2016
Udo na Ndụ Nke-a
Disemba 2016


Ozi nke Ndị Isi Nduzi Mbụ, Ọnwa iri na abụọ 2016

Udo n’ime Ndụ Nke-a

N’ime ụwa anyị niile biara, Onye nzọpụta kwuru na, “Na ụwa unu na enwe mkpagbu” (Jọn 16:33). Ọ kwere nkwa nke-a dị egwu nye ndị na eso ụzọ Ya mgbe Ọ na agbasa ozi-ọma Ya n’ime ụwa: “Udo ka-m na hapụrụ unu; udo nkem ka M na-enye unu: ọ bụghị dika ndị ụwa na enye ka Mụ onwe-m na enye unu” (Jọn 14:27) Ọ bụ ihe nkasi-obi imata na nkwa ekwere maka inweta udo nke onwe na adigide nye ndị na eso ụzọ ma taa.

Ụfọdụ n’ime anyị bị ebe-obobi mara-nma ma dikwa jụụ, ma na enwekwa nsogbu n’ime mụọ Ụfọdụ na enwe udo na ezi ọnọdụ n’ime oke ihe efu, ihe mberede, na ọtụtụ ihe ọnwụnwa.

Enwere ike ihụla ihe ọrụ-ebube nke udo na ihu ndị na eso-ụzọ Jisọs Kraịst ma-ọbụ nụ ya na ọnụ okwu ha. Ahụlam ya ọtụtụ ugboro. Mgbe ụfọdụ, ọ na abụ na ụlọ-ọgwu ebe ezi-na-ụlọ na agbakọ gburu-gburu onye ozi Chineke na achọ inwu-anwu.

A nam echeta ị ga ileta otu nwanyị na ụlọ-ọgwu abali ole-na-ole tupu ọnwuọ site na ọrịa kansa. Akpọtara m ụmụ ndị nwanyị abụọ ka ha soro-m gaa maka nwata nwanyị-a mara-nma bụụrụ onye nkuzi ha na Praịmarị.

Ndị ezi-na-ụlọ ya gbakọtara na gburu-gburu ebe akwa-ndina ya, jiri oke mmasi ịnọnyere ya na mgwucha ọnọdụ ya na-elu ụwa. Ọ tụrụ na-anya mgbe okulitere elu site na akwa-ndina. O jigidere ụmụ abụọ ahụ ma kowari ndị ezi-na-ụlọ niile ahụ ndị ha bụ na-otu na-otu, Okwuru okwu dika aga asi na ụmụ bụ ndị si na obị-eze ndị ana akpọgara eze-nwanyị. Ọ chọtara otu ụzọ iji kwuo ihe gbasara ụzọ onye ọbụla n’ime ha na esi eme ihe ka onye na eso ụzọ Onye-nzọpụta. A nam echeta ikike, nwayo, na ihụnaya nọ na olu-okwu ya. Ọtụrụ na anya ịhụta ihu ọchị ya ọbụladị mgbe ọ makwa na oge ya na ụwa fọdụrụ nwa-ntakiri.

Ọ nwetawo ngozi-nkasi-obi nke ọkwa-nchụ-aja, mana ọ nyere anyị niile ọgbụgba-ama nke dị ndụ na nkwa nke udo Onye-nwe anyị kwere bụ ezi-okwu: “Ihe niile ndị-a nke ekwu-woro nye unu, na site n’ime-m unu ga enweta udo. Na ụwa unu ga enwe mkpagbu: ma na nwee nụ ańụrị; E-merie-la m ụwa” (Jọn16:33).

Ọ nabatala ọkpụkpọ-oku Ya, dika anyị niile nwere ike, na agbanyeghi ọnwunwa anyị na nsogbu niile:

Bịakwute nụ-m unu niile ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ ndi ebowokwara ibu dị arọ Mụ onwe-m ga-emekwa ka unu zuru ike.

Nwere nụ ihe nke nkọta nke-m, mụtakwa nụ ihe gbasara-m, n’ihi na abụ-m onye dị nwayọọ na onye dị ume-ala n’obi: unu ga-enwetakwa udo nye mkpụrụ obi unu (Matiu 11:28–29).

Ọ bụ site na iso Onye-nzọpụta ka onye ọbụla n’ime anyị nwere ike ịchọta udo na ume-ala n’ime ihe nwale niile nke ga abiakwuta anyị niile.

Ekpere nke oriri-nsọ na enyere anyị aka inweta udo ahụ na-ime nsogbu nke ụwa-a. Dika anyị na anata oriri-nsọ ahụ, anyị nwere ike ikpebi ikwesi-ike na ọgbụgba-ndụ nke isoro Ya.

Anyị nwere ike ikwe-nkwa icheta Onye-nzọpụta. I nwere ike ihọrọ icheta Ya na ụzọ nke kacha gị nma idọta obi na ebe Ọ ọnọ. Mgbe ụfọdụ mụ onwe-m, ọ bụ ị hụ Ya ebe osekpuru-ala na ogige nke Getsamenị ma-ọbụ ị hụ Ya ebe ọ na akpọku lazarus ka o bilite na ilị. Dika nke na eme, ana-m enweta mmetụta Ya, na afọ ojuju nke na enweta udo na ime obi-m.

Ị kwere nkwa na ịdobe iwu Ya niile. I kwere nkwa iwere aha Ya na onwe gị ma bụrụ-kwa onye mgba-ama Ya. Ọ kwere nkwa na ọbụrụ na gị bigide ọgbugba-ndụ gị na Ya, Mụọ-nsọ ga anọ-nyere gị (Lee O & Ogb 20:77, 79).

Nke-a na ewebata udo opekata mpe na ụzọ abụọ. Mụọ-nsọ na asachapụ anyị njọ site na Aja Mgbaghara mmehie nke Jisọs Kraịst. Mụọ-nsọ na enye anyị udo nke na abia site na nkwado nke Chineke na olile-anya nke ndụ ebighi-ebi.

Onye ozi Pọl kwuru gbasara ngozi ọma ndị-a: Mana mkpụrụ nke Mụọ bụ ihụnanya, ọńụ, udo, ntachi-obi, ịdị-nwayọọ, ịdị-nma okwukwe” (Galatians 5:22).

Mgbe ndị-ozi wetara-ozi gbasara ọmụmụ nke Onye-nzọpụta, ha kwusara, “otịto diri Chineke na elu kachasi elu, na elu-ụwa udo” (Luke 2:14; e kwu-kwara ugboro-ugboro). A nam agba-ama dika onye aka-ebe nke Jisọs Kraịst na Nna na Okpara Ya Ọ hụrụ na anya nwere ike izitere anyị Mụọ-nsọ ime ka anyị nweta udo na ndụ nke-a, na ihe ọnwunwa niile nke na abiakwute anyị, ya na ndị anyị hụrụ na anya.

Ịkuzi ihe site n’Ozi-A

Onye Isi Nduzi Eyring kuziri na ekpere orịrị-nsọ nwere ike inyere anyị aka ịmata otuu anyị ga esi chọta udo. Ha na echetara anyị na dika anyị na edote iwu ọgbụgba ndụ anyị niile, anyị ga enweta nkwa nke ahụ Chineke kwere na Mụọ-nsọ ga anọnyere anyị. Tulee ịju ndị ị na akuziri otu inwe Mụọ-nsọ nime anyị nwere ike inyere anyị aka nweta udo I nwere ike ikwusa echiche gị ma-ọbụ ahụmihe otu Mụọ-nsọ siri nyere gị aka inweta udo. I nwere ike igwa ndị ị na akuziri ka ha tulee ozi nke-a na oge ana eri orịrị-nsọ na ịzu-ụka nke-a.

Bipụta