Akwụkwọ nsọ
Ime ka a mata


Ime ka a mata

Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile bụ nchịkọta nke mkpughe dị nsọ nile na nkwụpụta nile nke nkwalite mụọ e nyere maka nhiwe na nhazi nke ala-eze nke Chineke n’elu ụwa n’ụbọchị ndị ikpe-azụ a. Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime nkeji nile bụ ndị e chere iru na ndị-otu Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a, ozi ya nile, ịdọ-aka-na ntị ya nile, na ịgba-ume ya nile, bụ maka uru nke ụmụ mmadụ nile ma nwekwara n’ime ya ọkpụkpọ-oku nye mmadụ nile ebe nile ka ha nụrụ olu-okwu Onye-nwe Jisus Kraịst, na-ekwuru ha n’ ihi ọdị-mma nke ụwa ha na nzọpụta ha mgbe nile na-adigide.

Ọtụtụ n’ime mkpughe nile dị n’ime nchịkọta nkea bụ ndị a natara site n’aka Joseph Smith, Nta; onye-amụma nke mbụ na onye-isi nduzi nke Nzukọ-nsọ nke Jisus Kraịst Ndị-nsọ nke Ụbọchị-Ikpeazụ a. Ndị ọzọ bụ ndị e nyere site n’aka ụfọdụ ndị na-eso ya n’Otu ndị-isi nduzi (lee isi-ọkwu nile nke nkeji nile 135, 136 na 138 na Nkwụpụta nile nke Ụlọ-ọrụ nke 1 na nke 2.)

Akwụkwọ nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile bụ otu n’ime ọkọlọtọ-ọrụ nile nke Nzukọ-nsọ ya na Bible Nsọ, Akwụkwọ nke Mọmọn, na Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa. Otu o sila dị, Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile pụrụ iche n’ihi na ọ bụghị ntụgharị asụsụ nke dọkụmenti ochie, mana ọ bụ nke nwere mbido ọhụrụ nke Chineke nyere ndị-amụma ya ọ họpụtara maka mwetaghachi nke ọrụ ya dị nsọ na nhiwe nke ala-eze nke Chineke n’ụwa n’ụbọchị ndị a nile. N’ime mkpughe ndia nile a na-anụ olu dị nro mana na-ekwusi-ike nke Onye-nwe Jisus Kraịst, na-ekwu ọzọ n’ọgbọ ozuzu oge akara aka; ma n’ọrụ nke a malitere n’ebe a bụ nke njikere ọbịbịa nke ugboro abụọ ya, na mmezu nke na ndakọta ya na okwu nile nke ndị-amụma nsọ nile ke mgbe mmalite nke ụwa.

Joseph Smith, Nta, ka a mụrụ na 23 Disemba 1805, na Sharon, Ógbè Windsor, Vermont. N’oge ọ bụụrụ nwata, ọ kwagara ya na ezi na ụlọ ruo Manchester, nke nọ n’ọdịda anyanwụ New York. Ọ bụụrụ mgbe o biiri na-nso Manchester n’oge mmalite udummiri nke 1820, mgbe ọ gbara afọ iri na anọ, ka ọ hụrụ ọ́hụ̀ nke mbụ, n’ime ebe nke Chineke, Nna nke Mgbe Ebighi-ebi na Ọkpara ya Jisus Kraịst, bịakutere ya n’onwe ha. A gwara ya n’ime ọ́hụ̀ a na ezi Nzukọ-nsọ nke Jisus Kraịst bukwa nke ehiweworo n’oge Testament Ọhụrụ, na nke nyeworo uju nke ozi-ọma ahụ, a nọghịkwa n’elu ụwa. Ihe ngosipụta nile ndị ọzọ dị-nsọ sochiri ebe a kuziiri ya ihe site n’aka ọtụtụ ndị mụọ-ozi; e zikwara ya na Chineke nwere ọrụ pụrụ iche ọ ga-arụ n’ụwa na kwa site n’aka ya a ga-eweghachite Nzukọ nke Jisus Kraịst n’elu ụwa.

Mgbe oge na-aga, e mere ka Joseph Smith nwee ike site n’enyem-aka dị nsọ tụgharịa ma bipụta Akwụkwọ nke Mọmọn. N’oge a ya na Oliver Cowdery nwetara echichi Ọkwa Nchụ-aja Erọn site n’aka Jọn O Me Baptism n’ọnwa Mee 1829 (lee OznỌd. 13), ma ngwa ngwa mgbe nke a gasịrị e chikwara ha echichi baa n’Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek site n’aka Ndị-ozi ochie Pịta, Jemes, na Jọn (lee OznỌd. 27:12). Echichi ndị ọzọ nile sochikwara n’ime nke e nyefere ha ọtụghe-ụzọ nile site n’aka Moses, Elaịja, Elaias, nakwa ọtụtụ ndị-amụma ochie (lee OznỌd. 110; 128:18, 21). Echichi nile ndị a bụ, n’ezie, mwetaghachi nke ikike dị nsọ nye mmadụ n’ụwa. Na 6 Epril 1830, site na ntuzi-aka nke elu-igwe, Onye-amụma Joseph Smith haziri Nzukọ-nsọ ahụ, ma site otu a ezi Nzukọ-nsọ nke Jisus Kraịst ebidowo ọrụ ọzọ dịka ewumewu n’etiti mmadụ, ikike ikuzi ozi-ọma ma lekọta emume-nsọ nile maka nzọpụta. (Lee Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa, Akụkọ—Joseph Smith 1:1–75 na OznỌd. 20.)

Mkpughe nile ndị a dị-nsọ ka a natara n’ịza ekpere, n’oge mkpa, ma pụtara dika ihe mere na-ndụ ma gbasakwa ndị mmadụ. Onye-amụma na ndị-otu ya chọrọ odudu dị-nsọ, ma mkpughe ndị a nile gosịrị na ha nwetara ya. N’ime mkpughe nile a ga-ahụ mwetaghachi na mpụta-ìhè nke ozi-ọma nke Jisus Kraịst na ndubata nke ọgbọ ozuzu oge akara aka. Ịga njem e lewere anya n’ọdịda anyanwụ nke Nzukọ-nsọ site na New York na Pennsylvania ruo Ohio, ruo Missouri, ruo Illinois, ma n’ikpeazụ ruo Nnukwu Basin nke ọdịda anyanwụ Amerika na ndọlị ukwu nile nke Ndị-nsọ n’iji chọọ iwu Zaịọn n’ụwa n’oge ugbụ a bụkwa ihe egosipụtara na mkpughe nile ndịa.

Ọtụtụ n’ime nkeji ndị mbụ metụtara okwu nile gbasara ntụgharị-asụsụ na mbipụta nke Akwụkwọ nke Mọmọn (lee nkeji 3, 5, 10, 17 na 19). Ụfọdụ nkeji ndị ikpe-azụ na-egosi ọrụ nke Onye-amụma Joseph Smith na-ime ntụgharị-asụsụ nke Bible site na nkwalite nke mụọ, n’ọge mgbe a natara ọtụtụ n’ime nnukwu nkeji nile nke ozizi (n’iji maa atụ, nkeji 37, 45, 73, 76, 77, 86, 91 na 132 nke ọbụla n’ime ha nwere mmekọrịta doro-anya na ntụgharị-asụsụ Bible).

N’ime mkpughe ahụ nile, ozizi nile nke ozi-ọma pụtara ìhè ya na nkọwa nile gbasara isi-ọkwu ndị dị mkpa dịka ụdị nke Chukwu, mmalite nke mmadụ, nke bu ezi-okwu maka Setan, ebum n’obi nke ọnọdụ pụrụ ịnwụ anwụ, ịdị mkpa nke irube-isi, mkpa enwere maka nchegharị, ọrụ nile nke Mụọ Nsọ; emume-nsọ nile na emume ngosi nile nke gbasara nzọpụta, akàràkà nke ụwa, ọnọdụ ọdịn’iru nile nke mmadụ mgbe Mbilite n’Ọnwụ gasịrị na Ikpe, ịdị ruo mgbe ebighi-ebi nke mmekọrịta nke ọlụlụ di na nwunye, ebighi-ebi nke ezi na ụlọ. N’otu aka ahụ, mpụta-ìhè ntakịrị-ntakịrị nke usoro nlekọta nke Nzukọ-nsọ ka e gosịrị ya na ọkpụkpọ-oku nke ndị ụkọchukwu, Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, Kansụl nke Iri na Abụọ, na ndị Iri Asaa ahụ na nhiwe nke ọkwa ndị nọ n’isi ndị-ọzọ na ọnụ-ọgụgụ juru aka nile. N’ikpeazụ, ịgba-ama nke e nyere maka Jisus Kraịst—ịdị-nsọ ya, ụdị eze ya, izu-oke ya, ịhụ n’anya ya, na ike mgbapụta ya—mere akwụkwọ a ihe oke uru nye ezi na ụlọ nke mmadụ nile na oke ọnụ-ahịa karịa akụ nile nke elu ụwa dum.

Ọtụtụ n’ime mkpụghe nile ka e bipụtara na Zaịọn (Independence), Missouri, na 1833, n’okpuru aha a kpọrọ A Book of Commandments for the Government of the Church of Christ (Akwụkwọ nke Iwu-nsọ nile maka Ọchịchị nke Nzukọ-nsọ nke Kraịst.) Gbasara mbipụta nke a ndị-okenye nke Nzukọ-nsọ nyere ịgba-ama dị mkpa na Onye-nwe gbaworo ama n’ime mkpuru-obi ha nile na mkpughe nile ndị a bụ ezi-okwu. Dịka Onye-nwe na-aga n’iru n’ịgwa ndị odibo ya okwu, otu nchịkọta nke e mere ka o buo ibu ka e bipụtara mgbe afọ abụọ gasịrị na Kirtland, Ohio, nke a kpọrọ Doctrine and Covenants of the Church of Jesus Christ of Latter-day Saints (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile nke Nzụkọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a). Nye mbipụta a na 1835, ọgbụgba-ama e derede nke Ndị-ozi Iri na-abụọ ka anyapadọrọ si otu a:

Ịgba-ama nke
Ndị-ozi iri na Abụọ Nye Ezi-okwu nke Akwụkwọ
Nke Ozizi Na Ọgbụgba-Ndụ Nile

Ịgba-ama nke ndị Aka-ebe nye Akwụkwọ nke Iwu-nsọ nile nke Onye-nwe, iwu-nsọ nke O nyere Nzukọ-nsọ Ya site n’aka Joseph Smith, Nta, onye olu Nzukọ-nsọ họpụtara nye ọkwa maka nke a:

Anyị, ya mere , nwere mmasị ịgba-ama nye ụwa nile nke ụmụ mmadụ, nye ihe ọbụla e kere eke nọ n’elu iru nke ụwa, na Onye-nwe agbawo-ama n’ime mkpụrụ-obi anyị nile, site na Mụọ Nsọ nke a wụkwasiworo n’elu anyị, sị na iwu-nsọ nile ndia ka enyeworo site na nkwalite-mụọ nke Chineke, na ha bara uru nye ndị mmadụ nile, na ha bụ ezi-okwu n’ezie.

Anyị na-agba-ama nke a nye ụwa, ebe Onye-nwe bụ onye enyem-aka anyị; ma ọ bụ site n’amara Chineke Nna, na Ọkpara Ya, Jisus Kraịst ka e nyere anyị ikike inwe ohere nkea nke ịgbara ụwa nile ama nke a, n’ime nke anyị na-an̄ụrị ọn̄ụ karịrị akarị, na-ekpere Onye-nwe mgbe nile ka ụmụ nke ndị mmadụ nweta uru site n’ebe ahụ.

Aha mmadụ Ịri-na-abuo ahụ bụ:

Thomas B. Marsh

David W. Patten

Brigham Young

Heber C. Kimball

Orson Hyde

Wm. E. McLellin

Parley P. Pratt

Luke S. Johnson

William Smith

Orson Pratt

John F. Boynton

Lyman E. Johnson

Na mbịpụta ndị ọzọ na-esota Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile, a gbakwụnyere mkpughe nile ndị-ọzọ ma-ọbụ okwu ndị ọzọ kwesịrị ndekọta ka agbakwu nyerewo, dịka anatara ya, ma-ọbụ ka e si nabata ha n’ọgbakọ nile nke ndị kwesịrị ma-ọbụ nzukọ zuru-ọha-nile nke Nzukọ-nsọ.

N’ịbido na mbipụta nke 1835, ndokọ usoro ihe-ọmụmụ okpukpe-chi asaa ka e tinyekwara; ndia ka a kpọrọ aha ha Lectures on Faith (Nkuzi nile n’Okwukwe). Ndị a ka a kwadobeworo ịba uru n’Ụlọ-Akwụkwọ nke ndị Amụma, na Kirtland, Ohio, site n’afọ 1834 ruo 1835. Ọ bụ ezie na ha bara uru maka ozizi na nkuzi, e wepụrụ nkuzi ndia site n’Ozizi na Ọgbụgba-ndụ ke mgbe mbipụta nke 1921 n’ihi na e nyeghị ha ma-ọbụ gosi ha dịka mkpụghe nye Nzukọ-nsọ dum.

O doro anya na e meworo ka ụfọdụ amaghị-eme dịgịde na mbipụta nile gara aga, nke ka nke n’ebe a na-akọ akụkọ maka isi-ọkwu nkeji nile. N’ihi nke a, mbịpụta nke a nwere ndezi nile nke akara-oge na aha-ebe nile nakwa ndezi ntakịrị ole na ole ndị ọzọ mgbe o kwesịrị. Mgbanwe ndị a bụ ndị e mere iji mee ka akwụkwọ a na dọkụmenti nile nke akụkọ kwekọrịta. Ụdị ndị ọzọ puru iche nke mbịpụta nke a tinyere ime ka nrụtụ-aka si n’otu ebe gaa ebe ọzọ dị mma karịa, isi-ọkwụ nkeji nile, na nchikọta isi-ọkwu nile, ihe nile bụ nke e mere iji nyere ndị na-agụ aka ịghọta ma n̄urịa ọn̄ụ n’ime ozi nke Onye-nwe otu esi nye ya n’Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile.

Ime ka a mata nile nke nkeji nile nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile nwere nrụtụaka nile nye History of the Church (Akụkọ nke Nzukọ-nsọ). History of the Church bụ akwụkwọ dị ukwu-akwụkwọ asaa nke nkọwasị ndepụta Nzukọ-nsọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a sịte na 1820 ruo 1848. N’ihi na a tụgharịbeghị-asụsụ akwụkwọ ndị a ma ha dị nanị n’asụsụ Bekee, ebe-mnweta nye History of the Church dị na ime ka a mata nke nkeji nile nke mbịpụta nkea a kpọrọ ahụ nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile na-arụtụ aka n’ukwu- akwụkwọ ndị nke nọ n’asụsụ Bekee nke akụkọ a.