2013
Bia, Sonye Anyi
Novemba 2013


Nkụzi ndi nleta ụmụnwanyi, Ọnwa ịrị 2013

Bia, sonye anyi

Na agbanyeghi ọnọdụ gị, ihe nkọpụta banyere gị, ma ọ bụ ikịke nke ọgbụgba-ama gị, enwere ohere na Nzukọ a maka gị.

Otu mgbe enwere otu nwoke rọrọ nrọ hụta onwe ya n’ime ebe mgbakọ buru ibu ebe okpukpere n’ile nke ụwa gbakọrọ. Ọ chọpụtara na okpukpere chi ọbụla nwere ọtụtụ ihe dika ihe achọsiri-ike ma kwesi inweta.

O zutere otu di na nwunye ndị ozi nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndi Nsọ Ikpe-azụ a ma jụọ sị, “Gini ka tụrụ-anya n’aka ndi otu nzukọ unu?

Anyi achoghị ihe ọbụla,” ha zara. “MaOnye-nwesị ka anyị nye ihe nile”

Di na nwanyi a gara n’ihu kọwa ọkpụkpọ-oku nke nzukọ, nkuzi na nleta nke ezi-na-ụlọ, ọrụ mgbasa-oziọma, mgbakọ ezi-na-ụlọ izu-ụka nile, ọrụ nke tempụl, ozi nke nleta na imetụta ndi ụwa na atụ n’ọnụ, na nkenye nke nkuzi.

“Unu ọ na akwụ ndi unu ụgwọ maka ọrụ nile ndia ha n’arụ?” nwoke a jụrụ.

“Oh, mba,” di-na-nwanyi a kọwara. “Ha na enye oge ha n’efu.”

“Ọzọ,” di-na-nwanyi a kwupụtara, “ọnwa isi nile ndi otu Nzukọ-nsọ na otu izu-ụka na esonye na Ọgbakọ nzukọ zuru ọha nile nke n’eri elekere iri.”

“Awa iri ndi mmadu ji ekwu okwu?” nwoke a jukwara.

“Kedu maka okpukpere unu izu-ụka nile? Oleghi otu ha si tee aka?”

“Awa atọ, Sọnde nile!”

“Oh, mụ,” nwoke ahụ siri. “Ndi otu nzukọ unu ha n’eme ihe ndi a ikwuputara n’ezie?”

“Ha nile ma ọzọ. Anyi ekwubeghi maka ị chọpụta agbụrụ ezi-na-ụlọ, ọgbakọ ndi ntorọbia na agbọghọ, ofufe-nro nke mụọ, imụ akwụkwọ nsọ, nkuzi ndi nduu, ihe omume ndi ntorọbia na agbọghọ, Seminary isi-ọtụtụ, ndozi ụlọ nzukọ, ma tinyere iwu Onye-nwe banyere ahụ ike, obubu-ọnụ inyere ndi n’enweghi aka na ọnwa nile, na otu ụzọ na ụzọ iri.”

Nwoke a siri, “Ugbua Enwere m mgbagujuanya. Kedu ihe ga eme ka onye ọbụla chọọ isonye nzukọ di otu a?”

Di-na-nwanyi ahụ chiri ọchi ma si, “Anyi chere na ị gaghi ajụ.”

Kedu Ịhe Onye Ọbụla ga eji Sonye Nzukọ di Otu a?

N’oge ọtụtụ nzukọ n’ụwa nile na ahụta odida na ọnụ ọgụgụ, Nzukọ Nke Jisọs Kraịst Nke Ndi Nsọ Ịkpe-azụ a—n’agbanyeghi idi nta mgbe atulere ya na ọtụtụ ndi ọzọ—bụ otu n’ime nzukọ na eto ọsisọ karicha n’ụwa nile. Dika ọ di rue ọnwa ịtolu 2013 Nzukọ a nwere karia ndi otu nde iri-na-ise n’ụwa nile.

E nwere ọtụtụ ihe kpatara nke a, ma m nwere ike ikwuputa ole na ole?

Nzukọ nsọ nke Onye-nzọpụta

Na mbụ, Nzukọ a bụ Jisọs Kraịst ji aka ya weghachitara ya n’ụbọchi anyi. Na ebe a i ga ahụta ikike iji ịrụ ọrụ na aha Ya —ịwụ mmịrị maka nsachapụ mmehie, ịbikwasi aka nye onyinye nke Mụọ Nsọ, ma kechie n’ụwa ma n’elu igwe.1

Ndi sonyere na Nzukọ a hụrụ Onye-nzọpụta Jisos Kraịst n’anya ma nwe mmasi iso Ya. Ha na aṅụrị na mmata na Chineke n’ekwuru mmadụ ọzọ. Mgbe ha natara emume ndi dị nsọ nke ọkwa nchụ aja ma nwe ọgbụgba- ndụ ha na Chineke, ha nwere ike ihụta ikike Ya na ndụ ha.2 Mgbe ha banyere tempụl dị nsọ, ha na ahụta onwe ha n’ihuYa. Mgbe ha gụrụ akwụkwọ nsọ3 ma bie ndụ dika nkuzị nke ndi amụma Ya, ha n’eto na-ụdị nke Onye-nzọpụta ha hụrụ n’anya nke ukwuu.

Okwukwe nke siri ike

Ịhe ọzọ bụ maka na Nzukọ a n’enye ohere eji arụ ọrụ ọma.

Ịkwenye na Chineke dị nma, ma ọtụtụ chọrọ ime karia ige okwu Chukwu ma ọ bụ irọ nrọ ala-eze ha dị n’elu.4 Ha chọrọitinyeokwukwe ha naọrụ. Ha chọrọ ifuli aka efe ha ma sonye na ọrụ a dị ukwuu.

Nke a bụ ihe n’eme mgbe ha sonyere anyi—ha na nwere ohere dị ọtụtụ ịtụgharị akaraka ha, obi-ebere, na oge iji rụọ ọrụ ndị dị nma. N’ihi na anyị enweghị ndị ụkọchukwu a na-akwụ ụgwọ na ọgbakọ anyị n’ụwa nile, ndị otu nzukọ na arụ ọrụ nke izi-ozi a n’aka ha. Ọkpụkpọ oku ha bụ dika Mụọ nsọ kpaturu. Mgbe ụfọdụ anyi na ekwupụta mmasi anyi; mgbe ụfọdụ a na“họpụta anyi” Anyi na ahụta orụ dika ohere oma iji mejupụta nkwa-nile anyi kwere na agba nile di nsọ anyi mere iji gaara Chineke na ụmụ Ya ozi.

Ngọzi ndi dị oke ọnụ ahia

Ịhe nke atọ n’eme ndi mmadụ ji esonye Nzukọ a bụ maka na oke ngọzi diri ndi na eso ụzọ.

Anyị hụtara ọwụwụ mmịrị dika mbido njem iso ụzọ anyị. Ịso Jisos Kraịst ụbọchi anyị nile n’eweta udo na ntuzi aka na ndụ a ya na ọṅụ na nzọpụtza ebighị-ebi n’ụwa n’abia.

Ndi n’eji okwukwe na esoro ụzọ a n’agabiga ọtụtụ nsogbu, iri-uju, na mmakwara nke ndụ a.

Ndi nwere mụọ di nro na obi eziokwu n’enweta oke amamihe ebe a.

Ndi n’ata ahụhụ ma ọ bụ na-eri uju na-anata ọgwụgwọ n’ebe a.

Ndi mmehie n’akpagbu n’enweta mgbaghara, inwere onwe, na izu ike.

Maka ndi n’ahapụ

Ọchichọ eziokwu edubatala ọtụtụ ndi madụ na Nzukọ nsọ nke Jisos Kraịst nke Ndị-Nsọ Ịkpeazụ a. N’agbanyeghi, enwere ụfọdụ n’ahapụ Nzukọ a ha hụrụ n’anya na mbụ.

E nwere ike jụọ, “Ọ bụrụ na oziọma a di oke nma, gini ga eme ka onye ọbụla hapụ-ya?

Mgbe ụfọdụ anyị n’eche n’onwe anyị na, ọ bụ maka na emesuru ha iwe ma ọ bụ ịdi ume-ngwụ, ma ọ bụ oke-mmehie. N’ezi a, ọ dịghị mfe otu ahụ. N’eziokwu, o nweghị otu ihe kpatara ya nke aga eji kọwaa ọnọdụ a di iche na iche.

Ụfọdụ ndi otu anyị na agba mgba ọtụtụ afọ ka ha n’eche ma ha ga ahapụ nzukọ a.

Na nzukọ a na akwanye ugwu di ukwu nye ohere nhọrọ nke onwe madụ, nke eweghachitara sita n’aka nwokorọbia jụrụ ajụjụ ma chọọ ọsisa, anyị n’akwenyere ndi nile ji obi ha achọ eziokwu ugwu. Ọ ga emetu anyị n’obi mgbe njem ha kpọpụrụ ha site na nzukọ a anyị hụrụ n’anya na eziokwu anyị chọtara, ma anyi nwere nkwanye ugwu nye ikike ha ife Chineke di Ukwu dika obi ha tuziere ha, dika anyi n’onwe anyi nwere.5

Ajụjụ ndi a na-azabeghị

Ụfọdụ n’agba ngba na ajụjụ ndi a na-azabeghị banyere ihe ndi emere ma ọ bụ ekwuru n’oge gara aga Anyi n’anabata na mbara na ihe diri ka afọ narị abụọ nzukọ a—nọrọla n’enwebeghi mgbe mkpuhe kwusiri—na enwere ihe ndi ekwuru ma mee nke nwere ike ime ndi madụ ijụ ajụjụ.

Mgbe ụfọdụ ajụjụ n’abia n’ihi na anyi enweghi ọsisa nile ma nani ihe anyi kwesiri inwe bụ ndidi. Mgbe amatazuru eziokwu nile, ihe ndi anyi n’aghọtachaghị na mbụ ga abụ nke doro anyi anya ma nye anyi afọ ojuju.

Mgbe ụfọdụ enwere okwu di iche na iche banyere ihe “isi-okwu” pụtara. Ajụjụ n’eme ka ụfọdụ nwe obi abụọ nwere ike elebamacha ya anyị bulite okwukwe na ime ndi ọzọ.

Nmegharị nke ndi N’ezughị oke

Ma, ikwu eziokwu zuru oke, enwere oge ndi otu ma ọ bụ ndi nduu na nzukọ a na eme nmegheri. O nwere ike bụrụ na enwere ihe ndi ekwuru ma ọ bụ mee nke megidere amamihe anyi, ụsoro ndụ, na ozizi anyi.

Ana m eche na Nzukọ a ga ezu oke ma ọ bụrụ na ọ bụ ndi zuru oke na ahazi ya. Chineke zuru oke, ma nkuzi Ya zukwara oke. Ma Ọ na arụ ọrụ site na aka anyi—ụmụ Ya n’ezughi oke—ma ndi n’ezughi oke n’emeghari

Na ndepụta bidoro Akwụkwọ nke Mọmọn anyi gụrụ, “Ma ugbu a, ọ bụrụ na ezughi oke di ọ bụ nmegheri nke madụ; ya mere, ekwugidekwala ihe nke Chineke, ka ikpe hara ima gi na oche-ikpe nke Kraịst.”6

Otu a ka ọ diri ma ọ ga aighide rue ụbọchi ahụ zuru oke mgbe Kraịst na onwe Ya ka achi n’elu ụwa.

Ọ bụ ihe di njọ na ụfọdụ akwanyola n’ihi nmeghari nke ndi madụ mere. N’agbanyeghi nke a, eziokwu ebighi-ebi nke oziọma eweghachiri nọ na Nzukọ nke Jisos Kraịst nke Ndị-Nsọ Ịkpeazụ a anaghi emebi, peleta, ma ọ bụ mebie.

Dika Onye-Ozi nke Onyenwe Jisos Kraịst na dika onye na ahụtala n’aka mbụ ọgbakọ nhazi na ọrụ nke nzukọ a, a na m agba ama di nsọ na o nweghi mkpebi banyere nzukọ a ma ọ bụ ndi otu ya a na eme ma agbebeghị mbọ ijụta na mkpuhie, ntuzi aka, na nkwado nke Nna Ebighi-ebi anyi. Nke a bụ Nzukọ nsọ nke Jisos Kraịst. Chineke agaghi ekwe ka Nzukọ Ya dapụ site n’ụzọ akapụtala ya ma ọ bụ ka ọ hara imejupụta ebum-na-obi eji hiwe ya di nsọ.

Ohere diri Gị

Ị kwuru ndi n’ewezugala onwe ha site na nzukọ a, ana m asi, ndi enyim, ohere ka diri unu ebe a.

Bia ma tinye akara-aka, onyinye, na ikike unu na nke anyi. Anyi nile ga adi nma karia maka nke a.

Ụfọdụ nwere ike jụọ “Kee maka mgbagwoju anya m?”

Ọ di natụral inwe ajụjụ—maka na ọchichọ nke eziokwu bụ ihe ọtụtụ oge n’epuole ma topụta na nghọta di ukwu. Enwere nani ndi otu nzukọ ole na ole ndi, otu mgbe ma ọ bụ ọzọ, n’ajubeghi ajụjụ di ukwu. Otu n’ime ihe nzukọ a n’arụ bụ izụ ma lekọta mkpụrụ nke okwukwe—ọ bụ n’adighi na ozize aja nke obi-abụọ na amachaghi mgbe ụfọdụ. Okwukwe bụ inwe olile-anya maka ihe ndi a n’ahụbeghi ma ha bụ eziokwu.7

Ya mere, ụmụnne m nwoke na ndi nwanyi—ndi enyim—biko, buru ụzọ nwe obi-abụọ banyere obi-abụọ gị tutu Ị nwe obi-abụọ banyere okwukwe gị.8 Anyi agaghi ekwe ka obi-abụọ jide anyi ka ndi nkpọrọ ma wezuga anyi site na ihụnanya, udo na onyinye nso nile na abia site n’inwe okwukwe na Onyenwe Jisus Kraịst.

Ụfọdụ nwere ike sị, “O nweghi otu m si diri ka unu na nzukọ a

Ị nwe ike ihụta ime obi anyi, Ị nwere ike chọpụta na itozuru karia otu ichere n’onwe gi. Ị nwere ike chọpụta na itụnanya na anyi nwere ọchichọ na ndọga na olile-anya yiri nke gi. Ogige gi na ntolite gi nwere ike diri iche na nhụta gi n’ebe ọtụtụ Ndi-Nsọ Ịkpeazụ a nọ, ma nke a nwere ike bụrụ ngọzi. Ụmunne nwoke na ndi nwanyi, ndi enyi, anyi chọrọ akara aka gi pụrụ iche na nhụta gi. Ọ di iche ndi madụ na ndi ụwa nile bụ idi-ike nke nzukọ a.

Ụfọdụ nwere ike sị, “E cheghi m na a ga m ebili dika unu tụrụ anya

Nke nile bụ ihe kpatara Ị ga eji bia! Nzukọ nsọ bụ ebe akwadoro iji zulite ndi na etozughi-oke, ndi na agba-mbọ, na ndi ike gwuruchara. O jupụtara na ndi mmadu, ndi nwere mmasi iji obi ha nile dobe iwu nile, ọbụ ladi ndi na matabeghịiwu ndi a

Ufọdụ nwere ike isi “Ama m otu onye otu nzukọ nsọ unu bụ onye ihu-abụọEnweghim ike ịsonye na otu nzụkọ nsọ nwere onye otu dika ya

oburu na ikọwainwe ihu-abụọdika onye na enwe ike ibị-ndụ dika otu onwe ya kwere, mgbe ahụ anyi nile bụ ndi ihu-abụọ. Onweghi onye n’ime anyi dika Karịst dika anyi maara anyi kwesiri idi. Kama anyi chọsiri ike imeri ọrụ anyi nile ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Iji obi anyi na eciche anyi nile, anyi na enwe aguu idi ezi-nma site na enye m aka Aja-nmehie ahụ nke Jịsọs Karist.

Obụrụ na nke abụrụ ebum n’uche gi, na agbanyeghi ọnọdụ gi,akụkọ agugu gi,ma-ọbụ ike mgba-ama gi,enwere ohere nye gi na nzukọ-nsọ a. Bia sonye anyi!

Bia Sonye Anyi!

Na agbnyeghi etozughi oke anyi, Enwere m obi site na anyi ga achọta n’ime ndi otu nzukọ-nsọ a ufọdụ ndi ezigbo mmadu nke di na elu-uwa. Nzukọ-nsọ nke Jịsọs Karist dika ha na ekpokọta ndi nwereobi ebere, ndi ezi-okwu na ndi na nwere mmasi ọrụ.

Ọbụrụ na ina achọ ndi mmadu zuru-oke ebe a, igaghi ahụta ha. Mana ọbụrụ na ina chọ nkuzi nke Jịsọs, okwu nke Chineke “nke na agwọ obi rụrụ-arụ”9 ya na ọrụ nsachasi nke Mụọ-nsọ, iga ahụta ha. Na oge ugbu a bụ oge nwulite okwụkwe—na oge ugbu a mgbe ọtụtụ mmadu na eche na ha anọghi nso na elu-igwe—ebe a ga ahụ ndi mmadu chọsiri-ike imata na inọ nime Onye Nzọpụta ha site na ife Chineke na inyere mmadu ibe ha aka dika unu. Bịa, sonye anyi!

Iga kwa apụ na ebe a?

Echetara m otuu mgbe na ndụ Onye nzọpụta mgbe ọtụtụ hapụrụ Ya 10 Jịsọs jụrụ ndi ozi Ya iri na abụọ:

“Iga kwa apụ na ebe a?

“ mgbe ahụ Simon Peter azaa ya, onwe-nwe, onye ka anyi ga agakwuru? ọbụ gi ji okwu nile nke ndụ ebighi-ebị”11

Enwere mgbe ụfọdụ anyi ga zaa udi ajuju a. Iga kwa apụ na ebe a? ka ọbụ anyi , dika Peter, ga anọgide na okwu nile nke ndụ ebighi-ebị?

Ọbụrụ na ina achọ ezi-okwu, nke pụtara, ụzọ iji gbanwe okwukwe ka ọbụrụ ọrụ; ọbụrụ na ina achọ ebe iga esonye: Bịa sonye anyi!

Ọbụrụ na ihapụla okwukwe nke ikwenyeworo: Bịa-ha-chi azu ọzọ. Sonye anyi

Ọbụrụ na ina enwe ihe ọnwunwa igharipụ; nagide nwa-mgbe nta Enwere ohere nke gi ebe a.

A nam arịọ ndi nile na anu ma na agu okwu nile a: Bịa, sonye anyi. Bịa zaa oku nke Karist onye di nwayọọ Were nsogbu gi nile ma soro Ya.12

Bịa, sonye anyi! na ebe a iga achọta ihe di mkpa ma dikwa oke ọnụ.

A nam agba-ama na iga achọta okwu nke ndụ ebighi-ebị, nkwa ngozi nke mgbapụta, ya na ụkpụrụ nke obi-otu na ańurị.

A nam ekpesi ekpere ike ka ọchịchọ nke ezi-okwu gi, enye gi obi nkwado nke ịchọsike ịbịa sonye anyi. Site na aha di nsọ nke Jịsọs Karist, amen

Bipụta