Bịanụ, Soro M—Atụmatụ nke Onyenwe anyị Tụrụ na gboo maka Ịgbanarị ọnwụnwa
Onyenwe anyị na-akwado ndị Ya maka iguzogide mbuso agha nke onye iro. Bịanụ, Soro M bụ atụmatụ nke Onyenwe anyị Tụrụ na gboo maka Ịgbanarị ọnwụnwa.
Anyị na-ańụrị ọńụ na-izukọta ọnụ na ọgbakọ izugbe nke a dị ukwuu nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a. Ọ bụ ngọzị ị nata echiche na uche nke Onyenwe anyị site na nkuzi nke ndị amụma na ndị ozi Ya. Onyeisi Russell M. Nelson bụ onye amụma Chineke dị ndụ taa. Obi juru anyị n’ekele maka ndụmọdụ na ntụzi aka anyị natara taa site na mkpalite nke mmụọ ya.
A na m agbakwunye aka ebe m na nke ndị ahụ a gbararịị na mbụ. A na m agba ama maka Chineke, Nna anyị nke dị Ebighị ebi. Ọ dị ndụ, hụ anyị naanya ma na-elekọta anyị. Atụmatụ nke ọńụ Ya na-enye ohere inweta ngọzị ndụ anụ ahụ nke a nakwa anyị ịlaghachi n’iru Ya ma emesịa.
A nakwa m agba ama banyere Jizọs Kraịst. Ọ bụ Ọkpara nke Chineke Mụrụ Naanị Ya. Ọ zọpụtara anyị site n’ọnwụ, Ọ na-agbapụtakwa anyị na mmehie ma anyị tụkwasị okwukwe na Ya ma chegharịa. Aja mgbaghara mmehie na-enweghị ọgwụgwụ Ya a chụrụ maka anyị wetara ngọzị nke anụ ahụ anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi. Na-ezia, “Ekele dịrị Chineke maka onyinye na-enweghị atụ nke ọkpara Ya dị nsọ” (“Kraịst Ahụ Dị Ndụ: Ama nke Ndị Ozi ahụ,” Laịhona, Mee 2017, n’ime ihu akwụkwọ).
Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ na gburugburu ụwa bụ ndị nwere ngọzị ife Jizọs Kraịst ofufe na tempụl Ya niile. Otu n’ime tempụl ndị ahụ ka a na-arụ ugbu a na Winnipeg, Canada. Mụ na nwunye m, Anne Marie, nwere ohere ị ga leta ebe ahụ ọrụ na-aganiihu na Ọgọst afọ nke a. E sere tempụl ahụ nke ọma nke na ọ ga-ama mma dị egwu ma arụsịa ya. Kaosiladị, i nweghị ike inwe tempụl mara mma dị egwu na Winnipeg, ma ọbụ ebe ọbụla ọzọ, na-enweghị ntọala siri ike kwụ chịm.
Ọnọdụ nke obosara ala oyi kpọrọ nkụ e nwere na Winnipeg mere ka ọ raa ahụ ị kwado ntọala tempụl ahụ. Ọ bụ ya mere ka ekpebie na a ga-eji ukwu igwe 70 e jiri kọnkịrị kpụọ tụọ ntọala ya. Ukwu ihe ndị a dị nzọ ụkwụ 60 n’ogologo na ntụ si na 12 ruo na 20 (30 ruo na 50 cm) na obosara ya. A kpọnyere ha n’ime ala tutu ha erute na nkume, ihe fọdụrụ ntakịrị ka o ruo nzọ ụkwụ 50 (15 m) n’ime ala. N’ụzọ dị otu a, ukwu 70 ahụ mere ka ntọala ọmarịcha tempụl Winnipeg ahụ sie ezigbo ike, kwụrụ chịm.
Dị ka Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, anyị na-achọkwa ụdịrị ngọzị ahụ na ezi ntọala na ndụ anyị—ntọala nke ime mmụọ a chọrọ maka njem anyị na-eme site na ndụ anụ ahụ nke a ruo na-ịlaghachi na-ebe obibi anyị n’eluigwe. A tọrọ ntọala ahụ n’oke nkume nke ntọgharị anyị nye Jizọs Kraịst Onyenwe anyị.
Anyị na-echeta nkuzi niile nke Hilaman si n’Akwụkwọ nke Mọmọn: “Ma ugbua, ụmụ m ndị nwoke, chetanụ, chetanụ na ọ bụ nʼelu nkume nke Onye Mgbapụta anyị, onye bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke, ka unu ga-ewurịrị ntọala unu; ka ọ ga-abụ mgbe ekwensu ga-ezipụ ikuku ike ya, ee, akụ ya nile n’ime ifufe-gburu-gburu, e, mgbe uzu mmiri elu-igwe ya na ebili mmiri ike ya ga-apịakwasị unu, ọ gaghị enwe ike nʼarụ unu ịdọkpụda unu nʼolulu nke nhuju-anya na ahụhụ agwụgh-agwụ, n’ihi nkume ahụ nʼelu nke e wuru unu, nke bụ ezigbo ntọ-ala, ntọ-ala nʼelu nke ọbụrụ na ndị mmadụ wuo ụlọ, ha agaghị ada” (Hilaman 5:12).
Nʼobi ekele, anyị dị ndụ nʼoge ndị amụma na ndị ozi na-akụziri anyị ihe banyere Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst. Ị gbasoro ndụmọdụ ha na-enyere anyị aka ịtọ ntọala kwụ chịm nʼime Kraịst.
Na-afọ gara aga, n’okwu mmepe ya na ọgbakọ izugbe nke Ọktoba 2018, Onyeisi Russell M. Nelson mara ọkwa nke a na ịdọ aka na ntị sị: “Ebum n’uche Nzukọ-nsọ ahụ ka mgbe ụwa bụ, ị nyere ndị otu niile aka iwulite okwukwe ha n’ime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Aja Mgbaghara mmehie Ya, ị nyere ha aka ime, na idobe ọgbụgba ndụ ha na Chineke gbara, na ị gba ezinụlọ ha ume ma rachie ha. Na ụwa nke taa gbara ịgharamịịgha, ihe nke a adịghị mfe. TOnye iro na-aganiihu na agha ọ na-ebuso okwukwe na anyị onwe anyị nakwa ezinaụlọ niile n’ụzọ dị oke ọkụ ọkụ. Nʼịnya ndụ nke ime mmụọ , anyị kwesịrị inwe Atụmatụ a tụrụ na gboo maka ịgbanarị ọnwụnwa” (“Okwu Mmepe,” Laịhona, Nov. 2018, 7; okwu e kwuru ugboro ugboro ka agbakwunyere).
Ka ozi Onyeisi Nelson gasịrị, Okenye Quentin L. Cook nke Kworum Ndị ozi Iri na abụọ webatara Bịanụ, Soro M akwụkwọ ọmụmụ ihe nke ndị mmadụ na ndị ezinaụlọ ji amụ ihe. Okwu o kwuru gụnyere okwu ndị a na-esota:
-
“ Bịanụ, Soro M akwụkwọ ọmụmụ ihe nke a e wepụtara ọhụrụ eji a mụ ihe na-ebe obibi… bụ ihe ehiwere iji nyere ndị otu aka ịmụ oziọ ma na-ebe obibi.”
-
“‘Akwụkwọ ọmụmụ ihe a bụ maka mmadụ ọbụla nakwa ezinaụlọ ọbụla nọ nʼime Nzukọ nsọ’ [Bịanụ, Soro M—Maka mmadụ niile nakwa ezinaụlọ niile (2019), vi].”
-
Nzube anyị bụ ime ka nhụmiihe ndị a na-enwe na Nzukọ nsọ nakwa na-ebe obibi dị nhatanha nʼụzọ ga-ahụ na-ewelitere okwukwe na ndụ nke ime mmụọ elu nke ukwuu ma mee ka ntọgharị na-ebe Nna nke Eluigwe na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nọ dị omimi.” (“Ntọgharị dị Omimi Na-anọgide na-ebe Nna nke Eluigwe na Onyenwe anyị JIzọs Kraịst nọ,” Laịhona, Nov. 2018, 9–10.)
Site na mbido Jenụwarị nke afọ a, Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a na gburugburu ụwa bidoro ịmụ Agba Ọhụrụ, site na i ji akwụkwọ ọmụmụ ihe Bịanụ, Soro M dịka ihe ntụzi aka anyị. Site nʼihe omume a haziri kwa izu ụka, Bịanụ, Soro M na-enyere anyị aka ị mụ akwụkwọ nsọ, ozizi nke ozi ọma, nakwa nkuzi niile nke ndị amụma na ndị ozi. Ọ bụ akwụkwọ ọmụmụ ihe magburu onwe ya e mere maka anyị niile.
Ka ọnwa itolu gasịrị ke mgbe a gbara mbọ hiwe ihe ọmụmụ akwụkwọ nsọ a na gburugburu ụwa niile, gịnị ka anyị na-ahụ? Anyị na-ahụ Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a ebe niile na-eto nʼokwukwe na nnukwu ịhụnaanya na-ebe Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nọ. Anyị na-ahụ ndị mmadụ na ndị ezinaụlọ na-ewepụta oge ụbọchị niile nʼizu ụka ị mụ okwu nke Onye Nzọpụta anyị. Anyị na-ahụta ọganiihu nʼoge nkuzi ihe na klas anyị ụbọchị Sọnde niile dị ka anyị na-amụ akwụkwọ nsọ na-ebe obibi ma tụnye uche anyị na nzukọ nsọ. Anyị na-ahụtakwa ọńụ na ịdịnootu dị ukwuu nʼime ezinaụlọ dị ka anyị gafeworo site na-ịgụ akwụkwọ nsọ ruo na-ịmụ akwụkwọ nsọ nʼụzọ kachasị hie ụda.
E nwego m ohere pụrụ iche iji ga leta ọtụtụ Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a ma nụta na-onwe m ihe banyere ka ha si hụta Bịanụ, Soro M. Nkwupụta ha mere banyere okwukwe mere ka obi m jupụta na ọńụ. Ndị a bụ nnọọ okwu ole na ole ndị m nụgooro nʼọnụ ndị otu Nzukọ nsọ ahụ dị iche iche na mpaghara dị iche iche n’ụwa:
-
Otu onye nna kọwara nke a, “A na m enwe ọńụ na Bịanụ, Soro M, nke na-enye m ohere ị gbara ụmụ m ama banyere Onye Nzọpụta.”
-
Na-ebe obibi nke ọzọ, otu nwata sịrị: “Nke a bụ ohere ị nụ ka nne na nna m na-agba ama ha.”
-
Onye nke ọzọ kọwakwara: “Anyị enwetawo mkpalite nke mmụọ banyere ka anyị ga-esi mee ka Chineke bute ụzọ na ndụ anyị. Oge anyị [chere na anyị] ‘enweghị’ [ejupụtawo] na olile anya, ọńụ, udo, na ọganiihu nʼụzọ ndị anyị na-amabụgị na ọ dị mfe.”
-
Otu di na nwunye kwuru nke a: “Anyị na-agụ akwụkwọ nsọ nʼụzọ kachasị dị iche site na otu anyị sirịị na-agụ ya na mbụ. Anyị na-amụta ihe buru ibu karịa ka anyị matawororịị. Onyenwe anyị na-achọ ka anyị hụta ihe nʼụzọ pụrụ iche. Onyenwe anyị na-akwado anyị.”
-
Otu onye nne kwuru nke a: “Ọ na-amasị m na anyị na-amụkọta otu ụdịrị ihe ọnụ. Na mbụ na mbụ, anyị naara agụ ya agụ. Nʼụbọchị taa, anyị na-amụ ihe ọmụmụ.”
-
Otu nwanne nwanyị kọwara nhụnuuche nke a nʼụzọ doro anya: “Na mbụ na mbụ, ị na-amụ ihe ọmụmụ, akwụkwọ nsọ enyere ya aka. Ugbua, ị nwere akwụkwọ nsọ niile, ma ihe ọmụmụ enyere ya aka.”
-
Nwanne nwanyị ọzọ kwukwara sị: “A na m a hụta ọdịiche ma m mee ya [ma atụnyere ya na] mgbe m na-emeghị ya. Ọ na-aka a dịrị m mfe ị gwa ndị ọzọ ihe banyere Jizọs Kraịst na ihe ndị anyị kwenyere.”
-
Otu nne nne kwuru sị: “A na m a kpọkọta ụmụ m na ụmụ ụmụ m ọnụ ụbọchị Sọnde niile, anyị a kọwarịta ihe anyị mụtara site na Bịanụ, Soro M .”
-
Otu nwanne nwanyị hụtara na: “Bịanụ, Soro M na-eme ya dị ka Onye Nzọpụta na-akụziri m ihe na-onwe ya. Ọ bụ mkpalite mmụọ nke si nʼeluigwe.”
-
Otu onye nna kwuru sị: “Mgbe anyị na-eji Bịanụ, Soro M, na-amụ ihe anyị na-adị ka ụmụ Izrel, na-akanye ihe nʼọnụ ụzọ ụlọ anyị, na-echekwa ndị ezinaụlọ anyị site na mmetụta nke onye mbibi.”
Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ọ bụ ihe ọńụ nyere anyị ị bịa leta unu ma nụta ka mbọ unu na-agba i ji Bịanụ, Soro M mụọ ihe si na-agọzi ndụ unu. Unu emeela maka oke ịhụnaanya unu.
I ji Bịanụ, Soro M mụọ akwụkwọ nsọ dị ka ihe ntụzi aka na-ewulite ntọgharị anyị na-ebe Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya nọ. Anyị anaghị nnọọ atufu otu awa na nzukọ nsọ na Sọnde maka otu awa a na-etinyekwu na-ọmụmụ akwụkwọ nsọ na-ebe obibi anyị. Ị mụ ihe banyere ozi ọma bụ mbọ na-aganiihu ụbọchị niile nʼizu ụka. Dị ka otu nwanne nwanyị si kọọrọ m, “Ebumnobi ya a bụghị ime ka nzukọ nsọ jiri otu awa laa azụ; ọ bụ ime ka nzukọ nsọ jiri mkpụrụ ụbọchị isii gbatịkwuo!”
Ugbua, tụleekwa ọzọ ịdọaka na ntị nke onye amụma anyị, Onyeisi Nelson, dọrọ anyị mgbe o mepere ọgbakọ izugbe nke Ọktoba 2018:
Onye iro na-aganiihu na agha ọ na-ebuso okwukwe na anyị onwe anyị nakwa ezinaụlọ anyị n’ụzọ dị oke ọkụ ọkụ. Na-ịnya ndụ nke ime mmụọ, anyị kwesịrị inwe atụmatụ ndị a tụrụ na gboo maka ịgbanarị ọnwụnwa” (Okwu Mmepe,” 7).
Ma mgbe (ihe dị ka awa 29 e ji mesịa) na ehihie Sọnde, o jiri nkwa nke a mechie ọgbakọ ahụ: “Dị ka unu na-arụsi ọrụ ike i ji hazigharịa ebe obibi unu ka ọbụrụ isi ebe a na-amụ ozi ọma, … ike nke onye iro nwere na ndụ unu nakwa na-ebe obibi unu ga-ebelata” (“Ị ghọ Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a Eji ama atụ,” Laịhona, Nov. 2018, 113).
Kedụ otu agha a nke onye iro ga-esi na abawanye ọkụ ọkụ, ma nʼotu aka ahụ ike nke onye iro a na-ada mba? Ọ pụrụ ime eme, ma ọ na ha eme na gburugburu Nzukọ nsọ niile, nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ndị Ya megide agha nke onye iro . Bịanụ, Soro M bụ atụmatụ nke Onyenwe anyị Tụrụ na gboo maka Ịgbanarị ọnwụnwa. Onyeisi Nelson kuziri sị, “Usoro ọmụmụ ihe ọhụrụ etikọtara ọmụmụ ihe hiwere isi na-ebe obibi na nke hiwere isi na Nzukọ nsọ na-akwado nwere ike ịtọghapụ ndị ezinaụlọ na-agbụ.” Kaosiladị, ọ na-eme ma ọ chọrọ ka anyị gbaa mbọ kachasị mma; anyị kwesịrị “[ị nọgide] na-eme ihe niile anyị nwere ike ime ma kpachara anya gbanwee ebe obibi [anyị] ka ọ bụrụ ebe nsọ nke okwukwe” (“Ị ghọ Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a Eji ama atụ,” 113).
Ka ọ dị, dị ka Onyeisi Nelson kwukwara, “Ọrụ uto nke ime mmụọ dị nʼaka onye ọbụla nʼime anyị” (“Okwu Mmepe,” 8).
Site na akwụkwọ nkuzi ihe Bịanụ, Soro M Onyenwe anyị na-akwado anyị “maka oke ihe egwu anyị na-ezute ugbua” (Quentin L. Cook, “Ntọgharị Dị omimi Na-anọgide,” 10). Ọ na enyere anyị aka ihiwe “isi ntọala ahụ, ntọala nke ọ bụrụ ndị mmadụ wukwasị ya ụlọ ha a gaghị ada” (Hilaman 5:12)—ntọala nke ama dabeere chịm nʼisi ụkpụrụ nke ntọgharị nye Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.
Ka mbọ niile anyị na-agba na-ịmụ akwụkwọ nsọ kwadosie anyị ike ma mee ka anyị tozuo oke ị nata ngọzi ndị a e kwere na nkwa. Otu a ka m si rịọ n’aha Jizọs Kraịst, amen.