2016
Idowe Iwu-Nsọ niile na Ịhụ Ndị-ọzọ niile N’anya
Septemba 2016


Ntorobia

Idowe Iwu-Nsọ niile na Ịhụ Ndị-ọzọ niile N’anya

Mgbe anyị na-eche maka ịhụnanya, oge ufọdụ ihe mbu niile nke n’abịa n’obi bụ ihe nlere-anya mmekọ nwoke na nwanyị, chocolet, na ifuru niile. Mana ịhụnanya—ezigbo ịhụnanya—dị omimi karịa ma dịrịkwa mwezuga-onwe karịa nke ahụ. Jisọs Kraịst biri ndu n’ihi anyị ma nwụọ ọnwụ maka anyị n’ihi ịhụnanya Ya n’ebe anyị nọ. Na-eziokwu, iwu-nsọ abụọ kacha dị oke-elu bụ ịhụ Chineke n’anya na ịhụ onye ọbụla ọzọ n’anya (lee Matiu 22:36-40). Mana kedu otu anyị nwere ike igosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya?

Onye-isi-nduzi Uchtdorf kọwara akụkọ parabụl nke Kraịst maka ụmụ ndị-nwoke abụọ, otu nke na-arụrụ nna ya ọrụ na otu nke na anaghị arụ. Onye-nzọpụta n’ekwupụta okwu dị mkpa na ọ bụ nanị nwa-nwoke nke rubere nna ya isi hụrụ ya n’anya n’ezie. Otu aka ahụ, mgbe anyị na-erube-isi na iwu niile nke Chineke, anyị na-egosipụta na anyị hụrụ Ya n’anya ma chọọ ka anyị laghachikwute Ya.

Kama kedụ otu anyị na-esi egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ niile n’anya? Onye-isi-nduzi Uchtdorf kọwakwara nke ahụ: ọbụrụ na anyị hụrụ mmadụ ibe anyị n’ezie, anyị agbatia onwe anyị niile inyere ‘ndị ogbenye aka na ndị nwere mkpa, ndị nrịa nrịa na ndị ihe mekụtara.’ Nihi ndị ahụ ndị na-ewezuga onwe n’ime agwa omiko na ije-ozi, ndị ahụ kwa bụ ndị na-eso ụzọ nke Jisọs Kraịst.”

Ya mere oge ọzọ ị hụrụ ndị nne na nna gị, otu nwanne, ma ọbụ otu enyi, chee maka ijere ha ozi iji gosipụta ụdị mmetụta I nwere maka ha. Ọbụghị nanị na ọ ga-eme gị na ha obi-ụtọ, kama ọ ga-eme Nna gị bị N’Eluigwe obi-ụtọ kwa.

Bipụta