2013
Ọrụ dịrị anyi Ịnapụta
Ọktoba 2013


Ozi nke Otu Ndi-Isi Nduzi Mbụ, Onwa iri 2013

Ọrụ Dịrị Anyi Ịnapụta

Onye Isi Nduzi Thomas S. Monson

Maka ndi nsọ Ụbọchị Ikpe-azụ a, mkpa inapụta ụmụnne anyi ndi nwoke na ndi nwanyị ndi nke, site n’otu ihe ma ọbụ nke ọzọ, gahieworo site n’uzọ nke ịdị uchu n’ime ihe Nzukọ nsọ bụ ihe dị oke mkpa na ndụ. Anyi maara maka ndi dị otu-ahụ nke nabataworo ozị-ọma ahụ otu mgbe? Ọbụrụ otu ahụ, gịnị bụ ọrụ dịịrị anyi ịnapụta ha?

Tulee ndi dapuworo n’etiti ndi okenye, ndi isimkpe, na ndi ọrịa. Ọtụtụ mgbe ka a na enweta ha n’ọnọdị ndi dika ndị uwa jụrụ ajụ n’enweghi ndị na elebara ha anya Mgbe oge ntorobia gafere, mgbe ahụ-ike gbadara, mgbe ume belatara, mgbe ihe nke olile-anya na-alazi azụ na anwu ntakiri ntakiri mgbe nile, enwere ike inyere ha aka site na aka ndi ahụ nwere ike inye aka ma nwee obi nke maara ihe banyere ọmịko.

Na-ezie, e nwere, ndi ọzọ nwere mkpa nnapụta. Ụfọdu na agba-mbọ ịpụta na mmehie, ebe ndi ọzọ na-awaghari n’ujọ ma ọbụ agụụ inwe mmetụta ma ọbụ adịghị nke ha ma. Ihe ọbụla kpatara ya, ha ewezugala onwe ha iche n’ime ihe na Nzụkọ-nsọ. Ma ọ ga afọdụ ntakịrị ka ọbụrụ na ha ga-anọgide ịbu ndị furu efu ma ọbụghị ma akpọtere n’ime anyi—ndi otu dị uchu na Nzukọ-nsọ—nwere ọnụnụ-ọkụ n’obi inapụta na ịzọpụta.

Onye ga-Egosị Ụzọ

Oge gara aga anatara m akwukwọ-ozị e dere site n’aka otu nwoke nke gahieworo site na Nzukọ-nsọ a. O gosịrị ụdịri ọnọdụ nke ọtụtụ ndi otu anyi. Mgbe ọ kọwasịrị otu o siri bụrụzie onye na-adighi uchu na n’ime ihe, o dere:

Énwebụru m nnukwu ihe, ma ugbua enwere m sọsọ ntakịrị ihe, Enweghi m obị-ụtọ ma o na-emetụta m dika m na-adazi ada n’ihe nile. Ozị-ọma adibeghi mgbe ọ pụrụ n’obi m, na agbanyeghị na o pụwo- rịị na ndụ m. Ana m arịọ maka ekpere unu nile.

”Biko echefula anyi ndi nke dahiewororịị—ndi nsọ Ụbọchị ikpe-azu furu efu. Ama m ebe Nzukọ-nsọ a dị, kama oge ụfọdụ ana m eche na enwere m mkpa onye ọzọ igosị ụzọ ya, igba m ume, iwepụ egwu m, ma gbaara m ama.”

Mgbe m nọ na-agụ akwukwọ-ozị a, uche m tụgharirị na nleta m mere n”otu nnukwu ebe a na-akwasa ihe ọrụ nka nke ụwa—Ụlọ nkwasa nke Victoria na Alberta maara nke ọma di na London, England N’ebe ahụ, ka ọrụ a achọrọ mma mabigara oke, a kpachapụrụ anya mezie emezie etejiri n’afọ 1831 site n’aka Josef Mallord William Turner. Nteji ahụ na egosipụta urukpu ojii bụ ibu-arọ na oke iwe nke osimiri nwere, ebili mmiri na-egosi ihe egwu na ọnwụ. Ihé si n’ụgbọ mmiri tọrọ-atọ na ekewapụta site n’ebe di anya. N’ebe dị n’ihu, na ebuli elu, site n’ebili-mmiri na abata abata nke mmiri na-agbolite ụfụfụ,bụ, ru otu nnukwu ụgbọ-mmiri nke nchekwa ndụ Ndi nwoke dọsiri aka ike n’ogologo osisi ndokpụpụta ahụ dika ụgbọ -mmiri nchekwa ndụ na emikpu n’ime ebili-mmiri ahụ N’akụkụ mmiri ahụ ka otu nwanyi na ụmụ ya abụọ guzoro, dee, site na mmiri ozuzo na ikuku na efe ha. Ha legidesịrị anya ike n’ebe osimiri ahụ dị. N’echiche m edere m na nke-nke aha nke nteji ahụ. N’obi nkem oghọziri Na Nnapụta ahụ.1

N’ime ihe izedụ nke ụwa, jupụtara na ihe egwu zoro-ezo. Ndi nwoke na ndi nwanyi, ụmụ-okorobia na ụmụ-agbọgbọ na ahụta onwe ha dika ndi nọ-na mgbawoju-anya ma na-eche mbibi chere ha n’ihu. Onye ga eduzi ụgbọ-mmiri nchekwa-ndụ nile ahụ, ma hapụ ọnọdụ oma-ike nke ebe obibi na ezi-na-ụlọ, ma gaa nnapụta ahụ?

Ọrụ anyi nwere ịrụ abụghi ihe na-agaghi ekwe omume. Anyi nọ n’ozi nke Onye-nwe-anyi; anyi tozuru-oke inweta enye m aka Ya.

N’oge ije-ozi nke Onye-nzọpụta, Ọ kpọrọ ndi na-akụ azụ na Galili ka ha hapụ ụgbụ-azụ ha nile ma soro Ya, na-ekwụpụta,” Aga m eme unu ndi-ọkụ na–akụta mmadụ.”2 Ka anyi nwee ike sonyere otu nke ndi ọkụ-azụ na-akụta ndi nwoke na ndi nwanyi, ka anyi nwe ike nye enyem-aka ọbụla anyi nwere ike ịnye.

Orụ anyị bụ igba mbọ ịga napụta ndi ahụ nke hapụworo nchekwa nke ime ihe, ka ha nwee ikembụrụ ndi akpobatara na tebụlụ nke Onye-nwe-anyi inwe ọńụ n’Okwu Ya, inwe ọnụ nnọnyere nke Mụọ Ya, ma ka ha ghara “ibụ kwa ndi-ọbia na ndi mba ọzọ, kama ndi-otu ndi nwe obodo anyi na ndi-nsọ, na nke ezi-na-ụlọ nke Chineke”3

Ụkpụrụ nke Ịhụnanya

Achọpụtawo m na, ihe abụọ bụ ntọ-ala dị mkpa na-enye nnukwu nkọwa na nlaghachi n’ịdị uchu n’ime ihe na mgbanwe, nke akparam-agwa nile, obibi ndụ na omume ime ihe nile. Nke mbụ, ndị mmadụ na-alaghachi n’ihi na mmadụ egosiwo ha ihe nile kwere omume na ndụ ha ma enyere ha aka n’ikpebị inweta ha. Ndi na-ala azụ n’ịdị uchu ime ihe agaghị enwe ike ịnọ ogologo oge n’izu-ike n’ịnọ n’etiti ozugbo ha hụtara na imezi ihe nke ọma ga-eru ha aka.

Nke abụọ, ndi ọzọ na–alaghachi n’ihi na ndi ha hụrụ n’anya ma ọbụ ndi ha na ndi nsọ so nwere obodo” esorowo ndumọdụ nke Onye Nzọpụta, ahụwo ndi agbata-obi ha n’anya dika onwe ha4 ma ha enyeworo ndi ọzọ aka iweta ebum n’uche ha nile na mmezu na agụụ iwetazu ebun’uche ha nile.

Ihe na eweta mgbanwe n’usoro nke a abụrụwo rịị—ma ga-aga n’ihu na-abụ—ụkpụrụ nke ịhụnanya.

N’ezi uche, ndi ahụ tọrọ-atọ nime osimiri ahụ ebili-mmiri na-ebụgharị nke nteji Turner ahụ dị ka ọtụtụ ndi-otu na-adighizi uchu n’ime ihe ndi na-echere nnapụta site n’aka ndi na-edu ugbọ-mmiri nchekwa-ndụ ahụ. Obi ha na-achọsi enye m aka ike. Ndi Nne na ndi nna na ekpere ụmụ ha ndi nwoke na ndi nwanyi ekpere. Ndi nwunye na-arịọ arịrịọ ka e-rute ndi dị ha. Oge ụfọdụ ụmụaka na-ekpere ndi nne na nna ha ekpere.

Ekpere m bụ ka anyi nwee mmasị na-achọ ịnapụta ndi na anaghị adizi uchu n’ime ihe ma kpọghachi ha na ańuri nke ọzi-ọma nke Jisọs Kraist ka ha wee nwe ike soro anyi keta oke n’uju ihe nile ngakọrita nwere inye.

Ka anyi nwe ike gaa ịnapụta ndi dapụrụ adapụ gbara anyi gburu-gburu; ndi okenye, ndi isikpe, ndi ọria, ndi nke nwere nkwarụ, ndi na-adighịzi uchu n’ime ihe, na ndi na-anaghị edebe iwu-nsọ nile. Ka anyi setipụrụ ha aka enye m aka na obi nke juputara n’ọmịko Site n’ime otu ahụ, anyi ga-eweta anurị n’ime obi ha, ma anyi ga-enwe mmetuta uba afọ ojuju nke na-abiara anyi mgbe anyi na-enyere onye ọzọ aka n’okporo ụzọ na-eduba na ndụ ebighi-ebi.

Lee-anya

  1. Isi-okwu nteji ahụ n’uju ya bụỤgbọ-mmiri nchekwa ndụ na Ngwa-ọrụ Mandy Na-agapụ ruo n’Ụgbọ mmiri Tọrọ-atọ Na-eme ka Ahụ ọnọdụ Nnukwu Nsogbu ya (Blue Lights)

  2. Matiu 4:19

  3. Ndi Efesọs 2:19

  4. Lee Matiu 22:39

Nkuzi si na ozi a

Tulee ịjụ ndi Ị na-eleta ma ha matara onye ọbụla nke nọworo rịị na-agbali ịchọ ịbịa nzụkọ-nsọ. Ị nwere ike họrọ otu onye ma kparita-ụka ụzọ ndi enwere ike1 iji gosị ịhụnanya, di ka, ikpọ ya oku isoro mee ihe na nnọkọ-abalị nke ezi-na-ụlọ ma ọbụ ịbịafeta ka e rie nri.