2013
Ozi dị Nsọ nke Jisọs Kraist: Onye-okike
Ọktoba 2013


Ozi Nkuzi Nleta, Onwa iri 2013

Ozi Dị nsọ nke Jisọs Kraist: Onye-okike

Jiri ekpere mụọ ihe ngwa-ọrụ a ma, dika okwesiri, kparita ya na nkata, gị na ndi ụmụnne nwanyị ndi ị na-eleta. Were ajụjụ nile nyere onwe gi aka igba ndi ụmụnne gị nwanyi ume na ime ka Otu Enyem-aka bụrụ nke dị mkpa na ndụ gị. Maka inweta nkọwa ndi-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org.

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

jisọs kraist kere elu-igwe na ụwa” (3 Nifai 9:15) O mere otu ahụ site n’ike nke ọkwa-nchu-aja, n’okpuru ntụziaka nke Nna anyị nke Elu-igwe (lee Moses 1:33).

Lee otu inwe obi-ekele anyi kwesịrị ịdị na Onye-okike mazuru ihe nile O kere ụwa ma debe anyi n’ebe a” ka Onye-isi nduzi Thomas S. Monson kwuru “… ka anyi nwe ike nwe mmetụta oge mnwale, ohere ọma igosipụta onwe anyi iji nwe ike ịtozu-oke maka ihe nile nke Chineke kwadoro anyi ịnata”1 Mgbe anyi na eji ohere nhọrọ anyi na-erube isi n’iwu-nsọ nile nke Chineke ma na-echegharị, anyi na-etozu oke ịlaghachi ịbinyere Ya.

Na ihe banyere Okike, Onye-isi-nduzi Dieter F. Uchtdorf, Onye ndụmọdụ nke abụọ n’otu ndi isi nduzi nke mbụ, siri:

Anyi bụ ihe mere O jiri kee ụwa …

Nke a bụ nghọtahie di na okike-mmadu, atụnyere ya na Chineke, onweghi ihe mmadu bụ; mana anyi bụ ihe nile nye Chineke2 Ịmata na jisọs kraist kere ụwa maka anyi n’ihi na anyi bụ ihe nile nye Nna nke Elu-igwe, nwere ike inyere anyi aka wulite ihụnanya anyi nwere n’ebe Ha no.

Site na Akwukwọ-nsọ

John 1:3: Hebrews 1:1–2: Mosiah 3:8: Moses 1:30–33,35–39,: Abraham 3:24–25

Site na Akụkọ-ala Anyị

Ekewo anyi na ụdị nke Chineke (lee Moses 2:26–27) ma anyi nwe-kwara ikike ịwụlite onwe si n’elu-igwe. Onye Amụma Josef Smit dọrọ ụmụnne nwanyi nọ n’Otu Enye m aka na ntị ka ha “ bie ndụ dika ohere chi nyere ( ha).3 Site n’imesi-obi ike dika ihe nto-ala ụmụnne nwanyị nọ na Nzụkọ-nsọ nke Jisọs Kraist nke ndi ndi nsọ Ụbọchị Ikpe-azu a ka a kuzịworo ịbị ndụ igosi ihe ha nwere ike ịbụ site n’okike, site n’imejupụta ebum-núche nile nke Chineke n’ebe ha nọ Dika ha na-abia n’ịghọta ndi ha bụ n’ezie—ụmụ-ada nke Chineke, ha na omume ebum-pụta-ụwa ịhụnanya na ịzụlite—ha ga abụ ihe nile ha nwere ike ịbụ dika ndi ụmụnwanyi di nsọ.4

“Unu ugbu a n’ọnọdụ nke unu nwere ike ime ihe dika obi ọmịko, ndi ahụ nke Chineke kụnyere n’ime obi unu” ka Onye amụma Josef Smit kwuru. lee otu nnukwu na ịdị-ebube si di” Obụrụ na unu bie ndụ dika ụkpụrụ nile ndi a,—ọbụrụ na unu ebizuo ndụ ohere ọma, odighi ihe ga ejichị ndi mụọ-ozi site n’ibụ ndi unu na ha na-enwe mmekọ5

Lee-anya

  1. Thomas S. Monson, “Oso nke Ndụ,” Liahona, Onwa Ịse2012, 91.

  2. Dieter F. Uchtdorf, “Ịdi Ya Mkpa,” Liahona, Onwa iri na out,2011, 20.

  3. Josef Smit, n’imeDaughters in My Kingdom: Daughters in My Kingdom: Agụgụala na Ọrụ nke Otu-Enyem-aka (2011), 171.

  4. Daughters in My Kingdom,171.

  5. Josef Smit, na Daughters in My Kingdom 169.

Gịnị ka M Nwere Ike Ime?

  1. Olee otu, ịchọ ịghọta ụdị-okike nsọ anyi si na-eme ka ịhụnanya anyi n’ebe Onye-nzọpụta anyi nọ bawanye?

  2. Olee otu anyi nwere ike iji gosi obi-ekele anyi maka ihe nile Chineke kere?

Bipụta