2016
Alum D-na-Nwanyị Bụ ihe Chineke Hiwere
Febrụwarị 2016


Ozi nke Nkuzi ndi nleta ụmụnwanyị, Onwa abụọ 2016

Alum D-na-Nwanyị Bụ ihe Chineke Hiwere

Wereekperemụọakwụkwọọzizamachọpụtaiheịga-akuzi Kedu otu ịghọta “Ezi-na-ulọ: Ọkwa-amara nye ndị Ụwa” ga esi wulite okwukwe gị na Chineke ma goziekwa ndị ị na eleta site na ozi nleta gị? Maka inweta nkọwa ndi-ọzọ, gaa na reliefsociety.lds.org

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Relief

Ndị amụma, ndị ozi na ndị ndu na aga n’ihu na “ama-kwasi-okwa na alum di-na-nwunye na etiti nwoke na nwanyị bụ ihe chineke hiwere, na ezi-na-ụlọ dị oke mkpa na atụmatụ nke Onye-okike.“1

Okenye D. Todd Christofferson nke ndị Otuu Ndị Ozi nke Iri na Abụọ siri: “Ezi-na-ụlọ eweru site na alum di-na-nwunye nke nwoke na nwanyị na eweta ezigbo ọnọdụ nke ga eme ka atụmatụ Chineke mee nke ọma. …

“…onweghi onye n’ime anyị ma ọbụ onye ọzọ nwere ike imeghari iwu a dị-nsọ.”2

Bonnie L. Oscarson, onye isi nduzi zuru nke ndị ụmụagbọghọ, siri: “Onye ọbụla, na agbanye-ghi otuu ọbụla ọlụlụ dị na nwunye ya siri dị ma ọbụ ụmụ ọle nwere ike ịbụ ndị na echekwa atụmatụ nke Onye-nwe dika akọwara na okwa amara maka ezi-na-ụlọ. Ọ bụ atụmatụ nke Onye-nwee, ọ klwesiri ịbụ-kwa atụmatụ nke anyị!”3

Okenye Christofferson agara n’ihu: “Anapụrụ ụfọdụ n’ime unu ngozi nke alum di na nwunye nani maka, enweghi olile anya ndụ di nma, ihụnanya nwoke-na-nwoke nwanyị-na-nwanyị, isi ma ọbụ ahụ adighi nma, ma ọbụ ụjọ na agaghi eme nke ọma. w … Ma ọbụ na ịlụrụ, mana alum di-na-nwunye ahụ enweghi-zi isi. … Ụfọdụ n’ime unu ndị lụrụ enweghi ike imụta nwa. …

Ma otu-a, onye ọbụla nwere ike itinye ọke ya na imejupụta atụmatụ a dị nsọ na ọgbọ niile.”4

Akwụkwọ-nsọ niile Agbakwunyere

Jenesis 2:18-24; 1 Ndị Kọrịnt 11:11; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49:15-17

Akụkọ niile mere-eme

Nwanne nwoke Larry M. Gibson, onye bụụrụ onye ndụmọdụ nke mbụ na ndị isi nduzi zuru ọha nke ụmụokorobia, chetara mgbe Shirley, onye nke bụ nwunye ya ugbua, siri;

“’A hụrụ m gị na anya maka na amaara m na ihụrụ Onye-nwe na anya karia otu ihụrụ m.’ …

“Ọsisa nke ahụ metụrụ m na obi. …

“… [Mana] A chọkwara m ka ọmata mgbe niile na ahụrụ m Onye-nwe na anya karia ihe ọbụla.”5

Okenye David A. Bednar nke ndị Otuu Ndị Ozi Iri na Abụọ kuziri; “Onye-nwee Jịsọs Kraịst bụ isi nlegide anya naalum din a nwunye ọbụla alụrụ na okpuru iwu. …[Ma chee ka ọdị] na edotere Onye nzọpụta na elu-elu ihe nwere akụkụ atọ, ma dote nke nwanyị na ala otu akụkụ ma nke nwoke akụkụ nke ọzọ. Ma tulee ihe ga eme na mmekọrịta ga adị na etiti nwoke ahụ na nwanyị ahụ dika ha na agba mbọ nke onwe ha oge niile ‘íbiakwute Kraịst’ ma na agbalia itozu-oke na Ya’ (Moronaị 10:32). Maka na, nakwa site na Onye Mgbap[ta ahụ, nwoke ahụ na nwanyị ahụ abiakọta ọnụ.”6

Hụba-ama

  1. Ezi na ụlọ Okwa-amara nye Ụwa niile,” Liahona, Ọnwa iri na otu,2010, 129.

  2. D. Todd Christofferson, “Gịnị-kpatara Alum Di-na-nwanyị, Gịnị-kpatara Ezi-na-ụlọ,” Liahona, May 2015, 52.

  3. Bonnie L. Oscarson, “Ima-okwa nke Onye-nchekwa nke Ezi-na-ụlọ,” Liahona, May 2015, 15.

  4. D. Todd Christofferson, “Gịnị-kpatara Alum Di-na-nwanyị, Gịnị-kpatara Ezi-na-ụlọ,” 52.

  5. Larry M. Gibson, “Fulfilling Our Eternal Destiny,” Ensign, ọnwa abụọ. 2015, 21-22.

  6. David A. Bednar, “Alum Di-na-nwanyị Dị Oke-mkpa na Atụmatụ Ebighi-ebi Ya,” Liahona June 2006, 54.

TuleeuchenaNkea

Kedu otu-m ga esi nọgide na mgbali “na ịbiakwute Kraịst”?

Bipụta