2016
Ọkwa Nne na Nna Bụ Ọrụ Dị Nsọ
Septemba 2016


Ozi nke Nkuzi ndị nleta ụmụnwanyị, Ọnwa itolu 2016

Ọkwa Nne na Nna Bụ Ọrụ Dị Nsọ

Mụọ akwụkwọ ọziza site n’ekpere ma chọpụta ihe ị ga-akuzi Olee otutu ịghọta “Ezi-na-ụlọ ahụ: Ịmaa ọkwa nye ndị Ụwa” si ebulie okwukwe gị n’ime Chineke ma gozie ndị ị na-elekọta site na nkuzi nleta? Maka imata ihe ndị ọzọ, ga na reliefsociiety.lds.org.

Foto, oyiyi
Njiri-mara Otu Enye m aka

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

Nna anyị nke Eluigwe mepụtara ezi-na-ụlọ niile inyere anyị aka kuzie ukpuru bụ eziokwu n’ebe-obibi enwere ịhụnaanya. Onye-isi-nduzi Thomas S. Monson kwuru: “Nye nwantakịrị gị olu-ọma na mmaku; kwuo, ‘Ahụrụ m gị n’anya’ karịa; oge ọbụla n’ekwupụta ekele gị niile. Ekwekwala ka otu nsogbu aga ahazi dịrịzie oke mkpa karịa onye nke ekwesiri ịhụ n’anya.”1

Susan W. Tanner, onye bubuuru onye-isi-nduzi zuru-ọha nke Ụmụagbọghọ, kuziri: “Nna anyị bị N’eluigwe n’egosipụta usoro anyị kwesiri isonye. Ọ hụrụ anyị n’anya, na-akuziri anyị, n’enwe ndidi n’ebe anyị nọ, ma nyefee anyị nhọrọ nke onwe anyị. … Oge ụfọdụ ịdọ-aka na ntị, nke pụtara ịkuzi, n’agbagwoju anya ya na nkọja. Ụmụntakịrị—ma kwa mmadụ nke afọ-ole ọbụla—n’etolite n’agwa site na ịhụnaanya na mgbam-ume karịa site na nchọpụta ịda-mba.”2

“Ọ bụrụ na n’anyị site na okwukwe n’enwe ekpere ezi-na-ụlọ, ọmụmụ akwụkwọ-nsọ, nnọkọ mgbede ezi-na-ụlọ, ngọzi niile nke ọkwa-nchu-aja, na idowe ụbọchi izu-ike nsọ,” ka Okenye Quentin L. Cook nke Kworum ndị Ozi Iri na abụọ kwuru, “ụmụntakịrị anyị ga … adị na njikere maka ebe-obibi dị ebighi-ebi n’eluigwe, n’agbanyeghi ihe dakwasịrị ha n’ime ụwa nke siri ike.”3

Akwụkwọ-nsọ niile Agbakwunyere

1 Nifai 8:37; 3 Nifai 22:13; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 93:40; 121:41.

Akụkọ nịịle dị-ndụ

“A nọọrọ m na-agụ akwụkwọ akụkọ-ụwa mgbe otu n’ime ụmụ ụmụ m ndị nwoke na-etolite etolite gbabanyere m n’ime,” ka Okenye Robert D. Hales nke Kworum nke Ndị-Ozi Iri-na Abụọ kwuru. “Dịka m n’agụ, obi diri m ụtọ inụta olu ya dị ụtọ ka ọ na-ada na mbara-ezi. Chee maka ịtụnanya m mgbe, obere oge gachara, ọ kwanyere onwe ya n’etiti mụ na akwụkwọ ahụ. Were aka ya buru ihu m ma biagide imi ya n’elu nke m, ọ jụrụ, Papa nnukwu! Ị nọ n’ime ebe ahụ?’

“… Ịnọ n’ebe ahụ pụtara ịhọta obi niile nke ntoroọbịa ma jikọta onwe gị na ha. Ma njikọta onwe gị na ha pụtara ọbụghị nanị ikwunyere ha okwu kama isoro ha na-eme ihe niile kwa. …

“Anyị ga ahazirịrị ma were ohere ọma niile nke nkuzi. …

“… Ka m na-adị ndụ karịa, ka m na-achọpụta ohere niile nke ikuziri ntoroọbịa, kacha nke ndị ahụ sitere n’aka nne na nna m bịa, akpuwo ndụ m ma mee mụ onye m bụ.”4

Hụba-ama

  1. Thomas S. Monson, “Ịhụnaanya na Ụlọ—Ndụmọdụ sitere n’aka Onye-Amụma Anyị,” Liahona Ọnwa nke asatọ. 2011, 4.

  2. Susan W. Tanner, “Agwara M Gị …?” Liahona Ọnwa nke Ise2003, 74.

  3. Quentin L. Cook, “Onye-nwe-anyị bụ Ihé M.” Liahona Ọnwa Ise 2015, 64.

  4. Robert D. Hales, “Oke na Ọrụ Anyị nye Chineke: Ozi nke ndị nne na nna na Ndị Ndu nye Ọgbọ nke N’ebilite,” Liahona, Ọnwa Ise 2010, 96, 95.

Tulee Nkea

Gịnị mere esi akuzi ozi-ọma karịa site na asụsụ na ngosipụta nke ihụnaanya?

Bipụta