2014
Were ihụnanya gaara Onye-nwe ozi
Febrụwarị 2014


Ọzi nke Otu Ndi-isi Ndụzi Mbu,Ọnwa abụọ 2014

Were ihụnanya gaara Onye-nwe ozi

Foto, oyiyi
Onye Ịsị Ndụzị Thomas S. Monson

Onye –nwe Jịsọs Karist kuziri, “Onye ọbụla chọtara ndụ ya ga atufu ya: kama onye ọbụla tufuru ndụ ya na ihi m,onye ahụ ga achọta ya” (Luke 9:24).

E kwere m, “Onye Isi nduzi Thoma S. Monson, kwuru, Onye nzọpụta na agwa anyi na sọsọ na anyi ochefuru onwe anyi na igara ndi ọzọ ozi, onweghi ihe fọduru na ndụ anyi. Ndi nile na eme ihe nani ha ga emecha kpọnwụọ ma bia tufuo ndụ ha, ma ndi nile na etufu ndụ ha na ijere ndi ọzọ ozi ga na eto na abawanye— ma mecha zọpụta ndụ ha.1

Site na ihe ndi a Onye Isi nduzi Mọnson kwuru na ozi ya, ọ chetere anyi nile Ndi Nsọ ụbọchi Ikpeazu a na nchekwa nke Onye-nwe na ngozi nile nke ndụ ebighi-ebi na eche ndi nile ji okwụkwe ha na agaara ndi ọzọ ozi.

Ije ozi na Tempụl

“Ije-ozi di ukwuu ka anyi na enye mgbe anyi na emechitere ndi anyi wuru-anwu emume nsọ nile. Mgbe ụfọdụ anyi anaghi ama ndi anyi na emechitere emume nsọ ndi a. Anyi anaghi atụ anya ekele ma-ọbụ inwe ezi ntụkwasi obi na ha ga anabata ihe anyi meere ha. Ma-otu-osinadi, anyi na aga ozi, na usoro a anyi ga erute na ọnọdụ ahụ na ejighi ike ma ọbụ ume iji ga ozi: anyi ga abụzi ndi nzọpụta na Ugwu nke Zaiọn. Dika Onye nzọpụta anyi siri ji ndụ Ya chụọ aja nye anyi, otu a ka anyi, na ụzọ ọbụla, mee otu a mgbe anyi na eme emume nsọ na tempụl nye ndi na enweghi otu ha ga esi gaa na ihu ma ọbụghi na ndi di ndụ meere ha otu a.”2

Anyi bụ ndi Ọrụ Onye-nwe

Umu nne ndi nwoke na ndi nwanyi, ọtutu ndi gbara anyi gburu-gburu chọrọ ka anyi mata ha, agba m ume anyi, enye m aka anyi, nkasi obi anyi, obi ebere anyi —ha bụ ndi ezi-na-ụlọ, ndi enyi, ndi anyi matara, ma ọbụ ndi inamaghi-mbụ. Anyi bụ ndi ọrụ nke Onye-nwe na ụwa, ji ntụzi aka izọpụta ma bulite umu Ya. Ọ dabere na ebe anyi nọ na-otu-na-otu …

“ Ọrụ ahụ nke akpọrọ anyi nile bụ ọrụ nke Onye-nwe Jisọs Karist.”3

Ịje ozi na ụdị nke Onye-nwe

“Na ụwa ọhuu, Onye-nwee na mbilite na onwu kwuru, ‘Unu maara ihe ndi unu ga eme na nzukọ m; ma ọrụ ndi unu na ahụ m na arụ na eme unu otua; ma ihe ndi unu na ahụ m na eme, na eme nụ otua’ [3 Nephi 27:21].

“Anyi Na agozi ndi ọzọ dika anyi na aga ozi na udị nke Jisọs nke Nazaret…onye nke na agaghari na eme ezi-ihe [Acts 10:38]. Chineke gozie anyi, ka anyi nweta ọńụ na ijere Nna anyi nke bi na elu-igwe ozi dika anyi na ejere ụmụ Ya ndi nọ nụ ụwa ozi.”4

Mkpa ọdi ije ozi

“Anyi chọrọ inweta ohere ije ozi. Maka ndi otu nzukọ-nsọ ndi nke na ada-mba na ihe-mmem-me ma-ọbụ ndi na anaghi ekwupụta ihe ha bu na obi, anyi na ekpesi ekpere ike ichọta ụzọ zute ha. Ịrịọ ha ka ha je ozi na ụfọdụ ọnọdụ nwere ike ibụ ihe agba m ume ha chọrọ iji laha-chite na-ime ihe. Kama ndi ndu nile ndi nwere ike inye aka na ọnọdụ a, mgbe ụfọdụ ha enweghi mmasi. Anyi kwesiri ibu-na obi na ụfọdụ mmadu nwere-ike ịgbanwe ha nwere-ike hapụ agwa ọjọọ ha nile. Ha nwere ike chegharia na njehie ha nile Ha nwere ike tozuo-oke na ijigide ọkwa-nchụ-aja Ha nwere ike were ike ha nile jere Onye-nwe ozi.”5

Anyi Na Eme Ihe-nile Anyi Kwesiri?

“Uwa a chọrọ enye m aka anyi. Anyi ana eme ihe nile anyi kwesiri? Anyi na echeta okwu nile nke Onye isi nduzi John Taylor: Ọ bụrụ na ijeteghi ozi nile nke akpọrọ gi oku, Chineke ga atagi-ụta na ihe ọbụla mere ndi ahụ ikwesiri ịzopụta ma ọbụrụ na imere ihe ikwesiri ime? Nkuzi nile nke ndị isi nduzi nzụkọ a: John Taylor (2001), 164. Enwere ụkwụ ndi aga agbazi, aka ndi aga ejigide, echiche ndi aga agba-ume, obi ndi aga akwalite mụọ ha, na mkpuru-obi ndi aga azọpụta. Ngozi nile nke ndu ebighi-ebi na eche gi. Ọ bụ ohere oma ka anyi hara ibụ ndi na ele sọsọ anya kama isonye na ndi ọgbọ … ije ozi.”6

Ihe nhụba ama nile

  1. “Gini Ka M Mere-la Mmadu Ụbọchi taa?” Liahona, Nov. 2009, 85.

  2. “Tutu Anyi Ezute Ọzọ,” Liahona, May 2009, 113–14.

  3. Gini Ka M Mere-la Mmadu Ụbọchi taa?” 86, 87.

  4. “Oku nke Onye-nzọpụta Ije-ozi,” Liahona, Aug. 2012, 5.

  5. “Hụta ndi Ọzọ dika Otuu Ha Nwere ike Isi Dị,” Liahona, Nov. 2012, 68.

  6. “Inwe-obi na Itozu-oke na Ije-ozi,” Liahona, May 2012, 69.

  7. Teaching, No Greater Call: A Resource Guide for Gospel Teaching (1999), 12

Nkuzi si na ozi a

“Ọ bụrụ na inwe ihunnanya nke Karist, iga adi njikere ikuzi ozi-ọma a. Ị ga enwe ihe nkwalite-mụọ inyere ndi ọzọ aka na imata Onye-nzọpụta ma sorokwa ụzọ Ya.”7 Tuule Ikpe-ekpre inweta ọmiko nye ndi ina eleta. Dika i na eto na igosi ha ihunanya nke Karist, iga enwe-ike ije-ozi na ụzọ bara uru, ebe Onye-nwe na ndi ina akuziri.

Bipụta