2014
Ozi ahụ si na Chi nke Jisus Kraịst: Onye nlere-anya.
Jenụwarị 2014


Ozi nke Nkuzi ndi nleta ndinyom, Onwa Mbụ 2014

Ozi O-sina-chi nke Jisus Kraịst: Onye ịma-atu

Jiri ekpere mụọ ihe-ọmụmụ nke a ma chọọ ịmata ihe Ị ga-ekekorịta. Olee otu ịghọta ndụ na ozi nke Onye-nzọpụta ahụ ga-esi mee ka okwukwe gị na Ya bawanye ma gọzie ndi Ị na-elekọta site na nkuzi nleta? Maka inweta nkọwa ndi-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org

Dịka anyị na-aghọta na Jisos Kraịst bụ onye nlere-anya anyị n’ihe nile, anyị nwere ike ịbawanye n’ọchịchọ anyị isoro Ya. Akwụkwọ-nsọ nile jupụtara na mgbam-ume maka anyị isoro na nzom-ukwu nile nke Kraịst. Maka ndi Nifaị, Kraịst sịrị, “Maka ọrụ nile ahụ nke unu hụworo m na-eme nke ahụ kwa ka unu ga na-eme” (3 Nephi 27:21). Maka Thomas, Jisos Sịrị, “Abụ m ụzọ, ezi-okwu, na ndụ: ọdighị onye na-abịakwute Nna, ma ọbụghị site na mụ” (John 14:6).

Taa ndi ndu anyị na-echetara anyị idebe Onye nzọpụta ahụ dịka onye nlere anya. Linda K. Burton, onye-isi nduzi otu Enyem-aka ozuru-ọha, sịrị, “Mgbe onye ọbụla n’ime anyị nwere ozizi nke Aja-mgbaghara mmehie ahụ edere n’ime obi anyị nile, mgbe ahụ ka anyị ga-abụzi ụdị mmadụ ahu Onye-nwe-anyị chọrọ ka anyị bụrụ.”1

Onye-isi-nduzi Thomas S. Mọnson sịrị, “Onye-nwe-anyị na Onye-nzọpụta anyị, Jisos Kraịst, bụ onye Nlere-anya anyị na ike anyị.”2

Ka anyị kpebie ịbịaru Jisus Kraịst nso, irube-isi n’iwu-nsọ Ya nile, na ịgba-mbọ ịlaghachikwuru Nna anyị nke bi N’elu-igwe

Site na Akwukwọ-nsọ

2 Nephi 31:16; Alma 17:11; 3 Nephi 27:27; Moroni 7:48

Site na Akụkọ mgbe ochie anyi

“O tụrụ-ụkpụrụ ụzọ ma duzie ụzọ ahụ,” ka Eliza R. Snow, onye isi nduzi Otu-Enyem-aka Ozuru-oha nke abụọ, nke ije-ozi n’anụ-ahụ nke Jisos Kraịst.3 O kuziiri onye ọbụla —n’otu n’otu. Ọ kuziri na anyị ga ahapụ iri-itolu na itolu ndi ahụ ma ga zọpụta ndi ahụ gafụrụ-agafụ.(lee Luke 15:3 –7). Ọ gwọrọ ma kuziere ndi mmadụ n’otu-n’otu, ọbụna na-ewere oge leta onye ọbụla n’ime igwe mmadụ nke 2,500. (lee 3 Nephi 11:13–15; 17:25).

Maka umunwanyị nke Ndi-nsọ ụbọchị Ikpeazụ a, Onye-Isi-Nduzi Dieter F. Uchtdorf, onye-ndụmọdụ Nke-abụọ n’otu Ndị Isi Nduzi Mbụ, sịrị: unu ụmụnne nwanyị dị ebube na-enyere ndi ọzọ, inye-aka omiko maka ebum n’obi nke karịrị ọchịchọ nile nke irite uru nile nke onwe. Na nke a unu na-eńomi Onye-nzọpụta ahụ. …Uche Ya nile bụụru ihe oge nile n’inyere ndi ọzọ aka oge nile.”4

Ihe ncheta nile

  1. Linda K. Burton, “Okwukwe n’ime Aja-mgbaghara-mmehie nke Jisus Kraịst Edewo ya n’ime Obi anyị nile?” Ensign or Liahona, Onwa Iri na otu. 2012, 114

  2. Thomas S. Monson, “Izute Aka-mgba nile nke Ndụ,” Ensign, Nov. 1993, 71

  3. “How Great the Wisdom and the Love,” Abu nile, no. 195.

  4. Dieter F. Uchtdorf, “Happiness, Your Heritage,” Ensign or Liahona, Onwa iri na otu. 2008, 120.

Gịnị ka m nwere ike ime?

  1. Kedu otụ Jisọs Karịst siri bụrụ onye nlere anya Gini mere nke?

  2. Olee otu ikwusara ụmụnne nwanyị m na-eleta ozi-ọma ga-esi nyere m aka isoro Onye-nzọpụta ahụ?

Bipụta