2014
Ọrụ O-sinachi nke Jisọs Karist: Ezigbo Onye-ọzụzụ aturu
Febrụwarị 2014


Ozi nke Nkuzi ndi nleta ụmụnwanyị, Onwa abụọ 2014

Ọrụ O-sinachi nke Jisọs Karist: Ezigbo Onye-ọzụzụ aturu

Were ekpere muo ngwa ọrụ ndi a ma chọọ imata ihe ndi iga ekekọrita. Kedu ka ighọta ndu na ozi nke Onye nzọpụta ga esi wulite okwụkwe unu na Ya ma gozie kwa ndi unu na eleta site na ozi nleta ụmụnwanyi? Maka inweta nkọwa ndi-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

Jisọs Karist, Ezigbo Onye-ọzụzụ aturu ahụ, kuziri:

Kedu onye ọbụ, nwere nari aturu,ọbụrụ na otu n’ime ha furu, na agaghi ahapụ iri-itoli na itoli na ọzara, ma chọpụga otu ahụ furu-efu, rue mgbe ọchọtara ya? …

“A si m unu, na … ọńụ ga adi na elu-igwe maka otuu onye njọọ cheghariri” Luke 15:4, 7.

Dika anyi na aghọta na jisọs Karist bụ ezigbo Onye ọzụzụ aturu, mmasi anyi nwere iso ọmụma-atu na ijere ndi nọ na mkpa ozi na abawanye. Jisọs siri: “Abụ m ezigbo onye ọzụzụ aturu ahụ, ma amakwara m aturu m, ma ha makwara m. … Ma atọgbọrọ m ndụ m maka aturu m” (Jọn 10:14–15 Maka Aja-mmehie ahụ Jisọs Karist churu, onweghi onye nime anyi ga efu nke na anyi enweghi ike ichọta ụzọ anyi ga esi lahachi (lee Luke 15.

Onye isi nduzi Thomas S. Mọnson siri, “Ọrụ anyi bụ ilekọta ndi igwe aturu. … Ka anyi nile di na njikere ije-ozi.1

Site na Akwukwọ-nsọ nile

Psalm 23; Isaiah 40:11; Mosiah 26:21

Site na Akụkọ mgbe ochie anyi

Elizabeth Ann Whitney, onye nke jeere nzukọ Otu Enye m Aka nke mbụ, siri gbasara ncheghari ya na 1830: “Dika m na anụ Ozi-ọma ahụ mgbe ndi Elder ahụ na ekwusa ya, A nuru m ya dika olu nke Ezigbo Onye-ọzụzụ aturu.” Elizabeth sooro olu nke Ezigbo Onye-ọzụzụ aturu ahụ, emekwara ya baptism ma meekwa ya onye otuu.

Anyi nwekwara ike inu olu nke Ezigbo Onye-ọzụzụ aturu ma kekọrita nkuzi Ya nile nye ndi ọzọ nile. Onye isi nduzi Mọson siri, “Anyi bụ ndi ọrụ nke Onye-nwe na ụwa a, ji ikike ije-ozi na ibulite ụmụ Ya nile.3

Otu ahụ onye-nche aturu si na achọpụga aturu ahụ furu-efu, otu a ka ndi nne na nna nwere ike ichọpụga otu nwa kpafuru-akpafu. Onye isi nduzi James E. Faust (920–2007), Onye ndụmọdụ nke abụọ na ndi isi nduzi nke mbụ, siri “Ndi nne na nna nọọrọ na nwute, ndi naara eme ezi-omume, na rụsie ọrụ ike, na kpesie ekpere ike na ikuziri ụmụ ha ndi nupụrụ isi, anyi na asi unu, Onye-ọzụzụ aturu ahụ na echekwa ha. Chineke maara na ghọtakwa iruju unu. Olile anya di.”4

Lee-anya

  1. Thomas S. Monson, “Heavenly Homes, Forever Families,” Liahona, June 2006, 70.

  2. Elizabeth Ann Whitney, na Daughters in My Kingdom: Akụkọ Ochie na Ọru nke Otu Enye m Aka (2011), 128.

  3. Thomas S. Monson, “Gini ka Imere Mmadu Ụbọchi Taa?” Liahona, Nov. 2009, 86.

  4. James E. Faust, “Dear Are the Sheep That Have Wandered,” Liahona, May 2003, 68.

Gịnị ka m nwere ike ime?

  1. kedu ka imata na Onye nzopụta bụ Ezigbo Onye ọzụzụ aturu si enweta udo na ndụ anyi?

  2. Kedu ụzọ anyi nwere ike iji nyere ndi ahụ “kpafuru-akpafu” site na emume nzukọ-nso ma ọbụ ndi na anọghi na okwukwe anyi aka?

  3. Kedu ka m ga esi nyere ndi nne na nna aka ndi nwere ụmụntakiri kpapụrụ na ibi ndụ ozi-ọma?

Bipụta