2013
Nkụzi na Ọmụmụ nke Ọzị-ọma
Julaị 2013


Ozi nke Nkụzi ndị nleta ụmụ-nwanyị, Ọnwa-Asaa 2013

Nkụzi na Ọmụmụ nke Ọzị-ọma

Jiri ekpere gụọ ịhe ngwa-ọrụ a ma, dịka okwesịrị, kpaa ya na nkata gị na ndị ụmụnne nwanyị ndị ị na eleta. Were ajụjụ nile nyere onwe gị aka ịgba ndị ụmụnne gị nwanyị nile ume na ị mee ka Otu Enyem-aka bụrụ nke dị mkpa na ndụ gị. Maka inweta nkọwa ndi-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org.

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

Jịsọs Kraịst bụụrụ onye nkụzi ọkacha-mara. O gosiri anyị ịhe nlere anya dịka Ọ “ọkụziri igwe-ụmụ nwanyị na ndị mmadụ na-otu-na otu, na okporo-ụzọ ma na akụkụ mmiri, na akụkụ ọmịị ma n’ebe ụlọ ha. O gosiri ha ihụnanya pụrụ-iche ma gwọ-kwa ha na ezi-na-ụlọ ha nrian-nria ha nile.”1

Ọ kụziri Martha na Mary ma “kpọọ ha ka ha bụrụ ndị na eso ụzọ ya ma nata nzọpụta, ‘ụzọ nke ahụ di nma’ [Luke 10:42] nke na agaghi anapụkwa ha”2

N’ime akwụkwọ nsọ nile anyi nke ụbọchị ikpeazụ, Onye-nwe anyi nyere anyi na ịwu ka anyi “kụziere otu onye nye ịbe ya, ozizi ahụ nke ala-eze” (O&O 88 :77). Na nkụzi na Ọmụmụ ozizi, CheryI A. Esplin, Onye ndụmọdu nke abụọ na ndi otu nduzi zuru-ọha nke Pramari siri, “Na ịmụ-ihe ka ịghọta nke ọma ozizi nile nke ozị-ọma bụ ihe nke na adigide na ndụ ma na abiakwa ‘na-ahiri n’elu ahiri, ozizi n’elu ozizi ntakiri n’ebe a ntakiri ebe ahụ” 2 Nefai 28:30)3

Dika anyi na amụ, agụ na ekpe-ekpere, anyi ga na akụzi site na ike nke mụọ nsọ, onye nke ga ebụrụ ozị anyi “baa ruo n’obi nile nke ụmụ mmadu” (2 Nefai 33:1).

Site na Akwukwọ-nsọ nile

Alma 17:2–3; 31:5; Ozizi na Ọgbụgba Ndụ nile 42:12–13; 84:85

Site na Akụkọ ochie anyị

Ndi amụma na oge gara-aga na echetara anyị na dịka ndị nwanyị, anyị nwere ọrụ dị mkpa dịka ndị nkụzi na ezi-na-ụlọ na Nzụkọ-nsọ. Na Onwa-Itoli 1979, Onye Ịsị Ndụzi Spencer W. Kimball (1895–1985)rịọrọ anyi ka anyi bụrụ “ụmụnne nwanyi ndi nke maara akwụkwọ nsọ nke ọma” Ọ siri: “Bụrụ nụ ndị ọgụ akwụkwọ nsọ nile ọbụghị iji weda ndị ọzọ ka ma ọbụ iji bulie ha elụ! Asị ka ekwu-we, onye nwere nnukwu mkpa “ịmụkọ” ezi-okwu nile dị na ozị-ọma (nke ha nwere ike iwere mgbe ha chọsịrị ya ike) karịa ndị ụmụnwanyị na ndị nne ndị nke na eme otu a ọtụtụ oge ha na azụlite na akụziri?”4

Anyị nile bụgasi ndị na akụzi-akụzi ma na amụ kwa amụ. Mgbe anyị na akụzi site na akwụkwọ nsọ na kwa okwu nke onye amụma anyị ndị ndụ, anyi na enyere ndi ọzọ aka ịbiakwute Kraịst. Mgbe anyị na amụ-ịhe site na ịjụ ajụjụ bara uru na kwa ịge ntị, anyị na enweta ọsịsa iji gbo mkpa anyị nile.

Gịnị ka m nwere ike ị mee?

  1. Kedụ kam ga esi akwadebe onwe m ịbu ezigbo onye nkuzi?

  2. Anam agba ama m nye ndị ụmụnwanyị m na elekọta anya?

Lee-anya

  1. Daughters in My Kingdom: Akwụkwọ akụkọ na Ọrụ nke ndi Otu Enye-m Aka (2011), 3

  2. Daughters in My Kingdom 4

  3. Chery A. Esplin, “Teaching Our Children to Understand Liahona na Ensign Onwa ịse 2012, 12

  4. Spencer W. Kimball, n’ime Daughters in My Kingdom 50

Bipụta