Nghazigharị-emere maka Ị gba ndị Ntorobịa Ume
Ọtụtụ Ụmụ Okorobịa-nta na ndị Ụmụ Agbọghọbịa nta g’ebili elu wee merie ịma-aka ahụ ma nọrọ n’ụzọ ọgbụgbandụ ahụ n’ihi nlebanya nke-a a ga elebara ndị ntorobịa anyị.
Ị meela, ezi Onye Isi Nelson, maka mkpughe ọñụ ahụ nke kọwara aka-ebe nile aga agba n’oge baptizim, nakwa odudu nke ị gwara anyị k’anyị kesara maka ịgba ntorobịa ume ma iwulite akaraka nsọ ha.
Tupu m kwuo maka nhazigharị ndị ahụ, anyị n’ekwupụta ekele anyị n’ụzọ pụrụ-iche maka otu ndị otú anyị jiri nabata ntụpụta nile nke Mweghachi-azu oziọma nke ka na-aga n’ihu. Dịka Onye Isi Nelson jiri kwuo afọ gara-aga, unu añụwo ọgwụ vitamin unu!
Unu n’eji ọñụ na amụ Come, Follow Me n’ebe obibi unu. Unu anabatawo nghazigharị nile nke emere nime nzụkọ-nsọ. Ndị otu kworum nile nke ndị okenye, ma ndị ụmụnne-nwanyị nke Otú Enyema-aka jikọrọ aka ọnụ n’arụ ọrụ nke mgbapụta.
Ekele anyị jupụtara na ọnụ. Anyị nwere obi ekele n’ụzọ pụrụ-iche maka ndị ntorobịa anyị ndị siiri ike ma kwụsie ike.
Ndị ntorobịa anyị bi n’ụwa n’oge ọñụ ma n’oge ịma-aka. Nhọrọ nile nke chere ha n’ihu dị nnukwu karịa otu ọ dị na mbụ. Otu ọmụmatụ: ekwentị nke ugbua n’enye ha ohere ị nwete ozi nke dị mkpa ma nke n’ebuli elu, tinyekwara akụkọ agbụrụ nke ezinụlọ ma akwụkwọ-nsọ nile. N’otu aka ahụ, ekwentị nwere ihe nzuzu, ajọ-omume, ma ajọ ihe nke dị nso n’aka karịa otu ọ dị n’oge gara-aga.
N’ihi a chọrọ ị nyere ndị ntorobịa aka gafee nhọrọ ndịa dị rịgọrịgọ, Nzukọ-nsọ akwadowo atụmatụ atọ dị ukwu ma dịkwa ezi nghọta. Nke mbụ, atụmatụ nkuzi-ihe bụ nke agbara ume ma webata ya nime ebe obibi. Nke abụọ, atụmatụ nke ụmụaka na ntorobịa nke egwuregwu ọñụ dị iche-iche na mwulite nke onwe dị nme ya ka atụpụtara ụbọchị Sọnde nke gara-aga site n’aka Onye Isi Russel M. Nelson, Onye Isi M. Russell Ballard na ndị Ọkwa ọrụ Zuru ụwa ndị ọzọ. Nke atọ bụ mgbanwe emere otú nile nke g’eme ka ndị bishop nile na ndị ndu ọzọ lebara ndị ntorobịa anya karịa. Nleba-anya nke-a kwesịrị idi ike nke mụọ ma nyere ndị ntorobịa anyị aka bụrụ ndị ntorobịa-agha nke Onye Isi Nelson gwara ha ka ha bụrụ.
Ụsoro nile
Mbọ ndịa nile , ma ndị ahụ amara okwa ha na afọ ole n’ole gara-aga, abụghị mgbanwe noro onwe ha na nkịtị. Nhazigharị ọbụla n’ọnwe ya bụ otụ akụkụ dị mkpa nke ga-agọzi Ndị-nsọ ma kwado ha izute Chineke.
Otu akụkụ nke atụmatụ ahụ gbasara ndị ogbo nile n’eto-eto. Ndị ntorobịa anyị ka a nagwa ka ha bido n’oge tinyewa aka n’ọrụ dịịrị ha—n’abụghị na ndị nne na nna, na ndị ndu nile ga anara ha oké-n’ọrụ ha nke ha nwere ike ị mee n’onwe ha.
Ọkwa
Taa anyị n’ama ọkwa maka mgbanwe nile otú maka ndị ntorobịa, bido na ngalaba-ụka nta ruo na stek. Dịka Onye Isi Nelson kọwara, Nwanne-nwanyị Bonnie H. Cordon ka akọwa mgbanwe nke ndị ụmụ agbọghọ-ntaa mgbede nke-a. Otu ihe ebunuche mee mgbanwe ndịa, nkem ga-ekwu ugbua bụ ka agba Ndị Ji Ọkwa-nchụ-aja Erọn ume, tinyekwara kworum nile ma ndi isi nke kworum. Mgbanwe ndịa dabara-adaba dịka ọ dị nime Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 107:15, nke gụpụtara“Ndị-otu ụkọchukwu bụ ndị-isi nduzi nke ọkwa nchụ-aja nke [Erọn] , ma na-ejide ọtụghe-ụzọ nile ma-ọbụ ikike nke ọkwa ahụ.”
Otu nime ọrụ nke bishop dịka ọ dị nime akwụkwọ-nsọ bụ ị nọ n’isi ndị nchụ-aja ma ị dụ nye ha ndụmọdụ, ikuziri ya ọrụ ha nile nke ọkwa-ọrụ ha. Na mgbakwụnye, ọnye ndụmọdụ nke mbụ nime ndị-otu ụkọchukwu ga-enwe ọrụ pụrụ-iche maka ndị nkuzi nile, ma onye ndụmọdụ nke abụọ maka ndị dikọnụ.
N’ihi nke-a, dịka o sịrị dị nime mkpuhe nke Ozizi na Ogbụgbandụ nile, aga akwụsị ị nwe Ndị-otú Ndị Isi nke Otú Ụmụ Okorobịa-nta n’ebe ngalaba-ụka nta nọ. Ndị ụmụnne nwoke ndịa kwụsịrị ike n’okwukwe emewo ọtụtụ ihe ọma, m’anyị n’ekele ha.
Anyị nwere olileanya na Ndị-otu ụkọchukwu anyị ga-elebazi anya nime ọrụ ọkwa nchụ-aja nile nke ndị Ụmụ Okorobịa-nta ndịa ma nyere ha aka n’ọrụ kworum ha nile. Ndị nwoke ma nke an’eme ndị bụ ndị ndụmọdụ Ụmụ Okorobịa-nta ka a g’akpọ ị nyere ndị ndị-isi kworum nke Ọkwa-nchụ-aja Erọn na ndị otú bishop aka nime ọrụ ha nile. Anyị nwere obisike na ọtụtụ Ụmụ Okorobịa-nta na ndị Ụmụ Agbọghọbịa nta g’ebili elu wee merie ịma-aka ahụ ma nọrọ n’ụzọ ọgbụgbandụ ahụ n’ihi nlebanya nke-a a ga elebara ndị ntorobịa anyị.
Dịka usoro nke Onye Nwe-anyị kwadoro, bishop nwere oké-n’orụ ịlekọta onye ọbụla na ngalaba ụka-nta. Ọ n’agọzi ndị nne-na-nna nke ndị ntorobịa makwa ndị ntorobịa. Otu bishop chọpụtara na mgbe ọ n’adụkọrịta ọdụ ya na otu onye okorobịa-nta, onye mmehie ponografi ji aka, na ọ nwere ike ị nyere okorobịa-nta ahụ aka na nchegharị ya nanị m’ọbụrụ na ọ nyere ndị nne-na-nna ya aka gosi ya ịhụnanya na nghọta n’ọnọdụ ya nke-a. Ọgwụgwọ nke nwata nwoke nke-a bụkwa ọgwụgwọ nke ezinụlọ ya, ma nke-a gadị iré site naka bishop ahụ ịrụ ọrụ ya maka onye nile nọ nime ezinụlọ ahụ. Ugbua, nwa nwoke ahụ bụzi onye ji Ọkwa nchụ-aja Melkizedek tozuru oké ma onye mgbasa oziọma n’uju ya.
Dịka akụkọ a gosiri, nhazigharị nkea ga:
-
Enyere ndị bishop na ndị ndụmọdụ ha aka lebanya nime ọkpụrụkpụ ọrụ ha nke metụtara ndị ntorobịa na ụmụaka nke Pramarị.
-
Dobe ike na ọrụ nile nke Ọkwa nchụ-aja Erọn n’etiti ndụ na ebumnuche nile nke nwa nwoke ọbụla.
Nhazigharị ndịa gakwa:
-
A kọwazi ọké n’orụ nile nke ndị isi kworum Ọkwa nchụ-aja Erọn ọfụma nakwa na ọnye ha ga n’enye nkọwa ọrụ bụ ndị otú bishop.
-
Kpalie ndị okii bụ ndị ndu ka ha nye aka ma duzie ndị isi kworum Ọkwa nchụ-aja Erọn ka ha mujupụta ike na ikike nke ọkwa-ọrụ ha.
Dịka akọwara, nhazigharị ndịa ewedaghi oké-n’ọrụ nke ndị otú-bishop nwere maka ndị ụmụ agbọghọ-nta. Dịka Onye Isi Nelson kụziri ugbua, “Ọrụ mbụ na nke kachasị mkpa [bishopụ] bụ ịlekọta ndị okorobịa-nta na ndị agbọghọ nta nke ngalaba ụka nta ya.”
Kedụ otu ndị bishopụ ọma anyị, ndị n’arụsi ọrụ ike g’eji mezuo oké n’ọrụ nke-a? Dịka ị ga-echeta, n’afọ 2018, ahazigharịrị kworum nile nke Ọkwa nchụ-aja Melkizedek ka ha na Otú enyem-aka rụkọta ọrụ ha, ka ndị kworum nile nke ndị okenye na Otú nile nke Enyemaka nwe ike, nokpuru nduzi nke bishọpụ, nyere ya aka buo ibu anrụ nke ọrụ ya nile ndị ahụ n’ewere ọtụtụ oge ya. Ọrụ ndịa bụ ọrụ nke mgbasa ọziọma, na ọrụ nke tempụl na akụkọ ezinụlọ nke ngalaba ụka-nta ahụtinyekwa ọtụtụ ọrụ nke ije ozi-nleta nke ndị otú ngalaba ụka-nta.
Bishọpụ agaghị ahapụrụ mmadụ ụfọdụ ọrụ, dịka ị gba ndị ntorobịa ume, ị bụ ọka ikpe nke ọha, ịlekọta ndị nọ na mkpa, ma ilekọta okwu-ego na ịhe ndị ozo. Ịhe ndịa, kosiladị, dị ntakịrị karịa otu anyị ghọtara na mbụ. Dịka Okenye Jeffrey R. Holland kọwara afọ gara-aga n’oge ahụ a mara okwa gbasara nhazigharị nke kworum nille nke Ọkwa nchụ-aja Melkizedek. “Onye bishọpụ ka bụkwa onye ndu ọkwa nchụ-aja dị elu nke ngalaba-ụka nta. Nhazigharị ọhụrụ [nke kworum nile nke ndị okenye na otú nile nke Enyemaka] g’eme ka ọ nọrọ n’isi ọrụ nke Ọkwa nchụ-aja Melkizedek na nke Otú Enyemaka n’abụghị ka ọ mee ka ọ rụọ ọrụ nke dịrị otú abụọ ndịa.
N’ọmụmatụ, otu onye isi Otú Enyemaka na Onye Isi kworum ndị okenye, dịka enyere ikike ọrụ, nwere ike ị nara ọrụ nnukwu nke ịdụkọrịta ọdụ ya na ndị okii—dịkakwa otu onye isi nke otú Ụmụ Agbọghọ-nta n’ịdụkọrịta ọdụ ya na ndị ụmụ agbọghọ-nta. Nanị onye bishọpụ g’abụ onye ọka-ikpe nke ọha, ndị ndu ọzọ ndịa nwekwara ike ị nata mkpughe si n’elu igwe maka ị nyere ha aka nime ịma-aka ọbụla nabụghị nke onye ọka-ikpe ọha g’ahụ maka ya m’ọbụ nke gbasara mmerụ-arụ ụdị ọbụla.
Nke apụtaghị na nwa agboghọ ọbụla enweghi ike m’ọbụ ọ kwesịghị ị kwusara onye bishop na ndị nne-na-nna ya okwu. Ịlebara ndị ntorobịa anya bụ ọrụ ha! Mana nke-a pụtara na o nwere ike bụrụ na otu onye ndụ Ụmụ agbọghọ nta karịrị nwe ike ị gbo mkpa nile nwa agbọghọ ọbụla. Otu ndị ụmụ okorobịa nta jiri dịịrị ndị otú bishọpụ mkpa bụkwa otu ndị ụmụ agbọghọbịa nta jiri dịịrị, kama anyị kọtara ike nke n’abịa site n’ịnwe ndị ndụ Ụmụ agboghọ-nta siri ike, ndị n’ahụ n’anya ma n’eduzi, na anapụghị ndị isi klasị ọrụ ha, kama n’enyere ndị ntorobịa aka n’imejupụta ọrụ nile ndịa.
Nwanne-nwanyị cordon g’ekwu maka mgbanwe ọñụ ndị ọzọ emere maka ndị ụmụ agbọghọ-nta n’abalị a. Mana a na m ama okwa na ndị isi nke otú Ụmụ Agbọghọ-nta gazi n’enye nanị bishọpụ ngalaba ụka-nta ahụ nkọwa ọrụ ha ma nata ndụmọdụ n’aka ya. N’oge gara-aga, ọrụ nke-a ka enwere ike ị hapụrụ otu onye ndụmọdụ, mana site ugbua gawa, ụmụ agbọghọ gazi a nọ n’aka onye ahụ ji ọtughe nile nke ngalaba ụka ahụ. Onye isi nke Otú Enyemaka ga aga n’ihu n’enye nanị bishọp nkọwa ọrụ ya.
Maka gburugburu ụwa nile ma gbadata na stek, anyị ga aga n’ihu n’enwe Ndị Isi Nduzi nke Otú Ụmụ okorobịa-nta. Maka nke stek, onye high councilor gazị abụ onye isi otú umu okorobịa-nta ma, ya ndị high councilor ahụ enyere ikike ị hụ maka otú nile nke Ụmụ agbọghọ-nta na Praịmarị, soro ma bụrụ ndị otú kọmịtii Ọkwa nchụ-aja Erọn – na nke Ụmụ Agbọghọ-nta. Ndị ụmụnne nwoke ndịa na onye isi otú Ụmụ Agbọghọ-nta nke stek garụkọ ọrụ nọtụ kọmitii a. N’ihi otu onye ndụmọdụ onye isi stek bụ onye isi, otú kọmiti nke-a gazi enwe mkpa dị elu n’ihi ọtụtụ atụmatụ na egwuruegwu nọ nime atụmatụ ọhụrụ maka Ụmụaka na Ntorobịa ka a g’eme na stek.
Ndị high councilor ndịa, ndị nọ n’okpuru ndị isi stek, nwere ike ịbụ enyemaka nye bishọpụ na ndị kworum nile nke Ọkwa nchụ-aja Erọn n’ụzọ dịkwaka ije-ozi ahụ ndị high councilor n’enye ndị kworum nile nke ndị okenye nke ngalaba ụka nta.
Ịhe ọzọ metụtara nke-a, onye high councilor ọzọ g’eje ozi dịka onye isi Ọmụmụ-ịhe Sọnde nke stek ma, mgbe ọ dịmkpa, ọ nwere ike jee ozi nime otú kọmịtii nke stek maka Ọkwa nchụ-aja Erọn – na nke Ụmụ Agbọghọ-nta.
Mgbanwe nhazi otú ndị ọzọ emere ka a ga-akọwazi nime ozi ezigara ndị ndu. Mgbanwe ndịa bụ:
-
Komịtii nke ndị otú bishop na ntorobịa bụ nke ejiri otú kansụl ndị ntorobịa dochie.
-
Okwu nke-a “Mutual” ga ala ezumike nka ma bụrụzie “egwuregwu nke ndị Ụmụ agbọghọ-nta,” “egwuregwu nke ndị kworum nke Ọkwa nchụ-aja,” m’ọbụ “ egwuruegwu nke ndị ntorobịa,” a g’eme nkea izu-ụka nile n’ebe ọ kwere omume.
-
Akpa-ego maka egwuruegwu ndị ntorobịa ka a ga eke ka ha hanra otu n’etiti ụmụ okorobịa-nta na ụmụ agbọghọ-nta dịka ọnụ-ọgụgụ ndị ntorobịa siri diri nime otú ọbụla. A ga ewepụta ezigbo ego maka egwuruegwu ndị Praịmarị.
-
N’ebe nile—na ngalaba ụka-nta, na stek ma zuru ụwa nile—aha anyị gazi akpọ otú ndịa bụ “organization” ma ghara ị kpọ ha “auxiliary.” Ndị ndu Otú Enyem-aka Zuru Ọha, Ụmụ Agbọghọ-nta, Ụmụ Okorobịa-nta, Praịmarị, na Ọmụmụ-ihe Sọnde ka aga akpọ “Ndị Ọkwa-ọrụ Zuru-ọha.” Ndị ndu organization nile nke ngalaba ụka-nta na nke stek ka aga akpọ “ndị ọkwa-ọrụ nke ngalaba ụka-nta” na “ndị ọkwa-ọrụ nke stek.”
Nhazigharị ndịa amara ọkwa ya taa nwere ike ibido mgbe ọbụla ngalaba ọbụla dị njikere, mana ha kwesịrị ị dị otua n’ọnwa Jenụwarị 1, 2020. Nhazigharị ndịa, mgbe agbakwụnyere ya ma tinye ya nime nhazigharị emere na mbụ, n’egosi mbọ nsọ nile nke dabara-adaba dịka ozizi sịrị kwuo maka ị gọzị ma gbaa ume nye nwoke, nwanyị, ntorobịa na nwata ọbụla, wee n’enyere onye ọbụla aka isoro ọmụmatụ nke Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, dịka anyị n’aga n’ihu n’ụzọ ọgbụgbandụ ahụ.
Ụmụnne ọma ndị nwoke na nwanyị, a nam ekwe unu nkwa ma n’agba ama na nhazigharị ndịa n’uju ha, n’okpuru nduzi nke onye isi na onye amụma, Russell M. Nelson, g’enye ike ma gbaa onye otú Nzukọ-nsọ ọbụla ume. Ndị ntorobịa anyị g’enwe nnukwu okwukwe nime Onye nzọpụta karịa, nwete nchekwa n’ebe ọnwụnwa nile nke onye iro dị, ma guzoro ọtọ ị kwado i megide ịma-aka nile nke ndụ a. Site na aha di nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen