moronaị 7:11-17).

Ndị otù Nzukọ nsọ ekwesịghị itinye aka n’ụdị ọbụla nke ife Setan ma ọ bụ mee ihe n’ụzọ ọbụla ha na ndị otu nzizo. Ha ekwesịghị ilekwasị anya n’ụdị ọchịchịrị a na mkparịta ụka ma ọ bụ na nzukọ niile nke Nzukọ nsọ.

38.6.13

Nziakwụna

Nzukọ nsọ megidere nziakwụna n’ụdị ọbụla. Ile ụdị nziakwụna ọbụla na-emebi ndụ ndị mmadụ, ezi na ụlọ niile, na obodo. Ọ nakwa achụpụ Mmụọ nke Onyenwe anyị. Ndị otù Nzukọ nsọ kwesịrị izere ụdị akụrụngwa nziakwụna niile ma megide nrụpụta ya, nkesa ya, na iji ya eme ihe.

Ndụmọdụ nke onwe na mgbochi niile nke ịbụ onye otù na-adịghị n’okpuru iwu na-ezukarị maka inyere mmadụ aka chegharịa site n’ojiji nziakwụna. Anaghị emekarị kansụl niile nke ịbụ onye otù. Kosiladị, kansụl nwere ike ịdị mkpa maka ojiji nziakwụna kpụ ọkụ n’ọnụ na amanye amanye nke kpataworo ezigbo mmerụ ahụ nye alụmdi na nwunye ma ọ bụ ezi na ụlọ nke onye otù (lee 38.6.5). Kansụl dị mkpa ma ọ bụrụ ma onye otù mee, kesaa, nwere, ma ọ bụ na-elegharị mgbe niile oyiyi nziakwụna nke ụmụntakịrị (lee 38.6.6).

38.6.14

Akpamoke

Ndị mmadụ niile bụ ụmụ Chineke. Ndị niile bụ ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị ndị bụ akụkụ nke ezi na ụlọ Ya si n’eluigwe (lee “Ezi na ụlọ: Ọkwa a mara nye Ụwa”). Chineke “emewo mba niile otu ọbara” (Ọrụ 17:26). “Ndị niile yiri otu” nye Ya (2 Nefi 26:33). Onye ọbụla “dị oke ọnụ ahịa n’anya ya dị ka ndị ọzọ” (Jekọb 2:21).

Akpamoke adabaghị adaba n’okwu Chineke ekpughere. Ihu ọma ma ọ bụ enweghị ihu ọma n’ebe Chineke nọ dabeere na nraranye enyere Ya na iwu nsọ Ya niile, ọ bụghị na ụcha akpụkpọ ahụ nke onye ahụ ma ọ bụ njirimara ndị ọzọ.

Nzukọ nsọ na-akpọku mmadụ niile ịhapụ agwa niile na omume niile nke akpamoke maka otù ọbụla ma ọ bụ mmadụ. Ndị otù Nzukọ nsọ kwesịrị ịnọ n’ihu na-akwalite nsọpụrụ maka ụmụ Chineke niile. Ndị otù n’esoro iwu nsọ nke Onye Nzọpụta inwe ịhụnaanya n’ebe ndị ọzọ nọ (lee Matiu 22:35–39). Ha na-agba mbọ ịbụ ndị mmadụ nwere ezi uche n’ebe ndị niile nọ, jụ ụdị akpamoke ọbụla. Nke a gụnyere akpamoke dabeere na agbụrụ, agbụrụ onye si pụta, mba, ebo, okike ọmụmụ, afọ ole, nkwarụ, ọnọdụ mkpata ego ọha, nkwenye ma ọ bụ ekwenyeghị nke okpukperechi, na nkuzi ihe maka mmekọahụ.

38.6.15

Mmasị Otu Ụdị Okike ọmụmụ na Omume Otu Ụdị Okike ọmụmụ

Nzukọ nsọ na-agba ezi na ụlọ niile na ndị otù ume ileta site na mmetụta uche, ịhụnaanya, na nsọpụrụ nye ndị mmadụ ndị ahụ n’enwe mmasị mmekọahụ nye ndị ọzọ bụ otu ụdị okike ọmụmụ nke onwe ha. Nzukọ nsọ nakwa akwalite nghọta niime obodo niile nke n’egosipụta nkuzi ya niile banyere obi ọma, nke ngụnye, ịhụnaanya maka ndị ọzọ, na nsọpụrụ nye ụmụ mmadụ niile. Nzukọ nsọ anaghị ewere ọnọdụ banyere ihe ndị kpatara mmasị mmekọahụ ụdị okike ọmụmụ nke onwe.

Iwu nsọ niile nke Chineke machibidoro omume na-adịghị ọcha, ma ọ bụ nwoke idina nwanyị ma ọ bụ ndina n’etiti otu ụdị okike ọmụmụ. Ndị ndu na-adụ ndị otù mebiworo iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta ndụmọdụ. Ndị ndu na-enyere ha aka nwete nghọta nke okwukwe doro anya niime Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya, usoro nke nchegharị, na Ebumnoobi nke ndụ n’elu ụwa.

Ọ bụrụ ma ndị otù nwee mmasị mmekọahụ maka ụdị okike nke onwe ha ma na-agbalị idebe iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta, ndị ndu na-akwado ma na-agba ha ume na mkpebi ha. Ndị otù ndị a nwere ike nata ọkpụkpọ okù Nzukọ nsọ, nwee rekọmend tempụl, ma nata emume nsọ niile nke tempụl ọ bụrụ ma ha tozuo oke. Ndị otù Nzukọ nsọ nwoke nwere ike nata ma tinye ọkwa nchụaja n’ọrụ.

Ndị otù niile ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ha ga-anata ngọzi niile ekwere na nkwa na mgbe ebighị ebi niile ma ọ bụ na ma ọ bụghị na ọnọdụ niile ha kwere ha ịnata ngọzi niile nke alụmdi na nwunye ebighị ebi na ịbụ nne na nna niime ndụ nke a (lee Mozaya 2:41).

38.6.16

Alụmdi na nwunye Otu ụdị Okike ọmụmụ

Dị ka ụkpụrụ nke ozizi, dabeere na akwụkwọ nsọ, Nzukọ nsọ na-ekwu na alụmdi na nwunye n’etiti otu nwoke na otu nwanyị dị oke mkpa n’atụmatụ nke Onye Okike maka akara aka ebighị ebi nke ụmụ Ya. Nzukọ nsọ nakwa ekwu na iwu nke Chineke kọwara alụmdi na nwunye dịka njikọ ziri ezi iwu kwadoro n’etiti otu nwoke na otu nwanyị.

38.6.17

Mmụta Mmekọahụ

Ndị nne na nna nwere isi ọrụ maka mmụta mmekọahụ nke ụmụ ha. Ndị nne na nna kwesịrị ikwu okwu eziokwu, doro anya, ma na-aganiihu ha na ụmụ ha banyere mmekọahụ dị mma ziri ezi.

38.6.18

Mmetọ Mmekọahụ, Idina n’ike, na Ụdị Mmegide Mmekọahụ Ndị Ọzọ

Nzukọ nsọ megidere mmetọ mmekọahụ. Dị ka edere ebe a, mmetọ mmekọahụ ka a kọwara dị ka ịmanye ụdị omume mmekọahụ ọbụla a na-achọghị n’ahụ onye ọzọ. Omume mmekọahụ n’ahụ onye na-enyeghị ma ọ bụ na-enweghị ike enye nkwenye iwu kwadoro ka a hụtara dị ka mmetọ mmekọahụ. Mmetọ mmekọahụ nwekwara ike mee n’etiti di na nwunye ma ọ bụ n’etiti mmekọrịta ndị n’eme enyi. Maka ozi ndị ọzọ banyere mmetọ mmekọahụ nke nwata ma ọ bụ ntoroọbịa, lee 38.6.2.3.

Mmetọ mmekọahụ kpuchitere obosara omume dị iche iche, site na mmaja ruo na ịkwa iko n’ike na ụdị mmegide mmekọahụ ndị ọzọ. O nwere ike ime n’anụ ahụ, n’okwu ekwuru, na n’ụzọ ndị ọzọ. Maka nduzi banyere ịdụ ndị otù gabigaworo mmetọ mmekọahụ, ịkwa iko n’ike, ma ọ bụ ụdị mmegide mmekọahụ ndị ọzọ ndụmọdụ, lee 38.6.18.2.

Ọ bụrụ ma ndị otù na-enyo ma ọ bụ mata maka mmetọ mmekọahụ, ha na-eme ihe iji chekwaa ndị ihe metụrụ na ndị ọzọ ozugbo enwere ike. Nke a gụnyere ịrepọọtụrụ ndị ji ikike nke obodo na ime ka bishọp ma ọ bụ onyeisi stek mata. Ọ bụrụ na emetọwo nwata, ndị otù kwesịrị isoro nkuzi niile dị na 38.6.2.

38.6.18.2

Ndụmọdụ maka Ndị Mmetọ Mmekọahụ, Idina mmadụ n’ike, na Ụdị Mmegide Mmekọahụ Ndị Ọzọ metụtara

Ndị mmetọ mmekọahụ, idina mmadụ nike, ma ọ bụ ụdị mmegide mmekọahụ ndị ọzọ metụtara ọtụtụ mgbe na-ata ahụhụ nkụja dị ike. Mgbe ha kọsaara bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na nzuzo, ọ na-eji ọmịiko na obi ebere si n’obi azaghachi. Ọ na-ewete ndụmọdụ na nkwado ime mmụọ iji nyere ndị ihe metụrụ aka merie mpụtara nke mmetọ na-emebi ihe. Ọ nakwa akpọtụrụ akara ekwe ntị enyemaka nke Nzukọ nsọ n’ihi mmetọ maka nduzi ebe ọ dị adị.

Mgbe ụfọdụ ndị ihe metụrụ na-enwe mmetụta ihere ma ọ bụ ọmụma ikpe. Ikpe mmehie amaghị ndị ihe metụrụ. Ndị ndu anaghị ata onye ihe metụtara ụta. Ha na-enyere ndị ihe metụtara na ndị ezi na ụlọ ha aka ghọta ịhụnaanya nke Chineke na ọgwụgwọ nke na-abịa site na Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya (lee Alma 15:8; 3 Nefi 17:9).

Ebe ndị otù nwere ike ịhọrọ ikesa ozi banyere mmetọ ma ọ bụ mmegide, ndị ndu ekwesịghị ịdabere n’ụzọ gafere oke na nkọwa niile. Nke a pụrụ ịmerụ ndị ihe metatara ahụ.

Na mgbakwunye ịnata enyemaka mmụọ kpalitere nke ndị ndu Nzukọ nsọ, ndị ihe metụrụ na ndị ezi na ụlọ ha nwere ike nwee mkpa ndụmọdụ ọkachamara. Maka ozi, lee 31.3.6.

38.6.18.3

Kansụl niile nke Ịbụ onye otù

Kansụl ịbụ onye otù nwere ike ịdị mkpa maka mmadụ onye mekpaworo ma megbuo mmadụ n’ụzọ mmekọahụ. Kansụl ịbụ onye otù dị mkpa ọ bụrụ ma onye otù dịna mmadụ n’ike ma ọ bụ a mara ya ikpe ụdị ụzọ mmegide mmekọahụ ọzọ.

38.6.20

Igbu onwe

Ndụ anụ ahụ bụ onyinye dị oke ọnụ ahịa sitere n’aka Chineke—onyinye nke ekwesịrị iji kpọrọ ihe ma echekwaa ya. Nzukọ nsọ na-akwadosike mgbochi nke igbu onwe.

Ọtụtụ ndị mmadụ ndị cheworo banyere igbu onwe chọrọ inwete enyemaka site na mgbu anụ ahụ, nke echiche, nke mmetụta uche, ma ọ bụ nke ime mmụọ. Ụdị mmadụ ndị a na-achọ ịhụnaanya, enyemaka, na nkwado site n’aka ezi na ụlọ, ndị ndu Nzukọ nsọ, na ndị ọkachamara tozuru etozu.

Bishọp na-ewete nkwado ụkọchukwu ma ọ bụrụ ma onye otù na-atule igbu onwe ma ọ bụ anwawo ya. Ọ nakwa enyere ndị otù aka ozugbo inwete enyemaka ọkachamara.

Na-agbanyeghị mgbalị kachasị mma nke ndị a hụrụ naanya, ndị ndu, na ndị ọkachamara, anaghị egbochikarị mgbe niile igbu onwe. Ọ na-ahapụkarị mgbawa obi miri emi, ọgba aghara mmetụta uche, na ajụjụ ndị na-enweghị aziza maka ndị a hụrụ naanya na ndị ọzọ. Ndị ndu kwesịrị inye ndụmọdụ ma kasie ezi na ụlọ ahụ obi. Ha na-ewete ọzụzụ na nkwado.

Ọ dịghị mma na mmadụ ga-ewepụ ndụ ya onwe ya. Kosiladị, naanị Chineke nwere ikike ikpe ikpe nye echiche niile, omume niile, na ogo nke inye nkọwa nke mmadụ (lee 1 Samuel 16:7; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 137:9).

Ndị ahụ ndị ha hụrụ naanya funarịrị ha n’aka igbu onwe nwere ike ịchọta olileanya na ọgwụgwọ na Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya.

38.6.23

Ndị Mgbanwe Okike

Ndị mgbanwe okike na-ezute ọtụtụ ịma aka gbagwojuru anya. Ndị otù na ndị na-abụghị ndị otù ndị na-ahụ onwe ha dị ka ndị mgbanwe okike—na ezi na ụlọ ha na ndị enyi ha—ka e kwesịrị iji inwe uche, obiọma, ọmịiko, na ụbara ịhụnaanya nke dị ka nke Kraịst kpasị agwa. Ndị niile ka a nabatara ịbịa nzukọ oriri nsọ, nzukọ Sọnde ndị ọzọ, na emume ọha niile nke Nzukọ nsọ (lee 38.1.1).

Okike ọmụmụ bụ njirimara dị mkpa nke atụmatụ obi ụtọ nke Nna nke Eluigwe. Mpụtara ebu n’obi nke okike ọmụmụ niime ọkwa a mara nye ezi na ụlọ bụ okike ndụ oge ọmụmụ. Ụfọdụ ndị mmadụ na-enwe mmetụta niile nke n’ekweghị ekwe n’etiti okike nke amụrụ ha niime ya na okike ọmụmụ nke ha nabatara. N’ihi ya, ha nwere ike hụta onwe ha dị ka ndị mgbanwe okike. Nzukọ nsọ anaghị ewere ọnọdụ banyere ihe ndị kpatara ndị mmadụ ji ahụta onwe ha ka ndị mgbanwe okike.

Ọtụtụ nsonyere nke Nzukọ nsọ na ụfọdụ emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja nọpụrụ iche n’ihe gbasara okike ọmụmụ. Ndị mgbanwe okike nwere ike e mee ha baptizim na onye otù dị ka edepụtara niime 38.2.8.10. Ha nwekwara ike rie oriri nsọ ma nata ngọzi niile nke ọkwa nchụaja. Kosiladị, echichi ọkwa nchụaja na emume nsọ niile nke tempụl ka a na-anata dị ka otu okike ndụ n’oge ọmụmụ siri dị.

Ndị ndu Nzukọ nsọ na-enye ndụmọdụ megide mmadụ ijiri aka ya mee nhọrọ nke ịwa ahụ maka Ebumnoobi nke ịnwa ịgbanwe ndụ ọmụmụ pụọ n’okike ndụ oge ọmụmụ onye ahụ (“inyegharị okike ndụ”). Ndị ndu na-enye ndụmọdụ na ime ihe ndị a ga-akpata mgbochi niile nke ịbụ onye otù Nzukọ nsọ.

Ndị ndụ nakwa enye ndụmọdụ megide mgbanwe ọdịdị n’ihu ọha. Mgbanwe ọdịdị n’ihu ọha gụnyere ịgbanwe uwe na ekike, ma ọ bụ ịgbanwe aha ma ọ bụ nnọchiaha, igosipụta onwe onye dị ka otu n’abụghị okike ndụ n’oge ọmụmụ ya. Ndị ndu na-enye ndụmọdụ na ndị ahụ gbanwere ọdịdị n’ihu ọha ga-enweta ụfọdụ mgbochi ịbụ onye otù Nzukọ nsọ ruo n’oge niile emere mgbanwe nke a.

Mgbochi niile gụnyere ịnata ma ọ bụ itinye ọkwa nchụaja n’ọrụ, ịnata ma ọ bụ ojiji rekọmend tempụl, na ịnata ụfọdụ ọkpụkpọ okù Nzukọ nsọ. Na-agbanyeghị ụfọdụ ọhere ịbụ onye otù Nzukọ nsọ ka egbochiri, nsonye ime ihe ndị ọzọ na Nzukọ nsọ ka a nabatara.

Ọ bụrụ ma onye otù kpebie ịgbanwe aha ọ họọrọ ma ọ bụ nnọchiaha eji akpọ ya, aha ahụ ọ họọrọ ka e nwere ike idedata n’ohere eji ede aha a họọrọ na ndekọihe ịbụ onye otù. Onye ahụ ka enwere ike ịkpọ aha ọ họọrọ na ngalaba ukwu.

Ọnọdụ niile n’adị iche iche nke ukwuu site na ngalaba ruo na ngalaba ma site na mmadụ ruo na mmadụ. Ndị otù na ndị ndu na-adụkọrịta ndụmọdụ ọnụ ha na Onyenwe anyị. Otù Ndịisi Mpaghara ga-enyere ndị ndu obodo aka kwuzie nke ọma ọnọdụ niile nke onye ọbụla. Bishọp na-adụ ndụmọdụ ya na onyeisi stek Ndịisi stek na ndịisi mishọn ga-achọrịrị ndụmọdụ site n’aka Otu Ndịisi Mpaghara (lee 32.6.3).

38.7

Atụmatụ niile nke nka Ọgwụgwọ ọrịa na Ahụike

38.7.2

Olili na Ọgbụgba ọkụ

Ezi na ụlọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ na-ekpebi ma ahụ ya ekwesịrị ili ya ma ọ bụ gbaa ya ọkụ. Ha na-asọpụrụ mkpebi niile nke onye ahụ.

N’ụfọdụ mba, iwu na-achọ ọgbụgba ọkụ. Na ndị ọzọ, olili anaghị ekwe omume ma ọ bụ ọ dịghị ọnụ ala nye ezi na ụlọ ahụ. N’ọnọdụ niile, anụ ahụ kwesịrị ka enye ya nsọpụrụ na nkwanye ugwu. Ndị otù kwesịrị ka emesie ha obi ike na ike nke Mbilite n’ọnwụ na-emetụta mgbe niile (lee Alma 11:42-45).

Ebe o kwere omume, anụ ahụ nke onye otù nwụrụ anwụ onye nweteworo onyinye dị nsọ kwesịrị ka eyiwe ya uwe mmemme tempụl mgbe a na-eli ma ọ bụ agba ya ọkụ (lee 38.5.8).

38.7.3

Ụmụ Ndị Nwụrụ tupu Ọmụmụ ha (Nwa nwụrụ n’afọ na Ime Pụrụ apụ)

Ndị nne na nna na-ekpebi ma ha ga-eme mmemme ncheta m’ọbụ nzukọ olili n’akụkụ ala ili.

Emume nsọ tempụl niile adịghị mkpa ma ọ bụ na agaghị eme ha maka ụmụ ndị nwụrụ tupu ọmụmụ. Nke a anaghị agọnarị ike ikwe omume na ụmụ ndị a nwere ike ị bụ akụkụ ezi na ụlọ ahụ na mgbe ebighị ebi niile. Ndị nne na nna ka a na-agba ume ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị ma chọọ nkasị obi ya.

38.7.4

Inye aka gbuo onwe

Ndụ anụ ahụ bụ onyinye oke ọnụ ahịa sitere na Chineke. Inye aka gbuo onwe bụ ịkpachara anya ịkwụsị ndụ nke mmadụ onye na-ata ahụhụ nke nrịanrịa n’enweghị ọgwụgwọ ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ. Onye na-esonye na inye aka gbuo onwe, tinyekwara inyere mmadụ aka nwụọ site n’igbu onwe, na-emegide iwu nsọ niile nke Chineke ma nwere ike imegide iwu nke obodo.

Ịkwụsị ma ọ bụ hapụ oke emereme niile maka nkwado ndụ nke onye nọ na ngwụcha ndụ esoghị na inye aka gbuo onwe (lee 38.7.11).

38.7.5

Nje HIV na AIDS

Ndị otù butere nje HIV (human immunodeficiency virus) ma ọ bụ ndị nwere AIDS (acquired immunodeficiency syndrome) kwesịrị ka anabata ha na ọgbakọ na ihe omume niile nke Nzukọ nsọ. Ọbịbịa ha abụghị ihe ize ndụ ahụike nye ndị ọzọ.

38.7.8

Nlekọta nke nka Ọgwụgwọ ọrịa na Ahụike

Ịchọ enyemaka nka ọgwụgwọ ọrịa site n’aka ọkachamara maara nke oriri, itinye okwukwe n’ọrụ, ma na-anata ngọzi niile nke ọkwa nchụaja na-arụkọ ọrụ ọnụ maka ọgwụgwọ, dị ka otu uche nke Onyenwe anyị siri dị.

Ndị otù ekwesịghị iji ma ọ bụ kwalite omume nke nka ọgwụgwọ ọrịa ma ọ bụ nke ahụike ndị g’aza ajụjụ maka eziomume, nke ime mmụọ, ma ọ bụ nke iwu obodo. Ndị ahụ nwere nsogbu ahụike kwesịrị ịjụta ọkachamara maara nke oriri n’ọgwụ ndị nwere ikike na mpaghara ebe ha na-arụ ọrụ.

38.7.9

Nka Ọgwụgwọ ọrịa Anwụrụ ike wii wii

Nzukọ nsọ megidere ojiji nke anwụrụ ike wii wii maka Ebumnoobi niile na-abụghị nke nka ọgwụgwọ ọrịa. Lee 38.7.14.

38.7.11

Ịgbati Ndụ (Gụnyere Nkwado Ndụ)

Ndị otù ekwesịghị inwe mmanye ịgbatị ndụ anụ ahụ site n’oke ụzọ. Mkpebi ndị a kachasị mma ime site n’aka onye ahụ, ọ bụrụ ma o kwe omume, ma ọ bụ site n’aka ndị otù ezi na ụlọ. Ha kwesịrị ịchọ ndụmọdụ nke ọgwụ bara uru na nduzi si na chi site n’ekpere.

38.7.13

Ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa niile

Ọgwụ mgbochi ọrịa ndị agbara site n’aka ndị ọkachamara nke nka ọgwụgwọ ọrịa bara uru na-echekwa ma na-echebe ndụ. Ndị otù Nzukọ nsọ ka a na-agba ume ichekwa onwe ha, ụmụ ha, na obodo ha site n’ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa.

N’ikpeazụ, ndị mmadụ ka ọ dị n’aka ime mkpebi nke onwe ha banyere ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa. Ọ bụrụ ma ndị otù nwere nchegbu, ha kwesịrị ịnara ndụmọdụ n’aka ndị ọkachamara nke nka ọgwụgwọ ọrịa maara nke ha riri nakwa chọọ nduzi nke Mmụọ Nsọ.

38.7.14

Okwu nke Amamiihe na Omume niile Ahụike

Okwu nke Amamiihe bụ iwu nsọ nke Chineke. Ndị amụma emewo ka o doo anya na nkuzi niile dị na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89 gụnyere iwepụ aka na ụtaba, mmanya ike (mmanya na-aba n’anya), na ihe ọńụńụ ọkụ (tii na kọfị).

E nwere ihe ndị ọzọ na omume ndị na-emerụ ahụ ndị a na-akpọghị aha niime Okwu nke Amamiihe ma ọ bụ site n’aka ndị ndu Nzukọ nsọ. Ndị otù kwesịrị iji amamiihe na ikpe sitere n’ekpere na-eme nhọrọ iji kwalite ahụike ha nke anụ ahụ, ime mmụọ, na nke mmetụta uche.

38.8

Atụmatụ Nchịkwa na Nlekọta niile

38.8.1

Ikute nwa na Nlekọta Nkuchi

Ikute ụmụ na inye nlekọta nkuchi nwere ike ịgọzi ụmụaka na ndị ezi na ụlọ. Ezi na ụlọ nwere ịhụnaanya dị ebighị ebi ka enwere ike ikewapụta site na ikute nwa. Ma ụmụ ha bịara n’ezi na ụlọ site na ikute nwa ma ọ bụ n’ịmụ nwa, ha bụkwa ngọzi dị oke ọnụ ahịa.

Ndị otù chọrọ ikute nwa ma ọ bụ inye nlekọta nkuchi kwesịrị irube isi na iwu niile dabara adaba nke obodo niile na gọvmentị ndị ọ metụtara.

38.8.4

Aka edemede onwe na Foto niile nke Ndị Ji ikike Zuruọha, Ndị Ọkwa ọrụ Zuruọha, na Ndị Iri Asaa Mpaghara

Ndị otù Nzukọ nsọ ekwesịghị ịchọ aka edemede onwe nke Ndị Ji ikike Zuruọha, Ndị Ọkwa ọrụ Zuruọha, ma ọ bụ Ndị Iri Asaa Mpaghara. Ime otu a na-ewepụ uche site n’ọkpụkpọ okù dị nsọ nke ha na mmụọ nke nzukọ niile. Ọ nakwa egbochi ha site n’ikele ndị otù ndị ọzọ.

Ndị otù ekwesịghị ise foto nke Ndị Ji ikike Zuruọha, Ndị Ọkwa ọrụ Zuruọha, ma ọ bụ Ndị Iri Asaa Mpaghara niime ụlọ ụka.

38.8.7

Magazin niile nke Nzukọ nsọ

Magazin niile nke Nzukọ nsọ gụnyere:

Otù Ndịisi Mbụ na-agba ndị otù niile ume ịgụ magazin niile nke Nzukọ nsọ. Magazin niile nwere ike inyere ndị otù aka mụọ ozi ọma nke Jizọs Kraịst, mụta nkuzi niile nke ndị amụma dị ndụ, nwee mmetụta njikọ nye Nzukọ nsọ ezi na ụlọ n’ụwa niile, zute ịma aka mgba niile n’okwukwe, ma bịarute Chineke nso.

38.8.8

Aha Nzukọ nsọ, Akara mkpụrụokwu, na Ọdịmara

Foto, oyiyi
Akara mkpụrụokwu, na Ọdịmara Nzukọ nsọ

Aha nke Nzukọ nsọ, akara mkpụrụokwu, na ọdịmara bụcha isi ngosipụta nke Nzukọ nsọ.

Akara mkpụrụokwu na Ọdịmara. Akara mkpụrụokwu na ọdịmara nke Nzukọ nsọ (lee ngosịpụta dị n’elu) ka ekwesịrị iji mee ihe naanị dị ka Otù Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ kwadoro. Enweghi ike iji ha dị ka mmewere ndị eji achọ mma. Ma ọ bụ na ha ga-eji ya n’ụzọ nke onwe, nke azụmahịa ma ọ bụ nkwado ọbụla.

38.8.10

Kọmputa niile

Kọmputa niile na software a na-eji n’ụlọ ụka Nzukọ nsọ niile ka ewetere ma jikwaa site n’aka isi ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ ma ọ bụ ụlọ ọrụ mpaghara. Ndị ndu na ndị otù na-eji akụrụngwa ndị a iji kwadoo Ebumnoobi niile nke Nzukọ nsọ, tinyekwara ọrụ agụgụala ezi na ụlọ.

Software niile dị niime kọmpụta ndị a ka agarịrị enye Nzukọ nsọ ikike kwesịrị ekwesị.

38.8.12

Ngwa ọrụ Kurikulum niile

Nzukọ nsọ na-ewete ngwa ọrụ niile iji nyere ndị otù aka mụọ ma bie ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ndị a gụnyere akwụkwọ nsọ, ozi ọgbakọ zuruọha niile, magazin niile, akwụkwọ ọmụmụ ihe niile, akwụkwọ niile, na akụrụngwa ndị ọzọ. Ndị ndu na-agba ndị otù ume iji akwụkwọ nsọ na akụrụngwa ndị ọzọ dị ka ọ dị mkpa iji mụọ ozi ọma n’ebe obibi.

38.8.14

Uwe na Ọdịdị

Ndị otù Nzukọ nsọ ka a na-agba ume igosi nkwanye ugwu maka anụ ahụ na nhọrọ ha banyere uwe na ọdịdị kwesịrị ekwesị. Ihe kwesịrị ekwesị na-adị iche iche gburugburu omenaala niile na maka ọnọdụ ndị dị iche iche.

38.8.16

Ụbọchị Obubu ọnụ

Ndị otù nwere ike buo ọnụ oge ọbụla. Kosiladị, ha na-edebekarị ụbọchi Izuike mbụ dị n’ọnwa dị ka ụbọchi obubu ọnụ.

Ụbọchi obubu ọnụ na-agụnyekarị ikpe ekpere, erighị nri ma ọ bụ ịńụ ihe ọńụńụ ruo oge awa 24 (ọ bụrụ na o kwere omume), na inye onyinye obubu ọnụ mmepụ aka. Onyinye obubu ọnụ bụ onyinye iji nyere ndị ahụ nọ na mkpa aka (lee 22.2.2).

Mgbe ụfọdụ nzukọ niile nke Nzukọ nsọ gburugburu ụwa ma ọ bụ nke obodo ka a na-eme n’ụbọchi izuike mbụ nke ọnwa. Mgbe nke a mere, otu ndịisi stek na-ekpebi ụbọchị Izuike ọzọ maka ụbọchị obubu ọnụ.

38.8.17

Ịgba chaa chaa na Lọtrị niile

Nzukọ nsọ megidere ma na-enye ndụmọdụ megide ịgba chaa chaa n’ụdị ọbụla. Nke a gụnyere ịkụ nzọ egwuregwu na lọtri niile gọvmentị kwadoro.

38.8.19

Ọpụpụ

Ndị otù ndị nọgidere n’ala nna ha ọtụtụ mgbe na-enwe ohere iwulite ma gbaa Nzukọ nsọ ume ebe ahụ. Kosiladị, ọpụpụ gaa n’ala ọzọ bụ nhọrọ nke onwe.

Ndị otù ndị kwagharịrị gaa ala ọzọ kwesịrị irube isi nye iwu niile metụtara ebe ahụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:21).

Ndị mgbasa ozi ọma ekwesịghị ikwe nkwa ịkwụ ụgwọ ọpụpụ nke ndị ọzọ.

38.8.22

Iwu niile nke Ala ahụ

Ndị otù kwesịrị irube isi, kwanye ugwu, ma kwadoo iwu niile dị n’ala ọbụla ebe ha bi ma ọ bụ ebe ha mere njem (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:21-22; Ndepụta nke Okwukwe 1:12). Nke a gụnyere iwu niile nke machibidoro ikwusa oziọma.

38.8.25

Nzimozi nke Ndị otù ha na ndị otù ha na Isi Ụlọ ọrụ Nzukọ nsọIsi Ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ

A na-akụda mmụọ nke ndị otù site n’ịkpọ n’ekwe ntị, ide email, ma ọ bụ idegara Ndị Ji ikike Zuruọha leta banyere ajụjụ ozizi niile, ịma aka mgba nke onwe, ma ọ bụ arịrịọ. A na-agba ndị otù ume ịkpọtụrụ ndị ndu dị n’obodo ha, gụnyere onyeisi Otù Enyemaka ma ọ bụ kworum ndị okenye ha, mgbe ha na-achọ nduzi nke ime mmụọ (lee 31.3).

38.8.27

Ndị otù nwere Nkwarụ

Ndị ndu na ndị otù ka a na-agba ume igbo mkpa nke ndị niile bi na gburugburu ngalaba ha. Eji ndị otù nwere nkwarụ kpọrọ ihe ma ha nwere ike ịrọpụta ụzọ ndị bara uru. Nkwarụ nwere ike bụrụ nke ọgụgụ isi, nke mmekọrịta ọha, nke mmetụta uche, ma ọ bụ nke anụ ahụ.

38.8.29

Okpukperechi Ndị Ọzọ

Ọtụtụ nke na-akpate mmụọ, mara mma, ma tozuo oke nkwanye ugwu kachasị elu ka a na-ahụta niime ọtụtụ okpukperechi ndị ọzọ. Ndị mgbasa ozi ọma na ndị otù ndị ọzọ ga-enwerịrị mmetụta uche ma dị nsọpụrụ n’ebe nkwenye na omenaala nke ndị ọzọ nọ.

38.8.30

Ihe omume Ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke Obodo

Ndị otù Nzukọ nsọ ka a na-agba ume isonye n’ihe ndị banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ihe ndị gbasara gọvmentị. niime ọtụtụ obodo, nke a nwere ike gụnye:

  • Ịtụ vootu.

  • Isoro ma ọ bụ ije ozi n’otù ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

  • Iwete nkwado ego.

  • Izikọrịta ozi ha na ndị ụlọ ọrụ na ndị ahọpụtara n’otù paati.

  • Ije ozi n’ụlọ ọrụ ndị ahọpụtara ma ọ bụ ndị a kpọrọ n’ọkwa ọrụ ndị dị niime gọvmentị nke ime obodo na nke mba.

Ndị otù ka a na-agbakwa ume isonye n’ihe ndị kwesịrị ekwesị iji mee obodo ha ebe dị mma ibi ma zulite ndị ezi na ụlọ.

Ndị ndu Nzukọ nsọ Obodo ekwesịghị ịhazi ndị otù isonye n’okwu ndị banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ndị ndu ekwesịghịkwa ịnwe inwe mmetụta otu ndị otù si esonye.

Ndị ndu na ndị otù kwesịkwara izere ikwu okwu ma ọ bụ mee omume enwere ike ịtapịa dị ka nkwado Nzukọ nsọ nke otu pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọbụla, otu platfọm, atụmatụ, ma ọ bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

38.8.31

Ịdị Nzuzo nke Ndị òtù

Ndị ndu Nzukọ nsọ nwere oke na ọrụ ichekwa ịdị nzuzo nke ndị òtù. Ndekọihe niile nke Nzukọ nsọ, akwụkwọ ndekọ aha niile, na ụdị ngwa ndị yiri ibe ha abụghị nke a ga-eji eme ihe maka Ebumnoobi nke onwe, nke azụmahịa, ma ọ bụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

38.8.35

Ndị Gbara ọsọ ndụ

Dị ka akụkụ oke na ọrụ ha ilekọta ndị nọ na mkpa (lee Mozaya 4:26), ndị otù Nzukọ nsọ na-enye oge ha, akara aka ha, na adịnamma iji nabata ndị gbara ọsọ ndụ dị ka ndị otù obodo ha.

38.8.36

Arịrịọ niile maka Enyemaka Ego Nzukọ nsọ

A na-agba ndị otù nọ na mkpa ume ikwuru bishọp ha okwu kama ịdị na-akpọ isi ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ ma ọ bụ ịrịọ ego site n’aka ndị ndu Nzukọ nsọ ma ọ bụ ndị otù ọzọ.

Bipụta