2013
Manye site na Okwụkwe
Julaị 2013


Ntorobia

Iji Okwụkwe N’aga

Onye odee a bị na North Carolina, USA.

Agaghị m echefu oge-mgbe m kpara-ụkwụ na ala ebe Winter Quarters, Nebraska, USA, ebe ndị mbute-ụzọ biri ọtụtụ afọ gara-aga. Ala ebe ahụ dika ọdị nsọ, ọdị kam nọ na mbara ịro ebe nleta di na tempụl.

Akwa anya-mmiri juru m na anya, ma mee-kwa ahụghị m ụzọ nke ọma. Ahụrụ m onye akpuru-akpu mana akọtaghị m otu ọdị. Ma mgbe m hichara anya mmiri nke ọma, ahụrụm otu nwoke na nwanyi ihụ jọrọ-njọ site na ihe ahụhụ. Mgbe mlere anya nke ọma, ahụkwara m ịhe dịka nwatakịrị eliri-eli na ụkwụ ha.

Ihe nke-a m hụrụ mere ka mkpalite jupụta m na obi: obi-ọjọọ, ịwe,obi-ekele, na anụrị. Achọsịrị m ike ịwepụga ịhe ụfụụ ndị nsọ nile riri, ma na otu aka ahụ, obi dị m ụtọ na ịhe nile ha chụrụ na ajah maka ọzị-ọma a.

Ahụmịhe mnwere na Winter Quarters mere kam ghọta na Nna anyị nke Bi-na-Igwe nyere ụmụ Ya ọzị-ọma ma nyekwa anyị ohere iji akọ na uche ha ịje mee ịhe dịka ha chere masịrị ha. Ndị nne na nna nwatakịrị ahụ gaara-ahọrọ ụzọ nke kachasị nfe. Isoro onye amụma na ịbị-ndụ nke ọzị-ọma, kpatara na ndị mbute-ụzọ ahu, ga-aga n’ ihụ, ọbụ-nadị mgbe ọpụtara na ha ga eli nwa ha. Ma na ha họọrọ ị were ọzị-ọma ahụ tinye na ndụ ha ma nabata ịhe ima-aka nile chere ha n’ihụ. Achọpụtara na ndị nsọ inyefe onwe ha na-aka ọzị-ọma, ya na mkpebi ha ikwudosi ike bụ ịhe mkpali site na okwụkwe na olile-anya—olile-anya nke ezi-ndụ na abịa n’ihụ ya na okwụkwe na Onye-nwe maara ha na onwere-ike wezuga ahụhụ ha.

Bipụta