2014
Oge ụkọ nke ije ozi
Febrụwarị 2014


Ndi Ntorobia

Oge ụkọ nke ije-ozi

Odee akwụkwọ a bi na Virginia, USA

Otu oge Ọkọchi, anọọrọm na mba ọzọ mụ na ụmụntakiri nwegasiri mkpa di ịche na arụ-ọrụ. Na mbụ nhuru ụmụntakiri ndi a, Enwere m ọnọdụ mgbakasi ahụ Anaghi m asụ asụsụ ha, ma enwere m nchekube na mụọ-nsọ ga edum na mkparita uka mụ na ha. Dika m na bia amata ụmụntakiri ndi na-otu na-otu, Amataram na asụsụ abughi mgbochi nye ihụnanya Anam egwu-egwu, chia-kwa ọchi, ma rụọkwa ihe nka mụ na ha, ọdighi ihe ọzọ na abughi inwe ezi ihụnanya nye ha. Ahụtara nwa-ntakiri, ihụnanya Nna anyi nke bị na Elu-igwe nwere ebe ụmụ ya nọ, enweghim ike ikọwapụta ọńu juru m n’obi.

Mgbe m na agara ndi ọzọ ozi, Ana m achọpụta na ihụnanya m abụghi maka nani ndi m na agara ozi kama ọbụ kwa nye Nna anyi nke bị na Elu-igwe. Amatawom na ezie na “mgbe ina agaara maadu ibe gi ozi inọ na ije ozi nke Chineke gi” Mosiah 2:17. Ebum n’obi m iga ozi, ma ọbụ iga ozi nke ọrụ ngo ma ọbụ site na iga ozi nke ọrụ ime ihe obi ebere, bụ nye Chineke otito Matiu: 5:16. Ana m atụ anya dịka m na agara ndị ọzọ ozi, ndi mmadu ga ahụta ihụnanya m nwere ebe Nna anyi nke bị na elu-igwe ya na Ihé nke Karist nke na anụ-ọkụ n’ime m.

Bipụta