2016
Ebe Ndabere nye Ịgba-ama M
Febrụwarị 2016


Ntorobia

Ebe Ndabere nye Ịgba-ama M

Onye odee ya bi na Utah, USA.

Mgbe ndi afọ iri na isii, otu enyị m akpọrọ ndị mgbasa ozi-ọma bia na ụlọ anyị. Nani na otu ọnwa anyị nwere mkparịta ụka ọmụmụ-ihe, ajụjụ m niile nwetara ọsịsa ebe odoro-anya Enwetara m mmetụta nke Mụọ-nsọ nke na agbara m ama na ozi nke Nweghachi ozi-ọma-a bụ ezi-okwu. A hụtụbeghi ihe dị otu-a na ndị, amaara m na ha niile bụ ezi-okwu.

Ma otu osinadị, enwetara ihe ọjụ-ọjụ na megide ttu m na enwebeghi mbụ. Agbahapụrụ m, ike agwụ m ihe n amaghi-kwa ihe m ga eme. Ọ bụrụ na m na eme ihe dị nma, gịnị kpatara m ji na enwe ihe mkpagbu? Enweghi m ike ịghọta ihe mere ihe nwale m jiri bụrụ maka ọdị nma nke m. Ndị mgbasa ozi-ọma kuziiri m ka na ekpe-ekpere ma na ebu-ọnụ, ọbụnadị mgbe m nọ na ụlọ-akwụkwọ. Mgbe ihe na ekweghi m odidi, ana m eji obi m kpee-ekpere ma ozigbo nweta nkasi-obi nke Mụọ-nsọ.

Oge izu-ụka m ga eme baptizim jupụtara na ihe nwale. Onye isi-ọrụ m yiri egwu ichum na ọrụ ma ọ bụrụ na m ahapụghi baptizim m bia rụchitere onye ọzọ ọrụ, emea ụlọ anyịchara m gaa ụlọ-ọgwu maka ọria akpa-mamiri, na kwa ndị mụrụ m si ka pụọ Ebe m na amaghi-kwa ihe m ga eme na ihe niile ndị, nani ihe maara nwere ike ime bụ ịgakwuru Onye-nwe.

Nwale niile ndị-a mechara bụrụ ihe nrite nye mụ onwe-m. Ha nyere m aka ịmụta maka ihe ozizi niile nke ozi-ọma nke nyere ebe mgbakwasi nke igba-ama-m.

Bipụta