2014
Oge kachasị mma Ịkụnye otu Osisi
Jenụwarị 2014


Ozi nke Otu Ndi-Ịsi Nduzi Mbụ, nke ọnwa January 2014

Oge kachasị mma Ịkunye otu Osisi

Foto, oyiyi
Onye Isi-Nduzi Dieter F. Uchtdorf

Na Rom mgbe ochie, Janus bụụrụ chi nke mmalite nile. Ọtụtụ mgbe a naara eji ihu abụọ na-amata ya — otu na-ele anya n’azụ n’ihe gara aga, nke ọzọ na-ele anya n’ihu n’ihe dị n’ihu. Ụfọdụ asụsụ gụrụ ọnwa mbụ aha maka ya n’ihi na mmalite nke afọ bụụrụ oge maka ntụgharị-uche na kwa nke iyi atụmatụ.

Ka ọtụtụ puku afọ gasịrị, ọtụtụ omenala n’ụwa nile na-eme ọdị n’ala nke ime mkpebi nile maka afọ ọhụrụ. Otu o-sina-dị, ime mkpebi nile dị mfe — idebe ha bụ ihe dị iche n’onwe ya.

Otu nwoke nke meworo rịị otu ogologo usoro ndepụta nke mkpebi nile nke Afọ Ọhụrụ nwere mmetụta dị mma gbasara oganihu ya. O chere echiche n’ime onwe ya, “Rute ugbu-a, anogidewo m n’ụdị ihe-mkpebiri, ewebeghị m iwe-ọkụ, edebewo m usoro mkpata na mmefu-ego m, ma ọdịbeghị otu mgbe m kpesara-mkpesa gbasara nkịta onye-agbata obi m. Mana taa bụ abalị 2 n’ọnwa mbụ ma ekwe-ụtụtụ akụọla,oge eruola mgbe mkwesịrị ikulite na akwa-ndina m. Ọ ga-abụ ihe ọrụ-ebube ime ka ihe m ji na-amata oge na-aga n’ihu.

Ịmalitekwa ọzọ

Enwere ihe olile-anya na-enweghị-atụ gbasara mmalitegharị ọhụrụ Ana m ewere na n’otu oge ma ọbụ nke ọzọ anyị nile achọọla ịmatite ọzọ n’epekele dị ọcha.

Enwere m mmasị inweta kọmputa ọhụrụ nwere ihe hard-drive dị ọcha. Na nwa oge nta ọ na arụ-ọrụ n’ozuzu-oke. Mana dịka ụbọchị nile na ịzụ-ụka nile na-agafe ma ana-etinye ọtụtụ programs ime-ya (ụfọdụ akpacha-anya, ụfọdụ akpachaghi-anya), emesịa kọmputa ahu malitere igbakasi, ma ihe nile o nara eme ọsọsọ, na imeta otu esiri chọọ ya nwezie umu-ngwụ. Mgbe ụfọdụ ọ naghị arụ-ọrụ ma otu. Ọbụnadi ime ya ka ọ malite nwere ike bụrụzie ọrụ,dịka hard drive ibuzi ihe kpụkọtara-ọnụ ya na ọgba-aghara dị iche iche na mkpekere ihe electrik. O nwere oge mgbe nanị enyem-aka e nwere bụ imezigharị kọmpụta ahụ ma malitegharịa.

Ndị mmadu nwekwara ike otu aka ahụ ịkpụkọta-ọnụ n’ụjọ nile, obi-abụọ nile, na ibu-nnyida nke ikpe-ọmụma. Ihe na-ezighị-ezi nile anyị meworo (ma nke anyị kpachapụrụ anya mee ma nke anyị na-akpachapụghị-anya mee) nwere ike ịnyịgide anyị rụọ mgbe ọ ga-adị ka o siri ike ime ihe anyị ma na anyị kwesịrị ime.

Mana oge ụfọdụ ihe ndi ọzọ na-eme ka anyị ghara ime ngwa ngwa ma na ejighachi anyị azụ, na-akpata echiche nile na ewepụta ọrụ na akparam-agwa nile na anaghị eweta ihe dị mma nke na-eme ka o siere anyị ike ịmalite.

Iwepụta nke ahu Kachasị mma n’ime Anyị

Itinye ebum n’uche nile bụ mgbali zuru oke. Anyị matara na Nna anyị nke bi N’elu-igwe nwere ebum-n’uche nile n’ihi na Ọ gwawo anyị na ọrụ na otuto Ya bụ “iweta na mmezu anwụghị-anwu na ndu ebigh-ebi nke mmadụ” (Moses 1:39).

Ebum-n’uche nke onwe anyị nwere ike iwepụta ihe kachasị mma n’ime anyị. Otu o-sinadị, otu n’ime ihe nile nke na-akwagheri mgbalị anyị nile n’ime na idebe mkpebi nile bụ iche ka emesịa. Mgbe ụfọdụ anyị na egbu-oge n’ịmalite, na-eche oge kacha-mma iji bido—ụbọchị mbụ nke afọ ọhụrụ, mmalite ọkọchị, mgbe a kpọrọ anyị ịbụ bishop ma ọbụ onye-isi-nduzi Otu Enyem-aka, mgbe ụmụaka ahụ bara ụlọ-akwụkwọ, mgbe anyị lara ezumike ọrụ.

I nweghị mkpa ọkpụkpọ-ọku tutu gị amalite ịga n’ụzọ nke ebum-n’uche gị nile ziri-ezi. I nweghi mkpa ichere maka ịnata ike ịbụzi onye ahụ e mere gị ka I bụrụ. Inweghị mkpa ichere ka a kpọọ gị oku ije-ozi n’ime Nzukọ-nsọ a.

Anyị nwere ike oge ụfọdụ ịla ọtụtụ afọ nke ndụ anyị nile n’iyi na-eche ka a họrọ anyị (lee D&C 121:34–36). Mana nke ahụ abụghi ezigbo ebe-mgbagide-ukwu. Ahọrọwo gị rịị

Oge ụfọdụ na ndụ m anọwo m ọtụtụ abalị na-arahụghị ụra na-eche ọtụtụ ihe, nsogbu nile, ma ọbụ mwute nile nke onwe m. Mana na-agbanyeghị otu ọbụla abalị ahụ siri gba ọchịchiri, ana m enwe mgbam-ume oge nile site n’echiche nke a: n’ụtụtụ anwụ ga-awa.

N’ụbọchị ọhụrụ ọbụla, chi ọbụbọ ọhụrụ na-abịa — ọbụghị nanị maka ụwa mana maka anyị kwa. Ma n’ụbọchị ọhụrụ ka mbido ọhụrụ na-abịa —ohere ịmalite kwa ọzọ

Mana Gịnị ga-eme Ma ọbụrụ na Anyị Daa?

Mgbe ụfọdụ ihe na-adoghachi anyị azụ bụ ụjọọ. Anyị nwere ike nwe ụjọọ na anyị agaghị emeta ihe a chọrọ, na anyị ga-emeta ihe a chọrọ, na e nwere ike itinye anyị egwu, na imeta ihe a chọrọ nwere ike ịgbanwe anyị, ma ọbụ na o nwere ike ịgbanwe ndi mmadụ anyị hụrụ n’anya.

Maka nke a anyị echere. Ma ọbụ kwụsị

Ihe ọzọ anyị ga-echeta mgbe ọ bịara n’itinye ebum n’uche nile bụ nke a: Ọ di-anyi ka ọfọdụrụ nwa ntakirị ka ọ bụrụ na anyị ga-ada rịrị — na nke oge mkpụmkpụ ahụ. Mana kama inwe obi ijụ-oyi, e nwere ike inye anyị ike n’ihi na nghọta nke a na-ewepụ nkwagide nke izu-oke ugbu-a. Ọ na-anakwere n’ezi okwu site na mmalite na otu mgbe ma ọbụ nke ọzọ, anyị nwere ike ịla-azụ. Imata nke a na mbido na-ewepụ ụfọdụ mgbagwoju-anya na mmejụ-obi-oyị nke ọdịda.

Mgbe anyị sooro ebum-n’uche nile n’ụzọ dị otu-a, ọdịda ekwesịghị ịnabi anyị. Cheta, ọbụna ma ọbụrụ na anyị agarughị ebe kachasị, masịrị anyị, anyị chọrọ ozigbo, enwere ike anyị emewo nke ọma na ụzọ ebe ga eduga anyi na ya.

Ma nke ahụ dị mkpa — ọ pụtara ihe dị ukwuu.

Ọbụna na-agbanyeghị na anyị nwere ike rie mpe n’ịgaru ebe anyị ga-akwụsị, nanị ịgan’ihu na njem ahụ ga-eme ka anyị dị ukwuu karịa otu anyị ha na mbụ.

Oge kachasị mma Ịmalite Bụ Ugbu-a

Otu ilu ochie na-asị, “Oge kachasị mma ịkụ osisi bụ afọ 20 gara aga. Oge nke abụọ kachasị mma bụ ugbu-a.”

E nwere ihe dị ebube ma nwe olile-anya gbasara okwu ahụ ugbu-a. E nwere ihe na-enye ike gbasara ezi-okwu ahụ na ọbụrụ na anyị họrọ ikpebi ugbu-a, anyị nwere ike ịga n’ihu ugbu-a.

Ugbua bụ oge kachasị mma ịmalite ịbụzi onye ahụ anyị ga-achọ ịbụ ma emesịa — ọbụghị nanị afọ 20 site ugbua kama na kwa ruo ebigh-ebi nile.

Nkuzi si na ozi a.

Onye-isi-nduzi Uchtdorf kọwara na mgbe anyị na-enweghị ike ịgaru ebum n’uche anyị nile, “e nwere ike inye anyị ike. …Na-agbanyeghị na anyị nwere ike laa azụ n’ịgaru ebe anyị na-aga, nanị ịga n’ihu na njem ahụ ga-eme ka anyị dị ukwuu karịa otu anyị dịịrị na mbụ.” Gwa ndi-otu ezi-na-ụlọ ka ha kekọrịta mmetụta ha nile n’ime nke ha mụtara ihe karịa site na ihe a ha nile n’ime nke ha mụtara ihe karịa site na ihe a na-eme karịa nke ha mụtara site n’ihe si n’ime ya pụta, dịka ngụcha akwụkwọ site n’ụlọ-akwụkwọ ma ọbụ ịnata ihe nrite.

Bipụta