Iwu-nsọAbụọ Dị-Ukwuu.
Anyị kwesịrị ịgba-mbọ idobe iwu-nsọ abụọ a dị ukwuu. Na i mee otu a, anyị n’aga n’etiti iwu na ịhụn’anya.
Ụmụnne m nwanyị n’ime ozi-ọma nke Jizọs Kraịst, a na m ekele unu dịka ndị-nlekọta Chineke họpụtara nke ezi-na-ụlọ ebigh-ebi. Onye-isi Russell M. Nelson akuzierela anyị, “Eweghachịrị Nzukọ-nsọ a ka enwere-ike nwee ezi-na-ụlọ nile, arachiri, ma bulie-elu mgbe ebigh-ebi.” Nkuzi ahụ nwere mmetụta nile dị-mkpa maka ndị-mmadụ pụtara dịka lesbian, gay, bisexual, ma-ọbụ transgender, ndị-agụrụ dịka LGBT. Onye-isi Nelson echetakwarala anyị na anyị agaghị “ekwekọrịta [mgbe niile] tupu anyị ahụ onwe anyị na-anya.” Nkuzi nile nke onye-amụma ndị a dị-mkpa maka mkparịkọta-ụka nile ezi-na-ụlọ iji zaa ajụjụ nile nke ụmụntakịrị na ndị-ntorobia. E werela m ekpere chọọ nkalite-mụọ ikwuru unu okwu maka ajụjụ nile ndị a gbasara unu, nke otu-aka ma-ọbụ ibeya mmetụtara ezi-na-ụlọ ọbụla n’ime Nzukọ-nsọ.
I.
Ka m were ihe Jizọs kuziri bụ iwu-nsọ abụọ dị-ukwuu bido.
“Ị ga-ewere obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gi nile, werekwa uche gị nile hụ Onye nwe gị Chineke gi n’anya.
“ Nke a bụ ịhe ukwu na ịhe mbụ enyere n’iwu-nsọ.
“Ịhe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dịka onwe gị”
Nke a pụtara na-enyere anyị iwu ịhụ onye-ọbụla n’anya, ebe ilu nke Jizọs nke ezigbo onye Samerịa kuziri na onye-ọbụla bụ onye-agbataobi anyị. Kama ọnụnụ-ọkụ-nobi anyị idobe iwu-nsọ nke abụọ ekwesighị ime ka anyị chefuo nke-mbụ ahụ, iji obi, mkpụrụ-obi, na uche anyị nile hụ Chineke n’anya. Anyị na-egosi ịhụnanya ahụ site na “idobe iwu-nsọ [Ya] nile.” Chineke chọrọ ka anyị dobe iwu-nsọ Ya nile maka ọbụ nanị site na irube-isi ahụ, tinyere nchegharị, ka anyị nwere-ike ịlaghachi biri n’ihu Ya ma zuo-oke dịka Ya.
N’ime okwu ya nso-nso a nye ndị ntorobia nke Nzukọ-nsọ, Onye-isi Russell M. Nelson kwuru maka ihe ọ kpọrọ “njikọta siri-ike n’etiti ịhụnanya nke Chineke na iwu Ya nile.” Iwu nke mmetụtara nke-ọma nye isiokwu niile gbasara ndị hụtara onwe ha dịka LGBT bụ iwu nke Chineke nke ọlụlụ di na nwunye na iwu sotere ya nke ịdị-ọcha-mmekọrịta. Ha abụọ dị-mkpa n’ime atụmatụ nke nzọpụta nke Nna anyị nke Elu-igwe maka ụmụ Ya. Dịka Onye-isi Nelson kuziri,“iwu nile nke Chineke na-eme site na ịhụn’anya Ya maka anyị na ọchichọ Ya ka anyị bụrụ ihe nile anyị nwere-ike ịbụ.”
Onyeisi Nelson kuziri: “Ọtụtụ obodo … anabatala ọlụlụ nwoke na nwoke nwanyị na nwanyị. Dịka ndị-otu nke Nzukọ-nsọ, anyị na-akwanyere iwu nile nke ala ugwu … , tinyere ọlụlụ di na nwunye nke obodo. Ezi-okwu bụ, agbanyeghị, na mbido … ọlụlụ di na nwunye ka echiri site n’aka Chineke! Ma ruo ụbọchị taa a kọwara ya site n’aka Ya dịka ihe dị n’etiti nwoke na nwanyị. Chineke agbanwebeghị nkọwa Ya nke ọlụlụ di na nwunye.”
Onyeisi Nelson gara n’ihu: “Chineke agbanwebekwaghị iwu Ya nke ịdị-ọcha mmekọrịta. Ihe nile achọrọ iji banye temple agbanwebeghị.”
Onye-isi Nelson chetarala anyị nile na “ikike enyere anyị dịka Ndị-ozi bụ ikuzi nanị ezi-okwu. Ikikere ahụ enyeghị [Ndi Ozi] ikike ịgbanwe iwu dị-nsọ.” Ya mere, ụmụnne m nwanyị, ndị-ndu nke Nzukọ-nsọ oge niile na-akuzirịrị mkpa ọdị nke ọlụlụ n’etiti nwoke na nwanyị na iwu nke ịdị-ọcha mmekọrịta.
II.
Ọrụ nke Nzukọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a nwerịrị ihe jikọtara ya na ijikere ụmụ nke Chineke maka ala-eze selestial, ma nke kacha maka otuto ya kachasị-elu, mbuli-elu ma-ọbụ ndụ ebigh-ebi. Akaraka ahụ kachasị-elu bụ ihe dị ire nanị site na ọlụlụ di-na-nwunye maka mgbe ebigh-ebi. Ndụ ebigh-ebi tinyere ikike enyere nwoke na nwanyị ịmụ nwa— ihe mkpughe ọhụrụ kọwara dịka “ ịganihu nke mkpụrụ-afọ ruo mgbe nile na mgbe nile.”
N’okwu ya nye ndi okenye nta, Onyeisi Nelson kuziri, “Ịnọgide n’iwu nke Chineke ga-echekwa gị dịka ị na-aga n’ihu na mbuli elu dị ire”—ya bụ, ịbụrụzị dịka Chineke, jiri ndụ ebuliri elu na ikikere dị nsọ nke ndi Nne na nna anyị nke Eluigwe. Nke ahụ bụ akaraka anyị chọrọ maka ndị anyị hụrụ n’anya. Maka ịhụn’anya ahụ, anyị agaghị ekwe ka ịhụn’anya anyị kaa iwu-nsọ nile na atụmatụ na ọrụ nke Chineke, nke anyị mara ga-ewetara ndị anyị hụrụ n’anya ańụrị kachasị elu.
Kama enwere ọtụtụ ndị anyị hụrụ n’anya,tinyere ụfọdụ nwere ozi-ọma eweghachiri, ndị na-ekweghị ma-ọbụ ndị họrọ na agaghị esoro iwu-nsọ nile nke Chineke gbasara ọlụlụ di na nwunye na iwu nke ịdị-ọcha-mmekọrịta. Kedụkwanụ maka ha?
Ozizi nke Chineke gosịrị na anyị nile bụ ụmụ Ya ma O kewo anyị ka anyị nwee ọńụ. Mkpughe ọhụrụ kuziri na Chineke wepụtara atụmatụ maka nhụmihe na-anwụ-anwụ ebe onye-ọbụla nwere-ike ịhọrọ irube-isi iji nweta ngọzi Ya nile kachasị-elu ma-ọbụ họrọ ihe ndị ga-eduba ha na otu n’ime ala-eze enweghị ebube. Maka ịhụn’anya dị ukwuu nke Chineke nwere ebe ụmụ Ya nile nọ, ala-eze ndị ahụ enwechaghị ebube kaa nma karịa ihe ọbụla ndị na-anwụ-anwụ nwere-ike ịghọta. Aja-mgbaghara-mmehie nke Jizọs Kraịst na-eme ka ihe ndị a nile dị ire, dịka Ọ “ na-eto Nna, ma na-azọpụta aka-ọrụ nile nke aka ya.”
III.
E kwuola m maka iwu-nsọ nke mbụ, kama kee maka nke abụọ? Olee ka anyị si edobe iwu-nsọ ịhụ ndị-agbataobi anyị n’anya? Anyị n’achọ ịrịọ ndị-otu anyị na ndị na-eso nkuzi na omume nile nke lesbian, gay, bisexual, ma-ọbụ transgender kwesịrị inweta ịhụn’anya nke Onye-nzọpụta anyị nyere anyị iwu igosị ndị agbataobi anyị nile. Ya mere, mgbe iwu kwadoro nwoke ma ọbụ nwanyị ịlụ ibeya nime mba United States, Otu Ndi-isi Mbụ na Kworum nke Iri na abụọ mara-ọkwa: “Ozi-ọma nke Jizọs Kraịst n’akụziri anyị ịhụ mmadụ nile n’anya ma kpasa ha agwa-ọma—ọbụnaghị mgbe anyị ekwerikọtaghị. Anyị na-ekwupụta na ndị-ahụ na-edobe iwu nile na mkpebi nile nke ụlọ-ikpe gwadoro nwoke ọlụ ibeya kwesịrị ịkwanyere ugwu.”
Ịganihu, anyị ekwesịghị ịkpagbu ndị-ahụ n’ekwenyeghị na nkwenye na nranye-n’aka anyị nile. N’inwe-nwute, ụfọdụ ndị nwere nsogbu nile ndi a n’aga n’ihu neche na ụfọdụ ndị-otu na ndị-ndu n’ime ezi-na-ụlọ, ngalaba-otu-ndi-ụka, na stek anyị nile achọghị ha. Anyị nile ga-agbalịrị inwe obi-ọma karịa.
IV.
N’ihi akọ-na-uche nile anyị aghọtaghị, anyị nwere aka-mgba nile dị iche-iche n’ime ndụ anyị. Kama anyị mara na Chineke ga-enyere onye-ọbụla n’ime anyị aka imeri aka-mgba nile ndị a ọbụrụ na anyị chọọ enyem-aka Ya n’ezi-okwu. Mgbe anyị tachara-ahụhụ ma chegharịa maka nmebi nile nke iwu nile a kuziri anyị, anyị nile nwere ala-eze nke dị-ebube. Ikpe nke ikpeazụ ga-esi n’aka Onye-nwe-anyị, onye nanị ya nwere ọmụma-ihe, amamihe, na amara ikpe onye-ọbụla n’ime anyị ikpe.
Mgbe-nka-n’eme, anyị kwesịrị ịgba-mbọ idobe iwu-nsọ abụọ a dị ukwuu. Na imee otua, anyị nọ n’etiti iwu na ịhụn’anya—idobe iwu-nsọ nile na isoro ụzọ ọgbụgba-ndụ, ma n’ahụ ndị agbataobi anyị n’anya. Ije nke a kwesịrị anyị ịchọ nkwalite-mụọ dị-nsọ ịma ihe anyị ga-akwado na nke anyị ga-emegide ma otu esi ahụ n’anya ma gee kwa ntị n’otu aka ahụ. Njem anyị chọrọ ka anyị hara iji iwu-nsọ nile gwuo egwu kama igosi nghọta na ịhụn’anya zuru-oke. Njem anyị ga-enyerịrị ụmụntakịrị ndị aghọtaghị ma ha bụ nwoke ma-ọbụ nwanyị ohere, kama ọ naghị akwado inye-aha mgbe oge erubeghị nihi, n’ime ọtụtụ ụmụntakịrị, ụdị amataghị ahụ n’agbada nke-ọma ka oge n’aga. Njem anyị na-emegide ịnabata ndị anọghị n’ụzọ ọgbụgba-ndụ, ma ọnaghị akwado onye-ọbụla na edufu ndị mmadụ site na Onye-nwe-anyị. N’ime ihe ndị a anyị n’echeta na Chineke kwere nkwa olile-anya na ọńụ na ngọzi nile maka ndị nile n’edobe iwu-nsọ Ya nile.
V.
Ndị-nne na nna ma anyị nile nwere oke-nọrụ ịkuzi iwu-nsọ abụọ dị-ukwuu. Maka ndị-nwanyị nke Nzukọ-nsọ, Onye-isi Spencer W. Kimball kọwara ọrụ ahụ nime amụma nke a dị-ukwuu: “Otito g’abiara Nzukọ-nsọ n’ime ụbọchị nile ikpeazụ ga-abia nihi ọtụtụ ndị ezigbo nwanyị nke uwa … ga-adị ọtụtụ bata n’ime Nzukọ-nsọ. Nke a ga-eme ruo ka ndị-nwanyị nke Nzkọ-nsọ gosiri omume-ziri-ezi na ịkpakọta-ọnụ n’ime ndụ ha ruo ebe a n’ahu ndị-nwanyị nke Nzukọ-nsọ ka ndị dị iche … site na ndị-nwanyị nke ụwa. … Ya mere ọ ga-abụ na ngosipụta nile nke ndị-nwanyị nke Nzukọ-nsọ ga-adị ike na otito ọnụ-ọgụgụ na mụọ nke Nzukọ-nsọ n’ime ụbọchị ikpeazụ nile.”
Ka ọ na-ekwu maka amụma ahụ, Onye-isi Russell M.Nelson kwupụtara na “ụbọchị ahụ nke Onye-isi Kimball hụrụ bụ taa. Unu bụ ndị-nwanyị ọ hụrụ!” Anyị bụ ndị nụrụ amụma ahụ afọ 40 gara-aga amaghị na n’etiti ndị mmadụ ndị-nwanyị nke Nzukọ-nsọ nwere-ike zọpụta bụ ndị enyi na ezi-na-ụlọ ha nile ndị ihe nile nke ụwa ka na emetụta. Ekpere na ngọzi m bụ na unu ga-akuzi ma kpaa-agwa imezu amụma ahụ, n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.