2016
Ọńụ Ezi-na-ụlọ na amalite site na ezi-omume
Disemba 2016


Ozi nkuzi ndị nleta ụmụnwanyị Onwa Ịrị na abụọ 2016

Ọńụ Ezi-na-ụlọ na amalite site na ezi-omume

Mụọ akwụkwọ ọziza nke-a site n’ekpere ma chọpụta ihe ịga-akuzi Kedụ otu ịghọta “Ezi n’ụlọ: Ọkwa-amara nye Ụwa niile” ga-esi amụba okwukwe gị nime Chineke ma gọzie ndị ahụ ị na-elekọta site na nkuzi nleta? Maka imata ihe ndị ọzọ, ga na reliefsociety.lds.org.

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

Chineke “hiwere ezi-na-ụlọ iji wetara anyị ọńụ, iji nyere anyị aka mụta ezi ụkpụrụ n’ime ọnọdụ dị nma, na-kwa iji kwado anyị maka ndụ-ebighi-ebi.”1 Site na “oke atụmatụ nke ańụrị” (Alma 42:8). Onye Isi Nduzi Russell M. Nelson, Onye Isi Nduzi nke Ndị Ozi Iri na abụọ, kwuru: “Atụmatụ Ya kwupụtara na nwoke na nwanyị biara, ka ha nwe ike inweta ańụrị [2 Nifaị 2:25] Ọńụ ahụ na abia mgbe anyị kpebiri ibi ndụ dika atụmatụ Chineke siri dị ”2

Ebe obibi dabere na Kraịst na ewetara anyị ohere ọma ime ka nke-a dị-ire. Okenye Richard G. Scott (1928–2015) onye otu nke Ndị Ozi Iri na abụọ kọwara ya dika otu-ebe “ebe ana akuzi ozi-ọma, ebe ọgbụgba-ndụ na ebe ihụnaya jupụtara “gbaa mgbọrọ-gwu na ozi-ọma nke Jisọs Kraịst.”3

Onye Isi Nduzi Henry B. Eyring Onye ndụmọdụ nke Mbụ na ndị Isi Nduzi Mbụ, kwuru: “Anyị nwere ike ikpebi na anyị ga eme ihe niile anyị nwere ike iji wedata ikike nke elu-igwe na ezi-na-ụlọ [anyị]. Ma otu-a anyị ga akwalite ihụnanya, ije-ozi, nrube-isi na ańụrị na ebe obibi anyị site na ụmụ anyị igere okwu nke Chineke ma na agbali iji okwukwe na eme ya. Ha mee nke-a, ndụ ha gaa agbanwe nke na ọ ga eweta ụdị ọńụ nke ha na achọ.”4

Ebe-obibi Dabere na Kraịst.

Anyị nwere ụdị ebe-obibi dabere na Kraịst na-ime akwụkwọ-nsọ. Mgbe nna ya, Lehị, nwụrụ, Nịfaị kpọọrọ ndị ezi-na-ụlọ ya na ndị ọzọ niile kwere na idọ-aka na ntị na ihe mkpughe nke Chineke na ndị niile kwere na okwu nke Nifaị, site na ala Ndị Lamanit. Na ebe ọhụụ nke-a, Ndị Nifaị nwere ike irube-isi na ikpe niile, iwu edere-ede, na iwu nke Onye-nwe anyị na ụzọ ọbụla, dika ọdị na iwu mosịs (lee 2 Nifaị 5:6–10). Na agbanyeghi na-ime ndị Nifaị, ụfọdụ n’ime ha mechara bụrụ ndị nnupụ-isi na iwu.

Ma dika ndị otu ezi-na-ụlọ anyị nwere ike inupụ-isi na ezi-omume dika ndị Nifaị mere, Okenye Scott kwuru na ezi-na-ụlọ dabere na Kraịst bụ-kwa ya na “enye ohere udo kachasị na ebe mgbaba na ebe-obibi anyị.” Ọ na akọwatakwa na ọtụtụ mgbe “ana enwe ọtụtụ ihe iche aka mgba, ma ọbụ isi-ọwụwa, mana na-ime ọgbaghara nke-a anyị nwere ike irite udo na ọńụ ahụrụ-anya.”5

Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere

3 Jọn 1:4; 1 Nifaị 8:12; 2 Nifaị 5:27

Huba-ama

  1. Handbook 2: Administering the Church (2010), 1.1.4.

  2. Russell M. Nelson ,“Alụ-m dị na nwunye nke Ala-eze,” Liahona, Ọnwa Ise 2008, 92.

  3. Richard G Scott “Maka Udo na Ebe-obibi” Liahona Onwa ise 2013 30, 31.

  4. Henry B. Eyring, Nkuzi niile nke “Ezi-na-ụlọ: Ọkwa Amara nye Ụwa,” New Era, Ọnwa Itoli. 2015, 5, 6.

  5. Richard G. Scott, “Maka Udo na Ebe-obibi,” 31.

Tulee uche na Nkea

Kedu ihe anyị nwere ike ime iji bie nke ọma na ezi-na-ụlọ anyị niile?

Bipụta