Ozi nke ndi Ịsi Nduzi nke mbụ, Onwa iri na otu 2013
“Agaghị M Agharịpụ Gị, Ma ọbụ Leghara Gị Anya”
Nna anyi nke bi na elu igwe …maara na anyi na amụ na eto ma na adikwa ike dika anyi na agabiga ihe onwunwa nile na abiara anyi.
Na ime akwukwọ agugu m na abali a, agam ede, “Nke a bụ otu n’ime ọgbakọ nile nke na akpalite mụọ m-garala, Ihe nile a bụ ihe di egwu dika chi siri kee ha
Ụmụnne m ndi nwoke na ndi nwanyị, ọnwa isii gara aga mgbe anyị gbakọtara ọnụ n’ọgbakọ zuruọha anyị, ezi nwunye dị m n’obi, Frances dinaburu n’ụlọ ọgwụ, ka ọ dachara ajọọ ada mkpụrụ ụbọchị ole na ole tupu ụbọchị ahụ. Na onwa ise, ka ụbọchi ịzu ụka ole na ole gara, o jiri obi di-ike dọlịchaa idigbu mmerụ ahụ ya, ọ hapụrụ ụwa a. Ọnwụ ya metụtara m nke ukwuu. Mụ na ya gbara akwụkwọ na Temple Salt Lake na Ọnwa iri 7, 1948. Echi gaara abụ iri afọ isii na ise (65th) anyị gaara eme ncheta agbam akwụkwọ anyị. Ọ bụụra onye m hụrụ n’anya karịchaa ihe niile m nwere na ndụ m, ọ bụ onye mụ na ya dị ezi ntụkwasị obi, ezi enyị m na-enweghị atụ. Ị sị na-agụụ ịhụ ya ọzọ na-agụ m agaghị enwe ike kọwapụta omimi otu o si ewute m.
Ọgbakọ nke a ga-eme ya afọ 50 ke mgbe akpọrọ m oku orụ ibanye na Kworum nke Ndi ozi Iri na abụọ site n’aka Onye-isi-nduzi Devid O. Mckay. Onwetụghị oge n’afọ ndi a niile m chọrọ nkwado onye ọma m bu n’obi na-enwetaghị ya. Ọ chụrụ nnukwu aja iji hụ na m mejuputara ọrụ ọkpụkpọ oku m. .Onwetụghị mgbe m nụrụ mkpesa si ya n’ọnụ dịka a chọrọ n’aka m ịhapụ ya na ụmụ anyị ọtụtụ ụbọchị ma mgbe ụfọdụ ọtụtụ izu ụka. Ọ bụ onye mmụọ ozi n’ezie.
Ana m enye unu ekele m, na nke ezi-na-ụlọ m, maka ụzọ pụrụ-iche unu jiri gosipụta ịhụnaanya ke mgbe Frances, hapụrụ. Ọtụtụ narị akwụkwọ ozi ekele na leta ka ezitere site gburu gburu ụwa na-akọwa ka o si masị ha ma na-akasi ezi-na-ụlọ anyị obi. Anyị natakwara ọtụtụ okoko-osisi ahaziri-ahazi nke eji achọ-nma. Anyị na-enye ekele maka ọtụtụ ụtụ di-iche-iche ndi enyere na-aha ya nke etinyere na Ego Ezumezu Mgbasa ozi-ọma nke Nzukọ-nsọ, Na-aha anyị nile ndi ọ hapụrụ, ana m ekele unu nke ukwuu maka obi ebere na nkọwapụta ịhụnaanya unu.
Ihe kachasị enye m nkasi obi n’oge nkewa nke a na-ewute m bụrịị ama nke ozi-ọma Jisọs Kraịst na ọmụma-ihe m nwere na ezigbo Frances m ka dị ndụ. Ama na nkewa anyị bụ nwa mgbe nta. Arachikọtara anyị ọnụ na n’ụlọ nsọ Chineke, Site n’aka onye ji ikikere ike ihe ọbụla agbụ n’elu ụwa na n’elu-igwe. Ama m na anyị ga-ezụkọta kwa ọzọ otu ụbọchị ma agaghị enwekwa ike ikewapụ anyị ọzọ. Nke a bụ ihe m maara na-agba m ume.
Ụmụnne m ndi nwoke na ndi nwanyị, ọ dị mfe iche na onwetubeghi onye na-ebie-la ndụ na enweghị mgbe ọ tara ahụhụ ma rie uju, ma ọbụ enwetụla oge ọbụla na ndụ mmadụ na-ezuteghị ọgbaaghara na nhuju anya n’uju.
Mgbe ọnọdụ ndụ anyi gbanwere na onodụ ọjọọ, anyi nwere-ike ịjụ ajụjụ “Gịnị mere o ji bụrụ m?” Mgbe ụfọdụ ọ na-adị ka ahụhụ ahụ agaghị ebi-ebi, enweghị mgbapụta ga-abịa site na nmwale anyị. Ọ na-eju anyị anya na ọchịchọ anyị abịaghị na mmezu ma anyị adaa mba n’ihi na emezughị nzube anyị. Anyị esoro rịọwa arịrịọ dịka e dere na baịbụl, “Ọbụ na ọdịghị balm dị na Giled?”1 Ọ dị anyị ka anyị bụ ndi ajụrụ ajụ, arịrị juru obi nnọọrọ onwe ha. Anyị nwere ụma ịhụta ihe ọjọọ nke onwe dakwasịrị anyị site na-echiche nke ịhụta sọọsọ ihe ọjọọ na ndụ. Anyị na-abụ ndi na-enweghị ndịdị na-iche ọsịsa nye nsogbu anyị, ma na echefu na mgbe ọbụla na ndidi bụ omume ọma nke elu-igwe nke chọrọ.
Ihe isi ike na-abịara anyị na-edobe anyị n’ọnọdụ inwe ezi nmwale n’ike anyị ji edi ihe ọbụla. Ajụjụ gbara ọkpụrụkpụ nke onye obula n’ime anyị nwere ịsa bụ: m kwesịrị ịchịsa ọwa, ka ọbụ m ga-emecha? Ụfọdụ na-achịsa ọwa mgbe ha hụtara onwe ha na ha enweghị ike ịgabiga mmekpaahụ ha. Imecha gụnyere idigide ruo na-ọgwụgwụ ndụ n’onwe ya.
Ka anyị na atụgharị uche n’ihe ndi nwere ike ịdakwasị anyị, anyị nwere ike soro Job onye nke bịrị ndụ oge gboo, kwuo: Amụrụ mmadụ nye nsogbu.”2 Job bụrịị nwoko “aka ya dị ọcha na-enweghị ntụpọ” onye “na-atụ egwu Chineke, ma kpọ ihe ọjọọ asị.”3 Omume ya jupụtara na-ezi-omume, ọ bara ọgaranya na-aganiihu, emere ka Job zute nmwale nke pụrụ ịla mmadụ ọbụla n’iyi. Anapụrụ ya ihe niile o nwere, ndi enyi ya emee ya akaje, nwee mkagbu site na ntaramahụhụ ya, rie arịrị site na ezi-na-ụlọ ya ifunarị ya, ajanyere ya ka “ọgbakụta Chineke azụ, ma nwụọ”4 Ọ gbanarịrị ọnwụnwa nke a ma kwupụta site na-ala ala obi ya nwere ugwu:
“Ọbụla ugbua, lee, n’elu-igwe ka onye ama m nọ, ndekọta aka ọrụ m nọkwa n’ebe dị elu.”5
“Ma mụ onwe m, amaaram na Onye mgbapụta m dị ndụ”6
Job nọgidere n’okwukwe. Anyị ga-eme otu a mgbe anyị na-ezute ihe isi ike nke anyị?
Mgbe ọbụla anyị hụtara onwe anyị na-ọnọdụ anyị chere na mkpagbu ụwa anyịgbuola anyị, ka anyị cheta na ndi ọzọ ahụtala nsogbu ndi ahu anyị na-enwe n’oge a ma ha gabigara ya na ntachi obi.
Na-agụgụala nke Nzukọ-nsọ n’oge nke a, agba nke ọgwu-gwu oge nile, jupụtara na nhụmiihe nke ndi ahụ na-agbaala mbọ mana ha guzosikwara ike n’okwukwe ma nwee obi ike. Gịnị kpatara nke a? Ha emeela ozi-ọma nke Jisọs Kraịst isi ihe nke ndụ ha. Nke a bụ ihe ga-enyere anyị aka ịnagide ihe ọbụla anyị nwere ike izute na ndụ. Anyị ga na-aganiihu na ahụta ihe isi ike ga-eche anyị aka mgba, kama anyị ga-enwe ike izute ha, izute ha na mgbam ume, ma nwee mmeri na-ikpeazụ.
Site na-akwa ihe mgbu, site na ihe nhido-isi nke dere n’anya mmiri, ana ebuli anyị elu site na-okwu nkasi obi dị nsọ na nkwa ahu dị ebube. Agaghị m agharịpụ gị, ma ọbụ leghara gị Anya.”7 Ụdịrị nkasi obi ahụ enweghị atụ.
Dịka m na aga njem ebe nile na gburu gburu ụwa na-emejupụta ọrụ nile nke ọkpụkpọ oku m, abịala m mata ọtụtụ ihe —banyere obi ọjọọ na ntaram ahụhụ, na ọbụ ihe zuru ụwa ọnụ. Enweghị m ike ịbịa ịtụwa ihe niile na-agbawa obi na iru uju mụ na-enweela mgbe m na-aga eleta ndi nwere mwute, ndi na-arịa ọrịọ, ndi na-agabiga nsogbu ịgba alụkwaghị m, ndi na-agba lịka lịka site n’inwe nwa na-eme isi ike, ma ọbụ na-ata ahụhụ dapụtara site n’ime mmehie. Ihe ndekọta ya nwere ike gaaniihu, n’ihi na-enwere nsogbu mmadụ apụghị ịkọ nwere ike ịdakwasị anyị. Iji otu ịmatu bụ ihe siri ike mana mgbe ọbụlaghị m chere echiche banyere ihe aka mgba, uche m agbalaa ebe Nwanne m nwoko Brems nọ Otu onye n’ime ndi nkuzi Ọmụmụ ihe Sọnde mgbe m na-etolite etolite. Ọ bụ onye otu Nzukọ-nsọ nwere okwukwe, nwoke obi ya jupụtara n’ịhụnaanya na-enweghị ntụpọ. Ya na nwunye ya, Sadie mụrụ ụmụ asatọ, ọtụtụ n’ime ha bụụrụ ndi ebiri ụmụ nke anyị.
Ka mụ na Frances mechara ọlụlụ di na nwunye ma si na ngalaba-ukwu anyị pụọ, anyị hụtara Nwanne nwoko na Nwanne nwanyị Brems na ndi otu ezi-na-ụlọ ha na mme mme agbam akwụkwọ na nke olili ozi, nakwa nzukọrịta ndi emere na ngalaba-ukwu.
Na-afọ 1968, Sadie, nwunye Nwanne nwoko Brems nwụrụ Ụmụ abụọ n’ime ụmụ asatọ ndi ọzọ nwụkwara ka afọ na-aga.
Otu ụbọchị ka ihe ruru afọ 13 gara, nwa nwa nke Nwanne nwoko Brems kacha okenye na ndi nwanyị kpọrọ m n’ekwe ntị. Ọ kọwara na nna nna ya agbaala afọ 105 rute ncheta ọmụmụ ya. Ọ sịrị “Obi n’obere ụlọ ebe ana elekọta ndi mmadụ ma ya na ndi ezi-na-ụlọ ya na-ezukota n’ụbọchị Sọnde ọbụla, ebe ọ na-akuzi ihe ọmụmụ ozi-ọma.” Ọ gara n’ihu, “Na Sọnde nke a gara aga, Nna nna mara anyị ọkwa sị, “Ndi m hụrụ n’anya, aga m anwụ n’izu ụka nke a. Unu ga-ejisi ike kpọọ Tommy Monson Ọ ga-ama ihe aga eme.”’
A gara m leta Nwanne Nwoko Brems na mgbede na-esote ụbọchị ahụ. Oteela anya m na-ahụbeghị ya. Enweghị m ike igwa ya okwu n’ihi na ntị ya echiela. Enweghị m ike idere ya ozi ọ ga-agụ, n’ihi na o kpuola isi. A gwara m na ndi ezi-na-ụlọ ya na-agwa ya okwu site na-iwere otu mkpịsịrị aka ya nke aka nri ma were ya dee aha onye bịara nleta n’ọba aka aka ekpe ya. Ozi ọbụla ka ana ezi n’otu ụzọ ahụ E sooro m ụkpụrụ ahụ were mkpụsiri aka ya dee “TOMMY MONSON,” aha nke o jiri mara m oge nile. Nwanne nwoko Brems bịara nwee ọńụ, were aka m abụọ, tụkwasị ha n’isi ya. Amaara m na ọchịchọ ya bụụrụ ịnata ngọzi nke ọkwa-nchụ-aja. Onye ọkwọ ụgbọ-ala bụ onye nke bu m gaa ebe ụlọ nlekọta ahụ bịara soro m ebe anyị bịakwasra aka anyị n’isi Nwanne Nwoko Brems ma nye ya ngọzi ọ chọrọ. Ka emechara nke a, anya mmiri gbara ya n’anya nke o jighị ahụ uzọ. O jidere aka anyị n’afọ ojuju. Ọbụladị na ọ nụghị ihe banyere ngọzi anyị nyere ya, o metụtara Mmụọ ya, ma ekwere m na o nwetara mkpalite nke mmụọ ịma na anyị enyela ngọzi ọ chọrọ. Nwoko ọma nke a enwekwaghị ike ịhụ ụzọ ozo. Onwekwaghị ike ịnụ ntị ọzọ. Ọ bụụrụ onye ahapụrụ n’otu obere ime ụlọ n’ebe nlekọta. Mana ihu ọchi ya na okwu ndi okwuru, metụrụ m n’obi. Ọ sịrị, “I meela,” “Nna m nke Elu-igwe dị ukwuu n’ebe m nọ.”
N’ime otu izu ụka, dịka Nwanne Nwoko Brems siri tụọ ọnụ, ọ hapụrụ. Onwetụghị mgbe o chekasịrị onwe ya banyere ihe ọna-enweghị, kama, obi ya jupụtara n’ọńụ mgbe nile banyere ọtụtụ ngọzi o nwere.
Nna Anyị nke Elu-igwe, onye nyere anyị ọtụtụ ihe anyị ji ańụrị ọńụ, makwara na anyị na-amụta ihe, na-eto eto, ma gbasie ike karịa mgbe anyị zutere ma gabiga nnwale nile ndi anyị garịrị agabiga. Anyị maara na enwere oge mgbe anyị ga ezute ihe mwute na-agbawa obi, mgbe anyị ga-eri uju, na mgbe enwere ike ịnwale anyị n’ogo kwesịrị anyị. Otu osiladị, ụdịrị ịhụsi anya ndi ahụ na-enye anyị ohere ime mgbanwe ma dị mma, iji hazie ndụ anyị n’ụzọ Nna anyị nke Elu-igwe na-esi akụziri anyị ihe, ma anyị abịa bụrụ ndi pụrụ iche site n’ihe anyị bụụrụ—dị mma karịa otu anyi dị na mbụ, nwee nghọta karịa ka anyị naara enwe, n’enwe obi ebere banyere mmadụ ibe anyị karịa ka anyị naara enwebu, tinyere inwe ọgbu-agba ama siri-ike karịa otu anyị nwere na mbụ.
Nke a kwesịrị ị bụ ebum n’obi anyị-ọbụghị sọọsọ ịkachi obi ma nwee nnagide, e, mana ịbịa dịrị ụcha n’ime mmụọ karịa na mbụ mgbe anyị na-ezute ihe ọma na ihe ọjọọ. Asị na ọbụghị ihe isi ike anyị nwere igabiga na nsogbu ndi anyị nwere igbo, anyị gaara anọgide nọọ otu anyị dị ugbua, na-agba obere mbọ ma ọbụ daa mba banyere ebum n’obi anyị nke inweta ndụ ebighị-ebi. Ode abụ kwuru otu ụdịrị ihe na mkpụrụ okwu ndi a:
Osisi dị mma anaghị eto n’ọnọdụ ọbụla’
Mgbe ikuku na-ekusi ike, otu a ka osisi ọ na-ekusa si esi ike karịa.
Ebe o nwere nnukwu ohere ịto eto, ka ọ ga-eto karịa
Ka oke ifufe mmiri na-akarị, otu ahụ ka ume ya na-akarị.
Ma na-anwụ ma na-oyi, site na mmiri ozizo ruo-na akụ mmiri igwe,
Osisi awara awa dị mma na-eto n’osisi, ma ezi agwa n’eto n’ime mmadụ.8
Sọọsọ Onye nzọpụta mara omimi nke nmwale anyị, ihe na-ewute anyị na ahụhụ anyị. Sọọsọ Ya na-enye anyị udo nke ebighị-ebi n’oge nsogbu. Naanị Ya na-emetụta mkpụrụ-obi anyị n’oge mkpagbu site na okwu nkasi obi Ya:
“Bịakwutenụ m, unu niile ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndi e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.
Nwere nụ ihe nkekọta nke m, mụtakwanụ ihe gbasara m; n’ihi na abụ m onye di nwayọọ na onye di ume-ala n’obi: unu ga-enwetakwa udo nye mkpụrụ obi unu.
N’ihi na ihe nkekọta nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”9
Ọbụladị ma ọbụ oge ihe kachasị dị mma ma ọbụ oge ihe jọgburu onwe ya, Ọ nọnyere anyị. O kwela nkwa na nke a enweghị ike agbanwe.
Umunne m ndi nwoko na ndi nwanyị, ka anyị mee mkpebi nye Nna anyị nke Elu-igwe, mkpebi na-agaghị agbanwe ọbụladị ma otee aka ma ọbụ dika ihe iru uju nke ndụ anyị siri dị. Anyị ekwesịghị iche ruo mgbe anyị nwere nsogbu tutu anyị echeta Ya, ma anyị agaghị eche mgbe ama-nyere anyị inwe umeala tutu anyị enwee okwukwe na ntụkwasị obi na Ya.
Anyị kwesịrị ina agba mbọ mgbe nile ịnọ Nna anyị nke Elu-igwe nso N’ime nke ahụ, anyị garịrị anọgide n’ekpere n’ebe Ọ nọ ma gee Ya ntị ụbọchị nile. N’ezie anyị chọrọ Ya na ndụ oge nile, na-agbanyeghị ma ọbụ n’awa nke ọńụ ma ọbụ nke iru uju. Ka nkwa O kwere bụrụ nkwamiike anyi oge nile:”Agaghị M agharịpụ gị, ma ọbụ leghara gị. anya”10
Eji m ike niile di na mkpụrụ obi m, na-agba ma na Chineke dị ndụ na Ọ hụrụ anyị n’anya, na Ọkpara Ya nke Ọ mụrụ naanị Ya dị ndụ ma ọ nwụrụ n’ihi anyị, mana ozi-ọma nke Jisọs Kraịst bụ isi mmetụta ume dị omimi na-enyere anyị aka idi oge ihe ndi kachasị sie ike na ndụ anyị. Ka o wee si otu a dị, ka m na-arịọ n’aha nsọ nke Jisọs Kraịst, amen.
2013 site na Intellectual Reserve, Inc. Ikike nbịpụta nile ejikọtara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/13 Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/13 Ntụgharị-asụsụ nkeFirst Presidency Message, November 2013. Igbo. 10670 593