Ozi nke Otu Ndị-Isi Nduzi Mbụ, Ọnwa itolu 2016
Enwetachaa Ịhụnaanya, Ọbụrụzie Gịnị?
Onye amụma anyị hụrụ n’anya, Onye-isi-nduzi Thomas S. Monson, akuziwo na “ịhụnaanya bụ ihe ụtọ karịchara nke ozi-ọma ahụ.”1
Ịhụnaanya dị nnọ mkpa mere Jisọs siri kpọọ ya “iwu-nsọ nke mbụ na nke kacha dị ike” ma kwuo na iberibe ndị ọzọ niile nke iwu ahụ na okwu niile nke ndị amụma dabere n’elu ya.2
Ịhụnaanya bụ ebumnobi dị n’etiti maka ihe niile dum anyị n’eme nime Nzukọ-nsọ Mmemme niile, nzukọ niile, akparam-agwa niile anyị sonyere dịka ndị n’eso ụzọ nke Jisọs Kraịst kwesịrị ịmalite site na ejiri mara nkea—n’ihi ewezuga afọ-ọma, “ịhụnaanya nke Kraịst n’enweghị ntupo,” enweghị ihe anyị bụ.3
Ozugbo anyị jiri mmuo anyị na obi anyị họta nkea, ozugbo anyị kwụpụtara ịhụnaanya anyị maka Chineke na maka mmadụ ibe anyị—ọbụrụzie gịnị?
Inwe mmetụta ọmiko na ịhụnaanya maka ndị ọzọ niile ọ ga ezu? Ọ pụtara na nkwupụta ịhụnanya anyị maka Chineke na ndị agbata-obi anyị ga-emejupụata oke na ọrụ anyị nye Chineke?
Akụkọ parabụl maka Ụmụ Ndị-nwoke abụọ ahụ niile
Na temple dị nime Jerusalem, ndị nchu-aja chiri echichi na ndị okenye nke ndị juu gakwutara Jịsọs iji ọnya mata Ya nime okwu Ya niile. Onye-nzọpụta, otu-o sila dị, bugharịrị okwu niile n’ebe ha nọ site n’igwa ha otu akụkọ.
“Otu nwoke nwere ụmụ ndị nwoke abụọ,” O malitere. Onye-nna ahụ gakwuru onye nke mbụ ma rịọ ya ka ọ gaa rụọ ọrụ nime ụbị-vine ahụ Mana nwa nwoke ahụ jụrụ-ajụ. Ma emesịa nwa-nwoke ahụ “cheghariri, ma gaa.”
Onye nna ahụ gakwuziri onye nke abụọ ma rịọ ya iga ọrụ nime ụbi-vine. Nwa nwoke nke abụọ mere ka obi sie ya ike na ya ga-aga, kama ọ gaghị ma ọlị.
Ma mgbe ahụ Onye nzọpụta ahụ tụgharịrị na-ebe ndi-nchu-aja niile na ndi okenye ma jụọ, “Ole otu nime nwa-nwoke abụọ ndịa niile mere uche nke nna ya?”
Ha bịara kwere na ọ bụ nwa-nwoke nke mbụ—onye nke kwuru na ọ gaghị aga mana ọ mesiri chegharịa ma gaa ịrụ-ọrụ nime ubi-vine.4
Onye-nzọpụta jiri akụkọ nkea iji kuo ihe dị mkpa gbasara otu ukpuru dị mkpa—ọ bụ ndị ahụ ndị na-erube isi nye iwu-nsọ niile ndị hụrụ Chineke n’ anya n’eziokwu.
Enwere ike nkea bụ ihe mere Jisọs jiri gwa ndị mmadụ ka ha gee ntị nye ma sọrọ okwu niile nke ndị Pharisee niile na ndị Scribe niile kama esokwala ọmụmatụ ha.5 Ndị nkuzi niile nke ozi-ọma emeghi otu ha si kwuo. Ha nwere mmasi ikwu gbasara ozi-ọma, kama na-nwute ha enwetaghi ihe nke kacha mkpa.
Agwa niile na Nzọpụta Anyị
N’ime otu nkuzi ngwucha niile nke Onye-nzọpụta nye ndị na-eso Ụzọ Ya, O kwuuru ha okwu gbasara ikpe nke ngwụcha. Ndị ajọ-omume na ndị ezi-omume ka aga edowe iche iche. Ndị ezi-omume ga-erite ndụ ebigh-ebi; ndị ajọ-omume ka aga enyefe ntaram ahụhụ nke ebigh-ebi.
Gịnị bụ idi-iche dị n’etiti otu abụọ ndịa?
Ndị ahụ nke gosipụtara ịhụnaanya site na-agwa ha ka azọpụtara. Ndị nke n’egosipụtaghị ka a mara ikpe.6 Ezi mgbanwe nime ozi-ọma nke Jisọs Kraịst na uru ya niile na ukpuru niile ka aga enwete site na-agwa niile nke anyị nime ndụ anyị niile kwa ụbọchi.
Na-ngwụcha, nkwupụta nke ure-ọnụ ịhụnaanya maka Chineke na mmadụ ibe anyị agaghị eme ka anyị tozuo mbuli-elu. N’ihi, dịka Jisọs kuziri, “Ọbụghị onye ọbụla nke na-asị m Onye-nwenwe Onye-nwenwe ga-aba n’ala-eze nke elu-igwe; kama onye nke na-eme ọchịchọ nke Nna m nke bi n’elu-igwe.”7
Gịnị Na-abịa mgbe Ịhụnaanya bịachara?
Aziza nye ajụjụ ahụ “Enwetachaa Ihụnaanya, Ọbụrụzie Gịnị?” nwere ike dịrị mfe ma bụrụ eziokwu. Ọbụrụ na anyị hụrụ Onye-nzọpụta n’anya n’eziokwu, anyị ga-eweba obi anyị niile nime Ya ma mgbe ahụ anyị agaa ije n’ụzọ nke ndị n’eso ụzọ. Mgbe anyị hụrụ Chineke n’anya, anyị ga-agbalisike idowe iwu-nsọ Ya niile.8
Ọbụrụ na anyị hụrụ mmadụ ibe anyị n’anya, anyị ga-agbati onwe anyị iji nyeere “ndi ogbenye na ndị nwere mkpa aka, ndị nrịa nrịa na ndị ihe na-akpagbu.”9 N’ihi ndị ahụ na-eme omume ọmiko na ije-ozi n’umeala,10 ndị ahụ kwa bụ ndi na-eso ụzọ Jisọs Kraịst.
Nkea bụ ihe na-abịa mgbe ịhụnaanya bịachara.
Nkea bụ ihe ụtọ dị nime ozi-ọma nke Jisọs Kraịst.
© 2016 site n’aka Intellectual Reserve Inc. Ikike Mbipụta nile ka edokwara Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/15 Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/15. Ntụgharị-asụsụnke First Presidency Message, September 2016. Igbo. 12869 593