2014
Ọzịza maka Ekpere Nwanyị a.
Maachị 2014


Ntorobia

Ọzịza maka ekpere nwanyị a

Odee nke a bi n’ime Gauteng, South Africa.

Otu abalị, otu enyi, onye okwukwe ọzọ bịara leta m. A nam agụkarị akwụkwọ-nsọ nanị m, n’abalị ahụ, ewepụtaram ha ka m tule uche na ha. Ọ metụtaram na mụọ ka m kpọọ ya ka o soro m tule-uche n’ime akwụkwọ-nsọ, ma ụjọ tụrụm, ma mmalitere ịmụ akwụkwọ nanị m. A maaram na a gbaram mmetụta Mụọ-nsọ nke a nkịtị. Mgbe nkeji ole-n’ole gara, m jụọ ya n’olu nwayọ, “Ị ga-achọ isoro m tule-uche na akwụkwọ-nsọ?” N’echeghi ya eche, enyi m zara “Eeh”.

Anyị aguzie Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọ jụrụm ụfọdụ ajụjụ, mgbe m na-aza ya, a mataram na Mụọ n’edu m na-ọsịsa m. A gbaram-ama maka ezi-okwu nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Mgbe m mesiworo nke a, ọ gwaram, “Ka mgbe taa, a nọm n’ebe-akwa na-atụ ụjọ. Ugbu a mkpechapụrụ ekpere nye Chineke maka enye m aka, ka ị gwaram ka mụ na gị gụọ akwụkwọ-nsọ . Ugbu a, obi dị mụ nma. Ị meela.”

Onye Nwe-anyị jirim kwara ngwa-ọrụ maka ị za otu ekpere na i jere otu nwa Ya nọ na mkpa ozi. A mam na mmetụta-nke-mụọ bụ ndụmọdụ dị nsọ si n’aka Nna onye amamịhe kwesịrị-otịto, bịa. Mgbe anyị ga ewezuga ụjọ anyị nile, anyị n’ahapụ Ya ka Ọ gosi ike Ya site na nrube-isi anyị.

Bipụta