2010–2019
Iwu-nsọ nke Abụọ Dị Ukwuu
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


2:3

Iwu-nsọ nke Abụọ Dị Ukwuu

Ọńụ anyị kacha elu na-abịa dịka anyị n’enyere ụmụnne anyị ndi nwoke na ndi nwanyị aka.

Ezi ụmụnne m ndi nwoke na ndi nwanyị, unu emeela maka ihe niile unu na-eme inye aka kpọkọta Izrel n’aka abụọ nke ndụ, ịgba ezinaụlọ unu ume, na ịgọzi ndụ nke ndi nọ na mkpa. Unu emeela maka ibi ndụ dịka ezi ndi nsiso nke Jizọs Kraịst. Unu maara ma nwee mmasị irube isi nye iwu-nsọ Ya abụọ dị ukwuu, ịhụ Chineke n’anya na ịhụ ndi agbata obi unu n’anya.

N’ime ọnwa isii ikpeazụ, mụ na Nwanne nwanyị Nelson zutere ọtụtụ puku Ndi Nsọ dịka anyị meworo njem gaa Central na Ndịda Amerịka, island nke Pasifik, na obodo dị iche iche dị n’ime United States. Dịka anyị mere njem, olile anya bụ iwulite okwukwe unu . Ma mgbe niile anyị na alọghachi inwetewo mgbam ume nye okwukwe anyị site n’aka ndi otu na ndi enyi anyị zutere. Enwere m ike m kwuo oge atọ bara uru site na nhụmihe anyị na nso nso?

Onyeisi Nelson n’ime New Zealand
Onyeisi Nelson n’ime New Zealand

Na Mee, mụ na Nwanne nwanyị Nelson mere njem anyị na Okenye Gerrit W na Nwane nwanyị Susan Gong gaa Ndịda Pasifik. Ka anyị nọ na Auckland, New Zealand, anyị nwetere nnukwu ugwu izute ndi imam sitere na mọsk abụọ n’ime Christchurch, New Zealand, n’ebe nanị ọnwa abụọ na mbụ, ndi n’efe ufufe aka ha dị ọcha ka agbagburu n’ime ọgba aghara jọgburu onwe ya.

Anyị gosipụtara obi ọmịiko anyị nye ụmụnne nwoke ndia nke okwukwe ọzọ ma kwusie ike nkwekọrịta nke onwe anyị maka nnwere onwe nke okpukpechi.

Anyị nyekwara ọrụ efu na enyem aka ego dị mma iji rụgharịa mọsk ha. Nzukọ anyị na ndi ndu Muslim jupụtara na ngosipụta nke nwanne dị nrọ.

Ndi nrite Oche ndi Ngwọrọ n’ime Argentina
Ndi nrite Oche ndi Ngwọrọ n’ime Argentina

Na Ọgọst, anyị na Okenye Quentin L. na Nwanne nwanyị Mary Cook, Nwanne nwanyị Nelson na mụ zutere ndi mmadụ n’ime Buenos Aires, Argentina—ọtụtụ n’ime ha abụghị nke okwukwe anyị—ndi ndụ ha gbanweworo n’ihi oche ndi ngwọrọ eweteere ha site n’aka Otu Afọ-ọma Ndi Nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a. Anyị nwetere nkwalite mụọ dịka ha kwupụtara obi ekele ha jupụtara n’ọńụ maka ụkwụ ọhụrụ ha nweteworo.

Oge nke atọ mara mma mere nanị izu ụka ole ma ole gara aga n’ebe a n’Obodo Salt Lake. Ọ sitere na akwụkwọ ozi pụrụ iche m natara na ụbọchị ncheta ọmụmụ m n’aka otu onye iyom nta m ga-akpọ Meri—gbara afọ 14.

Meri dere gbasara ihe niile mụ na ya nwekọtara ọnụ: I nwere ụmụ 10. Anyị nwere ụmụ 10. I na-asụ asụsụ Mandarin. Ụmụ asaa n’ime ezinaụlọ m, gụnyekọta mụ, ka apọtara site na China, ya mere Mandarin bụ asụsụ mbụ anyị. Ị bụ dọkịnta na-awa obi. Nwanne m nwanyị [awawo] obi ya ugboro abụọ I nwere mmasị na nzukọ nsọ awa abụọ. Anyị nwere mmasị na nzukọ nsọ awa abụọ. Ị na-agụ egwu nke ọma. Nwanne m nwoke na-agụkwa egwu nke ọma. O kpuru isi dịka m.”

Okwu nke Meri metụtara m nke ukwuu, n’ekwupụta ọbụna nanị nnukwu mụọ ya kama nakwa nyefechasị nke nne ya na nna ya.

Ndi Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, dịka ndi ọzọ n’eso Jizọs Kraịst, na-achọ mgbe niile ụzọ esi enye aka, ibuli, na ịnwe ịhụnanya nye ndi ọzọ. Ha ndi dị njikere ịkpọ ha ndi nke Onye-nwe-anyị “dị na njikere iburita ibu-arọ onye ọbụla nye ibe ya, … isoro ndị na-eru uju iru uju; … ma [ị] kasi ha obi bụ ndị chọrọ nkasi-obi.”

Ha na-achọsike idebe iwu nsọ ukwuu nke mbụ na nke abụọ. Mgbe anyị hụrụ Chineke n’anya jiri obi anyị niile, Ọ na-atụgharị obi anyị na ọdịmma nke ndi ọzọ n’ụzọ mara mma ziri ezi.

Ọ gaghị adị mfe ịgụta ije-ozi nke Ndi Nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a n’enye gburu gburu ụwa ụbọchi niile afọ niile, mana ọ bụ ihe dị ire ịgụta ihe ọma Nzukọ nsọ dịka otu na-eme ịgọzi ndi nwoke na ndi nwanyị—ụmụnta nwoke na nwanyị—ndi nọ na mkpa enyemaka.

Enyemaka ndi mmadụ nke Nzukọ nsọ ka ebidoro na 1984. Mgbe ahụ ibu-ọnụ gburu gburu Nzukọ nsọ ka emere iji kpakọ ego eji enyere ndi ahụ ọkọchị n’agbawa obi metụtara n’ime ọwụwa anyanwụ Afrịka. Ndi otu Nzukọ nsọ nyere nde $6.4 nanị n’ụbọchị ibu-ọnụ ahụ.

Okenye Ballard mgbe ọ nọ n’ime Ethiopia

Emesịa Okenye M. Russell Ballard na Nwanne nwoke Glenn L. Pace ka edupụrụ gaa Ethiopia ịga mata otu esi etinye n’ọrụ nke ọma ego niile ewepụtara. Mgbalị nkea gosiri ịbụ mbido nke ihe ga-emesi bụrụ Otu Afọ-ọma Ndi Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a.

Kemgbe oge ahụ, Otu Afọ-ọma Ndi Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a ewetewo karịa dọla ijeri abụọ n’enyemaka iji nyere ndi nọ na mkpa aka gburu gburu ụwa. Enyemaka nkea ka a n’enye ndi nrite n’agbanyeghị okpukperechi ha, mba ha si, agbụrụ, nghọta mmekọrịta ha, oke ma ọbụ nne, ma ọbụ ọchịchọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Nke ahụ abụghị ihe niile. Inyere ndi otu Nzukọ nsọ nke Onye-nwe-anyị nọ na mkpagbu aka, anyị nwere mmasị ma n’ebi iwu mgbe ochie nke ibu-ọnụ. Anyị na-ebu ọnụ inyere ndi ọzọ nọ na-agụrụ aka. Otu ụbọchị kwa ọnwa, anyị na-aga erịghị nrị ma nye ihe nri anyị pụtara (ma karịa) inyere ndi nọ na mkpa aka.

Agaghị m echefu njem nke mbụ na Ọdịda Anyanwụ Afrịka n’afọ 1986. Ndi Nsọ bịara nzukọ anyị n’igwe. N’agbanyeghị ha nwere obere gbasara ihe nke ụwa, ọtụtụ bịara yiiri uwe ọcha n’enweghị ntụpọ.

A jụrụ onye-isi stek otu o si elekọta ndi otu niile nwere obere ihe. Ọ zaghachịrị na ndi bishọp ha maara ndi ha nke ọma Ọ bụrụ na ndi otu nwere ike inye onwe ha nrị ugboro abụọ kwa ụbọchi, enweghị enyemaka ha chọrọ. Mana ọ bụrụ na ha ga-enye onwe ha nanị otu ugboro nrị ma ọbụ obere—ọbụna ma enyemaka ezinaụlọ—ndi bishọp n’ewete nri, site na onyinye nke ibu-ọnụ. Ma ọ gbakwunyere eziokwu nke ahụrụ anya: ụtụ onyinye ibu-ọnụ ha mgbe niile na-agafe mkpafu ha. Mmapụta onyinye ibu-ọnụ mgbe ahụ ka aga ezigara ndi mmadụ ebe ọzọ ndi mkpa ha gafere nke ha. Ndi Nsọ ndi ahụ guzosiri ike kuziiri m otu nkuzi dị ukwuu gbasara ike nke iwu ahụ na mụọ ahụ nke ibu ọnụ.

Dịka ndi otu Nzukọ nsọ, anyị n’enwe mmetụta mmekọrịta nye ndi ahụ na-ata ahụhụ n’ụzọ ọbụla. Dịka ndị nwa opara na nwa ada nke Chineke, anyị niile bụ ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị. Anyị n’esoro ndụmọdụ nke Testament Ochie: “Ị ga-emepe aka gị mbara nye nwanne gị nwoke, nye ndi dara ogbenye, na ndi gị nọ na mkpa.”

Anyị nakwa agbalị ibi nkuzi niile nke Onye-nwe-anyị Jizọs Kraịst dịka edere n’ime Matiu 25:

“Ma a nọọrọ m na-agụụ, ma gị enye m nri: akpịrị kpọrọ m nkụ, ma gị enye m mmiri: a bụụrụ m onye ezi, ma gị akpọbata m n’ime:

“Agba m ọtọ, ma gị enyem uwe: a nara m aria, ma gị abịa leta m. …

“… Ọbụna na unu emewo ya nye otu onye n’ime ụmụnne m ndia, unu emewo ya nye m.”

Ka m kwuo nanị ọmụmatụ ole ma ole otu Nzukọ nsọ n’esi eso nkuzi nke Onye-nzọpụta ndia.

Ụlọnchekwa nke Bishọp

Inye aka kwusị agụụ, Nzukọ nsọ nwere ụlọnchekwa nke bishọp 124 gburu gburu ụwa. Site na ha, ihe ruru nri 400,000 ka enyere afọ ọbụla nye ndi mmadụ nọ na mkpa. N’ebe a na-enweghị ụlọnchekwa, ndi bishọp na ndi-isi ngalaba nta n’esi na ego ibu-ọnụ nke Nzukọ nsọ were iji nye nri na iheahịa maka ndi otu ha nọ na mkpa.

Otuosiladị, aka mgba nke agụụ na-agafe karịa oke nke Nzukọ nsọ. Ọ na-amụba gburugburu ụwa. Akụkọ United Nations na nso nso a gosiri na ọnụọgụgụ ụmụ ụwa ndi n’erighị ezigbo nri ugbua akarịala ijeri mmadụ 820—ma ọbụ ruo otu onye n’ime mmadụ itolu nke ụwa.

Ụdị ọnụọgụgụ n’emetụ n’obi! Otu anyị si jupụta n’obi ekele n’ihi ụtụ unu niile. Ekele dịrị mbasara nke si unu n’obi, ọtụtụ ijeri gburu gburu ụwa ga-anata nri ha chọrọ nke ukwuu, uwe, ebe mgbaba nwa oge, oche ndi ngwọrọ, ọgwụ, mmiri dị ọcha, ma karịa.

Ọtụtụ nrịa nrịa gburu gburu ụwa bịara n’ihi mmiri n’adịghị ọcha. Ruo taa, nchepụta enyemaka ndi mmadụ nke Nzukọ nsọ enyewo aka wete mmiri dị ọcha n’ime ọtụtụ narị obodo n’ime mba 76.

Otu ọrụ n’ime Luputa, n’ime Democratic Repụblik of Congo, bụ nnukwu ọmụmatụ. Inwe ọnụ ọgụgụ ndi mmadụ gafere 100,000, obodo ahụ enwebughị mmiri dị mma. Ndi obodo na-aga ogologo ije inwete mmiri dị mma. A chọpụtara mountain spring maịlụ 18 (29 km) n’ihu, ndi ime obodo enweghị ike inwete mmiri ahụ mgbe ọbụla ha chọrọ.

Igwu olulu mmiri

Mgbe enyemaka ndi mmadụ ndi mgbasa ozi anyị matara gbasara aka mgba nkea, ha rụrụ ọrụ ha na ndi ndu nke Luputa site n’inye ngwa ọrụ niile na nkuzi ịdọ mmiri banye n’obodo. Ndi mmadụ nke Luputa gburu afọ atọ igwu otu mita n’ime ala site na okwute na ime ọhịa. Site n’ịrụkọta ọrụ ọnụ, ụbọchị ahụ jupụtara n’ọńụ n’ikpeazụ bịarụrụ mgbe mmiri dị mma dị ọcha ka emere irute onye niile n’ime obodo ahụ.

Ibu mmiri

Nzukọ nsọ nakwa enyere ndi gbara ọsọndụ aka, ma ọbụ site na ọgbaghara nke ime obodo, mmebisi nke okike, ma ọbụ mmegbu nke oziọma. Ihe karịrị ijeri mmadụ 70 ugbua enweghịzi ebe obibi ọbụla ha nwere.

Ije-ozi nlekọta nye ndi ọsọ ndụ

N’ime afọ 2018 nanị, Nzukọ nsọ wetere ihe-ahia mberede nye ndi ọsọndụ n’ime mba 56. Na mgbakwunye, ọtụtụ ndi otu Nzukọ nsọ n’enye oge ha n’ọrụ efu iji nyere ndi ọsọndụ aka nọzie n’ime obodo ọhụrụ. Anyị n’ekele onye niile n’ime unu ndi n’enyere ndi ahụ na-agbalị imepụta ebe obibi ọhụrụ aka.

Iké uwe

Site n’onyinye emesara aka nye ụlọ ọrụ Industrị Deseret n’ime United State, ijere pound akwa ka a nakọtara ma họọ kwa afọ. Ebe ndi bishọp anyị n’eji nkepụta nkea bara ụba nyere ndi otu nọ na mkpa aka, akụkụ ahụ kacha elu ka enyere otu-afọ-ọma ndi ọzọ ndi n’ekesa ihe ndia gburu gburu ụwa.

Ma nanị afọ ikpeazụ gara aga, Nzukọ nsọ wetere nlekọta anya maka ihe karịrị mmadụ 300,000 n’ime mba 35, nlekọta nwa ọhụrụ maka ọtụtụ nde ndi nne na ụmụaka n’ime mba 39, na oche ndi ngwọrọ karịrị mmadụ 50,000 bi n’ime mba karịrị otu dọzịn.

Nzukọ nsọ ka amaara ama maka ịnọ n’etiti ndi mbụ n’aza oku mgbe ọdachi kụrụ. Ọbụna tupu họrịken emee, ndi ndu Nzukọ-nsọ na ndi ọrụ nọ n’ebe ahụ n’eme atụmatụ maka otu ha g’esi ziga ihe enyemaka ma wepụta onwe ha maka inyere ndi ahụ ihe ga-emetụ aka.

Ndi yi uwe Helping Hands Eje-ozi

Nanị afọ gara aga, Nzukọ nsọ nyere aka ihe karịrị ọrụ 100 gburu gburu ụwa, nenyere ndi họrịken, ọkụ, iju mmiri, ala ọma jijiji, na mbibi ndi ọzọ metụrụ aka. Mgbe ọbụla ọ dị mfe, ndi otu Nzukọ nsọ yi uwe Aka Enyemaka na-acha edo edo na-akwado n’igwe inye aka ndi ihe metụrụ site na ọdachị. Ụdị ije-ozi nkea, enyere site n’aka ọtụtụ n’ime unu, bụ nzube nke ije-ozi nlekọta.

Ezigbo ụmụnne m ndi nwoke na ndi nwanyị, ihe ndia m kọwaworo bụ nanị obere akụkụ nke uto ọdịmma na enyemaka ndi mmadụ nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndi Nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a. Ma unu bụ ndi na-eme ihe niile a adị ire. N’ihi ndụ ọmụmatụ unu, obi unu sara mbara, na aka enyemaka unu, ọdịghị ịtụnanya na ọtụtụ obodo na ndi ndu gọvment n’eto mgbalị unu.

Kemgbe m bụụrụzi Onye-isi nke Nzukọ nsọ, ọ tụwo m n’anya otu ọtụtụ ndi isi, ndi prime minista, na ndi ambasadọ siworo kele m n’ezie maka enyemaka ndi mmadụ nye ndi ha. Ma ha egosipụtawokwa obi ekele maka mgbam ume nke ndi otu anyị jupụtara n’okwukwe n’ewetere mba ha dịka ndi otu mba enwere ntụkwasị obi n’enyeaka n’obodo.

Enwetewo m ịtụnanya dịka ndi ndu ụwa leteworo Otu Ndi Isi Mbụ n’egosipụta olile anya ha maka ịrụpụta Nzukọ nsọ n’ala ha. Maka Gịnị? N’ihi na ha ma na Ndi Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a ga-ewupụta ezinaụlọ na obodo siri ike, na-eme ndụ ndi ọzọ adị mma karịa n’ebe ọbụla ha bi.

N’agbanyeghị ebe anyị n’akpọ ebe obibi, ndi otu Nzukọ nsọ na-enwe mmetụta obi gbasara ịbụ nna nke Chineke na ịbụ nwanne nke mmadụ. Ya mere, ọńụ anyị kacha elu na-abịa dịka anyị n’enyere ụmụnne anyị ndi nwoke na ndi nwanyị aka, n’agbanyeghị ebe anyị bi n’ime ụwa nkea dị ịtụnanya.

Inye ndi ọzọ enyemaka—n’eme mgbalị pụtara ihe ịlekọta gbasara ndi ọzọ dịka karịa otu ma ọbụ karịa ka anyị n’elekọta gbasara onwe anyị—bụ ọńụ anyị. Kacha nke, enwere m ike ịgbakwunye, mgbe ọ n’adịghịrị anyị mfe na mgbe anyị anọghị ebe dị anyị mma. Ibi ndụ iwu nsọ nke abụọ dị ukwuu bụ ihe ọtụghe ịbụrụzi ezi onye-na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.

Ezigbo ụmụnne m ndi nwoke na ndi nwanyị, unu n’ebi ndụ ọmụmatụ niile nke mkpụrụ ndi n’abịa site n’isoro nkuzi niile nke Jizọs Kraịst. I meela! A hụrụ m gị n’anya!

A ma m na Chineke dị ndụ. Jizọs bụ Kraịst ahụ. Nzukọ nsọ Ya ka eweghachitere n’ụbọchi ikpeazụ ndia imejupụta ebumnuche ya dị nsọ. Otu a ka m si gbaa ama n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.