2014
Ije-ozi na Ndụ Ebighi-ebi
Maachị 2014


Ozi nke Otu NdỊ-isi Nduzi Mbụ, Onwa atọ 2014

Ịje-ozi na Ndụ Ebighi ebi

Onye isi nduzi Henry B. Eyring

Onye-Nzọpụta bụụrụ anyị ọmụmatụ maka ịje-ozi n’echeghi maka nanị onwe. Ndụ Ya nke zuru-oke, bụ ịhe o tinyechara n’ime ijere Nna nke bi N’elu Igwe, na ụmụ Ya nile nke Nna Ya ozi. Obi-bụ-otu nke Nna na Nwa, bụ ịnye anyị nile onyinye ndụ-anwụ-anwụ na ngozi nke ndụ ebighi-ebi (lee Mosis1:39).

I tozu maka ndụ ebighi-ebi, anyị kwesịrị ịnwete mgbanwe site na aja-mmehie nke Jisọs Kraịst—, bụrụ ndị amụrụ-ọzọ, na ndị asachapụrụ na mmehie. Ụmụ-ntakịrị n’erubeghi afọ asatọ, otuosiladị, enweghi mmehie,azọpụtawokwa ha site na aja-mmehie (lee Mosaia 3:16, 21 Moronaị 8:10–12).

Maka anyị-nile ndị rugoro afọ ịza-ajụjụ, enwere atụmatụ dị nma, nke g’eme ka anyị nwete nsachapụ mmehie ma bụrụ ndị akwadoro maka ndụ ebighi-ebi. Nkwado maka nke a n’ebido na baptizim site na ikike ọkwa nchụ-aja na ịnata Mụọ Nsọ. Emesịa, anyị kwesịrị ịchete Onye Nzọpụta mgbe ọbụla, ma n’edobe iwu nile nke Ọ nyere anyị.

Eze Benjamin gwara ndị obodo ya n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn maka ọńụ nke n’abịa site na inwete mgbaghara mmehie nke n’abịa site na aja-mmehie nke Jisọs Kraịst. Emesịa, ọ kuziri ha na ọ bụrụ na ha chọọ ijidesi nsachapụ mmehie ha ike, ha ga akuziri ụmụ ha ka ha jekọrịtawara onwe ha ozi, ma ha g’enwe obi imepụ-aka dịka ha nwere ike, ka ha nwee ike gboo mkpa anụ ahụ na nke mụọ nke ndị gbara ha gburu-gburu. (lee Mosaia 4:11–16).

Ọ kuzikwara, “Ma lee, a na m agwa unu ịhe ndịa ka unu mụta amamịhe; ka unu mụta na mgbe unu nọ n’ijere mmadụ ibe unu ozi, unu nọ nanị n’ije ozi nke Chineke unu” Mosaia 2:17.

Jisọs n’ejegharị n’akuzi oziọma Ya, ma n’emekwa ịhe ọma (leeActs 10:8) Ọ gwọrọ ndị ọrịa. Ọ kpọlitere ndị nwụrụ-anwụ. O ji ike Ya wee zụọ nde kuri-nde mmadụ mgbe agụ n’agụ ha, mgbe ha na-enweghi nri (leeMatiu 14:14–21;Jọn 6:2–13) Mgbe O biliri na ọnwụ, Ọ nyere ụfọdụ ndi Ndị-Ozi Ya nri mgbe ha bịara na Ọgbara-ala nke Mmiri Galili (leeJọn 21:12–13). Na Amerikas, Ọ gwọrọ ndị ọrịa, ma gozie ụmụ-ntakịrị n’otu n’otu (lee 3 Nifaị 1:7–9, 21).

Jemes Onye-Ozi kuziri anyị ọtu mmasi anyị nwere ịjere ndị ọzọ ozi na esi abawanye site na obi-ekele anyị maka ịhe Onye-Nwe-anyi meere anyị:

“Ma onye nyochaworo n’ime iwu ahụ zuru-oke nke mnwere-onwe, ma nogidekwa otu a, ghara ịghọ onye n’echefu ịhe ọ nuru, mana ghọọ onye n’eme eme, onye a ga-bụ onye agozịrị n’omume ya, …

Okpukpere-chi nke dị ọcha, nke ana-emerụghi n’ihu Chineke bụ Nna bụ nke a, Ileta ụmụ n’enweghi nna, ndị isi-mkpe n’ime mkpagbu ha, na idebe onwe-ha n’enweghi ntukpọ site n’ụwa” Jemes 1:25, 27.

Otu ịhe ga-agba-ume n’anyị n’enwete ịdị-ọcha, bụ mgbe ọchịchọ-obi maka ịjere ndị ọzọ ozi n’ihi Onye-Nzọpụta na-amubanye. Nkuzi-ezi-na-ụlọ na Nkuzi nleta gazi abụ ịhe ọńụ karịa ịbụ ọrụ. Ị ga-ahụta onwe gi ka ị n’arọpụta onwe gi karịa n’ime ụlọ-akwụkwọ, m’ọbụ ị nye aka ịleta ndị ogbenye nọ n’ime obodo gị. N’agbanyeghi na ị nwere ntakịrị ego ị nye ndị ahụ na enweghị, ị ga enwe mmasị ịnye ha karia ma ọbụrụ na inwee ya. (lee Mosaia 4: 24). Ị ga-ahụta onwe gị ka ọ na-anụ gị ọkụ n’obi ijere ụmụ gị ozi, ma gosi ha otu esi ejere ndị ọzọ ozi.

Mgbe ndụ gị n’agbanwe, ị ga enwete ọchịchọ obi ị nyere aka nke a na-akughị ekwe ya. A mam ndị n’eso ụzọ Onye-Nzọpụta ndị nke nyere nnukwu onyinye ego na enyem-aka ha nke ndị mmadụ na amaghị m’ọbụghị nanị Chineke na ụmụ ha ma maka ya. Chineke anabatowo enye m-aka ha site n’igozi ha na ndụ nkea, ma Ọ ga-agozikwa ha na ndụ ebighi-ebi nke n’abịa (lee Matiu 6:1–4; 3 Nifaị 13:1–4).

Dịka mgbe i dobere iwu maka ijere ndị ọzọ ozi (lee Matiu 22:39, ị nwetaworịị mgbanwe na ndụ nganga gị. Onye-Nzọpụta kuzi-maara Ndi-Ozi Ya mgbe ha na-adọ maka onye kacha elu n’ime ha. O kwuru:

“Ka aghara ịkpọ unu ndị-nna-ukwu: n’ihi na otu onye bu Nna-ukwu unu, ọ bụ Kraịst.

“Ma onye dịkarịsịrị ukwu n’etiti unu g’abụ onye n’ejere unu ozi” (Matiu 23:10–11).

Onye Nzọpụta kuziri anyị ụzọ anyị g’esi amụta ịjere ndị ọzọ ozi. Ọ jere ozi nke ọma, anyị kwesịrị ịmụta ịje ozi dịka Ọ mụtara— amara ruo n’amara (lee O&O 93:12–13). Site na ozi nke anyị n’eje, anyị nwere ike ịdịwanye ka Ya karịa. Anyị g’eji ume nile nke obi anyị, kpee-ekpere ka anyị hụ ndị-iro anyị n’anya dịka otu O ji hụ ha n’anya (lee Matiu 5:4–44; Moronaị 7:48). Emesịa n’ikpe azụ, anyị g’etozu maka ndụ ebighi-ebi anyị na Ya na Nna anyị Bi N’elu-Igwe.

A nam ekwe nkwa na anyị ga eje ozi nke ọma mgbe anyị n’eso nkuzi nile na ọmụmatu nke Onye Nzọpụta.

Nkuzi si na ozi a

Okenye M. Russell Ballard onye nke Kworum ndị Ndị-Ozi Iri na Abụọ akuziworo anyị k’anyị kpee ekpere maka ohere ije ozi: “N’ekpere ụtụtụ kwa ụbọchị ọhụrụ, rịọ Nna Bi N’Igwe ka o duo gị ka ịmata ohere ijere otu n’ime ụmụ ọma Ya ozi. Ịmesịa, gawa n’ụbọchị ahụ… na-achọ onye ị ga-ejere ozi” (“Tinye Uchu N’ọrụ” Ensign m’ọbụ Liahona Nov. 2012, 31). kwete ịkpọku ndị ahụ ịna-akuziri ka ha kpebie ịkpe ekpere ụtụtụ ọbụla maka ohere ije-ozi, emesịa, chọwazie ohere ndị a n’ụbọchị ahụ.