Otu Ihe e sere ese n’ụdị Izizi ha Dịbu Sitere n’Akwụkwọ nke Abraham
Nke 3
Nkọwa
Ụdị nke 1. Abraham na-anọdụ n’oche-eze nke Fero, site na nkwenye nke eze ahụ, jiri okpu-eze n’isi ya, na-anọchite anya Ọkwa Nchụ-aja, dịka akara nke isi Ndị-isi Nduzi ahụ n’Elu-igwe jiri mkpara nke ike ikpe ziri-ezi na ikpe n’aka ya.
Ụdị nke 2. Eze Fero, onye e nyere aha ya n’akara nile ahụ di n’elu isi ya.
Ụdị nke 3. Na-egosipụta Abraham n’Ijipt dịka e nyere na Ụdị nke 10 nke n’Ụdị izizi ha dịbu Nke 1.
Ụdị nke 4. Ọkpara-eze Fero, Eze nke Ijipt dịka e dere n’elu aka ya.
Ụdị nke 5. Shoolem, otu n’ime ndị na-apa mmanya nke eze ahụ, dịka akara nile ahụ dị n’elu aka ya nọchitere anya.
Ụdị nke 6. Olimla, otu onye-oru nke ọkpara-eze ahụ.
Abraham na-enye nkọwa ruru ala n’elu ụkpụrụ nile nke mmata maka urukpu nile nke elu-igwe nile n’ime obi-ikpe nke eze ahụ.