2013
Agbanweworo ya nye Onye-nwe
Febrụwarị 2013


Ozi nke Nkuzi ndi nleta ụmụnwanyị, Februari 2013

Agbanweworo ya nye Onye-nwe

Jiri ekpere gụọ ihe ngwa-ọrụ a ma, dika okwesiri, kpaa ya na nkata gị na ndi ụmụnne nwanyị ndi ị na eleta. Were ajụjụ nile nyere onwe gi aka igba ndi ụmụnne gị nwanyi nile ume na ime ka Otu Enyem-aka bụrụ nke dị mkpa na ndụ gị. Maka inweta nkọwa ndi-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org

Foto, oyiyi
Sil Otu Enyem-aka

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

Ndi ụmụnne nwanyị ọhụrụ n’ime nzụkọ-nsọ, tinyerekwara ụmụ agbọ-ghọbịa n’abanye n’ime otu Enyem-aka, ụmụnne nwanyị ndi na alaghachite na ihe omume, na ndi ọhụrụ agbanweworo nwere mkpa nke nkwado na ime-enyi nke ndi nkuzi na-eleta ha. “Ndi otu inye-aka di mkpa na nnọgide ndi agbanweworo ma n’iweghatachi ndi otu na-ada mba n’ihe omume n’uju,” kwuru Okenye M. Russel Ballard nke Kworum ndi Iri na Abụọ. “Nwete nghọta na Otu Enyem-aka … nwere-ike ibụ [otu n’ime] ihe inye-aka kachasi dike eji eme enyi anyi nwere na Nzukọ-nsọ. Gakwuo n’oge nye ndi ahụ ana akuziri na ndi ana akpọghachite, ma hụ ha n’anya n’ime Nzukọ-nsọ site na Otu ụnụ.1

Dika ndi otu Enyem-aka, anyi nwere-ike nyere ndi ọhụrụ nile aka imuta ntuala emume Nzukọ-nsọ, dika:

  • Ikwu okwu-chukwu

  • Ina agba-ama.

  • Ibi iwu nke ibu-ọnụ.

  • Ikwụ otu-ụzọ na ụzọ-iri na onyinye ndi-ọzọ.

  • Iso na-ọru nke akụkọ ezi-na-ụlọ.

  • Imere ndi agbụrụ ha nwụrụ-anwụ baptism na ime ha onye-otu.

“Ọ na-ewe ndi enyi anya doro ime ka ndi otu ohụrụ nwete ọnọdụ ọma ma ka anabatakwa ha na nzukọ-nsọ,” ka Okenye Ballard kwuru.2 Anyi nile, kama kachasi ndi nkuzi nleta ndi ụmụnwanyi, nwere ọrụ dị mkpa nke ihiwe ime enyi nye ndi otu ọhụrụ dika ụzọ aga-eji nyere ha aka ibu ndi gbara-mgbọrọgwu na mgbanwe nye Onye-nwe” (Alma 23:6 ).

Sitere na Akwukwọ-nsọ

2 Nifaị 31:19 – 20; Moronai 6:4

Site na Akụkọ ochie anyi

“Nye mbawanye nke ndi otu gbanweworo,” ka Onye Isi-Nduzi Gordon B. Hinckley kwuru, “anyi gariri eme ezigbo mgbali ka anyi nwee ike iji nyere ha aka ka ha n’achọ ụzọ ha. Onye ọ bụla n’ime ha nwere mkpa ihe atọ: enyi, ọru, na nlekọta-anya nke eji ezigbo okwu nke Chukwu’ (Moronai 6:4).”3

Ndi nkuzi nleta nọ na-onodu ga eme ka ha nyere ndi ha na-eleta anya aka. Ime-enyi n’abiakari mbu, dika omere otu obere nwanne nwanyi nke otu enyem-aka onye nke na-eleta nwanne nwanyi tọrọ ya. Ha jiburu nwayọ na-ewulite ime enyi rue mgbe ha rụrụ ọru ikpocha inyi n’akuku na akuku. Ha abụrụkwa enyi, ma dika ha n’ekwu gbasara ozi nleta, ha abụọ nwere nghọta site na “ezigbo okwu nke Chukwu.”

Onye Isi-Nduzi Josef Fielding Smith (1876 – 1972) kwuru si Otu Enyem-aka “bu mpaghara di mkpa nke Ala-eze nke Chineke n’ụwa ma … na enyere ndi otu ya nwere okwukwe aka inwete ndu ebighi-ebi n’ime Ala-eze nke Nna-anyi.”4

Lee-anya

  1. M. Russel Ballard, “Ndi-otu bụ ọtụghe-ụzọ.” Liahona, Sept. 2000, 18.

  2. M. Russell Ballard, Liahona Sept. 2000, 17.

  3. Gordon B. Hinckley, “Onye ọbụla gbanweworo di oke-mkpa, Liahona Feb. 1999, 9.

  4. Josef Fielding Smith, n’ime Daughters in My Kingdom: Akụkọ ochie na ọrụ nke otu-Enyem-aka (2011), 97.

Gịnị ka m nwere ike ime?

  1. Ana m ekpere onye-nsiso m ekpere, ma rịọ ka Mmụọ duo anyị dịka anyị n’akụziri umunne anyị ndị nwanyị?

  2. Kedụ ụzọ nile anyị na-eji ejere nwanne nwanyi ọbụla anyị na-elekọta ozi ka ọ wee mata na anyi n’ezie nwere mmasị n’ebe ọ nọ?

Bipụta