2013
Onyinye nke Jen
Ọktoba 2013


Ntorobia

Onyinye nke Jen

Onye dere ya bi na Utah, USA.

Emere m ọtụtụ nhọrọ n’ezighi-ezi n’afọ nke abụọ m n’ụlọ-akwukwọ sekọndrị. Nhoro nile ndi ahụ dubara na oke nso-n’azu nile ya na enweghi obi-ụtọ, ma ekpebiri m iwere oge-ezumike ọkọchị m ịmalite ime mgbanwe nile. Mgbe ụlọ-akwukwọ malitekwara ọzọ, anaara m eri-nri ehihie n’akụkụ ụlọ ịsa-ahụ ma ọbụ n’ebe ghere-oghe e si na-agafe ụlọ-ezumezu inwe ike gbanahụ ajọọ mmekọrịta niile chebiiri ịnabatachi m.

Ọdịbeghị mgbe m nwere mmetụta ịnọ-nanị m otu ahụ.

Mgbe ahụ Chineke nyere m onyinye: O zitere m Jen. Ọdịghị mgbe ọbụla o kpere m ikpe maka emezighi-ihe m nile kama ọ gbara m ume ka m gawa nnọọ n’ụzọ ahụ ziri-ezi. Ịmata na ọ ga-anọ n’ụlọ-akwukwọ nyere m aka ịga n’ihu ịgụ akwukwọ-nsọ m nile ma na-zulite ịgba-ama m. Mgbe oge inweta nzere agụmakwukwọ bịara, egosịpụtaworo-rịị onwe m na-m anọrọwo na mkpebi ịgbanwe.

Ana m eche na mgbe ụfọdụ ebe m gaara anọ taa ma ọ bụrụ na Jen esetịpụghị rịị aka nweta m. M gaara anọgide n’ụkpụrụ nile ma e wezuga ya? N’inwe ụwa ọma, ọdịghị mgbe m gaara amata n’ihi na ọ nọọrọ n’ebe ahụ jiri obi ya nile, nọrọ na njikere ma chọọ inyere m aka.

Bipụta