2016
Kedu Otu Ị Ga Esi Echeta Onye-nzọpụta Na Izu-Uka Nke-a?
Disemba 2016


Ntorobia

Kedu Otu Ị Ga Esi Echeta Onye-nzọpụta Na Izu-Ụka Nke-a?

Onye Isi Nduzi Eyring gbara anyị ume ka anyị “họrọ icheta [Onye-nzọpụta] na ụzọ nke kacha gị nma idọta obi na ebe Ọ ọnọ.”

Kedu otu ị na esi echeta Ya mgbe niile na izu-ụka (lee O&Ogb 20:77, 79)?

Ị nwere n’ime akwụkwọ-nsọ ebe na amasi gị gbasara Onye-nzọpụta? Ị nwere ike ihuba ọtụtụ ebe-ama n’ime akwụkwọ-nsọ na-ime izu-ụka nke-a, ma kwusara otu onye ọzọ.

Ị na agụ abụ ma ọbụ kwee ukwe ọzọ na akpalite mụọ na–ime obi gị mgbe ọbụla obi na adighi gị nma? I nwere ike ịhọrọ nke ekwuru gbasara Onye-nzọpụta na izu-ụka nke-a.

Ị na atulee uche gbasara ndị Onye-nzọpụta ahụ na aja mgbaghara mmehie na oge emume orịrị-nsọ na izu-ụka ọbụla? Ị nwere ike ikwado maka emume orịrị-nsọ site na icheta maka nhọrọ niile ndị imere na izu-ụka ahụ nke bụ icheta Onye-nzọpụta oge niile na ichegharị na oge ndị ị na agbali ime nke-a.

Ị na ekpe-ekpere ka oge pụtara gị ikesa ozi-ọma ụbọchị niile? Gbalia inwe mkparịta-ụka ozi-ọma na izu-ụka nke dabere na Onye-nzọpụta. Ị nwere ike igba-ama gbasara Onye-nzọpụta na oge nnọkọ-mgbede ezi-na-ụlọ, ma-ọbụ kwusara otu enyị gị na ụlọ-akwụkwọ gbasara ahụmihe i nwere na nzukọ-nsọ.

Mee atụmatụ icheta Onye-nzọpụta na ụzọ pụrụ-iche na izu-ụka nke-a. Gwa onye nne na nna, nwanne gị, onye ndụ, ma-ọbụ otuu enyị gị maka atụmatụ nke-a. Na ngwucha izu-ụka ahụ, gwa ha niile ihe mere. Unu abụọ ga enweta udo na ọńụ ahụ Onye Isi Nduzi Eyring kwuru maka ya.

Bipụta