2016
Ị lọdata N’udo n’ime Nsogbu
Febrụwarị 2016


Ozi nke Otu Ndị-Isi Nduzi Mbụ, Onwa abụọ 2016

Ị lọdata N’udo n’ime Nsogbu

Foto, oyiyi
Onye Isi-Nduzi Dieter F. Uchtdorf

Oge na eteghi anya gara-aga,mụ na nwanyị m Harriet nọ na ele ụgbọ-elu ndị dị egwu ka ha na efedata. Ọ bụ ụbọchị oke ikuku nke nọ na apian a ahụ ụgbọ-elu na abia, nke mere ka onye ọbụla na echihari ma na akpọ na ubu

Dika anyị na ahụta ịmaka nọ na etiti ihe dika chi siri kee na igwe-ọrụ, uche m na agaghachi mgbe mụrụ ife ụgbọ elu na agwa niile nmụtara ebe ahụ― ma mechaa kuziere ndị ọkwọ ụgbọ elu ndị ọzọ na ọzụzụ ha.

Ị chọkwala inwere ik- ntuzi-aka, ma enwee ihe oke nsogbu,” kam na agwa ha. ‘Nọrọ jii; enwela mgbakasi-ahụ. Gbado anya gị na ogologo ahiri nọ na ụzọ-ụgbọ-elu. Ọ bụrụ na imeghi ihe ikwesirri ime, mee ngwa-ngwa mee ihe niile ikwesiri ime. Tụkwasi-obi na ihe ụgbọ-elu pụrụ ime. Merie ihe nsogbu ahụ.”

Ndị ọkwọ-ụgbọ-elu nwere ahụmihe maara na ha enweghi ike itụzi-aka na ihe niile na eme na akụkụ ha. Ha enweghi ike iwezuga inwe ihe nsogbu. Ha enweghi ike ime ka mmiri-ozizo ma ọbụ akụ-mmiri-igwe fuo. Ha agaghi eme ka ikuku kwusi ife ma ọbụ ime ka ofegharia ebe ọ na achọghị ife.

Mana ha ghọtara na ọdighi nma itụ nsogbu ma ọbụ oke ikuku ụjọọ ― ọkachasi inọ na oke ụjọọ maka ihe ndị-a. Ụzọ esi echekwa onwe mgbe ọnọdụ na adighi nma, bụ ịnọzi nke ọma, ma mezie ihe dika okwere gị mee.

Dika m na ele ụgbọ-elu ka ha niile na ada, ana m echeta ihe ọmụmụ m niile dika m na efe ụgbọ-elu, ma chee, ọ bụ na enweghi ihe nmụta na nke-a maka ndụ anyị ụbọchị niile.

Ọbụghi mgbe niile ka na enwe ike ntuzi-aka ma ọ bụrụ na ihe nsogbu bia na ndụ. Mgbe ụfọdụ ihe anaghi agazi dika otu anyị siri chee ya. Anyị nwere ike inwe nchekasi na nkopụ site na ihe nsogbu nke ngharipụ, uche abụọ, ụjọọ, iwe, ma ọ bụ oke-ịgba-mbọ.

Na oge ndị, ọdị mfe anyị ime ihe na ezighi-ezi maka na, echiche anyị anọghi-kwa na obi anyị, echiche anyị nọ na nsogbu ahụ. Ihe nwale niile ga abụ, tinye obi gị na ihe ọnwụnwa niile anyị na agabiga, ma karia itinye ya ebe Onye-nzọpụta ya na ọgbụgba ama anyị nwere na ezi-okwu.

Mana nke ahụ abụghi ụzọ kachasi nma anyị ga esi gabiga ihe iche-aka mgba na ndụ anyị niile.

Dika otu onye ọkwọ ụgbọ-elu na esi elegide anya ya na etiti okporo-ụzọ karia ele anya na nsogbu iji fedata nke ọma, otua-kwa ka anyị ga esi legida anya na isi okwukwe anyị– Onye-nzọpụta anyị, Ozi-ọma Ya, atụmatụ nke Nna anyị nke Elu-igwe—na ebum n’uche anyị nke kachasi bụ ilahachi nke ọma na elu-igwe. Anyị kwesiri ịtụkwasi obi na Chineke ma nọgide-sie ike na iso-ụzọ ya nke bụ ebe mbọ niile anyị nọ. Anyị kwesiri igbado anya, obi, na echiche na ụdị ndụ anyị maara anyị kwesiri ibi.

Igosipụta okwukwe anyị na ntụkwasi-obi ebe Nna anyị nke elu-igwe site na irubeisi na iwu Ya niile ga ewetara anyị obi-ụtọ na otịto.s Ma ọ bụrụ na anyị anọgide na ezi-ụzọ, anyị ga emery nsogbu niile—otuu ọbụla osi dị ka osiri ike—ma lahachi na ụlọ anyị na elu-igwe na udo.

Ọ bụrụri na ụwa anyị niile diiri anyị nma, ma ọ bụ na ụwa anyị na achọ nghasa,dika ndị na eso ụzọ Kraịst, anyị ga achọalaeze chineke na ịdị nma Ya niile, mara na anyị mee nke-a, ihe niile ọbụla anyị chọrọ ka aga emere anyị (lee Matiu 6:33).

Nke-a bụ ihe mmụta dị mkpa na ndụ!

Mgbe ihe isike anyị, mgbali, obi-abụọ, na ụjọọ anyị na erikpo, mgbe ahụ ka ihe na esikwuru anyị ike. Mana anyị legide anya ebe njem anyị na elu-igwe, na ọńụ nọ na iso ezi-ụzọ—na ahụ Chineke na anya, na ejere ndị agbata-obi anyị ozi—anyị nwere ohere igabiga oge ihe mkpagbu na nsogbu.

Ndị Ezigbo enyi m, otu ọbụla ihe isike si na abiakwute anyị, ozi-ọma nke Jịsọs Kraịst nwere ụzọ kacha nma iji ruo na Alaeze Nna anyị nke Eluu-igwe.

Ịkuzi ihe site n’Ozi A

Onye Isi Nduzi Uchtdorf dụrụ anyị ọdụ “tụkawsi-obi na Chineke, ma mee ka mbọ niile bụrụ ịnọgide na iso-ụzọ ya.” Tulee ijụ ndị ị na akuziri otu ha si legide anya “na ebe njem elu-igwe anyị na ọńụ nke iso ezi-ụzọ” na oge ihe isike niile. Inwere ike ọgwa ha ka ha chee ụzọ ha nwere ike iji nọgide na ọgbụgba-ama ha ya na Kraịst mgbe ha nọ na ihe isike, na kwa kpee-ekpere otu ha ga eso tinye otu n’ime ụzọ ndị-a na ọrụ

Bipụta