2014
Njem dị nsọ nke Jisọs Kraịst: Íhé nke ụwa
Maachị 2014


Ozi nke Nkuzi ndi nleta ụmụnwanyị,Ọnwa atọ 2014

Ịje-ozi Sinachi nke Jisọs Kraịst: Íhé nke Ụwa

Jiri ekpere tule-uche na akwụkwọ nke a, ma chọọ ka ịmụta ịhe iga-ekesara ndị mmadụ. Kedụ otu nghọta maka ndụ, na ịje-ozi nke Onye nzọpụta g’esi ewulite okwukwe gị na Ya, ma gozie ndị ahụ ị na-elekọta site na nkuzi nleta gị? Maka inweta nkọwa ndị-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enyem-aka

Mgbe anyị n’aghọta na Jisọs Kraịst bụ Íhé nke Ụwa, anyi g’ewulite okwukwe anyị n’ime Ya, ma bụrụ íhé nye ndị ọzọ. Kraịst gbara-ama maka oke-na-ọrụ Ya dịka “ezi íhé ahụ nye nwoke ọbụla (na nwanyị ọbụla) na-abịa n’ime ụwa” O&O 93:2 ma Ọ gwawo anyị k’anyị “welite íhé (Ya) elu ka ọ na-enwu nye ụwa” (3 Nifaị 18:24).

Ndị-amụma anyị agbawokwa ama maka Íhé nke Kraịst. Onye Isi-Nduzi Henry B. Eyring, Onye-Ndụmọdụ nke Mbụ na Ndị-Isi Nduzi nke Mbụ, kwuru: “Mgbe ọbụla ịgbara mbọ ka ibie ndụ dịka Onye-Nzọpụta, ọgbugba-ama gi ga-esi-wanye-kwa ike. Ị ga-abịa mata n’onwe gị na Ọ bụ ya bụ Íhé nke Ụwa. …Íhe nke Kraịst nke ahụ nọ na ndụ gị, g’efesara ndị ọzọ.”1

Okenye Quentin L. Cook, onye nke Kworum ndị Ndị-Ozi Iri na Abụọ kwuuru maka anyị ị bụ íhé nye ụwa: “Anyị kwesịrị ịchekwa ezi-na-ụlọ anyị nile, nakwa soro ndị ezi-ọmume nọrọ n’ihu maka ịmee ịhe nile anyị nwere ike maka idokwa íhé, olile-anya, na ezi-omume n’ime obodo anyị nile.”2

Site na Akwukwọ-nsọ nile

Jọn 8:12; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ 50:24: 115:5

Site na Akụkọ ochie anyị

Ụmụ-nwanyị ndị Ndị-Nsọ Ụbọchị Ikpe-azụ taa, na-aga n’ihu n’egosipụta íhé ha.

N’ime okpu-ụlọ nke iri-asatọ nọ na otu nnukwu ụlọ-elu na Hong Kong, China, otu nwanne nwanyị n’alụbeghi dị, onye nwere nkwarụ na ahụ ya —, onye nanị ya bụkwa Onye-Nsọ Ụbọchị Ikpe-azụ n’ime ezi-n’ụlọ ya—, meziri ụlọ ya k’ọbụrụ ebe mgbabanye, ebe ya na ndị ọbịa ya ga-enwete mmetụ nke Mụọ. O dobere akwụkwọ-nsọ ya nile, akwụkwọ-ọmụmụ nile nke otu Enyem-aka, na akwụkwọ-abụ ya na-akụkụ ya. Ọ gara tempụl ka ọ mee emume-nsọ nile maka ndi nna-nna ya.3

Na obodo Brazil, otu nne onye ezi-omume zulitere ụmu ya n’ime íhé nke ozi-ọma. Ana agụ egwu ndị ụmụ-ntakịrị n’ụlọ ya kwa mgbe, ma ihe-osise si na Liahona nke tempụl, ndị amụma Chineke, na nke Onye-Nzọpụta ka ekobere na ahụ ụlọ. Ya na di ya gbara-mbọọ nke ukwuu ka ha mee emume nrachie ha n’ime tempụl, nke g’eme ka ụmụ ha bụrụ ndi amụrụ n’ime ọgbụgba-ndụ. Ekpere ya mgbe nile bụ ka Onye-Nzọpụta nyere ya aka ịzulite ụmụ ya n’ime íhé, eziokwu, na ike nke oziọma.4

Lee-anya

  1. Henry B. Eyring, “Ọgbụgba-Ama dị Ndụ,” Ensign m’ọbụ Liahona Ọnwa Ise 2011, 128.

  2. Quentin L. Cook, “Ka Íhé Dị!” Ensign mọbụ Liahona, Ọnwa Iri na otu. 2010, 30.

  3. lee Daughters in My Kingdom: Akwụkwọ Akụkọ na Ọrụ nke Otu Enye m aka (2011) 20–21.

  4. Lee Daughters in My Kingdom 164.

Gịnị ka m nwere ike ime?

  1. Kpakọrịta-nụ ụka ịhe ọ pụtara ịbụ íhé nye ụwa taa.

  2. Tule-uche maka otu iso íhé nke Kraịst g’esi enyere gị aka ị nagide mnwale nile.

Bipụta