2013
Ikwusara enyi gi.
Febrụwarị 2013


Ntorobia

Kwusara enyi gi

Otu ụbọchị mgbe m n’agu akwukwọ maka ọmumu seminary m, enwetara m mmetụta mara-mma ma di-kwa ichie. Mgbe m nọ n’agu akwukwọ gbasara ihe ọmụmụ nke ụbọchị na-abia, a hụrụ m ihu enyim nke ụlọ-akwukwọ ma nwe ezigbo mmetụta di-ike, ka m kwusara ya okwu gbasara aka-ebe m.

Na agbanyeghi na mmetụta pụtara-ihie, ụjọ tụrụ m. Enwere m nsogbu ị chee na enyim nwere-ike iju m, tumadi, maka oyighi nwanyi ga enwe mmasi ibata Nzukọ-nsọ anyi.

 Echetere m okwu nke Nwanne-nwanyi Mary N. Cook nke ndi Isi Otu Ụmụ agbo-gho zuru-ọha bụ nke ọtụrụ anyị aka-mgba ka anyi rụsie ọrụ ike ma diri-kwa ike ọrụ.1 A chọbụrụm idi otu a, ya mere, edeerem nwanta nwanyi ahụ leta ma gba-aka-ebe gbasara nke bụ eziokwu nke Nzukọ-nsọ na ihun’anya m nyere nye Akwukwọ nke Mọmọn. Echị ya, atunyere m otu Akwukwọ nke Mọmọn, ya na leta ahụ ndere, n’ime akpa ya.

 Na mgbagwoju-anya m, enyim abụrụ onye nabatara ozi-ọma. Site na Ụbọchi ahụ, ya ebido n’agwa m ihe mmụta nile ọgutara na Akwukwọ nke Mọmọn. Mgbe obere izu-uka gachara, E mere m ka ọmata ndi ọrụ mgbasa-oziọma. Otu mgbe-ahụ, o enwetere mmetụta nke sitere na mụọ-nsọ na ihe ya na amụta bụ ezi-okwu. Mụ na ndi mgbasa-oziọma nile ahụ bere-akwa dika ọ na agwa anyi gbasara mmetụta mụọ ya nile. Enyim ka emere baptism n’oge n’adighi-anya, ma ndi nne na nna ya nwere itu-n’anya ihụ mgbanwe nile nke mere n’ime ya.

A bụ m onye nwere obi-ụtọ na emeriri m ụjọọ m nile ma nye-aka nye ozi-ọma na ndu ya.

Lee-anya

  1. Lee Mary N. Cook, “Anwa la anwa da mba!” Liahona May 2010, 117–19. Liahona May 2010, 117–19.

Bipụta