2013
Okwu ndụmọdụ nye onye-mgbasa ozi-ọma ahụ na-enwe obi-abụọ
Febrụwarị 2013


Ọzi nke Otu Ndi-isi Ndụzi Mbu, Ọnwa abụọ 2013

Okwu nye onye-mgbasa ọzi-ọma n’enwe obi-abụọ

Foto, oyiyi
Onye Isi-Ndụzi Dieter F. Uchtdorf

Ndi n’eso ụzọ Jisọs Kraist nọ mgbe nile n’ọrụ nke ije gbasa ozi-ọma Ya nye ndi ụwa nile (lee Mak 16:15-16). Otu-osinadị, mgbe ụfọdu, ọdịghị-rị anyi nfe imepe ọnụ ma kwụpụta gbasara okwukwe anyi nye ndi nọ anyi nso. Ebe ụfọdụ, ndi otu nzụkọ-nsọ nwere onyinye nke igwa ndi-mmadu okwu gbasara okpukpere-chi, ndi-ọzọ n’enwe obi-abụọ ma-ọbụ n’eme ihere, ma-ọbụ n’atụ-ụjọ ime nke a.

Maka nke a, ka m tunye uche na ụzọ ihe anọ bu nke onye ọ bụla ga eme ka osoro ntụzi-aka Onye Nzọpụta ka ekwusaa ozi-ọma “nye ihe nile ekere-eke” (D&C 58:64).

Bụrụ Ịhié

Ihe nkwụpụta nkem bụ nke asi St. Francis nke Assisi siri “Kwusaa ozi-ọma ogeọbụla ma ọdịrị-mkpa, jiri mkpụrụ-okwu nile.”1 Ihe mpụta-ihie na nkwụpụta nke a, bụ nghọta na ọtụtụ-mgbe nkwụpụta okwu Chineke dị ike nke nnukwu bụ nke ekwupụtaghị.

Mgbe anyi nwere ugwu ma na n’ebi ndu dabara na ezị omume anyi, ndi-mmadu ga ahu ya. Mgbe anyi n’egosị ọnụ na obi-ụtọ, ha ga ahụ ya karia.

Onye ọbụla chọrọ inwe obi-ụtọ. Mgbe anyi bụ ndi otu nzụkọ-nsọ n’egosi ihie nke ozi-ọma, ndi mmadu nwereike ihu obi-ụtọ anyị ma chọpụta ihunanya nke Chineke jụpụtara ma n’ abawanye na ndụ anyi. Ha ga achọ ima ihe gbasara nke a. Ha ga achọ ighọta ihe nzuzo anyi.

Nke a ga eduba ha ijụ ajụjụ dika “Kedu ihe mere ịjịrị nwe obi-ụtọ?” Ma-ọbụ “Kedu ihe mere ịjịrị nwe agwa-ọma?” Ọziza nile nye ajụjụ ndia, n’ezie, n’eduba na nkọwa gbasara ozi-ọma nke Jisọs Kraist nke eweghachiri-eweghachi.

Bụrụ onye mkparịta-ụka.

Iwepụta okwu gbasara okpukpere-chi nke-ka-nke, nye ndi enyi anyi, ha na ndi anyi huru-n’anya nwereike bụrụ ihe di ike na ihe ima-aka. Okwesighi ibụ. Ikwute ihe mmetụta nke ime-mmụọ ma ọbu ikwu gbasara ihe emere na Nzụkọ-nsọ ma ọbu ihe-omume na ụzọ nkwurita-ụka dị mfe ga adi mfe ma dịrị-kwa ụtọ ọ bụrụ na anyi etinye obere ngwa m-ume na akọ-n’uche.

Nwunye m, Harriet, bu ezigbo ihe ịjị maa-atu nke a. Mgbe anyi bi na Germany, Ọ ga achọ ụzọ eji ewere okwu gbasara Nzukọ-nsọ na mkaprita-ụka ya na ndi enyi ya na ndi ya na ha nwere mmekọrịta. Iji maa-atu, mgbe ndi mmadu jụrụ ya gbasara ngwu-cha ịzu-ụka ya, ọ ga-asi “ụbọchị ụka nke a anyi nwere ihe nrịbama di egwu na Nzukọ-nsọ anyi! Nwa okoro-ọbia gbara afọ iri-na-ịsịị (16) kwuru okwu Chukwu mara-mma n’ihu nari mmadu abụọ (200) ndi nzukọ anyi gbasara ibi-ndu di-ọcha. Ma ọbu “A mụtara m gbasara nwanyi gbara afọ iri-itoli, (90) onye kpara akwa nsachi ebe ndina di nari ise (500) ma nye kwa ha ndi enyem-aka Nzukọ -nsọ ka ha zigara ndi nọ na unwụ, na ụwa gba-gburu-gburu.”

Ọtụtụ mgbe ndi núru nke a n’achọ ima karia. Ha n’ajụ ajụjụ di ọtụtụ. Ma nke a na enye ohere ikwu gbasara ozi-ọma n’uzọ nọrọ onwe ya, obisike, ma n’uzọ di obi ume-ala.

Site na nchọpụta nke internet na nkwụpụta egwuru-egwu nke ana-kpọ social media, ọ di mfe taa ikwu gbasara ihe ndia nile n’ụzọ nke nkwukọrịta okwu karia mgbe mbụ. Ihe anyi chọrọ bụ ume iji mee nke a.Jupụta n’amara

Ka osi di njọ, ọbụ ihe di mfe ka anyi na enwekari ekweghi-ekwe. Ọ na eme mgbe ọbụla na anyi na ịshị-agụgọ, ewedata, ma na ima-ikpe. Mgbe anyi na ewe-iwe, kwuo okwu ọjọọ, ma-ọbu mee ihe-ọjọọ, ihe ikpeazu ha chọrọ bụ ha imụrụ ihe ọzọ gbasara anyi. Ọ dighi mfe anyi ima mmadu ole hapụrụ-la Nzukọ-nsọ ma-ọbụ n’achọghị ịbata maka ihe otu onye kwuru, mere ha-ụfụ-obị, ma-ọbu kpasuru ha iwe.

Enwere ọtụtụ ndu-ọjọọ n’ime ụwa taa. Maka amaghi onye nke internet, ọdi mfe karia oge mbụ ikwu okwu ọjọọ ma-ọbụ ime ihe-ọjọọ mgbe anọ na internet. Okwesighị ka anyi, ndi nwere okwukwe bụ ndi na-eso ụzọ Kraist onye obi-ume-ala, nwe afọ-ọma di elu na agwa anyi? Akwukwọ-nsọ kuziri “Ka okwu-ụnụ di n’amara mgbe nile, ihe eji ọnụ me ka ọdi ụtọ, ka ụnụ we mata otu ụnụ naghagh iza madu nile ọbụla” (Ndi Kọlọsi 4:6).

Ọ masiri m otu echiche okwu anyi nile jiri doo-anya dika eluigwe anwu n’acha ma juputa na amara. Inwere-ike itu-aru ihe Ezinaụlọ anyi, ebe obibi nile, mba nile, na ma ụwa ga eyi ọ bụrụ na anyi anakwere ụkpụrụ di-mfe?Jụpụta na okwukwe.

Mgbe ụfọdu anyi na anakwere n’ime onwe anyi ọtụtụ otito ma ọbụ ọtụtụ ita-ụta mgbe ọbiara na ndi-ọzọ inara oziọma. Ọ dị mkpa ka echeta na Onye-nwe atughị-anya na ọ bụ anyi ga enwe mgbanwe.

Mgbanwe n’abia, ọbụghị site na okwu anyi kama site na nnọnyere nke elu-igwe nke mụọ-nsọ. Mgbe ụfọdu ihe nile ọ ga ewe bụ nani otu nkeji okwu nke igba-ama anyi ma ọ bu gbasara ihe nke mere anyi iji bido obi di nro ma ọbụ imepe ụzọ nke ga eduba ndi-ọzọ inweta mmetụta ezi-okwu nke ime-mụọ site na nrutu nke mụọ.Onye Isi-Nduzi Brigham Young (1801–77) siri na ya ma na oziọma a bụ ezi-okwu mgbe ọ siri ya, “huru nwoke n’enweghi onyinye ikwu-okwu, ma ọbụ, onyinye-chi nke ikwu-okwu n’ọha, bu onye ga-asi nani, A mara m, site n’ike nke mụọ-nsọ, na Akwukwọ nke Mọmọn bu eziokwu, na Josef Smith bụ onye amụma nke Onye-nwe.”

Onye Isi-Nduzi Young siri mgbe ya nụrụ igba-ama obi umuala ahu, “Mụọ-nsọ sin a onye ahu n’apụta, ọna eme ka nghọta ya n’abawa-nye, na iho, otuto, na anwughi-anwu [nọ] n’ihu Ya.”2

Umunne ndi nwoke na umunne ndi nwanyi, nwee okwukwe. Onye-nwe nwere ike ime ka okwu ndi nile i na-ekwu ka ọ daa uda ma dị ukwuu. Chineke anaghi asi gi ka inye mgbanwe ma kama ka imepe ọnụ gi nile. Ọru nke inye mgbanwe abụghịị nke gi — nke ahụ bụ nke onye n’anụ-anụ na nke Mụọ-nsọ.

Onye nzukọ-nsọ ọbụla bu onye mgbasa-oziọma.

Ndi enyim nile, taa enwere ọtụtụ ụzọ karicha oge mbu, nke anyi ga eji mepe ọnụ anyi ma gwa ndi ọzọ ọńụ dị na okwu ozi-ọma nke Jisọs Kraist. Enwere ụzọ nye onye ọbula — ọbụladi onye-mgbasa-ozi-ọma n’enwe obi-abụọ — ka osoro n’ọru nke a di mkpa. Anyi ga achọta ụzọ iji onyinye-chi anyi na mmasi nile nye ngwa-nye nke ọrụ nke iji ihie na eziokwu jụpụta na ụwa a. Mgbe anyi mere otu a, anyi ga enwete ọńụ na abiara ndi ahu nwere okwukwe na agbam-ume “iguzo dika ndi aka-ebe nke Chineke n’oge nile” (Mosaia 18:9).

Lee-anya

  1. Francis di-nsọ nke Assisi, n’ime William Fay na Linda Evans Shepherd, kwusaa Jisọs n’enweghi ụjọ (1999), 22.

  2. Nkuzi nile nke Ndi-Isi-Nduzi nile nke Nzukọ-nsọ: Brigham Young (1997), 67.

Nkuzi si na ozi a.

Otu ụzọ dị iree eji akuzi ihe bụ ka “agba ndi I na-akuziri ihe ume, ka ha nwe …ebum n’uche ga enyere ha aka ibi ụkpụrụ ndụ ndi I kuziri ha “(Nkuzi, Ọ dịghị ọkpụkpọ kariri ya [1999], 159). Tulee ịkpọ-kọ ndi ina akuziri ka ha jiri ekpere wepụta ebum-n’uche ikwuo okwu gbasara ozi-ọma nye otu ma ọ bụ ọtụtụ mmadu na ọnwa a. Ndi nne na nna nwereike ikpa-nkata ụzọ ụmụntakiri ga eji nye aka. Inwere-ike nyere ndi ezi na ụlọ gi aka, ka ha tulee echiche ma-ọbụ gosi ụzọ nile iji wete ozi-ọma n’ime nkwusara-okwu, ma chee-echiche gbasara ihe omume n’abia n’ihu na Nzukọ-nsọ bụ nke ha nwereike ikpọ enyi ha ka ha bia.

Bipụta