2013
Ọgbụgba-ndụ nke Tempụl
Eprel 2013


Ozi nke Nkuzi Nleta, Ọnwa anọ 2013

Ọgbụgba-ndụ nke Tempụl

Were ekpere gụọ ndepụta a ma dika okwesiri, were ya tule uche gị na ndị inyom Ị na-eleta. Were ajụjụ ndị a nyere onwe gị aka ikwalite ndị ụmụ nne gị nwanyị na ime ka Relif Society bụrụ akụkụ dị mkpa na ndụ gị. Maka imata ihe ndị ọzọ, ga na reliefsociiety.lds.org.

Foto, oyiyi
njiri-mara Relif Society

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Relif

“Emume-nsọ maka nzọpụta a na anata na tempụl na ekwe ka anyị laghachikwuuru Nna anyị nke Igwe otu ụbọchi na mmekọ nke ezi-na-ụlọ mgbe ebighi-ebi ma bụrụ ndị atụkwasiri ngọzi na ikikere site n’elu tozuru aja nile na mgbali nile,”1 Onye Ịsị Ndụzị Thomas S. Monson kwuru. Ọ bụrụ na Ị gabeghi tempụl, Ị nwere ike kwado inata emume nsọ nke tempụl site:

  • Ịkwenye na Nna nke bị na elu-Igwe, Jisus Kraịst, na Mụọ Nsọ.

  • Ịkụ ama nke aja-mgbaghara nke Jisus Kraịst na ozioma nke eweghachitala ọzọ.

  • Ịkwado ma na-eso onye amụma dị ndụ.

  • Ịtozu oke maka akwụkwọ nnabata nke tempụl site na ịkwụ otu ụzọ na ụzọ iri, bie ndụ dị ụcha, bụrụ onye ezi-okwu, dobe Okwu nke Amamihe, ma bie ndụ dika nkuzi nke Nzukọ a.

  • N’enye oge, akaraka, na ihe inwere inye aka wulite ala-eze nke Onye-nwe.

  • Ị na-arụ ọrụ nchọpụta agbụrụ ezi-na-ụlọ.2

Onye Isi Nduzi Monson kuzikwara si, “Ka anyị n’echeta ọgbụgba-ndụ anyị mere n’ime [tempụl], anyị ga enwe ike nagide mkpagbu ma merie ọnwụnwa ọbụla.”3

Site na Akwụkwọ-nsọ

Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 14:7; 25:13; 109:22

Site na Akụkọ anyị

“Ndị Nsọ ọnụ ọgụgụ ha kariri 5,000 kwo-juru Tempụl Nauvoo mgbe agọzichere ya. …

“Ume, ikike, na ngọzi nke ọgbụgba-ndụ nke tempụl [bụ nkwado] nye Ndị Nsọ nke Ikpe-azụ n’oge njem ha [ọdịda anyanwụ], mgbe ha [tara ahụhụ] oyi, ekpomọkụ, agụrụ, ogbenye, ọrịa, ihe mgberede, na ọnwụ.”4

Dika ọtụtụ ndị inyom Relif Society, Sarah Rich jere ozi ka onye-ọrụ nke tempụl. O kwuru maka nke a: “Ma ọ bụghị okwukwe na ọmụmụ-ihe nke awụkwasiri anyị na tempụl site…na Mụọ nke Onye-nwe, njem anyị gara adị ka itụfụ ụkwụ n’ime ọchichiri. … Ma anyị nwere okwukwe n’ime Nna anyị nke Igwe, … nwe mmetuta na anyị bụ ndị Ọ họpụtara … , ma kama iri-uju, anyị ṅụriri na ụbọchi mgbapụta anyị abiala.”5

Ọpụpụ ahụ abụghị “itụfụ ụkwụ n’ime ọchichiri” na-ebe ụmụ nwanyị Ndị nsọ Ụbọchi-Ịkpeazu a nwere okwukwe nọ. Ha bụ ndị ọgbụgba-ndụ ha nile na tempụl kwadoro.

Ndepụta

  1. Thomas S. Monson, “Tempụl dị Nsọ—Ịhé nke Ụwa,” Liahona, Ọnwa Ise 2011, 92.

  2. Hụta Ụmụada Ala-eze M,: Akụkọ na Ọrụ nke Ndi Inyom.

  3. Thomas S. Monson, Liahona, Ọnwa Ise 2011, 93.

  4. Ụmụada na Ala-eze M,29–30.

  5. Sarah Rich, na Ụmụada na Ala-eze M, 30.

Gini ka m ga emeli?

  1. A na m efe ofufe na tempụl mgbe ọbụla?

  2. A na m akwado ụmụ nwanyị ka ha nata ngọzi nile nke tempụl?

Bipụta