Ozi Nkuzi nke Otu-nleta, Onwa ise 2016
Ọ Ga Ebukwasị Gị na Ubu aka Ya ma Buruo Gị Ụlọ
Dịka nnọọ ka Ezigbo Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ chọtara atụrụ Ya furu efu, ọbụrụ na unu ga ebulite obi unu nye Onye-Nzọpụta nke ụwa, Ọ ga achọta unu.
Otu ihe m na-echetakarị ke mgbe m bụ nwata bụ ụzụ saịrin ụgbọ agha elu si ebe tere anya na ada nke na-akpọtekarị m n’ụra. Mgbe na-adịghị anya, obere ụda ọzọ nke prọpelas, ebidokwa dasiwa ike ruo nke-na ebe ọbụla amawa jijiji. Dịka nne anyị siri zụọ anyị, onye ọbụla n’ime anyị bụ ụmụntakịrị na-amakuru akpa e jiri kwajuo ngwo-ngwo anyị ma gbagoo n’elu ugwu a-rụrụ bọnka. Ka anyị ji ọsọ ọsọ agbapụ n’itiri ahụ, ụcha ọkụ ma ndị ọcha ma ndị ụcha akwụkwọ ndụ siri n’elu na-ada na-egosi ndị na-atụ bọmbụ ndị ha na-achọ. Na mgbagwọju anya, onye ọbụla na-akpọ ụcha ọkụ ndi a osisi Ekeresimesi.
A gbara m afọ anọ, ma a hụtara m naụwa nọ n’agha
Dresden
Ebe ezi-na-ụlọ m bi adịghị anya na nnukwu obodo Dresden Ndi biiri ebe ahụ elemaanya hụtara karịa ọtụtụ pụkụ ihe m hụtara. Nnukwu ire ọkụ juru ebe niile, nke sitere na ọtụtụ ogbu n’igwe a tụrụ,efesara ebe niile na Dresden, mebie ihe karịrị pesentị 90 na nnukwu obodo ahụ ma ihe juru ebe niile ka nke a mechara bụ, sọsọ ntụ na mkpu-mkpu okwute.
N’otu ntabi anya, nnukwu obodo nke ejiri mara ya bụ “Akpati Ọla dị oke ọnụ” lara niyi Erich Kästner, ode akwụkwọ si na Germany, dere akwụkwọ banyere mbibi ahụ, “N’otu puku afọ ka e jiri wuo obodo ọma ahụ, ma n’otu abalị ka e jiri laa ya n’iyi kpam kpam.”1 Mgbe m bụ nwata atụghị m anya na mbibi nke agha ndi bịebe anyị kpatara bụ ihe a pụrụ ichefu. Ọ dịịrị ka ụwa anyị ọgwụla, nke na onweghị ihe a pụrụ ime.
Afọ gara aga, e nwere m ohere ịlaghachi na Obodo Dresden ahụ ọzọ N’afọ iri asaa ka a lụsịrị agha, ọ ghọkwala “Akpati Ọla dị oke ọnụ” Ekpopụchara unyi ndi ahụ, ma nnukwu obodo ahụ eturukwala ugo ya karịa ka ọ dịbuuru.
N’oge ahụ m gara njem nleta a hụtara m ọmarịcha Nzukọ-nsọ Lutheran, Frauenkirche, Nzukọ nsọ nke Ezi nwanyị Anyị dị nwayọọ. E wuburu ya na mbụ na mbụ n’oge 1700s, Ọ bụụrụ otu n’ime ihe ndi dị mkpa nke Dresden naara arụta aka, mana agha mere ka ọ ghọọ ikpo okwute. Ọ nọrọ etu ahụ ọtụtụ afọ, tutu ụfọdụ ndị emechaa kpebie na-aga ewuchighari Frauenkirche ahụ.
Okwute niile sitere na nzukọ nsọ ahụ a lara n’iyi bụ ndị edokwara ma hazie ha nke ọma, ma ọtụtụ n’ime ha bụkwa ndi e ji rụọ ọrụ n’oge mwugharị ụlọ ahụ. A na-ahụta okwute ndi ahụ ọkụ majiri dị ka ápá na-ahụ mgbidi aja ụlọ ahụ taa. Ápá ndi ahụ abụghị nanị maka ncheta akụkọ ụlọ ahụ, kama ọ bụkwa ihe ncheta nke olile-anya— ákárá dị oke mma n’egosi ike mmadụ nwere imezi ihe mebiri emebi.
Ka m na-atụgharị uche banyere akụkọ ihe mere na Dresden ma nwee ịtụnanya n’ịdị uchu n’ọrụ na mkpebi nke ndi ahụ weghachitere ihe emebichara emebicha azụ, enwetara m mmetụta nke Mmụọ Nsọ n’enye obi ụtọ. Ezi-okwu m, echere m, na ọ bụrụ na mmadụ nwere ike were unyi, okwute ndi kụwara akụwa, ihe ndi fọrọ nke otu obodo dara ada ma wugharịa ụlọ tụrụ mmadụ n’anya lara elu nke ukwuu, kedụ kwanụ maka Nna nke Elu-igwe nwere ike ikulite ụmụ Ya ndi na-erubeghị isi, ndi na-esichaghi ike n’okwukwe, ma ọbụ ndị dabara na mmehie?
Otu ọbụla ndụ anyị siri laa n’iyi enweghị ihe o mere Ọbụladị na mmehie anyị na-acha uhie uhie emeghị ihe ọbụla, na-agbanyeghị ọnụma juru anyị obi, owu kụrụ anyị, ma ọbụ obi mgbawa anyị nwere. Ọbụrụgodi ndi na-enweghị olileanya, ndi dara mba, ndi a kpụrụ n’ala, gbanyere ugwu ha nwere azụ, ma ọbụ site na Chineke pụọ pụrụ inwe nchegharị. Ewezuga ndi nyefere ekwensu onwe ha, enweghị ndụ lara n’iyi na-apụghị inwe nchegharị. Ewezuga ndi nyefere ekwensu onwe ha, enweghị ndụ lara n’iyi na-apụghị inwe nchegharị.
Ozi nke oziọma n’enye ańụrị bụ nke a: n’ihi atụmatụ nke inwe ańụrị dị ebighị-ebi nke Nna anyị nke Eluigwe hụrụ anyị n’anya wetara site n’Aja-mgbaghara-mmehie na-enweghị ọgwụgwụ nke Jisọs Kraịst, anyị agaghị abụ sọọsọ ndi a gbapụtara site na mmehie ma sachaa anyị anyị a dị ọcha na-enweghị ntụpọ, anyị nwekwara ike gaaniihu ị dị mma karịa ka mmadụ chere ma bụrụ ndi ga-eketa oke ndụ ebighị-ebi na ndi ga-enweta otuto nke Chineke nke ọnụ apụghị ịkọwa
Ilu gbasara Nwa mmefu
N’oge Onye Nzọpụta jere ozi, ndi ndu na-ekwusa okwu Chukwu n’oge ahụ anabataghị mmekọrịta nke Jisọs na ndi ha hụtara ka “ndi mmehie.”
Ebe ha nọ ha hụtara ya ka Ọ na-anakwere ha ma ọbụladị akwado omume ọjọọ Elemaanya ha kwenyere na ụzọ kachasị mma iji nyere ndi mmehie aka inwe nchegharị bụụrụ ịma ha ikpe, ime ha akaja, na imenye ha ihere.
Mgbe Onye Nzọpụta nyọpụtara ihe ndi Faresii na ndi ode akwụkwọ naara eche, Ọ kọrọ otu obere akụkọ:
Kedu onye ọbụ nwere nari aturu ọbụrụ na otu n’ime ha furu na-agagh iahapụ iri-itoli na itoli na ọzara ma chọpụga otu ahụ furu-efu rue mgbe ọchọtaraya
Ma mgbe ọ chọtara ya, ya eburu ya n’ubu aka ya, na-ańụrị ọńụ.”2
Ke mgbe ọtụtụ oge gara aga, nkọwa ana enye nke a bụ iwu ana enye anyị ịbanye n’ọrụ ịkpọghachite ụmụ atụrụ ndi furu efu azụ ma chọwa ndi dapụrụ na okwukwe. Ebe echere na nke a bụ ihe kwesịrị ekwesị, ana m eche ma o nwere ihe ndi ọzọ kachasị nke a enwere ike ime.
Ọ ga-abụ kwa ihe kwesịrị ekwesị na ebumnobi Jisọs, kachasị mma, bụ ikuzi ihe banyere ọrụ nke Ezigbo Onye Ọzụzụ Atụrụ?
O nwere ike ịbụ na Ọ naara agba ama ịhụnaanya nke Chineke nwere n’ebe ụmụ Ya nupụrụ isi nọ?
O nwere ike bụrụ na ozi nke Onye Nzọpụta bụ na Chineke maara ndi ahụ dapụrụ n’okwukwe –ma na Ọ ga-achọta ha, rute ha nso, ma napụta ha?
Gịnị bụ ihe atụrụ ahụ na-ahaghị ime iji tozuo oke maka enyem aka nke a si n’eluigwe?
Ọ pụtara na atụrụ ahụ kwesiri ịma etu esi eji ngwa eji amata agbata ebe mmadụ nọ iji gụkọta ogo mmadụ rutere? ka e kwesiri iji ngwa igwe eji anata ozi na satụlaịtị iji kọwaa ọnọdụ ya? O kwesịrị inwe amamihe pụrụ iche iji hiwe app ga-akpọku maka enyem aka? Atụrụ ahụ enwere mkpa maka onye na-ehi ụda itinyere ya aka n’akwụkwọ tutu Onye ọzụzụ atụrụ Ọma abịa napụta ya?
Mba kwa n’ezie mba! Atụrụ ahụ tozuru oke inweta nnapụta dị nsọ n’ihi na Onye ọzụzụ atụrụ Ọma ahụ hụrụ ya n’anya.
N’ebe m nọ, ilu gbasara nwa atụrụ furu efu bụ otu n’ime nkeji dị na-akwụkwọ kachasị enye nchekube.
Onye Nzọpụta, Ezigbo Onye ọzụzụ atụrụ Ọma, maara ma hụkwa anyị n’anya. Ọ maara gị ma hụkwa gị n’anya.
Ọ maara mgbe ifuru ma Ọ maara ebe ị nọ…. Ọ maara ihe mgbu gị Arịrịọ niile ị na-arịọ maka enyem aka. Egwu gị niile. Akwá ị na-ebe.
Ụzọ i siri fuo enweghị ihe o mere—ọ bụrụgodu n’ihi ajọọ nhọrọ ndi i mere ma ọbụ n’ihi ajọọ ọnọdụ ndi karịrị gị.
Ihe kacha mkpa bụ na ị bụ nwa Ya. Na Ọhụrụ gị n anya Ọ Hụrụ ụmụ Ya N’anya.
N’ihi na Ọ hụrụ gị n’anya, Ọ ga-achọta gị. Ọ ga ebukwasị gị n’ubu aka Ya na-ańụrị ọńụ. Ma mgbe Ọ kpọlatara gị n’ụlọ, Ọ ga-agwa ọbụla, “Soro nụ m ńụrịa, n’ihi na a chọtara m atụrụ m furu efu.”3
Gịnị ka anyị kwesiri ime?
Kama, ị nwere ike na-eche, gịnị ka a tụrụ anya n’aka m? Ekwesịrị m ime ọtụtụ ihe karịa ị nnọọ na-eche ka abịa napụta m.
Na-agbanyeghị na ọ masịrị Nna anyị hụrụ ụmụ Ya n’anya ka ụmụ Ya niile lọghachikwute Ya, onweghị onye Ọ ga-amanye ị ga eluigwe.4 Chineke agaghị anapụta anyị na mmanye.
Ya bụ gịnị ka anyị kwesiriime?
Oku Ọ na-akpọ dị mfe:
“Bịakwute … m.”5
“Bịakwute … m.”6
“Bịaruo nụ m nso ma a ga M abịaru unu nso.”7
Nke a bụ ụzọ anyị nwere ike iji gosi Ya na anyị chọrọ ka anapụta anyị.
Ihe a chọrọ bụ inwe obere okwukwe Kama adala mba. Ọbụrụ na ị nweghị ike iwulite okwukwe ugbu a, malite na ị nwe olileanya.
Ọ bụrụ na ị nweghị ike ikwu na ị maara na Chineke nọ ebe ahụ, ị nwere ike nwee olileanya na Ọ dị. I nwere ike nwee mmasị ikwere.8 Nke ahụ ezuola ị bido.
Site n’olileanya ahụ, rịọwa Nna gị nke Eluigwe arịrịọ. Chineke ga-eme ka ịhụnanya Ya rute gị, ma ọrụ nnapụta na nnwogharị Ya ga-ebido.
Mgbe na-adịghị anya, ị ga-ahụta aka ebere Ya n’ime ndụ gị. Ị ga-enweta mmetụta ịhụnanya Ya. Ma mmasị ime ihe dịka O siri chọọ na ị gbasoro ụzọ Ya ga-abawanye site n’ihe ọbụla I mere n’okwukwe.
Anyị na-akpọ nzọm ụkwụ okwukwe ndi a “nrube isi.”
Nke ahụ abụzighị okwu a maara nke ọma n’ụbọchị taa. Mana nrube isi bara nnukwu uru n’oziọma nke Jisọs Kraịst, n’ihi na anyị maara na “site na Aja-mgbaghara-mmehie nke Kraịst, mmadụ niile ga-enweta nzọpụta, site na-irube isi n’iwu na emume nsọ niile nke Oziọma.”9
Ka anyị na-abawanye n’okwukwe, anyị ahaghị kwa ị nọ na-aga n’ihu iji okwukwe arụ ọrụ. Na mbụ e kwuru m okwu banyere onye ode akwụkwọ dị na Germany onye nke kwuru okwu banyere mwute o nwere maka mmebi nke Dresden. O dedakwara mkpirisi okwu nke a: “Es gibt nichts Gutes, ausser: Man tut es.” “Maka ndị na-anaghị asụ asụsụ celestial, a tugharịrị ya otu a Enweghị ihe dị mma tutu gị emee ya.”10
Mụ na gị nwere ike ikwu okwu ihe ndi banyere mmụọ nke ọma. Anyị nwere ike nweta mmasị n’aka ndi mmadụ n’ihi oke amamihe anyị n’ịkọwapụta n’ụzọ doro anya isiokwu ndi gbasara okpukpere chi. Anyị nwere ike ikwute okwu nke ọma gbasara okpukpere chi ma chee ezigbo echiche banyere oke anyị ga-erite n’elu igwe.11 Kama ọ bụrụ na okwukwe anyị agbanyeghị ụzọ anyị si ebi ndụ—ọbụrụ na okwukwe anyị anaghị emetụta mkpebi anyị na-eme kwa ụbọchị-okpukpere chi anyi bụ ihe efu, ma okwukwe anyị, ọbụrụ na ọnwụghị anwụ, adịghị mma ma nọ n’ọnọdụ ọnwụ.12
Nrube isi na-akwalite okwukwe. Site n’okwukwe anyị ka anyị ga-esi nweta okwukwe na otuto.
Mgbe ụfọdụ a na m eche na anyị na-aghọtahie nrube isi. Anyị nwere ike hụta ya ka isi mbu n’obi n’onwe ya, karịa ụzọ esi emezu isi ihe anyị bu n’obi. Ma ọbụ imanye ewu ọbụ n’olu ma sị ya tawa ji.
O doro anya na-enwere oge ndi ekwesịrị ikwadosi anyị ike ka anyị chegharịa. Na-ezia,enwere ụfọdụ enwere ike inweta sọsọ nụzọ dị otu a.
Ma elemaanya enwere ọmụmaatụ ọzọ dị iche nwere ike ị kọwa ihe mere anyị ji erube isi n’iwu nsọ Chineke. Enwere ike nrube isi abụchaghị usoro eji amanye mmadụ na irube isi dịka esi arụ igwe n’oku tupu ya adị mma iji mee ihe. Kama, ọ bụ usoro anyị si achọpụta otu anyị dị n’ụzọ dọrọ anya.
Ọ bụ Chineke kachasị elu kere anyị. Ọ bụ Nna anyị bi N’elu-igwe. Anyị bụ dịka esi kwuo ụmụ ndi Ọ mụrụ na mmụọ. Anyi bụ ndi ejiri ngwa si n’eluigwe nke kachasị oke ọnụ akachasị mezie emezie wee kee, ya mere anyị ji nwee n’ime anyị ihe si n’aka Chukwu.
N’elu ụwa a ihe ndi rere ure, na-adịghi nsọ, ma adịghị ụcha na-emetụta echiche anyị na ihe ndị anyị na-eme n’ụzọ jọrọ njọ. Ụmụ ururu ihe ọjọọ dị ụwa anyị nọ n’ime ya na-eme ka mkpuru obi anyị ruo unyị, mee ka ọ raa anyị ahụ ịmata ma cheta oke anyị ketara na mbu n’obi ya.
Mana ọ pughị igbanwe onye anyị bụ n’ezia. Ntọala ọdịdị chi anyị dị oke mkpa ga-anọgịde Ma mgbe ọbụla anyị họọrọ iche obi anyị ihu na-ebe Onye Nzọpụta hụrụ anyị n’anya nọ ma gbakwasi ụkwụ n’okporo ị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ihe iriba ama na-emes. Ịhụnanya nke Chineke n’ejuputa n’ime obi anyị, ihe nke eziokwu na-ejuputa n’echiche anyị, anyị ebido jụwa mmasị ime mmehie, ma anyị agaghị achọ ime mmehie ọzọ.13
Anyị na-abịa ahụta na nrube isi abụghị ntaram-ahụrụ kama na ọ bụ usoro na-enye anyị ohere imejuputa akaraka anyị si na chi. Nwayọ nwayọ ire ure, urughuru, na ihe ndi na-ebuta agaghị n’ihu n’elu ụwa nke a ebido kwụsịwa. Emesịa, ekpughee mmụọ dị ebghi-ebi nke onye bi n’igwe bi n’ime anyị dị oke ọnụ, anyị aghọọ ụzọ eji ama atụ ihe mara mma.
Itozuru oke inweta nnapụta
Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, a na m agba ama na Chineke na-ahụta anyị dịka otu anyị dị n’eziokwu—otu anyị dị na-ezia-ma a na-anabata anyị ka ndị toruru inweta nnapụta.
Inwere ike iche na ndụ gị lara n’iyi. Inwere ike ị mehiela Inwere ike na-atụ egwụ, ewe iwe, eru uju, ma ọbụ na-anwụ n’ime obi abụọ. Kama na-otu ụdịrị ụzọ ahụ Onye ọzụzụ Atụrụ Oma siri chọta atụrụ ya fụrụ efụ, ọbụrụ na Ị ga-atụgharị echiile gị na otu ihe si emetụta gị n’ebe Onye Nzọpụta nke ụwa, Ọ ga achọta gị.
Ọ ga-anapụta gị
Ọ ga-ebụli gị elu ma bugowa gị n’elu ubu aka ya.
Ọ ga-eburu gị ụlọ.
Ọbụrụ na aka mmadụ dị ndụ nwere ike nwọgharịa ikpo okwute na unyị ya aghọọ ọmarịcha ụlọ ekpere, anyị nwekwara ike inwe ntụkwasị obi na Nna nke Eluigwe hụrụ anyị n’anya nwere ike ma ga-ewugharị anyị. Atụmatụ ya bụ ime ka anyị dị mma karịa ka anyị dịbụụrụ na mbụ–karịa ihe anyị nwere ike ịtụ anya ya. Na nzọm ụkwụ ọbụla anyị zọrọ n’okwukwe n’okporo ụzọ nke ịbụ ndị na-esọ ụzọ Kraịst, anyị na-eto ị bụ ndị juputara n’otuto dị ebighị-ebi na ọnụ na-enweghị nsọtụ a kwadoro ka anyị bụrụ.
Nke-a bụ ọgbụgba ama m na ekpere umeala m n’aha nke Jisọs Kraịst, amen.
© 2016 site n’aka Intellectual ReserveInc Ikike Mbipụta nile ka edokwara Ebipụtarana USA Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/15 Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/15 Ntụgharị asụsụ nke Visiting Teaching Message, May 2016. Igbo 12865 593