Ozi nke Otu Ndị-Ịsi Ndụzi Mbụ, Ọnwa-Asaa 2013
Ụwa-a chọrọ ndi Mbute-ụzọ Taa
Na ọtụtụ afọ gara-aga, njem ndị mbute-ụzọ nke 1847 amalite-ghi na Nauvoo, Kirtland, Far West, ma ọ-bụ New York, kama ọ-bụ na ndịda England, Scotland, Scandinavia, ma ọ-bụ Germany. Ụmụ-ntakịrị agaghị aghọtacha okwụkwe ahụ siri-ike nke na akwalite ndị nne-na-nna ịnwe nmasị ịhapụ ezi-na-ụlọ, ndị enyi,ọnọdụ-ọma, ya na nchekwa.
Otu nwata ntakịrị nwere-ike jụọ “Mama, gịnị mere anyị ji na ahapụ ebe-obibi anyị? Ebee ka anyị na-aga?
“Bia-wa-nụ nwa ọma-m; anyị na aga Zion, obodo nke Chineke anyị”
Na etiti nchekwa nke ezi-na-ụlọ, na Zion nke ekwere na nkwa, bụ nnukwu ebuli oke mmiri nke Atlantic. Onye ga akọli-akụkọ maka ụdị egwu tụrụ ndị mmadụ n’ọbị, mgbe ha na agafe ịhe oke-egwu-ndị-a? Site na nmetụta na uche nke Mụọ, nkwado nke nnagide okwukwe ha, ndị otu-nzụkọ-nsọ ọhụụ ndị-a kwe-nyere na Chineke ma malite-kwa njem ụgbọ-mmiri ha.
Ha mechara ga-ruo Nauvoo, kama ọbụ nanị imalite-kwa ọzọ ga tawa-kwa ahụhụ na oke njem ha. N’okporo ụzọ nile sitere Nauvoo na-aga Salt Lake City bụ, sọsọ ala-ịlị ala-ịlị ndị oke mmadụ. Ụdị-a bụụrụ nketa ugwo-ọrụ ụfọdụ ndị mbute ụzọ kwụrụ. Ma ahụ ha, ka elị-kwara nke ọma, mana ezi-aha ha, na-adịgide-ndụ na-aga n’ihu.
Ehi na-aga ike-ọgwụgwụ ike-ọgwụgwụ ,ụkwụ-igwe ụgbọ-ala na-ada chikiri-chikiri, ndi dimkpa ha rụrụ oke-ọrụ, ịgba egwu-agha dakwara, ya na oke-mkpu nkita-ọhịa n’eti. Ma, site na okwụkwe, na ebum-na uche, ndị njem ọhụụ-a, na-agakwa n’ihụ. Ọtutu mgbe ha n’ekwe:
Bia-nụ bia-nu ndi nsọ nile,unu atụla ọrụ-ike ma ọ-bụ ịrụsị ọrụ ike ụjọọ;
Ma were-nụ obi-ọma na aga njem unu.
Onwere-ike ọdị unu ka njem-a osiri-ike,
Amara ya, ka aga enye unu dịka ụbọchi nile. …
Ịhe-a nile dịcha nma! Ihe-a nile dịcha nma!1
Ndị njem ọhụụ-a chetara okwu nile nke Onye-nwe: “A ga-anwale ndị nke m n’ịhe nile, ka ha wee kwado ịnara ebube nke m debere ha, ọbụladị ebube nke Zaịọn.”2
Dika oge na aga, echi-che anyị na agbada-kwa na ịhe gbasara ndị anyị kwesịrị ịcheta site na ịhe ahụhụ ha tara, dịka anyị na ahụta ya na ọtụtụ ịlị gbawasiri-agbawasi, ndị anyị na amaghị. Ma-na kedụ maka ịhe iche-aka-mgba nile nke ụbọchi taa? Ọ bụ-na, onweghị okwute nọ na ụzọ njem gị, ọbụ-na enweghị ugwu ịga arị, ọbụ na-enweghi ndagwurugwu aga-agafe, onweghị ụzọ ọzọ aga egbuwa, onweghị mmiri unu ga agafe? Ka-ọbụ na ọbụ ihe dị oke mkpa, ka mụọ nke ndị mbute-ụzọ ahụ ga dupụta anyị site na ịhe egwu chọrọ-iri anyị, ma duba-kwa anyị na nchekwa nke Zaịọn?
Na-ime afọ iri alụchara agha Mba-Ụwa nke II, ịhe ntụtụ eji amatụ ezi-omume na ada-ada kwa-mgbe kwa-mgbe. Ịhe ọjọọ na abawa-nye; ezi-omume nọ na ụzọ oke ọdida. Ọtụtụ mmadụ nọ na ugbọ mbịbị, na achọ ịhe ga enye ha nmetụta mkpali nke ụwa ma hapụ obị-ụtọ nke ndụ ebighị-ebị. Mgbe ahụ anyị na ewezụga ịnwe udo.
Anyị echefuo otu ndị Greek na ndi Roman jiri nwe ọganihu mgbe ụwa ka gba ọtọ, na otu nke-a jiri kwụsị—otu, obi ume ngwụ na obi larịị jiri dakwasi ha na ọnọdụ mbịbị ha. Na ikpe-azụ, karịa otu ha si chọọ mnwere-onwe, ha chọkarịrị nchekwa-ndụ na ọnọdụ obịbị ndụ di nma; ma ha enwetaghị ha nile—ọnọdụ obịbị ndụ di-nma, nchekwa-ndụ, na nwere-onwe.
Ada-nye-kwala na ịhe onwụ-nwa nile nke Ekwensu, kama, kwụrụ na ezi-okwu. Afọ eju-eju nke mkpụrụ-obi abughị ịhe aga egbochi site na ịchọsi-ike ịnweta añuri nke nọ na etiti ebe ana enwe mmetụta mkpali ime ịhe ụma-ọjọọ. Ụma-ọjọọ anaghị eduba na ezigbo-ụma. Ịkpọ-asị anaghị ewulite ịhụnanya. Ịtụ oke ụjọ anaghị enye mgbamume. Ịnwe-obi-abụọ anaghị akpalite ịnwe okwụkwe.
Ụfọdụ ka ọ na arara ahụ iguzosị ike na etiti ịkwa-emu na okwu ndị jọrọ-njọ nke ndị iberibe, ndị nke ji iwu mmekọrịta nwoke na nwanyị,ikwu-aka-ọtọ,ịrube ịsị nye iwu Chineke nile akpa-amụ. Ma-na ndị ụwa dịbụ mbụ n’asị na ị kwagidesi-ike na ezi-okwu adịghị mkpa. Mgbe enyere Noah ntụzị-aka ka ọrụọ ụgbọ mmiri, ọha na eze ndị nzuzu mgbe ahụ lere anya na elu-igwe urukpuru na adịghị, ma ha kwara ya emo ma chịa-ọchi mkpasu iwe, rue mgbe mmiri ozuzo bịara.
Ọdị-mkpa na anyị ga na amugharị ụdị ịhe oke ọmụmụ-a ugboro-ugboro? Oge na agbanwe-agbanwe, ma-na ezi-okwu na atachi-obị, na anọgịde. Ọbụrụ na anyị enweghị ịhe mmụta site na ahụmịhe anyị gara-aga, anyị ga enwe ịhe mbịbị onwụ ọzọ nke ịhe ndị n’eso ya gunyere ịsị-owuwa,ịta-ahụhụ, na ịta ikikere-eze. Ọbụ na anyị enweghị amamịhe nye Ya onye ahụ ma ịsị-mbịdo site na ịsị-njedebe—Onye-nwe anyị, onye nke chepụtara atụmatụ nzọpụta—karịa onye ahụ bụ ekwensu, onye nke na eleda ịdịnma ya anya?
Akwụkwọ ọkọwa-okwu kọwara onye mbute-ụzọ dika” onye gara na obodo ọhụụ ịbị-ebị ma ọ-bụ ịrụ ọrụ nmepe tutu ndị ọzọ esowe”3 Anyi nwere-ike ịkpakọta mgbamume anyi ma guzosi-ike na ebum n’uche, nke bụ omume ndi mbute-ụzọ. Mụ na gị enwere-ike, na ezi asusu, bụrụ ndi mbute-ụzọ.
Amam na anyị nwere-ike ịbụ ya. Oh, otu ụwa-a siri chọsie-ike ndị mbute-ụzọ taa!
© 2013 site n’aka intellectual Reserve, Inc. Ikike Mbipụta nile ka e dokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/13 Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/13 Ntughari nke First Presidency Message, Ọnwa asaa 2013. Igbo. 10667 593