2016
Nhọrọ niile
Mee 2016


Ozi nke Otu Ndi-Isi Ndụzi Mbụ, Ọnwa ise 2016

Nhọrọ niile

Ka anyị họrọ nke ahụ dị nma rara-ahụ, karia nke ahụ na adighi ike dị mfe.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, tụpụ M mmalite inye ozi ụbọchị taa, Ọ ga amasi-m ikwupụta tempụl anọ ọhụụ, nke na, ọnwa na afọ ndị na abia, ka aga arụ na ebe ndị-a: Quito, Ecuador; Harare, Zimbabwe; Belém, Brazil; na tempụl nke abụọ na Lima, Peru

Mgbe mbatara na Otu Ndị Ozi Iri na abụọ na afọ 1963, enwere tempụl iri na abụọ na arụ-ọrụ na Nzukọ-nsọ niile. Site na ntinye n’ọrụ nke Tempụl Obodo Provo na ịzu-ụka abụọ gara-aga, enwere 150 tempụl ndị na arụ-ọrụ gburu-gburu ụwa. Otu ọdị bụ, ngozi ndị anyị na anata n’ime ụlọ-nsọ ndị-a niile.

Ugbua, ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, Ọ ga amasi-m igosipụta obi ụtọ-m maka ohere ọma ịkwusara unu ụfọdụ echi-chem na ụtụtụ-a

Oge na adịbeghi anya, ana-m eche gbasara nhọrọ niile. A na-ekwukarị na akụkọ ịhe mere na mbụ, na-ebidokarị na ịhe ntakịrị, ọ na-adịkwa otua na ịhe gbasara ndụ anyị. Nhọrọ niile anyị na eme nekpebi ihe anyị ga abụ.

Mgbe anyị hapụrụ ụwa nke mụọ ma bata na ụwa nke anụ-ahụ, anyị wetara onyinye nke ohere-nhọrọ. Ebum n’obi anyị bụ inweta otịto nke selestial, ma nhọrọ nke ọbụla anyị mere, na ọnọdụ buru-ibu, na ekpebi ma anyị ọ ga enweta ebum n’obi anyị

Ọtụtụ n’ime anyị maara Alis na akwụkwọ-akụkọ nke Lewis Carroll Njem Alice in Wonderland I ga echeta na ọ biara na etiti okporo ụzọ gara ụzọ abụọ na ịhu ya, ha abụọ chere-ihu ụzọ nke ọzọ. Dika ọ na eche ụzọ nke ọ ga eso, otu Nwa-ologbo Cheshire biakwutere ya, nke Alice jụrụ, “ Kedu Ụzọ nkem ga Eso?”

Nwa-ologbo ahụ zara, “Nke-a dabere na ebe ịchọrọ ị ga . Ọ bụrụ na ịmaghi ebe ị chọrọ ị ga, enweghi ihe omere ụzọ nke ịhọrọ ị ga.”1

Anyị abughi Alice, anyị ma ebe anyị chọrọ ịga, o nwere ihe omere ụzọ nke anyị na aga, maka na ụzọ nke anyị sooro na ndụ-a ga eduga anyị n’ebe njedebe anyị na ndụ ọzọ.

Ka anyị họrọ izulite n’ime anyị nuukwu okwukwe siri ike nke ga abụ ihe nchekwa anyị nye atụmatụ nke onye-iro—ezigbo okwukwe, ụdị okwukwe nke ga akwagide anyị ma duba anyị na ịhọrọ ezi-ihe. Ewezuga ụdị okwukwe-a, enweghi ebe anyị na aga…Anyị jiri ya, anyị ga emejupụta ebum n’obi anyị.

Ọ bụ ihe dị oke-mkpa na anyị ga ahọrọ nke ọma, onwere mgbe anyị na ahọrọ ihe ọjọọ. Onyinye nke ncheghari, nke Onye-nzọpụta wetaara anyị, na enyere anyị aka imezi ụzọ anyị ka anyị wee nwe ike ilahachi na ụzọ ahụ ga eduga anyị n’ime otịto nke selestial anyị na achọ.

Ka anyị nagide ume nke iji merie ndị ụwa. Ka anyị họrọ nke ahụ dị nma rara-ahụ, karia nke ahụ na adighi ike dị mfe.

Dika anyị na atụle mkpebi niile anyị na eme ụbọchị niile—ma ọbụ ime nhọrọ nke-a ma ọbụ nke ọzọ—ọ bụrụ na anyị ahọrọ Kraịst, anyị ahọrọwo nke ọma.

Na nke-a ga abụriri otua bụ ekpere si m n’obi na aha Jịsọs Kraịst, Onye-nwe na Onye nzọpụta anyị, amen

Hụba-ama

  1. Ewepụtara site n’aka Lewis Carroll, Alice’s Adventures in Wonderland (1898), 89.

Bipụta