Ozi nke otu Ndị-Isi Nduzi Mbụ, Ọnwa anọ 2013
O biliwo
Ọgbụgba ama banyere eziokwu mbilite n’ọnwụ nke Jisọs Kraist n’enye olile-anya na nnagide Ma o nwere ike ịdị otu a nye nwa Chineke ọbụla Ọ dịrị m otu a oge nne m nwụrụ n’ụbọchi sọma n’ọnwa Isịị 1969, ọ dịrịsi afọ nile ndia, ma ọ ga adigide rue mgbe m ga ahụ ya ọzọ.
Nwute nke ọnwụ a bụ ihe nke aṅụrị nọchiri n’otu ntapi anya. Ọkarịrị olile-anya maka izukọ ọzọ n’aṅụrị. N’ihi na Onye-nwe ekpuhewo ọtụtụ ihe site n’aka Ndị amụma Ya na n’ihi na Mụọ Nsọ agbaworo m ama eziokwu nke Mbilite n’ọnwụ, E nwere m ike ihụta n’uche m otu ọ ga dị anyị na ndị anyị hụrụ n’anya asachapụworo ma kulite n’ọnwụ izute ọzọ.
“Ndị a bụ ha ndị ga-apụta na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi-omume. …
“Ndị a bụ ha ndị e deworo aha ha n’elu-igwe, ebe Chineke na Kraịst bụ ndị ikpe mmadụ nile.
“Ndị a bụ ha ndị ezi-omume ndị e meworo ka ha zuo-oke site na Jisus onye-ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ, onye chụrụ-aja mgbaghara mmehie nke a zuru oke site n’ịkwafu ọbara nke ya” (Oz Ọd. 76:65, 68–69).
N’ihi na Jisus Kraịst atọpiawo nkikere nke ọnwụ, ụmụ Nna nke Igwe nile amụrụ n’ụwa ga ebilite n’ọnwụ n’ahụ nke n’enweghi ike ịnwụ ọzọ. Ya mere ọgbụgba-ama m na nke gi banyere eziokwu a di ebube nwere ike bupu ụfụ ọnwụ nke onye ezi-na-ụlọ ma ọbụ enyi ma were ọṅụ n’ime olileanya na nnagide kwụsiri ike wee nọchie ya.
Onye-nwe enyewo anyi nile onyinye nke mbilite n’ọnwụ, ebe mụọ anyi ga abanye anụarụ nke n’enweghi ntụpọ (lee Alma 11:42–44). Nnem ga-egosị onwe ya di ka agbọghọ n’ekeke, akara okenye na afọ ntaramahụhụ nile ka a ga e kpochapụwo. Nke a bụ onyinye ga abiara ya na anyi.
Ma ndị n’ime anyi n’ele anya isonye ya rue ebighi-ebi ga eme nhọrọ ndị ga eme ka anyi tozue oke maka nmekọ a, ibi ebe Nna na Nwa Ya Nwoke biliriwo n’ọnwụ bi n’ebube. Nke a bụ sọsọ ebe ndụ nke ezi-na-ụlọ ga anogide mgbe nile. Ọgbụgba-ama nke eziokwu a ewulitela nnagide m itozu onwe m na nke ndị m hụrụ n’anya maka ogo kachasị-elu nke ala-eze selestịal site n’aja mgbaghara mmehie nke Jisus Kraịst ịrụ ọrụ na ndụ anyị (hụta Oz Ọd. 76:70).
Onye-nwe nyere anyị ntuzi aka dika anyị na chọ ndụ ebighi-ebi na ekpere oriri-nsọ nke n’enyere m aka nwekwara ike inyere gị aka. A na akpọ anyị oku ịmegharị ọgbụgba-ndụ nke baptism anyị na ọgbakọ oriri-nsọ nile.
Anyi kwere nkwa icheta Onye-Nzọpụta mgbe nile. Nnochita nke aja Ya n’enyere anyi aka inwe afọ ojuju maka ụgwọ nke Ọ kwụrụ ịtịwasị ịkịkere nke ọnwụ, imere anyi ebere, ma wetara anyị mgbaghara nke mmehie anyị nile ma ọ bụrụ n’anyi họrọ ị chegharị.
Anyi n’ekwe nkwa idobe iwu nsọ Ya. Ị n’agụ akwụkwọ nsọ na okwu nke ndị amụma dị ndụ na ige okwu ndị juputara na Mụọ nsọ na ọgbakọ ọriri-nsọ n’echetara anyị ka anyị mezuo ọgbụgba-ndụ anyị. Mụọ nsọ n’ewetara echiche na obi anyị iwu kachasi mkpa anyị ga edobe ụbọchi a.
Na ekpere oriri-nsọ, Chineke n’ekwe nkwa izite Mụọ Nsọ ka Ọ nọnyere anyi (hụta Moronaị 4:3;5:2; Oz Ọd 20:77, 79). A chọpụtala m na oge ahụ Chineke nwere ike nye m ihe dị ka nchọpụta nke onwe. Ọ n’eme ka m mata ihe ndị mmere dị Ya nma, ebe ndị mkwesiri icheghari maka mgbaghara, na aha na ihu ndị mmadụ Ọ chọrọ ka m nyere aka.
Afọ nile ndị a, ihe mmegharị nke a emela ka olileanya n’eweta mmetụta n’obi nke ihụnanya ma wetakwa nkwa na ebere mepere m site na Aja-mgbapụta na mbilite n’ọnwụ nke Onye-nzọpụta.
A na m agba ama na Jisus bụ Kraịst nke biliworo n’ọnwụ, ma bụrụkwa ịmatụ anyị zuru-oke na onye ndu anyị na ụzọ ndụ ebighi-ebi.
© 2013 site n’aka intellectual Reserve, Inc. Ikike Mbipụta nile ka e dokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/12. Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/12. Ntụgharị-asụsụ nke First Presidency Message, April 2013. Igbo 10664 593